Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ebee Ka Ị Pụrụ Ịchọta Ezi Ụkpụrụ Ime Mmụọ?

Ebee Ka Ị Pụrụ Ịchọta Ezi Ụkpụrụ Ime Mmụọ?

Ebee Ka Ị Pụrụ Ịchọta Ezi Ụkpụrụ Ime Mmụọ?

“Ọ BỤRỤ na ị gaje ịbanye n’okpukpe nanị n’ihi na ọ bụ okpukpe e ji mara ezinụlọ unu, ọ́ gaghị aka mma na ị họọrọ okpukpe ndị nna nna anyị hà kpere afọ 2,000 gara aga?” ka Rodolphe ji njakịrị jụọ. Ajụjụ ahụ kpaliri nwa okorobịa na-ege ya ntị ịmụmụ ọnụ ọchị.

“Mmekọrịta mụ na Chineke dị m oké mkpa,” ka Rodolphe na-ekwu. “Ekwenyetụghị m n’echiche bụ́ na m kwesịrị ịbanye n’okpukpe n’ihi ọdịnala, nanị n’ihi na ndị òtù ezinụlọ m bụ́ ndị biri ndụ ọtụtụ iri afọ ma ọ bụ ọbụna ọtụtụ narị afọ kpere okpukpe ahụ.” Rodolphe lebaara okwu ahụ anya nke ọma; o leghị ihe a dị mkpa anya nanị dị ka ihe o ketara eketa.

Ọ bụ ezie na ndị mmadụ adịchaghịzi ekpe okpukpe ndị nna nna ha kpere, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ ka rapagidesiri ike n’okpukpe nke ezinụlọ ha. Ma ò ziri ezi mgbe nile mmadụ ịrapagidesi ike n’okpukpe ndị mụrụ ya na-ekpe? Gịnị ka Bible na-ekwu?

Mgbe ha nọsịrị afọ 40 n’ọzara, Jọshụa, bụ́ onye nọchiri Mozis, gwara ụmụ Izrel ka ha mee nhọrọ, sị: “Ma ọ bụrụ na ọ jọọ njọ n’anya unu ife Jehova ofufe, họpụtaranụ onwe unu taa onye unu ga-efe ofufe; ma ọ bụ chi nile nke nna unu hà fere ofufe nke dị n’ofe Osimiri ahụ, ma ọ bụ chi nile nke ndị Amọraịt, ndị unu onwe unu bi n’ala ha: ma mụ onwe m na ụlọ m, anyị ga-efe Jehova ofufe.”—Joshua 24:15.

Otu n’ime ndị nna nna Jọshụa kwuru banyere ha bụ Tira, bụ́ nna Ebreham, onye biri n’obodo Ua, nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Yufretis n’oge ahụ. Bible ekwughị ọtụtụ ihe banyere Tira, ma e wezụga eziokwu ahụ bụ́ na o fere chi ọzọ ofufe. (Joshua 24:2) Nwa ya nwoke bụ́ Ebreham, n’agbanyeghị na ọ maghị nzube Chineke nke ọma, dị njikere ịhapụ ala nna ya mgbe Jehova nyere ya iwu ime otú ahụ. Ee, Ebreham họọrọ okpukpe dị iche na nke nna ya. N’ihi ime otú ahụ, Ebreham nwetara ngọzi ndị Chineke kwere ya ná nkwa, ọ ghọkwara onye ọtụtụ okpukpe maara dị ka “nna nke ndị nile kweere na Chineke.”—Ndị Rom 4:11, Today’s English Version.

Bible kọkwara akụkọ ọma banyere Rut, bụ́ nne ochie Jizọs Kraịst. Rut, bụ́ nwanyị Moab nke onye Izrel lụrụ, ghọrọ nwanyị di ya nwụrụ ma nwee nhọrọ ọ ga-eme: ịnọrọ n’ala nna ya ma ọ bụ isoro nne di ya lawa Izrel. N’ịghọta otú ofufe Jehova si baa uru karịa arụsị ndị mụrụ ya na-ekpere, Rut gwara nne di ya, sị: “Ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m.”—Rut 1:16, 17.

N’ikwu banyere nnabata a nabatara ihe ndekọ a dị ka nke so n’akwụkwọ Bible, akwụkwọ bụ́ Dictionnaire de la Bible na-akọwa na ihe ndekọ a na-egosi “otú nwanyị a mụrụ n’ala ọzọ, nke a mụrụ n’etiti ndị na-ekpere arụsị bụ́ ndị ha na Izrel na-adịtụghị ná mma, . . . si ghọọ, site ná nduzi Chineke, nne ochie nke Eze Devid dị nsọ n’ihi ịhụnanya o nwere n’ebe mba na ofufe Jehova dị.” Rut alaghị azụ ịhọrọ okpukpe nke dị iche na nke ndị mụrụ ya, o nwetakwara ngọzi Chineke n’ihi mkpebi ahụ o mere.

Ihe ndekọ banyere mmalite nke Iso Ụzọ Kraịst kpọrọ nnọọ okwu aha n’ihe banyere ihe ndị mere ndị na-eso ụzọ Jizọs ji hapụ okpukpe nke ndị nna nna ha. N’okwu na-ekpo ọkụ Pita onyeozi kwuru, ọ gbara ndị na-ege ya ntị ume ‘ịbụ ndị a ga-azọpụta n’ọgbọ a gbagọrọ agbagọ’ site n’ichegharị ná mmehie ha ma bụrụ ndị e mere baptizim n’aha Jizọs Kraịst. (Ọrụ 2:37-41) Otu n’ime ihe atụ ndị dị ịrịba ama bụ nke Sọl, bụ́ onye Juu nke kpagburu Ndị Kraịst. Ka ọ nọ na-aga Damaskọs, ọ hụrụ Kraịst n’ọhụụ, mgbe nke ahụ gasịrị, Sọl ghọrọ Onye Kraịst, a bịakwa mara ya dị ka Pọl onyeozi.—Ọrụ 9:1-9.

Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná Ndị Kraịst oge mbụ enweghị ahụmahụ dị ịrịba ama otú ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ha nile hapụrụ ma ọ́ bụghị okpukpe ndị Juu ọ bụrụ ofufe nke chi dịgasị iche iche nke ndị ọgọ mmụọ. Ndị nakweere Iso Ụzọ Kraịst mere otú ahụ mgbe ha matara banyere ya nke ọma, ọ na-abụkarịkwa mgbe ha nwesịrị mkparịta ụka were ogologo oge banyere òkè Jizọs na-ekere dị ka Mezaịa ahụ. (Ọrụ 8:26-40; 13:16-43; 17:22-34) E mere ka mkpa ọ dị ime mgbanwe ná ndụ ha doo Ndị Kraịst oge mbụ ahụ anya. A kpọrọ mmadụ nile, ma ndị Juu ma ndị na-abụghị ndị Juu, òkù, ma, ọ bụ otu ozi ka e ziri ha nile. Iji na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ, ọ dị mkpa ịgbaso ụdị ofufe ọhụrụ, ya bụ Iso Ụzọ Kraịst.

Nhọrọ nke Dị Anyị Mkpa

N’ezie, ọ chọrọ nnọọ obi ike na narị afọ mbụ iji jụ okpukpe e ji mara ezinụlọ—okpukpe ndị Juu, ife eze ukwu, ife chi ndị ọgọ mmụọ—na isonyere okpukpe nke ma ndị Juu ma ndị Rom na-eleda anya. N’oge na-adịghị anya, nhọrọ a kpatara mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ. Taa, ọ na-achọ obi ike yiri nke ahụ iji jụ “ime na imikpu onwe onye n’ihe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ na-eme,” dị ka Hippolyte Simon, bụ́ bishọp Katọlik nke Clermont-Ferrand, si kwuo ya n’akwụkwọ ya bụ́ Vers une France païenne? (À Na-eme Ka France Bụrụ Mba Na-ekpere Arụsị?) Ọ na-achọ obi ike iji sonye n’òtù okpukpe dị nta nke a na-akatọ mgbe ụfọdụ, bụ́ Ndịàmà Jehova.

Paul, bụ́ nwa okorobịa si Bastia, Corsica, nke a zụlitere n’okpukpe Katọlik, keere òkè mgbe ụfọdụ n’ihe omume chọọchị, dị ka ire achịcha keki iji nweta ego a ga-enye òtù ọrụ ebere ndị Katọlik. N’ịchọ ịghọta Bible n’ụzọ ka mma, o kweere iso Ndịàmà Jehova nwechie mkparịta ụka anya. Ka oge na-aga, ọ bịara ghọta na ihe ọ na-amụta ga-abara ya uru n’ụzọ na-adịgide adịgide. N’ihi ya, Paul nakweere ụkpụrụ Bible nke ọma ma ghọọ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ndị mụrụ ya kwanyeere nhọrọ ya ùgwù, bụ́ nke na-emetụtabeghị mmekọrịta chiri anya ha nwere n’ezinụlọ ha.

Amélie bi n’ebe ndịda France. Ndị òtù ezinụlọ ya abụwo Ndịàmà Jehova ruo ọgbọ anọ. N’ihi gịnị ka o ji họrọ isonyere okpukpe nke ndị mụrụ ya? “Ị dịghị aghọ otu n’ime Ndịàmà Jehova n’ihi na nne na nna gị ma ọ bụ nne na nna gị ochie bụ ma ọ bụ bụbu Ndịàmà Jehova,” ka ọ na-ekwu. “Kama otu ụbọchị, ị na-agwa onwe gị, sị, ‘Ọ bụ okpukpe m n’ihi na ọ bụ ihe ndị a ka m kweere.’” Dị ka ọtụtụ Ndịàmà Jehova ndị ọzọ na-eto eto, Amélie maara na nkwenkwe okpukpe ya nke siri ike mere ka o nwee nzube ná ndụ ma na-enye ya obi ụtọ na-adịgide adịgide.

N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Nakwere Ụkpụrụ Chineke

Akwụkwọ Ilu, isi 6, amaokwu 20, na-agba ndị chọrọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ ume, sị: “Nwa m, chebe ihe nna gị nyere n’iwu, ahapụkwala iwu nne gị.” Kama ịtụ aro ka a na-erube isi n’ajụghị ase, ndụmọdụ dị otú ahụ na-agba ndị ntorobịa ume ịnakwere ụkpụrụ Chineke site n’ime ka okwukwe ha sikwuo ike nakwa site na ha ịkwụnyere Chineke n’onwe ha. Pọl onyeozi gbara ndị ya na ha rụkọrọ ọrụ ume ‘ịnwapụta ihe nile,’ ịchọpụta ma ihe a nọ na-akụziri ha ò kwekọrọ n’Okwu Chineke na n’uche Ya, na ime omume n’ụzọ kwekọrọ na ya.—1 Ndị Tesalonaịka 5:21.

Ma à zụlitere ha n’ezinụlọ Ndị Kraịst ma ọ bụ na a zụliteghị ha, ihe karịrị nde Ndịàmà Jehova isii, ma ndị na-eto eto ma ndị agadi, emewo mkpebi dị otú ahụ. Site n’iji nlezianya na-amụ Bible, ha nwetara azịza ndị a pụrụ ịtụkwasị obi nye ajụjụ ndị ha jụrụ banyere nzube nke ndụ ma nweta nghọta doro anya banyere uche Chineke maka ihe a kpọrọ mmadụ. Mgbe ha nwetara ihe ọmụma a, ha nakweere ụkpụrụ Chineke ma na-eme ike ha nile iji na-eme uche Chineke.

Ma ị̀ na-agụchi magazin a anya ma ọ bụ na ị dịghị agụchi ya, gịnị ma i kwere ka Ndịàmà Jehova nyere gị aka ileba anya na Bible iji tụlee ụkpụrụ ime mmụọ ndị dị na ya. N’ụzọ dị otú a, ị ga-enwe ike ‘idetụ ire, hụ na Jehova dị mma’ ma nweta ihe ọmụma nke bụ́, ọ bụrụ na i tinye ya n’ọrụ, ga-eduga ná ndụ ebighị ebi.—Abụ Ọma 34:8; Jọn 17:3.

[Foto dị na peeji nke 5]

Ọgbọ anọ nke otu ezinụlọ Ndịàmà Jehova nọ na France

[Foto dị na peeji nke 7]

Rut họọrọ ijere Jehova ozi kama ijere chi ndị nna nna ya hà ozi