Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Ntorobịa—Jehova Agaghị Echefu Ọrụ Unu!

Ndị Ntorobịa—Jehova Agaghị Echefu Ọrụ Unu!

Ndị Ntorobịa—Jehova Agaghị Echefu Ọrụ Unu!

“Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya, ebe unu jewooro ndị nsọ ozi ma nọgide na-eje ozi.”—NDỊ HIBRU 6:10.

1. Olee otú akwụkwọ Bible bụ́ Ndị Hibru na Malakaị si egosi na Jehova ji ozi gị akpọrọ ihe?

Ọ̀ DỊTỤWO mgbe i meere enyi gị ihe ọma ya emesịa ghara ikele gị? Ọ pụrụ iwute mmadụ nke ukwuu mgbe a na-ejighị omume mmesapụ aka ya kpọrọ ihe ma ọ bụ, nke kadị njọ, chefuo ya kpam kpam. Otú ọ dị, lee ka o si adị iche mgbe anyị ji obi anyị dum na-ejere Jehova ozi! Bible na-asị: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya, ebe unu jewooro ndị nsọ ozi ma nọgide na-eje ozi.” (Ndị Hibru 6:10) Chee banyere ihe nke ahụ pụtara. Jehova ga-ewere ya n’ezie dị ka ajọ omume n’akụkụ nke ya—mmehie—ma ọ bụrụ na o chefuo ihe i meworo ma nọgide na-eme n’ozi ya. Lee ka o si bụrụ Chineke nke na-enwe ekele n’ezie!—Malakaị 3:10.

2. Gịnị na-eme ka ijere Jehova ozi bụrụ ihe pụrụ iche n’ezie?

2 I nwere ohere pụrụ iche ife Chineke a nwere ekele ofufe na ijere ya ozi. Ebe ọ bụ na e nwere nanị ihe dị ka nde isii ndị kwere ekwe ibe gị n’iji ya tụnyere ijeri mmadụ isii bi n’ụwa, ihe ùgwù gị pụrụ iche n’ezie. Ọzọkwa, eziokwu ahụ bụ́ na ị na-ege ntị ma na-anabata ozi ọma ahụ bụ ihe àmà na-egosi na Jehova nwere mmasị kpọmkwem n’ebe ị nọ. E kwuwerị, Jizọs sịrị: “Mmadụ ọ bụla apụghị ịbịakwute m ọ gwụla ma Nna m, bụ́ onye zitere m, ọ̀ dọtara ya.” (Jọn 6:44) Ee, Jehova na-enyere ndị mmadụ aka n’otu n’otu irite uru ndị a na-erite n’àjà Kraịst chụrụ.

Inwe Ekele Maka Ọmarịcha Ihe Ùgwù Gị

3. Olee otú ụmụ Kora si kwupụta ekele ha nwere maka ihe ùgwù nke ijere Jehova ozi?

3 Dị ka a tụlere n’isiokwu bu ụzọ, ị nọ n’ọnọdụ pụrụ iche ime ka obi Jehova ṅụrịa. (Ilu 27:11) Nke a bụ ihe ị na-ekwesịtụdịghị iji gwurie egwu. N’otu n’ime abụ ọma ndị ha rọrọ n’ike mmụọ nsọ, ụmụ Kora kwupụtara ekele ha nwere maka ihe ùgwù nke ijere Jehova ozi. Anyị na-agụ, sị: “Otu ụbọchị n’ogige Gị nile dị mma karịa [otu puku ụbọchị] n’ebe ọzọ. Ahọpụtawo m iguzo ná mbata ụzọ n’ụlọ Chineke m, karịa ibi n’ụlọikwuu nile nke mmebi iwu.”—Abụ Ọma 84:10.

4. (a) Gịnị pụrụ ime ka ụfọdụ na-ele ife Jehova anya dị ka ihe na-adịghị ekwe mmadụ megharịa ahụ́? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova si egosipụta na ya na-achọsi ike ịhụ ihe ndị ohu ya na-eme na ịkwụghachi ha ụgwọ?

4 Ọ̀ bụ otú ahụ ka ihe ùgwù gị nke ijere Nna gị nke eluigwe ozi dị gị? N’ezie, mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ iyi ka ife Jehova adịghị ekwe gị megharịa ahụ́. Ọ bụ eziokwu na ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible na-achọtụ ịchụ onwe onye n’àjà. Otú ọ dị, mee elu mee ala, ihe ọ bụla Jehova na-achọ n’aka gị bụ maka abamuru gị. (Abụ Ọma 1:1-3) Tụkwasị na nke ahụ, Jehova na-ahụ mgbalị gị ma na-egosipụta ekele o nwere maka ikwesị ntụkwasị obi gị. N’ezie, Pọl dere na Jehova “bụ onye na-akwụghachi ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Jehova na-achọ ohere ndị ọ ga-eji mee nke a. Otu onye amụma bụ́ onye ezi omume n’Izrel oge ochie kwuru, sị: “Jehova, anya Ya na-ejegharị n’ụwa nile, igosi Onwe ya onye dị ike n’akụkụ ndị obi ha zuru okè n’ebe Ọ nọ.”—2 Ihe E Mere 16:9.

5. (a) Olee otu n’ime ụzọ ndị kasị mma ị pụrụ isi gosi na obi gị zuru okè n’ebe Jehova nọ? (b) N’ihi gịnị ka ịgwa ndị ọzọ banyere ihe i kweere pụrụ iji yie ihe siri ike?

5 Otu n’ime ụzọ ndị kasị mma ị pụrụ isi gosi na obi gị zuru okè n’ebe Jehova nọ bụ ịgwa ndị ọzọ banyere Ya. Ọ̀ dịtụwo mgbe i nwere ohere ịgwa ụfọdụ n’ime ụmụ akwụkwọ ibe gị banyere ihe i kweere? Ná mmalite, ime otú ahụ pụrụ iyi ihe na-amapụ obi, icheta ya n’echiche pụkwara ime ka egwu jidetụ gị. ‘Ha chịwakwanụ m ọchị?’ ka ị pụrụ ịjụ. ‘Gịnị ma ọ bụrụ na ha echee na okpukpe m gbapụrụ iche?’ Jizọs kwetara na ọ bụghị mmadụ nile ga-aṅa ntị n’ozi Alaeze ahụ. (Jọn 15:20) Otú ọ dị, nke a adịghị apụta na ị ga-anọgide bụrụ onye a na-akwa emo na onye a jụrụ ajụ. N’ụzọ megidere nke ahụ, ọtụtụ ndị ntorobịa bụ́ Ndịàmà achọtawo ndị dị njikere ige ntị, ọbụnakwa bụrụ ndị ndị ọgbọ ha na-akwanyere ùgwù nke ukwuu n’ihi ịkwụsi ike n’ihe ndị ha kweere.

“Jehova Ga-enyere Gị Aka”

6, 7. (a) Olee otú otu nwa agbọghọ dị afọ 17 si nwee ike ịgbara ụmụ klas ya àmà? (b) Gịnị ka ị mụtaworo site n’ahụmahụ Jennifer?

6 Ma olee otú ị pụrụ isi kata obi ikwupụta ihe i kweere? Gịnị ma i kpebie ikwu eziokwu mgbe ndị mmadụ jụrụ gị banyere okpukpe gị? Tụlee ahụmahụ Jennifer onye dị afọ 17. “Anọ m na-eri nri ehihie n’ụlọ akwụkwọ. Ụmụ agbọghọ ndị nọ na tebụl m nọ na-ekwu ihe banyere okpukpe, otu n’ime ha jụkwara m okpukpe m na-ekpe,” ka ọ na-ekwu. Ahụ́ ọ̀ mara Jennifer jijiji n’ịza ajụjụ ahụ? “Ee,” ka o kwetara, “n’ihi na ejighị m n’aka ihe ga-abụ mmeghachi omume ha.” Gịnịzi ka Jennifer mere? “Agwara m ụmụ agbọghọ ahụ na abụ m otu n’ime Ndịàmà Jehova,” ka ọ gara n’ihu ikwu. “Na mbụ, o juru ha anya. O doro anya na ha na-eche na Ndịàmà Jehova gbapụrụ iche. Nke a kpaliri ha ịjụ m ọtụtụ ajụjụ, abịakwara m nwee ike ime ka ha kwụsị inwe ụfọdụ echiche na-ezighị ezi ndị ha nweburu. Ọbụna mgbe ụbọchị ahụ gasịrị, ụfọdụ n’ime ụmụ agbọghọ ndị ahụ bịakwutere m site n’oge ruo n’oge na-ajụ m ajụjụ.”

7 Jennifer ọ̀ kwara ụta maka iji ohere ahụ kwuo okwu banyere ihe o kweere? Ọ dịghị ma ọlị! “Enwere m nnọọ obi ụtọ n’ihi ya mgbe oge nri ehihie ahụ gasịrị,” ka ọ na-ekwu. “Ugbu a ụmụ agbọghọ ahụ amatala ndị Ndịàmà Jehova bụ n’ezie karịa ka ha mabu.” Aro Jennifer na-atụzi dị mfe: “Ọ bụrụ na o siere gị ike ịgbara ụmụ klas gị ma ọ bụ ndị nkụzi gị àmà, kpee ekpere ngwa ngwa. Jehova ga-enyere gị aka. Ị ga-enwe obi ụtọ na i jiri ohere i nwere ịgba àmà mee ihe nke ọma.”—1 Pita 3:15.

8. (a) Olee otú ekpere si nyere Nehemaịa aka mgbe o chere ọnọdụ ọ na-atụghị anya ya ihu? (b) Olee ọnọdụ ndị pụrụ ibilite n’ụlọ akwụkwọ bụ́ mgbe ọ pụrụ ịdị mkpa ka i kpegara Jehova ekpere dị nkenke n’ime obi?

8 Rịba ama na Jennifer na-atụ aro ka ‘i kpegara Jehova ekpere ngwa ngwa’ mgbe ohere dapụtara iji gbaa àmà banyere ihe i kweere. Nke a bụ kpọmkwem ihe Nehemaịa, bụ́ obu ihe ọṅụṅụ nke Eze Ataksakses nke Peasia, mere mgbe o chere ọnọdụ ọ na-atụghị anya ya ihu. Ihu gbarụrụ nnọọ Nehemaịa n’ihi na a gwara ya banyere ọnọdụ ọjọọ nke ndị Juu nọ na ya, ya amatakwa na mgbidi na ọnụ ụzọ ámá nke Jeruselem bụ mkpọmkpọ ebe. Eze ahụ chọpụtara na obi adịghị Nehemaịa mma, n’ihi ya ọ jụrụ Nehemaịa ihe na-enye ya nsogbu n’obi. Tupu Nehemaịa azaa ya, o kpere ekpere maka nduzi. Ya ejirizie obi ike rịọ ka e kwe ka ọ laghachi Jeruselem ma nye aka wughachi obodo ahụ dara ada. Ataksakses nabatara arịrịọ Nehemaịa. (Nehemaịa 2:1-8) Gịnị ka ị na-amụta na nke a? Ọ bụrụ na ahụ́ amaa gị jijiji mgbe ohere dapụtara iji gbaa àmà banyere ihe i kweere, elegharala ohere i nwere ikpe ekpere n’ime obi anya. “Ka unu na-atụkwasị nchegbu nile unu n’ebe [Jehova] nọ,” ka Pita dere, “n’ihi na ọ na-eche banyere unu.”—1 Pita 5:7; Abụ Ọma 55:22.

‘Na-adị Njikere Ime Ngọpụ’

9. Olee otú Leah dị afọ 13 si nwee ike inyefe mkpụrụ 23 nke akwụkwọ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ?

9 Tụlee ahụmahụ ọzọ. Leah, bụ́ onye dị afọ 13, nọ na-agụ akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè * n’oge nri ehihie ha n’ụlọ akwụkwọ. “Ndị ọzọ nọ na-ele m,” ka ọ na-ekwu, “n’oge na-adịghịkwa anya, ìgwè mmadụ gbakọtara na-ele ihe m na-agụ. Ha malitere ịjụ m ihe akwụkwọ ahụ na-ekwu banyere ya.” Ka ọ na-erule ná ngwụsị nke ụbọchị ahụ, ụmụ agbọghọ anọ agwala Leah ka o wetara ha akwụkwọ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ. N’oge na-adịghị anya, ụmụ agbọghọ ndị a malitere ịgwa ndị ọzọ ihe ha na-agụta n’akwụkwọ ahụ, ndị ahụ bịakwara chọọ inweta nke ha. N’ime izu ole na ole sochirinụ, Leah nyere ụmụ akwụkwọ ibe ya na ndị enyi ha mkpụrụ 23 nke akwụkwọ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ. Ọ̀ dịịrị Leah mfe inwe nkwuwa okwu mgbe mbụ ndị ọzọ jụrụ ya ajụjụ banyere akwụkwọ ọ na-agụ? Ọ dịghị ma ọlị! “Na mbụ, ahụ́ mara m jijiji,” ka ọ na-ekweta. “Otú ọ dị, ekpere m ekpere, amakwaara m na Jehova nọnyeere m.”

10, 11. Olee otú otu nwa agbọghọ nta bụ́ onye Izrel si nwee ike inyere onyeisi usuu ndị agha Siria aka ịmụta banyere Jehova, mgbanwe ndị dịkwa aṅaa ka o mesịrị mee?

10 Ahụmahụ Leah pụrụ ichetara gị ọnọdụ yiri ya nke chere otu nwa agbọghọ nta bụ́ onye Izrel ihu bụ́ onye a dọọrọ n’agha laa Siria. Neaman, bụ́ onyeisi usuu ndị agha Siria, bụ onye ekpenta. Ikekwe ọ bụ nwunye ya malitere mkparịta ụka nke kpaliri nwa agbọghọ nta a ikwu okwu banyere ihe o kweere. “Ọ ga-adị m nnọọ mma, ma a sị na onye nwe m nọ n’ihu onye amụma nke nọ na Sameria!” ka o kwuru. “Mgbe ahụ ọ ga-eme ka o si n’ekpenta ya dị ọcha.”—2 Ndị Eze 5:1-3.

11 N’ihi obi ike nke nwa agbọghọ nta a, Neaman bịara mara na “ọ dịghị Chineke dị n’ụwa nile, ọ bụ nanị n’Izrel.” Ọbụna o kpebiri na ya agaghị ‘achụrụ chi ọzọ àjà nsure ọkụ ma ọ bụ àjà ọzọ site n’ugbu a, ma ọ bụ nanị Jehova.’ (2 Ndị Eze 5:15, 17) N’ezie Jehova gọziri obi ike nke nwa agbọghọ nta ahụ nwere. Ọ pụrụ imere ndị na-eto eto taa otu ihe ahụ, ọ ga-emekwara ha ya. Leah chọpụtara na nke ahụ bụ eziokwu. Ka oge na-aga, ụfọdụ n’ime ụmụ akwụkwọ ibe ya bịakwutere ya ma gwa ya na akwụkwọ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ na-enyere ha aka ịgbanwe àgwà ha. “Obi dị m ụtọ,” ka Leah na-ekwu, “n’ihi na amaara m na m na-enyere ndị ọzọ aka ịmụtakwu banyere Jehova ma na-enyere ha aka ịgbanwe ndụ ha.”

12. Olee otú ị pụrụ isi bụrụ onye e wusiri ike ime ngọpụ maka ihe i kweere?

12 Ị pụrụ inwe ahụmahụ ndị yiri nke Jennifer na Leah. Na-agbaso ndụmọdụ Pita, bụ́ onye dere na dị ka Onye Kraịst, i kwesịrị ịdị ‘na-adị njikere mgbe nile ime ngọpụ n’ihu onye ọ bụla nke na-ajụ gị ihe mere i ji nwee olileanya ahụ dị n’ime gị, ma jiri obi dị nwayọọ na nkwanye ùgwù miri emi na-eme nke ahụ.’ (1 Pita 3:15) Olee otú ị pụrụ isi na-eme nke ahụ? Na-eṅomi ụzọ ndụ nke Ndị Kraịst narị afọ mbụ bụ́ ndị kpegaara Jehova ekpere ka o nyere ha aka ime nkwusa “n’atụghị egwu ọ bụla.” (Ọrụ 4:29) Mgbe i mesịrị nke ahụ, jiri obi ike na-agwa ndị ọzọ banyere ihe i kweere. Ihe ga-esi na ya pụta pụrụ ịtụ gị n’anya. Ọzọkwa, ị ga-eme ka obi Jehova ṅụrịa.

Vidio na Ihe Omume Ndị Pụrụ Iche

13. Ohere ndị dị aṅaa ka ụfọdụ ndị ntorobịa jiworo gbaa àmà? (Lee igbe ndị dị na peeji nke 20 na 21.)

13 Ọtụtụ ndị ntorobịa akọwaworo ụmụ akwụkwọ ibe ha ma ọ bụ ndị nkụzi ha ihe ha kweere site n’iji vidio eme ihe. Mgbe ụfọdụ, ihe omume ndị e nyere n’ụlọ akwụkwọ emeghewokwa ohere maka iwetara Jehova otuto. Dị ka ihe atụ, e nyere ụmụ okoro abụọ dịcha afọ 15, ndị bụ́ Ndịàmà Jehova, ihe omume n’ihe ọmụmụ ha banyere akụkọ ihe mere eme nke ụwa, ide banyere otu n’ime okpukpe ndị e nwere n’ụwa. Ha abụọ jikọtara aka dee banyere Ndịàmà Jehova, jiri akwụkwọ bụ́ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom mee ihe dị ka ebe ha si nweta ihe ha dere. * Ha kwukwara okwu were minit ise. Mgbe e mesịrị, onye nkụzi ha na ụmụ akwụkwọ ibe ha jụrụ ọtụtụ ajụjụ nke na ụmụ okoro ahụ guzoro n’ihu klas ruo minit 20 ọzọ. Ruo ọtụtụ izu ka nke ahụ gasịrị, ụmụ klas ha nọgidere na-ajụ ha ajụjụ banyere Ndịàmà Jehova!

14, 15. (a) N’ihi gịnị ka egwu mmadụ ji bụrụ ọnyà? (b) N’ihi gịnị ka i ji kwesị inwe obi ike banyere ịgwa ndị ọzọ ihe i kweere?

14 Dị ka ahụmahụ ndị a kọrọ n’elu na-egosi, ị pụrụ inweta ngọzi dị ukwuu site n’ịgwa ndị ọzọ banyere ihe ndị i kweere dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ekwela ka egwu mmadụ napụ gị ihe ùgwù na ọṅụ nke inyere ndị ọzọ aka ịbịa mara Jehova. Bible na-ekwu, sị: “Egwu mmadụ na-eweta ọnyà: ma onye na-atụkwasị Jehova obi, a ga-eme ka ọ nọọ n’elu.”—Ilu 29:25.

15 Cheta na dị ka onye ntorobịa bụ́ Onye Kraịst, i nwere ihe ndị ọgbọ gị na-achọsi ike—ụzọ ndụ kasị mma ugbu a na nkwa nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu. (1 Timoti 4:8) N’ụzọ na-akpali mmasị, na United States—ebe ị pụrụ iche na ndị mmadụ n’ozuzu ha enweghị mmasị n’okpukpe ma ọ bụ bụrụ ndị na-achụso ihe nke ụwa—otu njụta echiche e mere gosiri na ọ dịkarịa ala, ọkara ndị ntorobịa nọ n’ebe ahụ ji okpukpe kpọrọ oké ihe, otu ụzọ n’ụzọ atọ na-ekwukwa na nkwenkwe okpukpe bụ “ihe kasị enwe mmetụta” ná ndụ ha. Eleghị anya, e nwere ọnọdụ yiri nke ahụ n’ọtụtụ ebe ndị ọzọ n’ụwa. Mgbe ahụ, o yikarịrị ka ndị ọgbọ gị nọ n’ụlọ akwụkwọ hà ga-enwe obi ụtọ ige ntị n’ihe i nwere ikwu banyere Bible.

Dị Ka Onye Ntorobịa, Bịaruo Jehova Nso

16. E wezụga ịgwa ndị ọzọ banyere Jehova, gịnị ọzọ ka ime ihe na-atọ ya ụtọ na-agụnye?

16 N’ezie, ime ka obi Jehova ṅụrịa na-agụnye ihe karịrị nanị ikwu banyere ya. Ọ dịkwa mkpa ka i mee ka àgwà gị kwekọọ n’ụkpụrụ ya. Jọn onyeozi dere, sị: “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị debe ihe ndị o nyere n’iwu; ma ihe ndị o nyere n’iwu adịghịkwa arọ.” (1 Jọn 5:3) Ị ga-achọpụta na nke a bụ eziokwu ma ọ bụrụ na ị bịaruo Jehova nso. Olee otú ị pụrụ isi mee nke ahụ?

17. Olee otú ị pụrụ isi bịaruo Jehova nso?

17 Wepụta oge iji na-agụ Bible na akwụkwọ ndị dabeere na Bible. Ka ị na-amụtakwu banyere Jehova, otú ahụ ka ọ ga-adịkwuru gị mfe irubere ya isi na ịgwa ndị ọzọ banyere ya. “Ezi mmadụ na-ewepụta ezi ihe site n’ezi akụ̀ nke obi ya,” ka Jizọs kwuru, “n’ihi na ọnụ ya na-ekwu okwu site n’ihe jupụtara n’obi ya.” (Luk 6:45) N’ihi ya, jiri ezi ihe mejupụta obi gị. Gịnị ma i setịpụ ihe mgbaru ọsọ n’akụkụ a? Ikekwe ị pụrụ imeziwanye ihe n’ihe banyere ịkwadebe maka nzukọ ọgbakọ n’izu a na-abịanụ. Ihe mgbaru ọsọ gị ọzọ pụrụ ịbụ ikere òkè na ya site n’ịza ajụjụ dị mkpirikpi ma site n’obi. N’ezie, ọ dị oké mkpa ka ị na-etinyekwa ihe ndị ị na-amụta n’ọrụ.—Ndị Filipaị 4:9.

18. Gịnị ka ị pụrụ ijide n’aka ọbụna ma a sị na i nweta mmegide ụfọdụ?

18 Ngọzi ndị na-abịa site n’ijere Jehova ozi na-adịte aka—n’ezie, ha na-adịru mgbe ebighị ebi. N’eziokwu, site n’oge ruo n’oge, ị pụrụ inwetatụ mmegide ma ọ bụ bụrụ onye a na-akwa emo n’ihi ịbụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ma chee banyere Mozis. Bible na-ekwu na “o legidere anya n’ụgwọ ọrụ a ga-akwụ ya.” (Ndị Hibru 11:24-26) Gị onwe gị pụkwara inwe obi ike na Jehova ga-akwụghachi gị ụgwọ maka mgbalị ndị ị na-eme ịmụta ihe banyere ya na ikwu okwu banyere ya. N’ezie, ọ dịghị mgbe ọ ‘ga-echefu ọrụ gị na ịhụnanya i gosiri maka aha ya.’—Ndị Hibru 6:10.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 13 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Ị̀ Na-echeta?

• N’ihi gịnị ka ị pụrụ iji jide n’aka na Jehova ji ozi gị kpọrọ ihe?

• Ụzọ ndị dị aṅaa e si agba àmà n’ụlọ akwụkwọ gawooro ụfọdụ ndị nke ọma?

• Olee otú ị pụrụ isi bụrụ onye e wusiri ike ịgbara ụmụ klas gị àmà?

• Olee otú ị pụrụ isi bịaruo Jehova nso?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 20]

Ọbụna Ụmụntakịrị Na-eto Jehova!

Ọbụna ndị na-erubeghị afọ iri na-atọ enwewo ike ịgba àmà n’ụlọ akwụkwọ. Tụlee ahụmahụ ndị a dị mkpirikpi.

Ndị nọ na klas nke ise bụ́ nke Amber, bụ́ onye dị afọ iri, nọ na ya nọ na-agụ akwụkwọ na-akọ banyere mmeso ọjọọ ndị Nazi mesoro ndị Juu n’Agha Ụwa nke Abụọ. Amber kpebiri iwetara onye nkụzi ya vidio bụ́ Purple Triangles. O juru onye nkụzi ahụ anya ịmata na a kpagbukwara Ndịàmà Jehova n’okpuru ọchịchị Nazi. Onye nkụzi ahụ mere ka klas ahụ dum kirie vidio ahụ.

Mgbe Alexa dị afọ asatọ, o degaara ndị klas ya akwụkwọ ozi, na-akọwara ha ihe mere na ọ pụghị iso gbaa Krismas. Nke a kpaliri nnọọ mmasị onye nkụzi ya nke na ọ gwara Alexa ka ọ gụọrọ klas ya na klas abụọ ndị ọzọ akwụkwọ ozi ahụ! “A kụziworo m ịkwanyere ndị ọzọ bụ́ ndị nkwenkwe ha dị iche na nke m ùgwù,” ka o kwuru ka ọ na-eru ná ngwụsị, “ana m ekelekwa unu maka ịkwanyere mkpebi m ịghara ịgba Krismas ùgwù.”

Obere oge ka Eric malitesịrị klas nke mbụ, o weere Akwukwọm nke Akukọ Bible gaa n’ụlọ akwụkwọ ma rịọ ka e kwe ka o gosi ụmụ klas ya ihe dị n’ime ya. “Ọ dị ihe m na-eche na ọ bụ ya ga-aka mma,” ka onye nkụzi ya kwuru. “Gịnị ma ị gụọrọ klas otu n’ime akụkọ ndị dị n’ime ya?” Eric mere otú ahụ. Mgbe e mesịrị, o kwuru ka ndị nile chọrọ inweta akwụkwọ ahụ welie aka elu. Mmadụ 18—gụnyere onye nkụzi ha—mere otú ahụ! Ọ dịzi Eric ka a ga-asị na o nwewo ókèala nke ya pụrụ iche ọ ga na-agba àmà na ya.

Whitney dị afọ itoolu nwere ekele maka broshuọ bụ́ Ndịàmà Jehova na Agụmakwụkwọ. * “Mama m na-enyekarị ndị nkụzi m broshuọ a kwa afọ,” ka ọ na-ekwu, “ma n’afọ a emere m nke ahụ n’onwe m. N’ihi broshuọ ahụ, onye nkụzi m họpụtara m dị ka onye ritere ihe nrite nke ‘nwata akwụkwọ kasị mma n’izu.’”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 56 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara akwụkwọ nile na vidio ahụ a kpọtụrụ aha.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 21]

Ọnọdụ Ụfọdụ Ndị Jiworo Kwuo Okwu Banyere Ihe Ha Kweere

Ụfọdụ ahọrọwo isiokwu ga-enye ha ohere ịgba àmà mgbe a gwara ha dee akụkọ ma ọ bụ mgbe e nyere ha ihe omume n’ụlọ akwụkwọ

Ọtụtụ ndị ntorobịa enyewo ndị nkụzi ha vidio ma ọ bụ akwụkwọ nke na-ekwu banyere isiokwu a na-amụ na klas

Ndị ntorobịa ndị ọzọ abịakwutewo ụfọdụ ndị ntorobịa anyị mgbe ha na-agụ Bible ma ọ bụ akwụkwọ ndị dabeere na Bible n’oge nkwụsịtụ ma jụọ ha ajụjụ

[Foto dị na peeji nke 18]

Ndị nwere ahụmahụ pụrụ inye aka zụọ ndị ntorobịa ijere Jehova ozi