Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Obiọma Sitere n’Ịhụnanya Dịruru ná Mkpa?

Olee Otú Obiọma Sitere n’Ịhụnanya Dịruru ná Mkpa?

Olee Otú Obiọma Sitere n’Ịhụnanya Dịruru ná Mkpa?

“IHE na-eme ka a na-achọsi mmadụ ike bụ ebere [“obiọma sitere n’ịhụnanya,” NW] ya,” ka Bible na-ekwu. (Ilu 19:22) N’ezie, obiọma nke ịhụnanya kwaliri bụ n’eziokwu ihe a na-achọsi ike. Otú ọ dị, n’ime Bible, okwu ahụ bụ́ “obiọma sitere n’ịhụnanya,” na-ezo aka n’obiọma nke pụrụ ịdabere ná mmekọrịta dịbu adị, dị ka nke dabeere n’obiọma onye nke ọzọ gosiri n’oge gara aga. N’ihi ya, ọ na-agụnye echiche nke iguzosi ike n’ihe.

Eze Joash nke Juda azụliteghị àgwà a a na-achọsi ike. O ji nwanne nna ya nke nwanyị na Jehoịada, bụ́ di nwanne nna ya, ụgwọ ekele. Mgbe Joash na-erubeghị otu afọ, ajọ nne ya ochie mere onwe ya eze nwanyị ma gbuo ụmụnne Joash nile, bụ́ ndị nketa nke ocheeze ahụ. Otú ọ dị, o gbughị Joash a ka ku n’aka n’ihi na nwanne nna ya nke nwanyị na di nwanne nna ya zoro ya nke ọma. Ha kụzikwaara ya Iwu Chineke. Mgbe Joash gbara afọ asaa, di nwanne nna ya jiri ikike ya dị ka nnukwu onye nchụàjà mee ihe iji gbuo ajọ eze nwanyị ahụ ma chie Joash eze.—2 Ihe E Mere 22:10–23:15.

Joash na-eto eto chịrị dị ka eze n’ụzọ dị mma ruo mgbe ọnwụ di nwanne nna ya gasịrị, o wee malitezie ikpere arụsị. Chineke zigara Zekaraịa, bụ́ nwa Jehoịada, ịga dọọ Joash aka ná ntị banyere ndapụ o si n’ezi ofufe dapụ. Joash mere ka e jiri nkume tụgbuo Zekaraịa. Lee ka nke a si bụrụ eguzosighị ike n’ihe na-awụ akpata oyi n’ahụ́ nye ezinụlọ o ji ụgwọ dị ukwuu!—2 Ihe E Mere 24:17-21.

Bible na-ekwu, sị: “Joash, bụ́ eze, echetaghịkwa ebere [“obiọma sitere n’ịhụnanya,” NW] nke Jehoịada, bụ́ nna [Zekaraịa] meere ya, o wee gbuo nwa ya.” Mgbe Zekaraịa na-anwụ, ọ sịrị: “Ka Jehova hụ ya, jụọ ase.” N’ikwekọ n’ihe ahụ Zekaraịa kwuru, Joash dara ọrịa, ndị ohu ya gbukwara ya.—2 Ihe E Mere 24:17-25.

Kama ịdị ka Eze Joash, ndị nile na-agbaso ndụmọdụ a ga-enweta ọdịnihu a gọziri agọzi: “Ekwela ka ebere [“obiọma sitere n’ịhụnanya,” NW] na eziokwu hapụ gị: . . . chọtakwa amara . . . n’anya Chineke na mmadụ.”—Ilu 3:3, 4.