Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Enyemaka Iji Nọgide Na-akwado Ịdị Nsọ nke Ọbara

Ihe Enyemaka Iji Nọgide Na-akwado Ịdị Nsọ nke Ọbara

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Ihe Enyemaka Iji Nọgide Na-akwado Ịdị Nsọ nke Ọbara

GBAA gburugburu ụwa, ndị ohu Jehova egosipụtawo iguzosi ike n’ihe ha nye Chineke n’ihe banyere ịdị nsọ nke ọbara. (Ọrụ 15:28, 29) Òtù ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche enyeworo òtù ụmụnna bụ́ Ndị Kraịst aka. (Matiu 24:45-47) Ka anyị hụ ihe nke a rụpụtara na Philippines.

Alaka ụlọ ọrụ dị na Philippines na-akọ, sị: “Na 1990, a gwara anyị na ndị nnọchianya si na Betel dị na Brooklyn na-aga inwe nzukọ ọmụmụ ihe na Philippines ebe a. A kpọrọ ụmụnna ndị sitere n’ọtụtụ alaka ụlọ ọrụ ndị dị n’Eshia, gụnyere Korea, Taiwan, na Hong Kong, òkù ka ha bịa. Nzube ya bụ iji nye aka iguzobe Ụlọ Ọrụ Ihe Ọmụma Ụlọ Ọgwụ n’alaka ha dị iche iche nakwa iji mee ndokwa maka Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ. Na Philippines, e bubu ụzọ guzobe kọmitii ndị ahụ n’obodo anọ bụ́ isi ná mba ahụ.” Kọmitii ndị ahụ ga-agbalịsi ike ịchọta ndị dọkịta dị njikere ikwenyere anyị na nkwenkwe Ndị Kraịst anyị banyere ọbara. Ha ga-enyekwara ụmụnna aka mgbe e nwere ihe isi ike n’ihe banyere ọbara.

A họpụtara Remegio ije ozi na Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ dị na Baguio. Ka oge na-aga, ndị dọkịta malitere ịchọpụta uru ọrụ kọmitii a na-arụ bara. Remegio na-echeta otu oge mgbe ọtụtụ ndị dọkịta ha na Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ nwere nzukọ chọrọ ịmara ụzọ a pụrụ isi gwọọ ndị ọrịa bụ́ Ndịàmà bụ́ ndị jụrụ ịnara ọbara. Remegio kwuru, sị: “Ndị dọkịta ahụ malitere ịjụ ọtụtụ ajụjụ, ma atọrọ m n’ụzọ n’ihi na ajụjụ ndị ha na-ajụ tara nnọọ akpụ.” O kpekuru Jehova ekpere maka enyemaka iji nagide ihe ịma aka ahụ. Remegio gara n’ihu, sị: “Mgbe a jụrụ ajụjụ nke ọ bụla, ndị dọkịta ndị ọzọ na-eweli aka elu ma kwuo ihe ha meworo n’ọnọdụ yiri nke a jụrụ ajụjụ banyere ya.” Remegio nwere obi ụtọ maka enyemaka ahụ, karịsịa ebe ọ bụ na ajụjụ na azịza ahụ gara n’ihu ruo awa abụọ.

Ugbu a, e nwere kọmitii 21 ná mba ahụ dum, na-enwe ngụkọta nke ụmụnna 77 nọ na ha. Danilo, bụ́ Onyeàmà nke bụ́ dọkịta, na-ekwu, sị: “Ndị dọkịta na-achọpụta na ndị ọrịa ha bụ́ Ndịàmà na-enweta nkwado nke nzukọ ji ịhụnanya na-elekọta ha.” Otu onye dọkịta ekwebughị ịwa otu nwanna ahụ́ n’amịnyeghị ya ọbara. Otú ọ dị, nwanna ahụ kwụsiri ike n’ihe o kweere. A wara ya ahụ́ ahụ, ọ gakwara nke ọma. Ụlọ Ọrụ Ihe Ọmụma Ụlọ Ọgwụ na-akọ, sị: “Otú nwanna ahụ si gbakee ngwa ngwa tụrụ nnọọ dọkịta ahụ n’anya. Ọ sịrị: ‘N’ihi ihe a mere n’ebe a, ọ bụrụ na onye òtù unu ọ bụla achọọ ka a waa ya ụdị ahụ́ a n’amịnyeghị ya ọbara, obi ga-adị m ụtọ ime otú ahụ.’”