Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

N’ihi gịnị ka Ụlọ Nche nke April 1, 2002, ji kwuo na peeji nke 11, paragraf nke 7, na baptizim ime mmiri nke ndị Juu a tọghatara ọhụrụ na Pentikọst 33 O.A. bụ iji gosipụta “nrara ha raara onwe ha nye Chineke site na Kraịst,” ebe echiche e nwebuuru bụ na mmikpu e mikpuru ndị Juu n’ime mmiri site na 33 O.A. ruo 36 O.A. achọghị ụdị nraranye ahụ?

Na 1513 T.O.A., Jehova Chineke nyere ụmụ Izrel ohere ịghọ mba dị nsọ nye ya ma ọ bụrụ na ha ‘egee ntị n’olu ya n’ezie ma debe ọgbụgba ndụ ya.’ Ha zara, sị: “Ihe nile Jehova kwuru, anyị ga-eme ya.”—Ọpụpụ 19:3-8; 24:1-8.

Site n’ikwere idebe ọgbụgba ndụ Iwu Mozis, ụmụ Izrel raara onwe ha nye Chineke. Ndị Juu a mụrụ mgbe nke ahụ gasịrị ghọrọ ndị a mụnyere ná mba a a raara nye. Otú ọ dị, baptizim nke ndị Juu bụ́ ndị ghọrọ ụmụazụ Jizọs Kraịst site na Pentikọst 33 O.A. gawa bụtara ihe dị iche site n’igosi Chineke onwe ha dị ka ndị so ná mba a raara nye. O gosipụtara nrara ha raara onwe ha nye Jehova Chineke iji soro ya na-enwe mmekọrịta ọhụrụ site na Jizọs Kraịst. Ò si aṅaa dị otú ahụ?

Mgbe a wụsasịrị mmụọ nsọ n’isi mmadụ 120 na-eso ụzọ bụ́ ndị gbakọtara n’otu ọnụ ụlọ dị n’ụlọ elu na Jeruselem na Pentikọst 33 O.A., Pita onyeozi biliri ọtọ ma malite ikwusara ìgwè ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu bụ́ ndị gbakọtaworo ịhụ ihe merenụ, ozi ọma. Mgbe ọ gbasịrị àmà nke ọma, ọ gwara ndị Juu ahụ akọ na uche ha na-enye nsogbu, sị: “Chegharịanụ, ka e meekwa onye ọ bụla n’ime unu baptizim n’aha Jizọs Kraịst maka mgbaghara mmehie unu.” N’ihi agbamume Pita nyekwuru, “e mere ndị ji obi ha nile nakwere okwu ya baptizim, a tụkwasịkwara ihe dị ka puku mkpụrụ obi atọ n’ụbọchị ahụ.”—Ọrụ 2:1-41.

Ọ̀ bụ na ndị Juu ahụ e mere baptizim n’ihi agbamume Pita esonyebeghị ná mba a raara nye? Ọ̀ bụ na ha na Chineke enweghị mmekọrịta dị ka ndị raara onwe ha nye ya? Ee e. Pọl onyeozi dere na ‘Chineke ewepụwo Iwu ahụ n’ụzọ site n’ịkụgide ya n’osisi ịta ahụhụ ahụ.’ (Ndị Kọlọsi 2:14) Site n’ọnwụ Kraịst na 33 O.A., Jehova Chineke wepụrụ ọgbụgba ndụ Iwu ahụ—kpọmkwem ihe ya na ụmụ Izrel gbakwasịrị ụkwụ na ya nwee mmekọrịta dị ka ndị raara onwe ha nye Ya. Chineke n’onwe ya bịaziri jụ mba ahụ jụrụ Ọkpara Ya. “Ihe ahụ nke bụ́ Izrel n’ụzọ anụ ahụ́” apụghịzi ikwu na ya bụ mba a raara nye Chineke.—1 Ndị Kọrint 10:18; Matiu 21:43.

A kagburu ọgbụgba ndụ Iwu ahụ na 33 O.A., ma oge Chineke nke inwe ihu ọma pụrụ iche n’ebe ndị Juu nọ na ilekọta ha akwụsịghị n’oge ahụ. * Oge ahụ gaje ịdịgide ruo 36 O.A., bụ́ mgbe Pita kwusaara onye Ịtali ahụ na-atụ egwu Chineke bụ́ Kọnịlịọs na ezinụlọ ya nakwa ndị Jentaịl ndị ọzọ, ozi ọma. (Ọrụ 10:1-48) Gịnị bụ ihe ndabere maka ihu ọma a a nọgidere na-enwe n’ebe ha nọ?

“[Mezaịa] ga-emekwa ka otu ọgbụgba ndụ siere ọtụtụ mmadụ ike otu izu,” ka Daniel 9:27 na-ekwu. Ọgbụgba ndụ e mere ka o siere ndị mmadụ ike ruo afọ asaa, ma ọ bụ “otu izu,” site n’oge Jizọs mere baptizim nakwa ná mmalite nke ozi Mezaịa ahụ jere maka ọha na 29 O.A., bụ ọgbụgba ndụ Ebreham. Iji sonye n’ọgbụgba ndụ ahụ, mmadụ aghaghị ịbụ nwa Ebreham na onye Hibru. Ọgbụgba ndụ ahụ otu onye mere ihe dị na ya emeghị ka onye nọ na ya soro Jehova nwee mmekọrịta dị ka onye raara onwe ya nye ya. N’ihi ya, ozugbo e wepụrụ ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, ndị Juu ahụ kwere ekwe e mere baptizim mgbe ha nụsịrị okwu Pita na Pentikọst 33 O.A., ọ bụ ezie na ha bụ ndị a na-elekọta n’ụzọ pụrụ iche dị ka ndị Juu anụ ahụ́, apụghị ịzọrọ na ha na Chineke nwere mmekọrịta dị ka ndị raara onwe ha nye ya. Ọ dị ha mkpa iji aka ha rara onwe ha nye Chineke.

Ọ dị ihe ọzọ mere o ji dị mkpa ka ndị Juu na ndị ahụ na-eso ụzọ ndị Juu bụ́ ndị bịara ka e mee ha baptizim n’ụbọchị Pentikọst 33 O.A. rara onwe ha nye. Pita onyeozi gbara ndị gere ya ntị ume ichegharị na ịbụ ndị e mere baptizim n’aha Jizọs. Ime otú ahụ na-achọ na ha ga-ajụ ụzọ nke ụwa ma nakwere Jizọs dị ka Onyenwe ha na Mezaịa ahụ, dị ka Nnukwu Onye Nchụàjà, nakwa dị ka onye na-anọdụ n’aka nri Chineke n’eluigwe. Ọ dị ha mkpa ịkpọku aha Jehova Chineke iji nweta nzọpụta site na Kraịst Jizọs, bụ́ nke gụnyere igosipụta okwukwe n’ebe Kraịst nọ na ịnakwere ya dị ka Onye Ndú ha. Ihe ndabere maka iso Chineke na-enwe mmekọrịta nakwa maka inweta mgbaghara mmehie agbanweela kpam kpam ugbu a. N’otu n’otu, ọ dị ndị Juu ahụ kwere ekwe mkpa ịnakwere ndokwa ọhụrụ a. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ bụ site n’ịrara onwe ha nye Chineke nakwa site n’igosipụta n’ihu ọha na ha emewo otú ahụ site n’ịbụ ndị e mikpuru n’ime mmiri n’aha Jizọs Kraịst. Baptizim ime mmiri bụ ihe na-egosipụta na ha ararawo onwe ha nye Chineke, na-eme ka ha na ya na-enwe mmekọrịta ọhụrụ site na Jizọs Kraịst.—Ọrụ 2:21, 33-36; 3:19-23.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Mgbe Jizọs Kraịst rịgooro n’eluigwe ma gosi Jehova Chineke uru nke ndụ mmadụ ya a chụrụ n’àjà, a kagburu ọgbụgba ndụ Iwu Mozis, a tọkwara ntọala maka “ọgbụgba ndụ ọhụrụ” ahụ e buru n’amụma.—Jeremaịa 31:31-34.