Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gee Ntị n’Ihe Mmụọ Nsọ Na-ekwu!

Gee Ntị n’Ihe Mmụọ Nsọ Na-ekwu!

Gee Ntị n’Ihe Mmụọ Nsọ Na-ekwu!

“Onye nwere ntị ya nụrụ ihe mmụọ nsọ na-agwa ọgbakọ ndị a.”—MKPUGHE 3:22.

1, 2. Ndụmọdụ dị aṅaa ka e nyere ugboro ugboro n’ozi ndị ahụ Jizọs zigaara ọgbakọ asaa ndị ahụ a kpọtụrụ aha ná Mkpughe?

NDỊ ohu Jehova aghaghị ige ntị n’okwu ndị sitere n’ike mmụọ nsọ nke Jizọs Kraịst gwara ọgbakọ asaa ndị ahụ a kpọtụrụ aha n’akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe. N’ezie, nke ọ bụla n’ozi ndị ahụ nwere ndụmọdụ a: “Onye nwere ntị, ya nụrụ ihe mmụọ nsọ na-agwa ọgbakọ ndị a.”—Mkpughe 2:7, 11, 17, 29; 3:6, 13, 22.

2 Anyị atụleelarị ozi Jizọs zigaara ndị mmụọ ozi, ma ọ bụ ndị nlekọta, nke Efesọs, Smụana, na Pagamọm. Olee otú anyị pụrụ isi rite uru site n’ihe o ji ike mmụọ nsọ gwa ọgbakọ anọ ndị ọzọ?

Nye Mmụọ Ozi ahụ Nọ na Taịataịra

3. Ebee ka Taịataịra dị, oleekwa ngwá ahịa a kasị jiri mara ya?

3 “Ọkpara Chineke” na-aja ọgbakọ ahụ dị na Taịataịra mma ma na-adọkwa ya aka ná ntị. (Gụọ Mkpughe 2:18-29.) E wuru Taịataịra (nke bụ́zi Akhisar) n’akụkụ otu mmiri nke na-asọnye n’Osimiri Gediz (Hermus oge ochie) nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ Asia Minor. E ji ọtụtụ nkà mara obodo ahụ. Ndị na-emepụta ihe ndị e ji esiji ákwà n’ebe ahụ na-eji mkpọrọgwụ osisi madder emepụta ihe e ji esiji ákwà uhie, ma ọ bụ nke odo ha a ma ama. Lidia, bụ́ onye ghọrọ Onye Kraịst mgbe Pọl letara Filipaị nke dị na Gris, bụ “onye na-ere ákwà odo odo, onye obodo Taịataịra.”—Ọrụ 16:12-15.

4. N’ihi gịnị ka e ji jaa ọgbakọ ahụ dị na Taịataịra mma?

4 Jizọs jara ọgbakọ ahụ dị na Taịataịra mma maka ihe ndị dị mma ọ na-eme, ịhụnanya ya, okwukwe ya, ntachi obi ya, na ọrụ ọ na-arụ n’ozi ahụ. N’ezie, ‘ihe ndị ha na-eme n’oge na-adịbeghị anya karịrị ndị ha mere n’oge gara aga.’ Otú ọ dị, ọ bụrụgodị na anyị nwere aha ọma, anyị agaghị anwa anwa leghara omume anyị anya.

5-7. (a) Ònye bụ “nwanyị ahụ bụ́ Jezibel,” gịnịkwa ka e kwesịrị ime banyere mmetụta ya? (b) Gịnị ka ozi Kraịst zigaara ọgbakọ ahụ dị na Taịataịra na-enyere ndị inyom na-asọpụrụ Chineke aka ime?

5 Ọgbakọ ahụ dị na Taịataịra nọ na-agbachi nkịtị ka ikpere arụsị, ozizi ụgha, na mmekọahụ rụrụ arụ dịgide. “Nwanyị ahụ bụ́ Jezibel”—ikekwe ìgwè ndị inyom nwere àgwà ndị yiri nke ajọ Eze Nwanyị Jezibel nke Alaeze ebo iri nke Izrel—nọ n’etiti ha. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-atụ aro na ‘ndị amụma nwanyị’ nke Taịataịra gbalịrị ịraba Ndị Kraịst ife chi na chi nwanyị dị iche nke ndị òtù ahịa ofufe na ịraba ha n’ikere òkè n’ememe ndị gụnyere iji ihe oriri achụrụ arụsị àjà. Ka onye amụma nwanyị ọ bụla ji aka ya họpụta onwe ya ghara iji aghụghọ chịkwaa ndị ọzọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst nke oge a!

6 Kraịst “na-aga ịtụba ya n’àkwà ọrịa, tụbakwa ndị ha na ya na-akwa iko n’oké mkpagbu, ọ gwụla ma ha si n’ihe ndị ọ na-eme chegharịa.” Ndị nlekọta ekwesịghị ịnwa anwa nabata ozizi na mmetụta ọjọọ ndị dị otú ahụ, ọ dịghịkwa mkpa ka Onye Kraịst kwaa iko n’ụzọ ime mmụọ na n’ụzọ nkịtị ma ọ bụ kere òkè n’ikpere arụsị iji ghọta na “ihe ndị miri emi nke Setan” bụcha ajọ ihe. Ọ bụrụ na anyị egee ntị n’ịdọ aka ná ntị Jizọs, ‘anyị ga-ejisi aka ike n’ihe anyị nwere,’ mmehie agaghịkwa na-achịkwa anyị. Ebe ọ bụ na ndị e tere mmanụ a kpọlitere n’ọnwụ jụrụ omume asọpụrụghị Chineke, agụụ ihe ọjọọ, na ihe mgbaru ọsọ ndị na-adịghị amasị Chineke, ha na-enweta “ikike n’ebe mba nile dị,” ha ga-esonyekwara Kraịst n’ịkụrisị ha. Ọgbakọ ndị e nwere n’oge a nwere kpakpando ihe atụ, a ga-enyekwa ndị e tere mmanụ “kpakpando ụtụtụ nke na-enwupụ enwupụ,” bụ́ Nwoke ahụ Na-alụ Nwanyị Ọhụrụ, bụ́ Jizọs Kraịst, mgbe a kpọlitesịrị ha n’ọnwụ gaa n’eluigwe.—Mkpughe 22:16.

7 A dọrọ ọgbakọ ahụ dị na Taịataịra aka ná ntị ka ọ ghara ịgbachi nkịtị ná mmetụta ọjọọ nke ndị inyom na-achọ isi n’ezi ofufe dapụ. Ozi sitere n’ike mmụọ nsọ nke Kraịst zigaara ọgbakọ ahụ na-enyere ndị inyom na-asọpụrụ Chineke aka ịnọ n’ọnọdụ Chineke debere ha taa. Ha adịghị anwa ịchịkwa ndị ikom, ha adịghịkwa araba nwanna nwoke ọ bụla n’ịkwa iko n’ụzọ ime mmụọ ma ọ bụ n’ụzọ nkịtị. (1 Timoti 2:12) Kama nke ahụ, ndị inyom dị otú ahụ na-esetịpụ ezi ihe nlereanya n’ime ihe ọma na n’ije ozi iji na-ewetara Chineke otuto. (Abụ Ọma 68:11; 1 Pita 3:1-6) Ọ bụrụ na ọgbakọ ahụ echebe ihe o nwere—ozizi na àgwà dị ọcha na ozi Alaeze nke dị oké ọnụ ahịa—Kraịst ga-abịa ịkwụ ya ụgwọ dị ebube, ọ bụghị ibibi ya.

Nye Mmụọ Ozi ahụ Nọ na Sadis

8. (a) Ebee ka Sadis dị, gịnịkwa bụ ihe ụfọdụ a maara banyere ya? (b) N’ihi gịnị ka ọgbakọ ahụ dị na Sadis ji chọọ enyemaka?

8 Ọgbakọ ahụ dị na Sadis chọrọ enyemaka ngwa ngwa n’ihi na ọ nwụrụ anwụ n’ụzọ ime mmụọ. (Gụọ Mkpughe 3:1-6.) N’ịbụ nke dị ihe dị ka kilomita 50 site n’ebe ndịda Taịataịra, Sadis bụ obodo nwere ihe ịga nke ọma. Azụmahịa, otú ala ebe ahụ si bụrụ ebe na-eme ihe nke ọma, na mmepụta a na-emepụta ákwà ogho na kapet n’ebe ahụ mere ka ọ bụrụ obodo bara ọgaranya nke ihe dị ka mmadụ 50,000 biburu na ya. Dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus si kwuo, ọtụtụ ndị Juu biri na Sadis na narị afọ mbụ T.O.A. Ihe ndị so n’ihe ndị e bibiri n’obodo ahụ bụ otu ụlọ nzukọ na ụlọ nsọ nke chi nwanyị ndị Efesọs bụ́ Atemis.

9. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ozi anyị na-eje bụ iji mezuo iwu?

9 Kraịst gwara mmụọ ozi nke ọgbakọ ahụ dị na Sadis, sị: “Amaara m ihe ndị ị na-eme, na i nwere aha na ị dị ndụ, ma ị nwụrụ anwụ.” Gịnị ma ọ bụrụ na a na-ele anyị anya dị ka ndị mụ anya n’ụzọ ime mmụọ ma anyị adịghị achọ ịnakwere ihe ùgwù ije ozi Ndị Kraịst, ozi anyị na-eje abụrụkwa nke “na-achọ ịnwụ anwụ” n’ụzọ ime mmụọ nakwa nke anyị na-eje iji mezuo iwu? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ dị mkpa ka anyị ‘nọgide na-echeta otú anyị si nata na otú anyị si nụ’ ozi Alaeze ahụ, anyị kwesịkwara itinyesikwu mgbalị ike n’ozi dị nsọ. N’ezie, anyị kwesịrị ịmalite iji obi anyị dum na-ekere òkè ná nzukọ Ndị Kraịst. (Ndị Hibru 10:24, 25) Kraịst dọrọ ọgbakọ dị na Sadis aka ná ntị, sị: “Ọ gwụla ma ì tetara, m ga-abịa dị ka onye ohi, ị gaghịkwa ama awa m ga-abịakwasị gị ma ọlị.” Gịnị banyere oge anyị? Anyị aghaghị ịza ajụjụ n’oge na-adịghị anya.

10. Ọbụna n’ọnọdụ yiri nke ahụ e nwere na Sadis, gịnị pụrụ ịbụ eziokwu banyere Ndị Kraịst ole na ole?

10 Ọbụna n’ọnọdụ yiri nke ahụ dị na Sadis, a pụrụ inwe mmadụ ole na ole bụ́ ndị ‘na-emerụghị uwe elu ha, ndị pụkwara iyiri nke na-acha ọcha soro Kraịst na-eje ije, n’ihi na ha kwesịrị ekwesị.’ Ha na-anọgide bụrụ ndị a maara dị ka Ndị Kraịst, ndị a na-emerụghị emerụ, ndị na-enweghị ntụpọ n’omume na n’ihe ndị metụtara okpukpe n’ụwa a. (Jems 1:27) N’ihi ya, Jizọs ‘agaghịkwa ehichapụ aha ha ma ọlị n’akwụkwọ nke ndụ, kama ọ ga-ekwupụta aha ha n’ihu Nna ya na n’ihu ndị mmụọ ozi.’ N’ịbụ ndị a gụrụ ná ndị kwesịrị ekwesị iso Kraịst na-eje ije, a ga-eyikwasị òtù nwanyị Kraịst na-alụ ọhụrụ, nke ndị e tere mmanụ mejupụtara, ákwà linin ọma nke na-enwupụ enwupụ ma dị ọcha, bụ́ nke na-ese onyinyo ezi omume nke ndị nsọ Chineke. (Mkpughe 19:8) Ihe ùgwù ije ozi dị ebube nke na-echere ha n’eluigwe na-akpali ha imeri ụwa a. Ọtụtụ ngọzi na-echekwa ndị ga-enweta ndụ ebighị ebi n’elu ala. E dekwara aha ha n’akwụkwọ nke ndụ ahụ.

11. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị na-ero ụra n’ụzọ ime mmụọ?

11 Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị nke chọrọ ịbanye n’ajọ ọnọdụ ime mmụọ nke ọgbakọ ahụ dị na Sadis nọrọ na ya. Ma gịnị ma ọ bụrụ na anyị achọpụta na anyị na-ero ụra n’ụzọ ime mmụọ? Anyị kwesịrị ime ihe ngwa ngwa maka ọdịmma anyị. Ka e were ya na a na-anwa anyị ịgbaso ụzọ ndụ ndị na-adịghị amasị Chineke ma ọ bụkwanụ na anyị adịchaghịzi enwe mmasị n’ịga nzukọ ma ọ bụ n’ikere òkè n’ozi anyị. Ka anyị chọọ enyemaka Jehova site n’ikpesi ekpere ike. (Ndị Filipaị 4:6, 7, 13) Ịgụ Bible kwa ụbọchị na ịmụ Akwụkwọ Nsọ na akwụkwọ ndị “onye ahụ na-elekọta ụlọ nke na-ekwesị ntụkwasị obi” na-ebipụta ga-enyere anyị aka ịmụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ. (Luk 12:42-44) Mgbe ahụ, anyị ga-adị ka ndị nọ na Sadis bụ́ ndị Kraịst nabatara, anyị ga-abụkwara ndị kwere ekwe ibe anyị ngọzi.

Nye Mmụọ Ozi ahụ Nọ na Filadelfia

12. Olee otú ị ga-esi akọwa ọnọdụ okpukpe e nwere na Filadelfia oge ochie?

12 Jizọs jara ọgbakọ ahụ dị na Filadelfia mma. (Gụọ Mkpughe 3:7-13.) Filadelfia (nke bụ́zi Alasehir) bụ ógbè bara ọgaranya na-emepụta mmanya nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ Asia Minor. N’ezie, chi ya bụ́ isi bụ Daịonisọs, chi nke mmanya. Ihe àmà na-egosi na ndị Juu nọ na Filadelfia gbalịrị ime ka ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst nọ n’ebe ahụ nọgide na-eme ihe ndị e dere n’Iwu Mozis ma ọ bụ maliteghachi ime ha, ma ha enweghị ihe ịga nke ọma.

13. Olee otú Kraịst siworo jiri “mkpịsị ugodi Devid” mee ihe?

13 Kraịst nwere “mkpịsị ugodi nke Devid,” n’ihi ya kwa, e nyewo ya ihe nile metụtara Alaeze ahụ na ọrụ ilekọta ezinụlọ nke okwukwe. (Aịsaịa 22:22; Luk 1:32) Jizọs ji mkpịsị ugodi ahụ megheere Ndị Kraịst nọ na Filadelfia na n’ebe ndị ọzọ ụzọ inweta ohere na ihe ùgwù ndị metụtara Alaeze ahụ. Kemgbe 1919, o megheworo “onye ahụ na-elekọta ụlọ nke na-ekwesị ntụkwasị obi” “ọnụ ụzọ buru ibu” nke na-eduga n’ọrụ nkwusa Alaeze bụ́ nke ọ na-adịghị onye mmegide pụrụ imechi ya. (1 Ndị Kọrint 16:9; Ndị Kọlọsi 4:2-4) N’ezie, e mechiworo ndị so ná “nzukọ Setan” ọnụ ụzọ nke na-eduga n’ihe ùgwù ndị metụtara Alaeze ahụ, n’ihi na ha abụghị ụmụ Izrel ime mmụọ.

14. (a) Nkwa dị aṅaa ka Jizọs kwere ọgbakọ ahụ dị na Filadelfia? (b) Olee otú anyị ga-esi zere ịda “n’awa nke ule”?

14 Jizọs kwere Ndị Kraịst nọ na Filadelfia nkwa a: “N’ihi na i debere okwu banyere ntachi obi m, m ga-echebekwa gị pụọ n’awa nke ule, bụ́ nke gaje ịbịakwasị elu ụwa dum mmadụ bi, iji tinye ndị bi n’elu ụwa n’ule.” Ikwusa ozi ọma chọrọ ụdị ntachi obi Jizọs gosipụtara. Ọ dịghị mgbe ọ bụla o kwenyeere onye iro ahụ kama ọ nọgidere na-eme uche Nna ya. N’ihi ya, a kpọlitere Kraịst n’ọnwụ gaa ná ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe. Ọ bụrụ na anyị anọgidesie ike ná mkpebi anyị ife Jehova ofufe ma na-akwado Alaeze ahụ site n’ikwusa ozi ọma, a ga-eme ka anyị ghara ịda n’oge ule e nwere ugbu a, bụ́ ‘awa nke ule.’ Anyị ‘ga-anọgide na-ejidesi ihe anyị nwetara’ site n’aka Kraịst ike site n’ịgbalịsi ike ịmụba ihe ndị metụtara Alaeze ahụ. Ime nke a ga-eme ka ndị e tere mmanụ nweta okpueze eluigwe nke dị oké ọnụ ahịa, meekwa ka ndị ibe ha na-eguzosi ike n’ihe nweta ndụ ebighị ebi n’elu ala.

15. Gịnị ka a chọrọ n’aka ndị ga-abụ ‘ogidi n’ụlọ nsọ Chineke’?

15 Kraịst na-agbakwụnye, sị: “Onye na-emeri emeri—m ga-eme ka ọ bụrụ ogidi n’ụlọ nsọ nke Chineke m, . . . m ga-edekwasịkwa n’ahụ́ ya aha Chineke m na aha obodo ukwu nke Chineke m, bụ́ Jeruselem ọhụrụ nke si n’eluigwe na-arịdata site n’ebe Chineke m nọ, nakwa aha ọhụrụ m ahụ.” Ndị nlekọta e tere mmanụ aghaghị ịkwado ezi ofufe. Ha aghaghị ịnọgide bụrụ ndị ruru eru iso na “Jeruselem ọhụrụ” ahụ site n’ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke na ịnọgide na-adị ọcha n’ụzọ ime mmụọ. Nke a dị mkpa ma ọ bụrụ na ha chọrọ ịbụ ogidi n’ụlọ nsọ ahụ e mere ka ọ dị ebube nke dị n’eluigwe nakwa ma ọ bụrụ na ha gaje ịza aha nke obodo Chineke dị ka ụmụ amaala eluigwe ya nakwa ịza aha Kraịst dị ka nwunye ọ na-alụ ọhụrụ. N’eziekwa, ha aghaghị inwe ntị nke ‘na-anụ ihe mmụọ nsọ na-agwa ọgbakọ ndị ahụ.’

Nye Mmụọ Ozi ahụ Nọ na Leodisia

16. Olee ihe ụfọdụ bụ́ eziokwu banyere Leodisia?

16 Kraịst dọrọ ọgbakọ ahụ dị na Leodisia nke onwe ya juru afọ aka ná ntị. (Gụọ Mkpughe 3:14-22.) Leodisia dị ihe dị ka kilomita 150 site n’ebe ọwụwa anyanwụ Efesọs ma dịrị n’ebe ụzọ abụọ ndị bụ́ isi e si eme njem azụmahịa sọkọtara isi na ndagwurugwu na-eme nri nke Osimiri Lycus, ọ bụ obodo bara nnọọ ọgaranya nke nwere ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ihe, bụrụkwa ebe bụ́ isi a na-echekwa ego. A maara uwe ndị e ji ogho ojii nke a na-emepụta n’ógbè ahụ mee, nke ọma. Dị ka ebe ụlọ akwụkwọ nkà mmụta ọgwụ a ma ama dị, eleghị anya ọ bụ na Leodisia ka e mere ọgwụ anya a na-akpọ Phrygian powder. Asclepius, bụ́ chi nke ọgwụ, bụ otu n’ime chi ndị bụ́ isi nke obodo ahụ. O yiri ka ọtụtụ ndị Juu hà biri na Leodisia, bụ́ ndị o doro anya na ụfọdụ n’ime ha bara ọgaranya.

17. N’ihi gịnị ka e ji dọọ ndị Leodisia aka ná ntị?

17 N’ịgwa ọgbakọ ahụ dị na Leodisia okwu site n’ọnụ “mmụọ ozi” ya, Jizọs ji olu dị ike kwuo okwu dị ka “ezi onye àmà ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, mmalite nke ihe Chineke kere.” (Ndị Kọlọsi 1:13-16) A dọrọ ndị Leodisia aka ná ntị n’ihi ‘ajụghị oyi na ekpoghị ọkụ’ n’ụzọ ime mmụọ. Ebe ọ bụ na ha dị ṅara ṅara, Kraịst gaje ịgbọpụ ha n’ọnụ ya. O kwesịghị isiri ha ike ịghọta isi ihe ọ na-ekwu. E nwere iyi na-ekpo ọkụ na Hierapolis bụ́ obodo dịdewere ha, e nwekwara mmiri oyi na Kọlọsi. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na a ghaghị isi n’ebe dị nnọọ anya dọta mmiri na Leodisia, o yikarịrị ka ọ na-adị ṅara ṅara mgbe o rutere n’obodo ahụ. Mmiri ahụ na-esi n’ọwa mmiri sọrọ ruo otu ebe. Ya rutewe Leodisia, ọ na-esizi n’oghere a wara n’etiti nkume ndị e jikọtara ọnụ, na-asọbata.

18, 19. Olee otú a pụrụ isi nyere Ndị Kraịst nke oge a aka dị ka e nyeere ndị ahụ nọ na Leodisia?

18 Ndị dị ka ndị Leodisia taa adịghị ọkụ n’ụzọ na-akpali akpali, ha ajụghịkwa oyi n’ụzọ na-enye ume ọhụrụ. Dị ka mmiri dị ṅara ṅara, a ga-agbọpụ ha n’ọnụ! Jizọs achọghị ka ha bụrụ ọnụ na-ekwuru ya, dị ka “ndị nnọchiteanya nọ n’ọnọdụ Kraịst.” (2 Ndị Kọrint 5:20) Ọ gwụla ma ha chegharịrị, ihe ùgwù ha nke ịbụ ndị nkwusa Alaeze ga-efunahụ ha. Ndị Leodisia chụsoro akụ̀ na ụba nke ụwa, ha ‘amaghịkwa na ha nọ ná nhụsianya, bụrụ ndị e kwesịrị imere ebere, ndị dara ogbenye, ndị kpuru ìsì na ndị gba ọtọ.’ Iji kwụsị ịda ogbenye, ikpu ìsì, na ịgba ọtọ n’ụzọ ime mmụọ, ọ dị mkpa ka ndị ọ bụla dị ka ha taa zụrụ site n’aka Kraịst ‘ọlaedo a nụchara anụcha’ nke bụ́ okwukwe a nwapụtara anwapụta, “uwe elu na-acha ọcha” nke bụ́ ezi omume, na “ọgwụ anya” nke na-eme ka a na-ahụ ụzọ nke ọma n’ụzọ ime mmụọ. Obi ga-adị Ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta ụtọ inyere ha aka ịma banyere mkpa ime mmụọ ha ka ha wee nwee ike ‘ịba ọgaranya n’okwukwe.’ (Jems 2:5; Matiu 5:3) Ọzọkwa, ọ dị mkpa ka ndị nlekọta nyere ha aka ite “ọgwụ anya” ime mmụọ—ịnakwere ozizi Jizọs, ndụmọdụ ya, ihe nlereanya ya, na ụzọ iche echiche ya, na ime ihe kwekọrọ na ha. Nke a bụ ihe ngwọta nye “ọchịchọ nke anụ ahụ́ na ọchịchọ nke anya na oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ.”—1 Jọn 2:15-17.

19 Jizọs na-adọ ndị nile o nwere mmetụta na-ekpo ọkụ n’ebe ha nọ aka ná ntị ma na-enye ha ahụhụ. Ndị nlekọta nọ n’okpuru ya aghaghị iji ụzọ dị nro na-eme otu ihe ahụ. (Ọrụ 20:28, 29) Ọ dị mkpa ka ndị Leodisia “na-anụ ọkụ n’obi ma chegharịa,” na-eme mgbanwe n’ụzọ ha si eche echiche na n’ụzọ ndụ ha. È nwere ụfọdụ n’ime anyị ndị ọ mawooro ahụ́ ibi ndụ n’ụzọ na-eme ka ozi dị nsọ anyị na-ejere Chineke nọrọ n’ọnọdụ dị ala ná ndụ? Mgbe ahụ ka anyị ‘zụrụ ọgwụ anya site n’aka Jizọs’ ka anyị wee nwee ike ịhụ mkpa ọ dị iji ịnụ ọkụ n’obi buru ụzọ na-achọ Alaeze ahụ.—Matiu 6:33.

20, 21. Olee ndị na-azaghachi n’ụzọ kwesịrị ekwesị ‘n’aka Jizọs na-akụ’ taa, gịnịkwa ka ha na-atụ anya ya?

20 “Lee!” ka Kraịst na-ekwu, “ana m eguzo n’ọnụ ụzọ ma na-akụ aka. Ọ bụrụ na onye ọ bụla anụ olu m ma meghee ụzọ, m ga-abata n’ime ụlọ ya ma soro ya rie nri anyasị, ọ ga-esokwa m rie.” Jizọs na-akụzikarị ihe ime mmụọ ka ọ na-eso ndị mmadụ eri nri. (Luk 5:29-39; 7:36-50; 14:1-24) Ọ na-akụ aka ugbu a n’ọnụ ụzọ nke ọgbakọ yiri nke ahụ dị na Leodisia. Ndị nọ na ya hà ga-emeghere ya ụzọ, nweghachi mmetụta na-ekpo ọkụ n’ebe ọ nọ, nabata ya n’etiti ha, ma kwe ka o zie ha ihe? Ọ bụrụ na ha emee otú ahụ, Kraịst ga-eso ha rie ihe bụ́ nke ga-abara ha uru dị ukwuu n’ụzọ ime mmụọ.

21 “Atụrụ ọzọ” nke oge a na-anabata Jizọs n’ụzọ ihe atụ, ime otú ahụ na-edubakwa ná ndụ ebighị ebi. (Jọn 10:16; Matiu 25:34-40, 46) Kraịst ga-enye onye e tere mmanụ ọ bụla na-emeri emeri ihe ùgwù nke ‘isoro ya nọdụ ala n’ocheeze ya, ọbụna dị ka o meriri wee soro Nna ya nọdụ ala n’ocheeze Ya.’ Ee, Jizọs na-ekwe ndị e tere mmanụ na-emeri emeri nkwa ịkwụ ha ụgwọ ọrụ dị ebube nke bụ́ iso ya nọrọ n’ocheeze n’aka nri nke Nna ya n’eluigwe. Atụrụ ọzọ ahụ na-emeri emeri na-atụkwa anya iketa ụwa n’okpuru ọchịchị Alaeze ahụ.

Ihe Mmụta Dịịrị Anyị Nile

22, 23. (a) Olee otú Ndị Kraịst nile pụrụ isi rite uru n’ihe Jizọs gwara ọgbakọ asaa ndị ahụ? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

22 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Ndị Kraịst nile pụrụ irite uru dị ukwuu n’ihe Jizọs gwara ọgbakọ asaa ahụ dị n’Asia Minor. Dị ka ihe atụ, n’ịrịba ama na Kraịst kwuru okwu ịja mma kwesịrị ekwesị, Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na-ahụ n’anya na-abụ ndị a kpaliri ịja ndị nọ n’ọgbakọ ha bụ́ ndị na-eme nke ọma n’ụzọ ime mmụọ mma. N’ebe e nwere adịghị ike, ndị okenye na-enyere ndị kwere ekwe ibe ha aka itinye ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị ga-eme ka ha gbasie ike, n’ọrụ. Anyị nile pụrụ ịnọgide na-erite uru n’akụkụ dị iche iche nke ndụmọdụ Kraịst nyere ọgbakọ asaa ahụ, ma ọ bụrụhaala na anyị ejiri ekpere tinye ya n’ọrụ, n’egbughịkwa oge. *

23 Ụbọchị ikpeazụ ndị a abụghị oge nke anyị ịbụ ndị onwe ha juru afọ, nke ịhụ ihe onwunwe n’anya, ma ọ bụ nke ime ihe ọ bụla ọzọ nke pụrụ ime ka anyị na-ejere Chineke ozi nanị iji mezuo iwu. N’ihi ya, ka ọgbakọ nile nọgide na-enwusi ike dị ka ihe ndọba oriọna ndị Jizọs na-ekwe ka ha dịrị n’ọnọdụ ha. Dị ka Ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi, ka anyị na-ekpebisi ike mgbe nile ịdị na-aṅa ntị mgbe Kraịst na-ekwu okwu ma na-ege ntị n’ihe mmụọ nsọ na-ekwu. Mgbe ahụ, anyị ga na-enwe ọṅụ na-adịgide adịgide dị ka ndị na-enye ìhè iji wetara Jehova otuto.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 22 A tụlekwara Mkpughe 2:1-3:22 n’isiakwụkwọ nke 7 ruo nke 13 nke akwụkwọ bụ́ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaghachi?

• Ònye bụ “nwanyị ahụ bụ́ Jezibel,” n’ihi gịnịkwa ka ndị inyom na-asọpụrụ Chineke na-ejighị eṅomi ya?

• Ọnọdụ dị aṅaa dị n’ọgbakọ ahụ dị na Sadis, gịnịkwa ka anyị pụrụ ime iji zere ịdị ka ọtụtụ Ndị Kraịst biri n’ebe ahụ?

• Nkwa ndị dị aṅaa ka Jizọs kwere ọgbakọ ahụ dị na Filadelfia, oleekwa otú ha si metụta oge a?

• N’ihi gịnị ka e ji dọọ ndị nọ na Leodisia aka ná ntị, atụmanya dịkwa aṅaa na-echere Ndị Kraịst na-anụ ọkụ n’obi?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 16]

A ghaghị izere ụzọ ọjọọ nke “nwanyị ahụ bụ́ Jezibel”

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Jizọs emegheworo ụmụazụ ya “ọnụ ụzọ buru ibu” nke na-eduga n’ihe ùgwù ndị metụtara Alaeze ahụ

[Foto dị na peeji nke 20]

Ị̀ na-anabata Jizọs ma na-ege ya ntị?