Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Họrọ Ndụ Ebighị Ebi

Họrọ Ndụ Ebighị Ebi

Họrọ Ndụ Ebighị Ebi

Ọ DỊBEGHỊ mgbe ọ bụla ọzọ ọtụtụ mmadụ nwere ọtụtụ nhọrọ ime. Dị ka ihe atụ, uwe anyị na-eyi, nri anyị na-eri, na ebe anyị na-arụ ọrụ na ebe anyị bi na-abụkarị ihe a na-eme nhọrọ maka ha. N’ọtụtụ ebe n’ụwa, mmadụ ịhọrọ onye ọ ga-alụ bụkwa ihe a na-emekarị. Otú ọ dị, Bible na-egosi nhọrọ nke karịrị nhọrọ ndị ọzọ nile—nke gheere oghe nye ihe nile a kpọrọ mmadụ.

Bible na-ekwu, sị: “Onye na-eguzosi ike n’ezi omume ga-eru ná ndụ: ma onye na-agbaso ihe ọjọọ ga-eru n’ọnwụ nke aka ya.” (Ilu 11:19) Jizọs Kraịst kwukwara, sị: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.”—Jọn 17:3.

Ee, Onye Okike anyị enyewo anyị ohere nke ịhọrọ ụzọ pụrụ iduba anyị ná ndụ ebighị ebi! Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji nweta ndụ ebighị ebi?

Dị ka Bible si kwuo, “n’ụzọ ezi omume ka ndụ dị.” (Ilu 12:28) Anyị pụrụ iso ná ndị ezi omume bụ́ ndị nọ n’ụzọ nke ndụ ebighị ebi. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ bụ site n’ijide n’aka na ndụ anyị kwekọrọ n’uche Chineke na n’iwu ya. (Matiu 7:13, 14) Ya mere, ka anyị mee nhọrọ ziri ezi ma nweta onyinye nke ndụ ebighị ebi nke Chineke na-enye.—Ndị Rom 6:23.