Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nọgidesie Ike, Ma Nwee Mmeri n’Ọsọ nke Ndụ Ahụ

Nọgidesie Ike, Ma Nwee Mmeri n’Ọsọ nke Ndụ Ahụ

Nọgidesie Ike, Ma Nwee Mmeri n’Ọsọ nke Ndụ Ahụ

Ọ BỤRỤ na ị ghaghị ime njem n’oké osimiri nke oké ebili mmiri na-enugharị, olee ụdị ụgbọ mmiri ị ga-ahọrọ ịbanye? Ị̀ ga-achọ ịbanye ụgbọ epeepe na-esighị ike ka ọ̀ bụ nnukwu ụgbọ mmiri siri ike nke a rụziri arụzi? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-ahọrọ nnukwu ụgbọ mmiri, ebe ọ bụ na ọ ga-enwe ike ịgabiga ajọ ebili mmiri ahụ n’enweghị nsogbu.

Ka anyị na-agabiga usoro ihe a jupụtara n’ọgba aghara na ihe ize ndụ, anyị na-eche ihe ịma aka ndị na-eme ka obi ghara iru mmadụ ala ihu. Dị ka ihe atụ, ndị na-eto eto pụrụ inwe mgbagwoju anya na ahụ́ erughị ala mgbe ụfọdụ n’ihi echiche na ihe ndị na-ewu ewu nke ụwa a bụ́ ndị na-etigharị mmadụ anya. Ndị ghọrọ Ndị Kraịst n’oge na-adịbeghị anya ka pụrụ ịbụ ndị obi na-esichaghị ike. Ọbụna ụfọdụ ndị na-eguzosi ike n’ihe bụ́ ndị jiworo ikwesị ntụkwasị obi jeere Chineke ozi ruo ọtụtụ afọ pụrụ ịbụ ndị na-eche ule ihu n’ihi na e mezuchabeghị ihe nile ha na-atụ anya ya.

Mmetụta ndị dị otú ahụ abụghị ihe ọhụrụ. Ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, dị ka Mozis, Job, na Devid, nwere mgbe obi na-erughị ha ala. (Ọnụ Ọgụgụ 11:14, 15; Job 3:1-4; Abụ Ọma 55:4) N’agbanyeghị nke ahụ, a maara ha dị ka ndị ji iguzosi ike n’ihe fee Jehova ofufe. Ezi ihe nlereanya ha na-akpali anyị ịdị na-eguzosi ike, ma Setan bụ́ Ekwensu na-achọ ịdọpụ anyị n’ọsọ nke ndụ ebighị ebi ahụ. (Luk 22:31) Ya mere, olee otú anyị pụrụ isi nọgide na-eguzosi ike, ‘na-esi ike n’okwukwe’? (1 Pita 5:9) Oleekwa otú anyị pụrụ isi wusie ndị kwere ekwe ibe anyị ike?

Jehova Chọrọ Ka Anyị Na-eguzosi Ike

Ọ bụrụ na anyị na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova, ọ ga-anọ ya mgbe nile inyere anyị aka ịnọgide na-eguzosi ike. Ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid chere ọtụtụ ọnọdụ ndị tara akpụ ihu, ma o nwere olileanya n’ebe Chineke nọ, ọ bụkwa ya mere o ji nwee ike ịbụ, sị: “[Jehova] wee mee ka m si n’olulu mbibi, n’apịtị nke ala ụrọ, rịgopụta; O wee mee ka ụkwụ m abụọ guzo n’elu nkume dị elu, Ọ na-eme ka nzọụkwụ m nile guzosie ike.”—Abụ Ọma 40:2.

Jehova na-enye anyị ike ịlụ “ezi ọgụ nke okwukwe” ka anyị wee nwee ike ‘ijidesi aka ike ná ndụ ebighị ebi ahụ.’ (1 Timoti 6:12) Ọ na-enyekwa anyị ihe ndị ga-enyere anyị aka ịnọgide na-eguzosi ike ma merie n’agha ime mmụọ anyị na-alụ. Pọl onyeozi gbara Ndị Kraịst ibe ya ume ka ha ‘nọgide na-enweta ike n’ime Onyenwe anyị nakwa n’ịdị ike nke ume ya,’ ka ha ‘yikwasịkwa ekike agha zuru ezu nke sitere na Chineke ka ha wee nwee ike iguzosi ike megide nzupụta ọjọọ dị iche iche nke Ekwensu.’ (Ndị Efesọs 6:10-17) Ma gịnị pụrụ ime ka anyị ghara iguzosi ike? Oleekwa otú anyị pụrụ isi guzogide mmetụta ndị dị otú ahụ dị ize ndụ?

Kpachara Anya Maka Ihe Ndị Na-eme Ka Mmadụ Ghara Iguzosi Ike

Ọ bụ ihe amamihe dị na ya icheta eziokwu a dị mkpa: Mkpebi ndị anyị na-eme na-emesị nwee mmetụta n’ebe iguzosi ike anyị dị ka Ndị Kraịst dị, ma ọ́ bụghị mmetụta dị mma ya abụrụ nke na-adịghị mma. Ndị ntorobịa nwere mkpebi ime n’ihe ndị metụtara ọrụ, ịgụkwu akwụkwọ, na alụmdi na nwunye. Ndị toworo eto nwere ike bụrụ na ha aghaghị ikpebi ma hà ga-akwaga n’ebe ọzọ ma ọ bụkwa ma hà ga na-arụ ọrụ ọzọ n’elu nke ha na-arụ. Anyị na-eme mkpebi kwa ụbọchị banyere otú anyị si eji oge eme ihe na banyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Gịnị ga-enyere anyị aka ime mkpebi ndị amamihe dị na ha bụ́ ndị ga-eme ka anyị na-eguzosikwu ike dị ka ndị ohu Chineke? Otu Onye Kraịst jeworo ozi ruo ogologo oge kwuru, sị: “Ana m arịọ Jehova maka enyemaka mgbe m na-eme mkpebi. Ekweere m na ọ dị mkpa ịnakwere na itinye ndụmọdụ e nyere na Bible, ná nzukọ Ndị Kraịst, site n’aka ndị okenye, na n’akwụkwọ ndị dabeere na Bible n’ọrụ.”

Mgbe anyị na-eme mkpebi, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Afọ ise ma ọ bụ afọ iri site n’ugbu a, m̀ ga-anọgide na-enwe obi ụtọ ná mkpebi ndị m na-eme taa, ka m ga-akwa ụta n’ihi ha? M̀ na-agbalịsi ike ịhụ na mkpebi ndị m na-eme agaghị eme ka m kwụsị iguzosi ike n’ụzọ ime mmụọ kama na ha ga-eme ka m nwekwuo ọganihu ime mmụọ?’—Ndị Filipaị 3:16.

Ụfọdụ ndị e mere baptizim adịghịzi eguzosi ike ná ndụ n’ihi ịbụ ndị a nwatara ma ọ bụ n’ihi ikwe ka ọ fọ ntakịrị ka ha mebie iwu Chineke. Mmadụ ole na ole a chụrụ n’ọgbakọ n’ihi ime mmehie n’enweghị nchegharị arụsiwo ọrụ ike iji bụrụ ndị a nabataghachiri, e mesịakwa chụpụ ha ọzọ—mgbe ụfọdụ obere oge ka a nabataghachisịrị ha—n’ihi ajọ omume yiri nke ha mere mbụ. Ọ̀ ga-abụ na ha ekpebeghị ekpere maka enyemaka Chineke iji ‘kpọọ ihe ọjọọ asị, ma na-arapara n’ezi ihe’? (Ndị Rom 12:9; Abụ Ọma 97:10) Ọ dị mkpa ka anyị nile ‘nọgide na-emere ụkwụ anyị ụzọ kwụ ọtọ.’ (Ndị Hibru 12:13) Ya mere, ka anyị tụlee ụfọdụ ihe ndị pụrụ inyere anyị aka ịnọgide na-eguzosi ike n’ụzọ ime mmụọ.

Nọgide Na-eguzosi Ike Site n’Ịrụ Ọrụ Dịịrị Ndị Kraịst

Otu ụzọ isi nọgide na-agba ọsọ nke ndụ ahụ bụ inwe ọtụtụ ihe ime n’ọrụ nkwusa Alaeze. Ee, ozi Ndị Kraịst anyị bụ ihe enyemaka bara uru n’ime ka obi na uche anyị dịrị n’ime uche Chineke ma dịgide n’ihe mgbata n’ọsọ ahụ nke bụ́ ndụ ebighị ebi. Pọl gbara ndị Kọrint ume banyere nke a, sị: “Ụmụnna m m hụrụ n’anya, bụrụnụ ndị na-eguzosi ike, ndị a na-apụghị ịkwapụ akwapụ, ndị nwere ọtụtụ ihe mgbe nile ime n’ọrụ Onyenwe anyị, ebe unu maara na ndọgbu unu na-adọgbu onwe unu n’ọrụ abụghị n’efu n’ihe metụtara Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 15:58) ‘Iguzosi ike’ pụtara ‘ịkwụsi ike n’ihe.’ Ịbụ onye “a na-apụghị ịkwapụ akwapụ” pụrụ ịpụta ‘mmadụ ịghara ikwe ka ụkwụ ya chipụ n’ebe ọ kwụ.’ N’ihi ya, iji ọrụ n’aka n’ozi anyị pụrụ ime ka anyị kwụsie ike n’ụzọ nke Ndị Kraịst. Inyere ndị ọzọ aka ịmara Jehova na-eme ka ndụ anyị nwee nzube ma na-ewetara anyị obi ụtọ.—Ọrụ 20:35.

Pauline, bụ́ Onye Kraịst nke jiworo ihe karịrị afọ 30 jee ozi ala ọzọ nakwa ọrụ nkwusa oge nile ndị ọzọ, na-ekwu, sị: “Ozi a bụ ihe nchebe n’ihi na ịgbara ndị ọzọ àmà na-eme ka obi sie m ike na m nwere eziokwu ahụ.” A na-enwetakwa obi ike yiri nke ahụ site n’ikerechi òkè anya n’ihe omume ndị ọzọ nke Ndị Kraịst, dị ka ịga nzukọ maka ofufe, na inwechi ọmụmụ Bible onwe onye anya.

Ịbụ Ndị Òtù Ụmụnna Na-ahụ n’Anya Mere Ka Ha Guzosie Ike

Iso ná nzukọ zuru ụwa ọnụ nke ndị na-efe ezi ofufe pụrụ ime nnọọ ka anyị na-eguzosi ike. Lee ka anyị si bụrụ ndị a gọziri agọzi iso n’òtù ụmụnna dị otú ahụ na-ahụ n’anya nke zuru ụwa ọnụ! (1 Pita 2:17) Anyị pụkwara ime ka ndị kwere ekwe ibe anyị na-eguzosi ike.

Tụlee omume na-enye aka nke nwoke ezi omume ahụ bụ́ Job mere. Ọbụna e mere nnọọ ka onye nkasi obi ụgha bụ́ Elifaz kweta, sị: “Okwu gị na-eme ka onye na-asụ ngọngọ guzosie ike, ị na-agbakwa ikpere na-ehuru ala ume.” (Job 4:4) Olee otú anyị na-eme n’akụkụ a? Anyị nile n’otu n’otu nwere ibu ọrụ nke inyere ụmụnna ime mmụọ anyị ndị nwoke na ndị nwanyị aka ịtachi obi n’ozi Chineke. Mgbe anyị na ha na-emekọ ihe, anyị pụrụ ime ihe kwekọrọ n’okwu a: “Meenụ aka kụdara akụda ka ha dị ike, gbaakwanụ ikpere na-asụ ngọngọ ume.” (Aịsaịa 35:3) Ya mere, gịnị ma i mee ya ihe mgbaru ọsọ gị ịhụ na ị na-ewusi otu Onye Kraịst ibe gị ma ọ bụ abụọ ike ma na-agba ha ume mgbe ọ bụla gị na ha nọkọrọ? (Ndị Hibru 10:24, 25) Ịgwa ha okwu ịja mma ndị na-agba ume na igosipụta ekele maka mgbalị ha nọgidere na-eme iji na-eme ihe na-atọ Jehova ụtọ pụrụ inyere ha aka n’ezie ịnọgide na-eguzosi ike, na-eburu n’uche inwe mmeri n’ọsọ nke ndụ ahụ.

Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye pụrụ ịrụzu ihe dị ukwuu site n’ịgba ndị ọhụrụ ume. Nke a pụrụ ikwe omume site n’ịtụrụ ha aro ndị na-enye aka na inye ha ndụmọdụ ndị ezi uche dị na ha bụ́ ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ nakwa site n’iso ha arụkọ ọrụ n’ozi ubi. Pọl onyeozi jiri ohere ọ bụla dapụtaranụ wusie ndị ọzọ ike mgbe nile. Ọ gụsiri ya agụụ ike ịhụ Ndị Kraịst nọ na Rom anya ka o wee nwee ike inye aka wusie ha ike n’ụzọ ime mmụọ. (Ndị Rom 1:11) O weere ụmụnna ya ndị nwoke na ndị nwanyị ọ hụrụ n’anya bụ́ ndị nọ na Filipaị dị ka ‘ọṅụ na okpueze’ ya ma gbaa ha ume ka ha ‘na-eguzosi ike n’ụzọ a n’ime Onyenwe anyị.’ (Ndị Filipaị 4:1) Mgbe Pọl nụrụ banyere ihe isi ike ụmụnna ya ndị nọ na Tesalonaịka nwere, o zigara Timoti ịga ‘mee ka ha guzosie ike ma kasie ha obi, ka mkpagbu ghara ịṅagharị onye ọ bụla.’—1 Ndị Tesalonaịka 3:1-3.

Ndị ozi bụ́ Pọl na Pita kwetara na ndị kwere ekwe ibe ha ji ikwesị ntụkwasị obi na-eme mgbalị, ha jikwa mgbalị ha kpọrọ ihe. (Ndị Kọlọsi 2:5; 1 Ndị Tesalonaịka 3:7, 8; 2 Pita 1:12) N’ụzọ yiri nke ahụ, ka anyị na-elekwasị anya, ọ bụghị n’adịghị ike nke ụmụnna anyị, kama n’àgwà ọma ndị ha nwere na n’ọgụ ha na-alụ iji nọgide na-eguzosi ike na iji wetara Jehova nsọpụrụ.

Ọ bụrụ na anyị na-enwe echiche na-ezighị ezi banyere ha ma ọ bụ na-akatọgharị ha, anyị pụrụ, n’amaghị ama, ịdị na-eme ka o siere ụfọdụ ike ịnọgide na-eguzosi ike n’okwukwe ahụ. Lee ka o si kwesị ekwesị icheta na ‘a na-agba ụmụnna anyị akpụkpọ, na-achụsasịkwa ha’ n’usoro ihe a! (Matiu 9:36) Ha kwesịrị ịtụ anya inweta nkasi obi na ume ọhụrụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst. N’ihi ya, ka anyị nile mee ihe nile anyị nwere ike ime iji na-ewuli ndị kwere ekwe ibe anyị elu ma na-enyere ha aka ịnọgide na-eguzosi ike.

Mgbe ụfọdụ, ndị ọzọ pụrụ imeso anyị ihe n’ụzọ pụrụ ime ka anyị ghara iguzosicha ike. Ànyị ga-ekwe ka okwu ọjọọ ma ọ bụ mmeso ọjọọ mee ka anyị kụda aka n’ozi Jehova? Ka anyị ghara ikwe ma ọlị ka mmadụ ọ bụla mee ka anyị kwụsị ịdị na-eguzosi ike!—2 Pita 3:17.

Nkwa Chineke—Ihe Na-eme Ka A Na-eguzosi Ike

Nkwa Jehova kwere maka ọdịnihu magburu onwe ya n’okpuru ọchịchị Alaeze ya na-eme ka anyị nwee olileanya nke na-enyere anyị aka ịnọgide na-eguzosi ike. (Ndị Hibru 6:19) Mmesi obi ike anyị nwere na Chineke na-emezu nkwa ya na-akpalikwa anyị ‘ịmụrụ anya na iguzosi ike n’okwukwe.’ (1 Ndị Kọrint 16:13; Ndị Hibru 3:6) Ihe yiri ka ọ bụ igbu oge ná mmezu nke nkwa ụfọdụ Chineke kwere pụrụ ile okwukwe anyị ule. N’ihi ya, ọ dị oké mkpa ka anyị nọrọ na nche megide ịbụ ndị ozizi ụgha duhiere ma mee ka anyị kwụsị inwe olileanya anyị.—Ndị Kọlọsi 1:23; Ndị Hibru 13:9.

Ihe nlereanya ọjọọ nke ndị Izrel bụ́ ndị lara n’iyi n’ihi na ha enweghị okwukwe ná nkwa Jehova kwesịrị ịbụrụ anyị ihe ịdọ aka ná ntị. (Abụ Ọma 78:37) Kama ịdị ka ha, ka anyị na-eguzosi ike, jiri echiche nke ịdị ngwa na-ejere Chineke ozi n’ụbọchị ikpeazụ ndị a. “Ana m ebi ndụ kwa ụbọchị dị ka a ga-asị na oké ụbọchị Jehova ga-abịa echi,” ka otu okenye nweworo ahụmahụ kwuru.—Joel 1:15.

Ee, oké ụbọchị Jehova dị nso. Otú ọ dị, ọ dịghị ihe anyị ga-atụrụ egwu ma ọ bụrụhaala na anyị anọrọ Chineke nso. Ọ bụrụ na anyị agbasochie ụkpụrụ ezi omume ya anya ma nọgide na-eguzosi ike, anyị pụrụ ịgbaru ọsọ nke ndụ ebighị ebi ahụ n’isi!—Ilu 11:19; 1 Timoti 6:12, 17-19.

[Foto dị na peeji nke 23]

Ị̀ na-eme ihe nile i nwere ike ime iji nyere Ndị Kraịst ibe gị aka ịnọgide na-eguzosi ike?

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji 21]

The Complete Encyclopedia of Illustration/J. G. Heck