Onye Ọ Bụla Ga-ebi n’Okpuru Osisi Fig Ya
Onye Ọ Bụla Ga-ebi n’Okpuru Osisi Fig Ya
NDÒ bụ ihe a na-achọsi nnọọ ike n’oge okpomọkụ n’ala ndị dị n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa. Osisi ọ bụla a pụrụ ịnọ n’okpuru ya zere anwụ bụ ihe a na-achọsi ike, karịsịa mgbe ọ dị nso n’ebe obibi mmadụ. N’ihi akwụkwọ ya ndị dị obosara na alaka ya ndị gbasapụrụ agbasapụ, osisi fig na-enye ndò dị mma karịa ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ osisi ọ bụla ọzọ e nwere n’ógbè ahụ.
Dị ka akwụkwọ bụ́ Plants of the Bible si kwuo, “a na-ekwu na ndò [osisi fig] na-enye ume ọhụrụ ma na-ajụ oyi karịa ndò ụlọikwuu.” N’Izrel oge ochie, osisi fig ndị a kụrụ n’akụkụ ubi vaịn bụ ebe dị nnọọ mma nke ndị na-arụ ọrụ n’ubi na-anọ ezurutụ ike.
N’uhuruchi nke ogologo ụbọchị anwụ chasiri ike na ya, ndị òtù ezinụlọ pụrụ ịnọdụ ala n’okpuru osisi fig ha ma nwee ntụrụndụ. Ọzọkwa, osisi fig na-amịrị onye nwe ya ọtụtụ mkpụrụ na-edozi ahụ́. Ya mere, malite n’oge Eze Solomọn, mmadụ ịnọdụ ala n’okpuru osisi fig ya na-anọchi anya udo, ọganihu na inwe ihe n’ụba.—1 Ndị Eze 4:24, 25.
Ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ, onye amụma ahụ bụ́ Mozis kọwara Ala Nkwa ahụ dị ka ‘ala nke osisi fig.’ (Deuterọnọmi 8:8) Ndị nledo 12 nyere ihe àmà na-egosi na ala ahụ na-eme ihe nke ọma site n’iwelata mkpụrụ osisi fig na mkpụrụ osisi ndị ọzọ n’ọmụma ụlọikwuu ndị Izrel. (Ọnụ Ọgụgụ 13:21-23) Na narị afọ nke 19, otu onye mere nleta n’ala ndị a kpọtụrụ aha na Bible kọrọ na osisi fig so n’osisi ndị kasị dị ọtụtụ n’ebe ahụ. Ka a sịkwa ihe mere Akwụkwọ Nsọ ji akpọtụkarị mkpụrụ fig na osisi fig aha!
Osisi Na-amị Ugboro Abụọ n’Afọ
Osisi fig na-eme nke ọma n’ọtụtụ ala, mkpọrọgwụ ya nke na-agbasapụ agbasapụ na-enyere ya aka ịghara ịkpọnwụ n’oge ọkọchị nke na-anọ ogologo oge n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa. Osisi ahụ pụrụ nnọọ iche n’ihi na ọ na-amị mkpụrụ mbụ ya n’afọ na June ma na-amịkarịkwa mkpụrụ ya dị ka o kwesịrị site n’August gawa. (Aisaia 28:4) Ndị Izrel na-ara mkpụrụ mbụ ya ara mgbe ha ghọtara ya ọhụrụ. Ha na-amịkpọ mkpụrụ ya nke abụọ maka iji ya mee ihe n’afọ ahụ nile. A pụrụ iji fig a mịrị amị mee achịcha, a na-etinyekwa ya mkpụrụ almọnd mgbe ụfọdụ. Achịcha ndị a e ji fig mee na-adị mfe, na-edozi ahụ́ ma na-atọ ụtọ.
Nwanyị ahụ nwere uche bụ́ Abigail nyere Devid ogbe achịcha 200 e ji fig a mịrị amị mee, ihe ịrụ ụka adịghị ya na o chere na nke a ga-abụ ezigbo nri maka ndị na-agba ọsọ ndụ. (1 Samuel 25:18, 27) A na-ejikwa fig a mịrị amị eme ọgwụ. E ji fig a gwakọtara agwakọta techie etuto chọrọ igbu Eze Hezekaịa, ọ bụ ezie na mgbake ọ gbakere ka oge na-aga bụ n’ihi enyemaka Chineke. *—2 Ndị Eze 20:4-7.
N’oge ochie, e ji fig a mịrị amị kpọrọ oké ihe n’ógbè Mediterenian nile. Otu onye ọnụ na-eru n’okwu bụ́ Cato gosiri Kansụl Kasị Ukwuu nke Rom mkpụrụ osisi fig n’ụzọ mere ka ha kwenye ịlụ Agha Punic nke Atọ megide Carthage. Fig kachasị mma a mịrị amị nke e nwere na Rom si na Caria, nke Asia Minor. N’ihi ya, carica ghọrọ aha fig a mịrị amị n’asụsụ Latin. A ka na-emepụta fig a mịrị amị ndị bụ́ ịgba n’otu ógbè ahụ nke bụ́ Turkey ugbu a.
Ndị Izrel na-arụ ọrụ ugbo na-akụkarị osisi fig n’ubi vaịn, ma ha na-egbutu osisi ndị na-adịghị amị mkpụrụ. Ezigbo ala dị nnọọ ụkọ nke na e kwesịghị ịhapụ osisi ndị na-adịghị amị mkpụrụ na ya. N’ihe atụ Jizọs banyere osisi fig nke na-amịghị mkpụrụ, onye ọrụ ugbo ahụ gwara onye ọrụ ubi vaịn ahụ, sị: “Ọ bụ afọ atọ ugbu a m bịaworo na-achọgharị mkpụrụ n’osisi fig a, ma ọ dịghị nke m hụrụ. Gbutuo ya! Ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka ọ ga-eji mee ka ala a ghara ịba uru?” (Luk 13:6, 7) Ebe ọ bụ na n’oge Jizọs, a na-akwụ ụtụ isi maka osisi ọ bụla na-amị mkpụrụ, osisi ọ bụla na-adịghị amị mkpụrụ bụ ụsụ ahịa.
Fig bụ ihe dị oké mkpa n’ihe oriri nke ndị Izrel. N’ihi ya, ọ bụrụ na fig amịghị mkpụrụ nke ọma—ikekwe n’ihi amamikpe nke Jehova—nsogbu dị. (Hosea 2:12; Emọs 4:9) Habakuk onye amụma kwuru, sị: “A sị na osisi fig adịghị ama ifuru, na ọ dịghị ihe omume dị n’osisi [vaịn]; na ihe a rụpụtara n’osisi [oliv] ebelatawo, na ubi nile emeghị ihe oriri . . . ma mụ onwe m ga-aṅụrị ọṅụ n’ime Jehova, m ga-etegharị egwú ọṅụ n’ime Chineke nke nzọpụta m.”—Habakuk 3:17, 18.
Ihe Atụ nke Mba Na-enweghị Okwukwe
Mgbe ụfọdụ, Akwụkwọ Nsọ na-eji mkpụrụ fig ma ọ bụ osisi fig eme ihe atụ. Dị ka ihe atụ, Jeremaịa ji ndị Juda ahụ kwesịrị ntụkwasị obi e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ tụnyere nkata fig dị mma, bụ́ fig nke buru ụzọ chaa a na-atakarị ata mgbe a ghọtara ya ọhụrụ. Otú ọ dị, e ji ndị ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi tụnyere fig ọjọọ, nke a na-agaghị ata ata kama a ga-atụfu ha atụfu.—Jeremaịa 24:2, 5,8, 10.
N’ihe atụ ya banyere osisi fig nke na-amịghị mkpụrụ, Jizọs gosiri ndidi Chineke nwere n’ebe mba ndị Juu dị. Dị ka e kwuru na mbụ, o kwuru okwu banyere otu nwoke nke nwere osisi fig n’ubi vaịn ya. Osisi ahụ anọwo n’amịghị mkpụrụ Luk 13:8, 9.
ruo afọ atọ, onye nwe ya chọkwara igbutu ya. Ma onye ọrụ ubi vaịn ahụ kwuru, sị: “Nna m ukwu, hapụkwuo ya afọ a, ruo mgbe m ga-egwu ala gburugburu ya ma tinye nsị anụ; ọ bụrụkwa na o mechaa mịa mkpụrụ n’ọdịnihu, nke ahụ amaka; ma ọ bụrụ na ọ mịghị, ị ga-egbutu ya.”—Mgbe Jizọs mere ihe atụ a, ọ nọworịị na-eme nkwusa ruo afọ atọ, na-agbalị ime ka ndị Juu gosipụta okwukwe. Jizọs rụsikwuru ọrụ ike, “na-etinye nri ala” n’osisi ihe atụ ahụ—mba ndị Juu—ma na-enye ya ohere ịmị mkpụrụ. Otú ọ dị, n’izu bu izu Jizọs nwụrụ ụzọ, ọ bịara doo nnọọ anya na mba ahụ n’ozuzu ya ajụwo Mezaịa ahụ.—Matiu 23:37, 38.
Ọzọkwa, Jizọs ji osisi fig mee ihe atụ nke ajọ ọnọdụ ime mmụọ nke mba ahụ. Ụbọchị anọ tupu ọnwụ ya, ka o si Betani na-aga Jeruselem, ọ hụrụ otu osisi fig nke akwụkwọ juru na ya ma o nweghị mkpụrụ ọ bụla ọ mịrị. Ebe ọ bụ na mkpụrụ fig mbụ na akwụkwọ ya na-apụta otu mgbe—mgbe ụfọdụ ọbụna na-amị mkpụrụ tupu akwụkwọ ya apụta—osisi ahụ ịbụ nke na-amịghị mkpụrụ gosiri na ọ baghị uru ọ bụla.—Mak 11:13, 14. *
Dị ka osisi fig ahụ na-amịghị mkpụrụ nke ahụ́ dị mma, ndị Juu nwere ọdịdị elu ahụ́ nke na-eduhie eduhie. Ma ọ mịghị mkpụrụ nke na-amasị Chineke, o mesịkwara jụ Ọkpara Jehova. Jizọs bụrụ osisi fig ahụ na-amịghị mkpụrụ ọnụ, n’echi ya kwa, ndị na-eso ụzọ ya hụrụ na osisi ahụ akpọnwụworị. Osisi ahụ kpọnwụrụ akpọnwụ na-egosi ọjụjụ Chineke gaje ịjụ ndị Juu dị ka ndị ya ọ họpụtara.—Mak 11:20, 21.
‘Mụta Ihe Site n’Osisi Fig’
Jizọs jikwa osisi fig kụzie ihe dị mkpa banyere ọnụnọ ya. O kwuru, sị: “Sitenụ n’osisi fig, dị ka ihe atụ, mụta isi ihe a: Ozugbo alaka ọhụrụ ya dịwara nro, o wee pupụtawa akwụkwọ, unu na-amara na oge okpomọkụ dị nso. N’otu aka ahụkwa, mgbe unu na-ahụ ihe ndị a nile, maranụ na ọ nọ nso n’ọnụ ụzọ.” (Matiu 24:32, 33) Akwụkwọ ya nke na-acha nnọọ akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ bụ ihe àmà doro anya nke oge okpomọkụ. N’otu aka ahụ, oké amụma Jizọs nke e dekọrọ na Matiu isi 24, Mak isi 13, na Luk isi 21 na-enye ihe àmà doro nnọọ anya nke ọnụnọ ya ugbu a n’ike Alaeze eluigwe.—Luk 21:29-31.
N’ezie, ebe ọ bụ na anyị na-ebi n’oge pụrụ iche otú ahụ n’akụkọ ihe mere eme, anyị kwesịrị ịmụta ihe site n’osisi fig. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ ma mụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ, anyị nwere olileanya nke ịhụ mmezu nke nkwa ahụ dị ebube, bụ́: “Ma ha ga-ebi, onye ọ bụla n’okpuru osisi [vaịn] ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji: n’ihi na ọnụ nke Jehova nke usuu nile nke ndị agha ekwuwo okwu.”—Maịka 4:4.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 8 H. B. Tristram, bụ́ ọkà mmụta ihe ndị si n’okike nke letara ala ndị a kpọtụrụ aha na Bible n’etiti narị afọ nke 19, kwuru na ndị ebe ahụ ka na-eji fig a gwakọtara agwakọta agwọ etuto.
^ par. 16 Ihe a mere n’ebe dị nso n’obodo Betfeji. Aha ya pụtara “Ebe Mkpụrụ Fig Na-ebu Ụzọ Amị.” Nke a pụrụ igosi na a ma ógbè ahụ ama dị ka ebe mkpụrụ fig na-ebu ụzọ amị.