Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Tatian—Onye Kwadoro Okwukwe Ka Ọ̀ Bụ Onye Jụrụ Okwukwe?

Tatian—Onye Kwadoro Okwukwe Ka Ọ̀ Bụ Onye Jụrụ Okwukwe?

Tatian—Onye Kwadoro Okwukwe Ka Ọ̀ Bụ Onye Jụrụ Okwukwe?

KA Ọ na-erule n’ọgwụgwụ nke njem ozi ala ọzọ nke atọ ya, Pọl onyeozi kpọrọ ndị okenye ọgbakọ Efesọs nzukọ. Ọ gwara ha, sị: “Amaara m na mgbe m pụsịrị, nkịta ọhịa ndị obi tara mmiri ga-abata n’etiti unu, ha agaghịkwa emeso ìgwè atụrụ ahụ ihe n’ụzọ dị nro, ndị ikom ga-esitekwa n’etiti unu onwe unu bilie ma na-ekwu ihe ndị gbagọrọ agbagọ iji dọrọ ndị ahụ na-eso ụzọ iso ha n’azụ.”—Ọrụ 20:29, 30.

N’ụzọ kwekọrọ n’okwu Pọl, narị afọ nke abụọ O.A. bịara bụrụ oge nke ma mgbanwe ma ndapụ n’ezi ofufe ahụ e buru n’amụma. Okpukpe Gnostic, bụ́ okpukpe nkà ihe ọmụma zuru ebe nile bụ́ nke mere ka ụfọdụ ndị kwere ekwe ghọzie ndị na-ekweghị ekwe, nọ na-aga n’ihu. Ndị Gnostic kweere na ihe ime mmụọ dị mma nakwa na ihe ọ bụla a na-ahụ anya bụ ihe ọjọọ. N’ime ka e kwere na anụ ahụ́ nile dị njọ, ha jụrụ alụmdi na nwunye na ịmụ nwa, na-ekwu na ha sitere n’aka Setan. Ụfọdụ n’ime ha kweere na ebe ọ bụ nanị ihe ime mmụọ dị mma, ihe mmadụ ji ahụ́ nkịtị ya eme adịghị ihe o mere. Echiche ndị dị otú ahụ dugara ha n’ibi ndụ nke imebiga ihe ókè, ma ọ́ bụghị na ha napụrụ onwe ha ihe ụtọ nile ọ bụrụ na ha nọ na-achọbiga ihe ụtọ nke anụ ahụ́ ókè. Nzọrọ ndị Gnostic na-azọrọ na nzọpụta na-abịa nanị site n’okpukpe Gnostic dị omimi, ma ọ bụ ihe ọmụma onwe onye, enyeghị ohere ọ bụla maka eziokwu nke Okwu Chineke.

Olee otú ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst si meghachi omume n’ihe ize ndụ nke okpukpe Gnostic? Ụfọdụ ndị gụrụ akwụkwọ katọrọ nkwenkwe ya ndị na-ezighị ezi, ebe ndị ọzọ nakweere ya. Dị ka ihe atụ, Irenaeus gbara mgba ná ndụ ya nile megide ozizi nke ndị jụrụ okwukwe. Ọ bụ Polycarp, bụ́ nwoke nke biri ndụ n’oge ndịozi, kụziiri ya ihe. Polycarp kụziiri ya ịgbasosi ozizi Jizọs Kraịst na nke ndịozi ya ike. Otú ọ dị, n’agbanyeghị na ọ bụ otu onye kụziiri Irenaeus na enyi ya bụ́ Florinus ihe, enyi ya ahụ mesịrị kwere n’ozizi Valentinus, bụ́ onye ndú a kasị mara amara n’okpukpe Gnostic. Oge ahụ bụ oge dị oké egwu n’ezie.

Akwụkwọ ndị Tatian, bụ́ onye edemede a ma ama na narị afọ nke abụọ, dere mere ka a ghọtakwuo ọnọdụ ndị e nwere n’oge ahụ. Olee ụdị mmadụ Tatian bụ? Olee otú o si soro ná ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst? Oleekwa otú ihe si gaara Tatian ka ikuku ịjụ okwukwe nke ndị Gnostic nọ na-ekusa ya? Azịza ndị na-akpali mmasị o nyere na ihe nlereanya o setịpụrụ na-enye ndị na-achọ eziokwu taa ihe mmụta ndị bara uru.

Ịgụ “Ụdị Ihe Odide Ndị M Na-ahụtụbeghị”

Tatian bụ onye Siria. Ọtụtụ njem ndị o mere na ọtụtụ akwụkwọ ndị ọ gụrụ mere ka ọ mara banyere ọdịbendị ndị Gris na Rom nke oge ya. Tatian bịara Rom dị ka ọkà n’ikwu okwu nke na-ejegharị ejegharị. Otú ọ dị, ka ọ nọ na Rom, ọ bịara nwee mmasị n’Iso Ụzọ Kraịst. Ọ malitere iso Justin Martyr na-akpakọrịta, ikekwe ghọọ nwa akwụkwọ ya.

N’otu ihe odide na-ekpughe ihe nke o dere banyere ntọghata a tọghatara ya gaa n’Iso Ụzọ Kraịst elu ọnụ, Tatian na-ekwu, sị: “Achọrọ m otú m pụrụ isi nwee ike ịchọta eziokwu ahụ.” N’ikwu banyere ahụmahụ ya onwe ya nwere mgbe ọ gụrụ Akwụkwọ Nsọ, ọ na-ekwu, sị: “Agụrụ m ụdị ihe odide ndị m na-ahụtụbeghị, ndị dị nnọọ ochie nke na a pụghị iji ha tụnyere echiche ndị Gris, dịkwa nnọọ nsọ nke na a pụghị iji ha tụnyere ụzọ ha na-ehie n’ihe odide ha; okwu ndị dị mfe e ji dee ha, ezi obi nke ndị dere ha, ngosi e gosiri ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu tupu ha emee, otú echiche ndị dị na ha si magbuo onwe ha, na otú ha si kọwaa ọchịchị nke ga-achị eluigwe na ala dị ka nke hiwere isi n’ebe otu Onye nọ, mekwara ka m kwere na ha.”

Tatian alaghị azụ n’ịgwa ndị ya na ha dịkọrọ ndụ ka ha nyochaa Iso Ụzọ Kraịst nke oge ya, ka ha hụkwa otú o si dị mfe ma doo anya ma e jiri ya tụnyere ọchịchịrị ndị ọgọ mmụọ nọ na ya. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe ndị o dere?

Gịnị Ka Ihe Odide Ya Na-ekpughe?

Ihe odide Tatian na-egosi na ọ bụ onye kwadoro okwukwe, onye edemede nke gbachiteere ihe o kweere. O lere nkà ihe ọmụma nke ndị na-ekpere arụsị anya ọjọọ ma kpọọ ya asị. N’akwụkwọ ya bụ́ Address to the Greeks, Tatian mesiri ya ike otú ikpere arụsị si bụrụ ihe na-abaghị uru na otú Iso Ụzọ Kraịst elu ọnụ si bụrụ ihe ezi uche dị na ya. O ji okwu ndị dị ike mee ihe ka ọ na-akatọ ụzọ ndị Gris si eme ihe. Dị ka ihe atụ, banyere ọkà ihe ọmụma bụ́ Heracleitus, o kwuru sị: “Ọnwụ nwoke a gosiri nnọọ otú o si daa iberibe; n’ihi na, ka ọ dara ọrịa ahụ́ mmiri, ebe ọ bụ na ọ mụwo nkà ọgwụ na nkà ihe ọmụma, o tere nsị́ ehi n’ahụ́ ya nile, bụ́ nke, ka ọ kpọrọ nkụ, dọkọtara anụ ahụ́ ya ọnụ, nke mere na anụ ahụ́ ya dọkasịrị, o wee nwụọ.”

Tatian kwenyesiri nnọọ ike n’otu Chineke, bụ́ Onye Okike nke ihe nile. (Ndị Hibru 3:4) N’akwụkwọ bụ́ Address to the Greeks, ọ kpọrọ Chineke “Mmụọ” ma kwuo, sị: “Nanị ya bụ onye na-enweghị mmalite, Ya Onwe Ya bụkwa mmalite nke ihe nile.” (Jọn 4:24; 1 Timoti 1:17) N’ịjụ ojiji e ji ihe oyiyi eme ihe n’ofufe, Tatian na-ede, sị: “Olee otú m ga-esi kwuo na osisi na nkume bụ chi?” (1 Ndị Kọrint 10:14) O kweere na Okwu ahụ, ma ọ bụ Logos ahụ, dịịrị dị ka ihe mbụ Nna nke eluigwe rụpụtara, mgbe e mesịkwara, na e ji ya mee ihe n’ike eluigwe na ala ndị a na-ahụ anya. (Jọn 1:1-3; Ndị Kọlọsi 1:13-17) Banyere mbilite n’ọnwụ n’oge a kara aka, Tatian na-ekwu, sị: “Anyị kweere na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ nke ahụ́ mgbe ihe nile bịasịrị ná njedebe.” Banyere ihe mere anyị ji na-anwụ anwụ, Tatian na-ede, sị: “E keghị anyị ịnwụ anwụ, kama anyị na-anwụ n’ihi ihe anyị metere. Nnwere onwe ime nhọrọ anyị alawo anyị n’iyi; anyị bụ́ ndị nwebuuru onwe ha aghọziela ndị ohu; e rewo anyị n’ihi mmehie.”

Otú Tatian si kọwaa mkpụrụ obi dị mgbagwoju anya. Ọ na-ekwu, sị: “Ndị Gris, mkpụrụ obi n’onwe ya abụghị ihe na-adịghị anwụ anwụ, kama ihe na-anwụ anwụ. Ma, o kwere omume na ọ gaghị anwụ. Ọ bụrụ n’ezie na ọ maghị eziokwu ahụ, ọ na-anwụ, ọ na-esokwa ahụ́ ree, ma na-eso ahụ́ ebili ọzọ n’ikpeazụ n’ọgwụgwụ nke ụwa, na-anwụ site n’inweta ntaramahụhụ ebighị ebi.” Kpọmkwem ihe Tatian bu n’uche kwuo okwu a edoghị anya. Ọ̀ pụrụ ịbụ na ka ọ nọ na-agbaso ụfọdụ ozizi Bible, ọ nwakwara ime ka obi dị ndị ya na ha dịkọrọ ndụ ụtọ, n’ihi ya kwa, gwakọta eziokwu Akwụkwọ Nsọ na nkà ihe ọmụma nke ndị na-ekpere arụsị?

Akwụkwọ ọzọ a ma ama Tatian dere bụ Diatessaron, ma ọ bụ Harmony of the Four Gospels. Tatian bụ onye mbụ nyere ọgbakọ ndị dị na Siria Oziọma ndị ahụ n’asụsụ ha. Akwụkwọ a bụ nke e ji nnọọ kpọrọ ihe, nke jikọtara Oziọma anọ ndị ahụ ịbụ otu akụkọ. Chọọchị Siria ji ya mee ihe.

Ọ̀ Bụ Onye Kraịst Ka Ọ̀ Bụ Onye Jụrụ Okwukwe?

Iji nlezianya tụlee ihe odide Tatian na-ekpughe na ọ maara Akwụkwọ Nsọ nke ọma ma kwanyere ya ùgwù nke ukwuu. Ọ na-ede banyere mmetụta o nwere n’ahụ́ ya, sị: “Enweghị m oké ọchịchọ ịba ọgaranya; ajụrụ m ịbụ ọchịagha; akpọrọ m ịkwa iko asị; oké ọchịchọ ịba ọgaranya emeghị ka m kwenye ịbụ ọkwọ ụgbọ mmiri; . . . Ịbụ onye a ma ama adịghị agba m ara . . . Otu anyanwụ na-awara onye ọ bụla, otu ọnwụ ka onye ọ bụla na-anwụkwa, ma hà nwere ihe ụtọ ná ndụ ma hà nọ n’ụkọ.” Tatian na-adụ ọdụ, sị: “Bụrụ onye nwụrụ anwụ n’ebe ụwa dị, na-ajụ ịwị ara nke dị n’ime ya. Dịịrị Chineke ndụ, sitekwa n’ịghọta Ya, yipụ ụdị mmadụ ochie gị.”—Matiu 5:45; 1 Ndị Kọrint 6:18; 1 Timoti 6:10.

Otú ọ dị, tụlee akwụkwọ Tatian dere nke aha ya bụ On Perfection According to the Doctrine of the Savior. N’akwụkwọ a, ọ sịrị na alụmdi na nwunye si n’aka Ekwensu. N’ịzọrọ na ndị mmadụ ga na-ekekọta anụ ahụ́ ha n’ebe ụwa a na-ala n’iyi dị site n’ịlụ di na nwunye, Tatian katọsiri ya ike.

O yiri ka n’ihe dị ka 166 O.A., mgbe Justin Martyr nwụsịrị, ma ọ́ bụghị na Tatian guzobere otu ịrọ òtù na-anapụ onwe ha ihe ụtọ nke a na-akpọ ndị Encratite, ọ bụrụ na o sonyeere ha. Ndị nọ na ya kwadosiri mmadụ ijide onwe ya na ịchịkwa ahụ́ ya, ike. Ụdị ihe ụtọ ha na-anapụ onwe ha bụ ịṅụ mmanya, ịlụ di ma ọ bụ nwunye, na inwe ihe onwunwe.

Ihe A Ga-amụta na Ya

N’ihi gịnị ka Tatian ji kpafunyụọ anya site n’Akwụkwọ Nsọ? Ọ ghọrọ “onye na-echefu ihe ọ nụrụ.” (Jems 1:23-25) Tatian ọ̀ hapụrụ ịjụ akụkọ ụgha ma si otú ahụ daba n’ọnyà nke nkà ihe ọmụma mmadụ? (Ndị Kọlọsi 2:8; 1 Timoti 4:7) Ebe ọ bụ na ihe ndị o jehiere na ha dị nnọọ ọtụtụ, ihe kpatara ya ọ̀ pụrụ ịbụ na uche ya kpasasịtụrụ?

Ihe ọ sọrọ ya bụrụ ya kpatara ya, ihe odide na ihe nlereanya Tatian na-eme ka a ghọta ọnọdụ okpukpe e nwere n’oge ya. Ha na-egosi otú mmetụta nke nkà ihe ọmụma ụwa pụrụ ibibiru ihe. Ka anyị buru n’uche ịdọ aka ná ntị Pọl onyeozi ka a gbakụta “okwu nzuzu ndị na-emerụ ihe dị nsọ azụ nakwa ihe ndị ahụ na-emegiderịta onwe ha nke a na-akpọ ‘ihe ọmụma’ n’ụzọ ụgha.”—1 Timoti 6:20.