Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Tupu Ya Amalite na Mgbe Ọ Malitesịrị—Ndụ Ọjọọ n’Oge Gara Aga, Ọdịnihu Dị Mma

Tupu Ya Amalite na Mgbe Ọ Malitesịrị—Ndụ Ọjọọ n’Oge Gara Aga, Ọdịnihu Dị Mma

“Bịaruonụ Chineke Nso, Ọ Ga-abịarukwa Unu Nso”

Tupu Ya Amalite na Mgbe Ọ Malitesịrị—Ndụ Ọjọọ n’Oge Gara Aga, Ọdịnihu Dị Mma

“OKWU Chineke dị ndụ ma na-akpa ike, dịkwa nkọ karịa mma agha ihu abụọ ọ bụla, . . . o nwekwara ike ịchọpụta echiche na ebumnuche nke obi.” (Ndị Hibru 4:12) Ihe a ka Pọl onyeozi kwuru banyere ike ozi sitere n’aka Chineke na-akpa. Ikike o nwere iru n’obi ndị mmadụ pụtara ìhè karịsịa na narị afọ mbụ O.A. N’agbanyeghị mmetụta ọjọọ ndị e nwere n’oge ahụ, ndị ghọrọ Ndị Kraịst yikwasịrị ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ.—Ndị Rom 1:28, 29; Ndị Kọlọsi 3:8-10.

Ike okwu Chineke nwere ịgbanwe mmadụ, dị ka e dekọrọ na Bible, na-apụtakwa ìhè otú ahụ taa. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe banyere otu nwoke toro ogologo ma dị ike aha ya bụ Richard. N’ịbụ onye iwe ọkụ, Richard na-alụ ọgụ ma a kpasutụhaala ya iwe. E ji ime ihe ike mara ya. Ọbụna Richard banyere n’otu òtù ndị na-akụ ọkpọ. Ọ mụsiri ya ike ma mụta ya nke ọma, ma nwee mmeri n’òtù ndị ọkpọ kasị gbaa dimkpa na Westphalia, Germany. Richard na-aṅụbigakwa mmanya ókè ma na-alụ ọgụ ìgwè. N’otu n’ime ọgụ ndị dị otú ahụ, e gburu otu onye, ọ fọkwara nke nta ka a tụọ Richard mkpọrọ.

Gịnị banyere alụmdi na nwunye Richard? “Tupu mụ na Heike amalite ịmụ Bible,” ka Richard na-echeta, “onye ọ bụla n’ime anyị na-agara onwe ya. Heike na-eji oge dị ukwuu anọnyere ndị enyi ya nwanyị, ebe m na-eji oge dị ukwuu enwe ntụrụndụ—karịsịa ịkụ ọkpọ, ịgba n’elu ebili mmiri, na igwu mmiri.”

Mgbe Richard na Heike malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible, echiche nke ime mgbanwe ndị yiri ihe na-apụghị ikwe omume iji mee ka ndụ ya kwekọọ n’ụkpụrụ ndị dị elu e setịpụrụ n’Okwu Chineke riri Richard ọnụ. Otú ọ dị, ka ọ bịara matakwuo Jehova Chineke, Richard zụlitere ọchịchọ siri ike ime ihe na-atọ ya ụtọ. Richard chọpụtara na Chineke adịghị anakwere ndị hụrụ ihe ike n’anya ma ọ bụ ndị ji ya emere ihe ntụrụndụ. Richard mụtara na “onye na-ahụ ihe ike n’anya ka mkpụrụ obi [Jehova] na-akpọ asị.”—Abụ Ọma 11:5.

Ọzọkwa, olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ime paradaịs n’elu ala masịrị ma Richard ma Heike. Ha abụọ chọrọ ịnọ ebe ahụ! (Aịsaịa 65:21-23) Òkù bụ́ “bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso” metụrụ Richard n’ahụ́. (Jems 4:8) Ọ hụrụ uru ịṅa ntị na ndụmọdụ a sitere n’ike mmụọ nsọ bara: “Ekwosola onye na-eme ihe ike ekworo, ahọpụtakwala otu efu n’ụzọ ya nile. N’ihi na ihe arụ n’anya Jehova ka onye sihiere esihie bụ: ma n’aka ndị ziri ezi ka izu nzuzo Ya dị.”—Ilu 3:31, 32.

N’agbanyeghị na Richard chọsiri ike ịgbanwe ụzọ ya, ọ ghọtara na ya apụghị ime otú ahụ n’ike aka ya. Ọ bịara hụ mkpa ọ dị ịchọ enyemaka Chineke n’ekpere. N’ihi ya, o mere ihe kwekọrọ n’ihe Jizọs gwara ndịozi Ya, sị: “Na-ekpe ekpere mgbe nile, ka unu wee ghara ịbanye n’ọnwụnwa. N’ezie, mmụọ na-anụ ọkụ, ma anụ ahụ́ adịghị ike.”—Matiu 26:41.

Mgbe Richard matasịrị otú Chineke si ele ime ihe ike na iwe ọkụ anya, ọ bịara doo ya anya na ịkụ ọkpọ bụ egwuregwu na-adịghị mma. Site n’enyemaka Jehova na agbamume ndị duziere ya ọmụmụ Bible nyere ya, Richard kwụsịrị ime ihe ike. Ọ kwụsịrị ịkụ ọkpọ na ịlụ ọgụ ìgwè ma kpebie ime ka ndụ ezinụlọ ya ka mma. “Ịmụta eziokwu sitere na Bible enyeworo m aka ịkwụsị ma chee echiche tupu m mewe ihe ọ bụla,” ka Richard, onye bụ́zi onye nlekọta dị nwayọọ n’obi n’otu n’ime ọgbakọ Ndịàmà Jehova, na-ekwu. Ọ na-agbakwụnye, sị: “Ụkpụrụ nke ịhụnanya na nkwanye ùgwù na-eduzi m ugbu a ná mmekọrịta mụ na nwunye m na ụmụ m. N’ihi ya, ezinụlọ anyị dịzi n’otu.”

Ndị na-amaghị nke bụ́ eziokwu ebowo Ndịàmà Jehova ebubo mgbe ụfọdụ na ha na-etisasị ezinụlọ. Otú ọ dị, ihe atụ nke mmadụ ndị dị ka Richard na-egosi na ebubo ha bụ ụgha. Nke bụ́ eziokwu bụ na eziokwu Bible pụrụ ime ka ezinụlọ kwụsie ike, meekwa ka ndị biri ndụ ọjọọ n’oge gara aga nwee ọdịnihu dị mma.—Jeremaịa 29:11.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]

“Olileanya nke ibi na paradaịs elu ala kpaliri m ime mgbanwe”

[Igbe dị na peeji nke 9]

Ụkpụrụ Bible Ndị Nọ n’Ọrụ

Bible pụrụ ịkpa ike ná ndụ ndị mmadụ. Lee ụfọdụ ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị nyewooro ndị na-eme ihe ike aka ịgbanwe:

“Ọ dị mma, bụ́ onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, karịa dike: ọ dịkwa mma, bụ́ onye na-achị mmụọ ya, karịa onye na-ewere obodo n’agha.” (Ilu 16:32) Iwe a na-achịkwaghị achịkwa na-egosi adịghị ike, ọ bụghị ịdị ike.

“Ezi uche mmadụ na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ.” (Ilu 19:11) Mmadụ inwe ezi uche na nghọta banyere ọnọdụ e nwere na-enyere ya aka ile anya gabiga ihe ndị yiri ihe ndị mere a ga-eji see okwu, ọ pụkwara ime ka iwe ya ghara ịdị ọkụ.

‘Gị na onye iwe ọkụ abụla enyi ka i wee ghara ịmụta ụzọ ya nile.’ (Ilu 22:24, 25) Ndị Kraịst na-eji amamihe ezere iso ndị na-ewekarị iwe akpakọrịta.