Ịmata Isi Ihe Na-akpata Inwe Afọ Ojuju
Ịmata Isi Ihe Na-akpata Inwe Afọ Ojuju
N’akwụkwọ ozi na-agba ume nke Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst nọ na Filipaị, o dere sị: “Amụtawo m, n’ọnọdụ ọ bụla m nọ na ya, inwe afọ ojuju. . . . N’ihe ọ bụla nakwa n’ọnọdụ nile amụtawo m ma ụzọ isi nọrọ n’ùjú ma ụzọ isi nọrọ n’agụụ, ma ụzọ isi nwee ihe n’ụba ma ụzọ isi nọrọ n’ụkọ.”—Ndị Filipaị 4:11, 12.
Gịnị bụ isi ihe mere Pọl ji nwee afọ ojuju? N’ihi ịdị oké ọnụ nke ihe ndị e ji ebi ndụ nakwa n’ihi ejighị ọnọdụ akụ̀ na ụba nke oge anyị n’aka, ọ ga-aba uru n’ezie ka ezi Ndị Kraịst mata ụzọ isi na-enwe afọ ojuju ka ha wee nwee ike ilekwasị anya n’ozi ha na-ejere Chineke.
N’IHE o bu ụzọ dee n’akwụkwọ ozi ahụ, Pọl kọwara ihe ịga nke ọma ndị o nweburu. O kwuru, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla ọzọ echee na ya nwere ihe ndabere maka inwe obi ike n’anụ ahụ́, m nwere karị: onye e biri úgwù n’ụbọchị nke asatọ, site n’eriri ezinụlọ Izrel, onye sitere n’ebo Benjamin, onye Hibru nke ndị Hibru mụrụ; n’ihe banyere iwu, onye Farisii; n’ihe banyere ịnụ ọkụ n’obi, na-akpagbu ọgbakọ; n’ihe banyere ezi omume nke sitere n’iwu, onye gosipụtara na ya bụ onye na-enweghị ụta.” (Ndị Filipaị 3:4-6) Tụkwasị na nke ahụ, dị ka onye Juu na-anụ ọkụ n’obi, ndị isi nchụàjà nọ na Jeruselem nyere Pọl ọrụ ma nye ya nkwado. Ihe a nile ga-eme ka o nwee ikike na ùgwù—n’ihe banyere ọchịchị, okpukpe, nakwa akụ̀ na ụba—n’usoro ihe ndị Juu.—Ọrụ 26:10, 12.
Otú ọ dị, mgbe Pọl ghọrọ Onye Kraịst ji ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi, ihe gbanwere n’ụzọ dị ịrịba ama. N’ihi ozi ọma ahụ, o ji ọchịchọ obi ya hapụ ọrụ ya na-aga nke ọma na ihe nile e leburu anya dị ka ihe ndị dị mkpa. (Ndị Filipaị 3:7, 8) Oleezi otú ọ ga-esi na-elekọta onwe ya? À ga na-akwụ ya ụgwọ dị ka onyeozi? Olee otú ọ ga-esi na-egbo mkpa ya?
Pọl jere ozi ya n’abụghị onye a kwụrụ ụgwọ. Iji ghara ịghọrọ ndị ọ na-ejere ozi ibu arọ, o sonyeere Akwila na Prisila n’ịkpa ákwà ụlọikwuu mgbe ọ nọ na Kọrint, o mekwara ihe ndị ọzọ iji gboo mkpa ya. (Ọrụ 18:1-3; 1 Ndị Tesalonaịka 2:9; 2 Ndị Tesalonaịka 3:8-10) Pọl mere njem ozi ala ọzọ atọ gaa ọtụtụ ebe, ọ gakwara n’ọgbakọ ndị chọrọ ka e leta ha. Ebe ọ bụ na o ji nnọọ ọrụ n’aka n’ozi Chineke, o nwere ihe onwunwe dị nta. Dị ka ọ na-adịkarị, ụmụnna gboro mkpa ya. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, n’ihi ọnọdụ ndị dị njọ, ọ nọrọ ná mkpa. (2 Ndị Kọrint 11:27; Ndị Filipaị 4:15-18) N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dịghị mgbe Pọl mere mkpesa banyere ọnọdụ ya, o nweghịkwa anyaukwu n’ihe ndị ọzọ nwere. O ji ọchịchọ obi ya na obi ụtọ rụsie ọrụ ike maka abamuru nke Ndị Kraịst ibe ya. N’ezie, ọ bụ Pọl hotara okwu ahụ a maara nke ọma nke Jizọs kwuru, sị: “A na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.” Lee ihe nlereanya dị ịrịba ama nke ahụ bụụrụ anyị nile!—Ọrụ 20:33-35.
Ihe Inwe Afọ Ojuju Pụtara
Otu ihe bụ́ isi mere Pọl ji nwee obi ụtọ bụ n’ihi na o nwere afọ ojuju. Otú ọ dị, gịnị ka inwe afọ ojuju pụtara? N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, ọ pụtara mmadụ ịbụ onye ihe ndị bụ́ isi o nwere juru afọ. Banyere nke a, Pọl gwara Timoti, bụ́ onye ya na ya jekọrọ ozi, sị: “N’ezie, ọ bụ ụzọ isi rite uru dị ukwuu, bụ́ nsọpụrụ Chineke a ya na inwe afọ ojuju. N’ihi na ọ dịghị ihe anyị webataworo n’ime ụwa, ọ dịghịkwa ihe anyị pụrụ iburu pụọ na ya. Ya mere, ebe anyị nwere ihe oriri na ihe mgbokwasị, anyị ga-enwe afọ ojuju n’ihe ndị a.”—1 Timoti 6:6-8.
Rịba ama na Pọl jikọtara inwe afọ ojuju na nsọpụrụ Chineke. Ọ ghọtara na ezi obi ụtọ na-abịa site n’ịsọpụrụ Chineke, ya bụ, site n’itinye ozi Chineke n’ọnọdụ mbụ, ọ bụghị site n’inwe ihe onwunwe ma ọ bụ ịba ọgaranya. “Ihe oriri na ihe mgbokwasị” bụ nanị ihe ndị ga-enyere ya aka ịnọgide na-achụso nsọpụrụ Chineke. Ya mere nye Pọl, isi ihe na-akpata inwe afọ ojuju bụ ịdabere n’ebe Jehova nọ, n’agbanyeghị ọnọdụ ndị pụrụ ịdapụta.
Ọtụtụ ndị taa na-enwe oké nchegbu na obi ilu n’ihi na ha amaghị isi ihe ahụ na-eme ka e nwee afọ ojuju ma ọ bụ n’ihi na ha na-eleghara ya anya. Kama ịmụta inwe afọ ojuju, ha na-ahọrọ ịtụkwasị obi n’ego na n’ihe ego pụrụ ịzụta. Ụlọ ọrụ na-akpọsa ngwá ahịa na-eme ka ndị mmadụ na-eche na ha apụghị inwe obi ụtọ ọ gwụla ma ha nwere ngwá ahịa 1 Timoti 6:9, 10.
na ngwá ụlọ ndị kasị bụrụ ọgbara ọhụrụ na ndị kasị mma—ma nweta ha ozugbo. N’ihi ya, ọtụtụ ndị na-etinye isi n’ịchụso ego na ihe onwunwe. Kama inweta obi ụtọ na afọ ojuju, ha “na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ ọchịchọ amaghị ihe nke na-emerụkwa ahụ́, bụ́ ndị na-akwakpu mmadụ ná mbibi na ịla n’iyi.”—Ha Amatawo Isi Ihe Na-akpata Ya
N’oge anyị a, ò kwere omume n’ezie ibi ndụ nsọpụrụ Chineke na nke inwe afọ ojuju ma nweta obi ụtọ? Ee, o kwere omume. N’ezie, ọtụtụ nde mmadụ taa na-eme otú ahụ kpọmkwem. Ha amatawo isi ihe na-eme ka ha na-enwe obi ụtọ n’ihe ọ bụla ha nwere. Ha bụ Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị rarawooro onwe ha nye Chineke, na-eme uche ya ma na-akụziri ndị nọ n’ebe nile nzube ya.
Dị ka ihe atụ, tụlee ihe banyere ndị nyeworo onwe ha n’afọ ofufo ka a zụọ ha ma ziga ha dị ka ndị Matiu 24:14) Mgbe mgbe, ọnọdụ ibi ndụ e nwere n’ala ebe e zigara ha anaghị adị mma n’ụzọ ihe onwunwe dị ka ọ dị n’ebe ha si. Dị ka ihe atụ, mgbe ndị ozi ala ọzọ rutere n’otu mba dị n’Eshia ná mmalite afọ 1947, mba ahụ ka nwere nsogbu ndị agha kpatara, ọ bụkwa nanị ụlọ ole na ole nwere ọkụ eletrik. N’ọtụtụ ala, ndị ozi ala ọzọ chọpụtara na a na-asa ákwà otu otu n’elu bọọdụ e ji asa ihe ma ọ bụ n’elu okwute dị n’iyi kama iji ígwè eletrik e ji asa ákwà asa ya. Ma ihe ha bịara bụ ịkụziri ndị mmadụ eziokwu Bible, n’ihi ya, ha mere mgbanwe iji kwekọọ n’ọnọdụ ndị e nwere n’ebe e zigara ha ma na-arụsi ọrụ ike n’ozi ahụ.
ozi ala ọzọ n’ala ha na-amabughị, ịga kwusaa ozi ọma nke Alaeze Chineke. (Ndị ọzọ ewerewo ozi oge nile ma ọ bụ kwaga n’ebe ndị ozi ọma ahụ na-erubeghị. Adulfo ejewo ozi oge nile ruo ihe karịrị afọ 50 n’ọtụtụ ebe na Mexico. Ọ na-ekwu, sị: “Dị ka Pọl onyeozi, mụ na nwunye m amụtawo ime mgbanwe iji kwekọọ n’ọnọdụ ndị e nwere. Dị ka ihe atụ, otu n’ime ọgbakọ ndị anyị letara dị anya site n’obodo ukwu ma ọ bụ ahịa ọ bụla. N’oge nri ọ bụla, ụmụnna ndị bi n’ebe ahụ na-enwe afọ ojuju n’ịta nanị otu achịcha tortilla e tinyere abụba anụ na nnu ma ṅụọ otu iko kọfị. Nke ahụ bụ nanị ihe ha na-eri—achịcha tortilla atọ kwa ụbọchị. Ya mere, anyị mụtara ibi nnọọ ndụ ka ụmụnna ndị ahụ. Enwewo m ọtụtụ ahụmahụ yiri nke a n’ime afọ 54 m nọworo na-ejere Jehova ozi oge nile.”
Florentino chetara otú ya na ezinụlọ ya na-aghaghị isi mee mgbanwe iji kwekọọ n’ọnọdụ ndị siri ike. N’icheta mgbe ọ bụ nwata, ọ na-asị: “Papa m bụbu onye ahịa bara ọgaranya. O nwere ọtụtụ ala. Aka m na-echeta ebe anyị na-akpọsa ihe n’ụlọ ahịa ebe anyị na-ere ihe ndị e ji esi nri. E nwere otu drọwa nke dị ihe dị ka sentimita 50 n’obosara na sentimita 20 n’omimi, o nwekwara nkebi anọ. Ebe ahụ ka anyị na-edebe ego anyị na-ereta n’ụbọchị. Mgbe anyị mechiri ahịa, mkpụrụ ego na akwụkwọ ego na-ejupụta n’ime ya.
“Ma na mberede, anyị nwere nsogbu akụ̀ na ụba ma si n’ịba ọgaranya gaa n’ịda ogbenye. Ihe nile funahụrụ anyị ma e wezụga ụlọ anyị. E wezụga nke a, otu n’ime ụmụnne m nwere ihe ọghọm ma daa ngwụrọ. Ihe adịghịzi otú ọ dịbu. Ruo oge ụfọdụ, erere m mkpụrụ osisi na anụ. Ana m aghọ ogho, grepu, na-egbute ahịhịa alfalfa, ma soro na-agba mmiri n’ebe a kọrọ ha. Ụfọdụ ndị na-akpọ m nwoke ezu ike. Mama m na-akasikarị anyị obi site n’ikwu na anyị nwere eziokwu ahụ, akụ̀ ime mmụọ nke ọ bụ nanị mmadụ ole na ole nwere. Ya mere, amụtara m ịba ọgaranya nakwa inwe ihe dị nta ma ọ bụ ịbụ ogbenye ọnụ ntụ. Ugbu a m jewooro Jehova ozi oge nile ruo ihe dị ka afọ 25, apụrụ m ikwu na kwa ụbọchị, m na-enweta ọṅụ nke ịmara na m họọrọ ụzọ ndụ kasị mma—ijere Jehova ozi oge nile.”
Bible na-agwa anyị hoo haa na “ọnọdụ ụwa a na-agbanwe agbanwe.” N’ihi nke a, ọ gbakwara anyị ume, sị: “[Ka] ndị na-aṅụrị ọṅụ [dịrị] ka ndị na-adịghị aṅụrị, ndị na-azụ ihe dị ka ndị ọ na-adịghị ihe ha nwere, ndị jikwa ụwa eme ihe dị ka ndị na-adịghị eji ya eme ihe n’újú.”—1 Ndị Kọrint 7:29-31.
N’ihi ya, ugbu a bụ oge ileru ụzọ ndụ gị anya. Ọ bụrụ na i nwere ihe dị nta, nọrọ na nche megide iwe iwe, ọbụna na-enwe obi ilu na anya ụfụ. N’aka nke ọzọ, n’agbanyeghị ihe onwunwe ọ bụla i nwere, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya idebe ha n’ọnọdụ kwesịrị ha ná ndụ ka ha ghara ịdị na-achịkwa gị. Dị ka Pọl onyeozi dụrụ n’ọdụ, ihe ọ sọkwara ya mee, tụkwasị olileanya gị, “ọ bụghị n’akụ̀ na ụba ndị a na-ejighị n’aka, kama na Chineke, onye na-enye anyị ihe nile n’ụba ka anyị wee nwee ọṅụ.” Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, mgbe ahụ, gị onwe gị pụkwara ikwu na ị matawo isi ihe na-akpata inwe afọ ojuju.—1 Timoti 6:17-19.
[Foto dị na peeji nke 9]
Pọl ji aka ya rụọ ọrụ iji ghara ịbụrụ ndị ọzọ ibu arọ
[Foto ndị dị na peeji nke 10]
Ọtụtụ puku mmadụ na-achọta ọṅụ ná ndụ nke ‘nsọpụrụ Chineke na inwe afọ ojuju’