Ọṅụ Na-enweghị Atụ!
Akụkọ Ndụ
Ọṅụ Na-enweghị Atụ!
DỊ KA REGINALD WALLWORK SI KỌỌ
“Ọ dịghị ihe ọ bụla dị n’ụwa a nke a pụrụ iji tụnyere ọṅụ anyị nweworo n’ozi ala ọzọ anyị ji oge anyị nile jeere Jehova!” Ahụrụ m mpempe akwụkwọ e dere ihe a na ya obere oge nwunye m nwụsịrị na May 1994 n’ebe o debere ya n’akwụkwọ ndị ọzọ.
KA M na-atụgharị uche n’ihe a Irene kwuru, m na-echeta afọ 37 na-enye obi ụtọ, nke na-ewetakwa afọ ojuju, nke anyị jiri jee ozi dị ka ndị ozi ala ọzọ na Peru. Kemgbe anyị gbachara akwụkwọ na December 1942, anyị anụwo ụtọ mbikọ ọnụ magburu onwe ya dị ka Ndị Kraịst—nke a bụkwa ebe dị mma isi malite akụkọ m.
A zụlitere Irene dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova na Liverpool, England. Ọ bụ otu n’ime ụmụaka ndị nwanyị atọ nna ya mụrụ. Nna ya nwụrụ n’oge Agha Ụwa Mbụ. Nne ya mechara lụọ Winton Fraser, ha mụtakwara otu nwa nwoke aha ya bụ Sidney. Ntakịrị oge tupu Agha Ụwa nke Abụọ amalite, ezinụlọ ha kwagara Bangor, Ebe Ugwu Wales, bụ́ ebe e mere Irene baptizim n’afọ 1939. E mere Sidney baptizim n’afọ bu ya ụzọ, ya mere ya na Irene jekọrọ ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ—ndị na-ezisa ozi ọma oge nile—n’akụkụ ụsọ oké osimiri nke ebe ugwu Wales, site na Bangor ruo Caernarvon, gụnyere àgwàetiti bụ́ Anglesey.
N’oge ahụ, anọ m n’Ọgbakọ Runcorn, ihe dị ka kilomita 20 n’ebe ndịda n’akụkụ ọwụwa anyanwụ Liverpool, na-eje ozi dị ka onyeisi oche ndị nlekọta, nke bụ́ ihe a na-akpọ ya taa. Irene bịakwutere m n’otu mgbakọ sekit ma jụọ ma a pụrụ ikenye ya ókèala o nwere ike ịdị na-eje ozi na ya, ebe ọ bụ na ya na Vera, bụ́ nwanne ya nwanyị lụrụ di, onye bi na Runcorn gaje ibi. Ihe dabaara mụ na Irene n’ime izu abụọ ahụ anyị na ya nọrọ, m mesịkwara gaa leta ya ugboro ugboro na Bangor. Lee obi ụtọ m nwere n’otu ngwụsị izu, mgbe Irene kwetara ka m lụọ ya!
Ozugbo m lọtara na Sunday, amalitere m ịhazi agbamakwụkwọ anyị, ma anatara m otu ozi teligram na Tuesday. “Ọ dị m mwute na ozi teligram a ga-ewute gị,” ka o kwuru. “Ana m akagbu agbamakwụkwọ anyị. Aga m ezitere gị akwụkwọ ozi.” Akpata oyi wụrụ m n’ahụ́. Gịnị mere?
Akwụkwọ ozi Irene bịara n’echi ya. Ọ gwara m na ya na-aga Horsforth nke dị na Yorkshire ịga soro Hilda Padgett sụọ ụzọ. * O kwuru na ọnwa 12 gara aga, na ya kwetara na ya ga-eje ozi n’ebe e nwere mkpa dị ukwuu ma ọ bụrụ na a sị ya gaa. O dere, sị: “Nke a dị m ka nkwa m kwere Jehova, ana m echekwa na ebe ọ bụ na m kwere ya nkwa tupu mụ amata gị, aghaghị m imezu ya.” Ọ bụ ezie na o wutere m, iguzosi ike n’ezi ihe ya masịrị m nke ukwuu, n’ihi ya, eji m teligram zigara ya azịza m, sị: “Gawa. M ga-echere gị.”
A mara Irene ikpe ịga mkpọrọ ọnwa atọ mgbe ọ nọ na Yorkshire n’ihi na ọ jụrụ ịkwado agha ahụ n’ihi akọ na uche ya. Ma ọnwa 18 ka e mesịrị, na December 1942, anyị gbara akwụkwọ.
Mgbe M Ka Bụ Nwatakịrị
N’afọ 1919, nne m zụtara ùkwù akwụkwọ bụ́ Studies in the Scriptures. * Ọ bụ ezie na dị ka nna m kwuru n’ụzọ ziri ezi n’oge ahụ, nne m agụtụbeghị akwụkwọ, ma o kpebisiri ike iji Bible ya mụọ mpịakọta a nke ọma. O mere otú ahụ, e meekwa ya baptizim n’afọ 1920.
Nna m anaghị enye nsogbu, o gbochighịkwa nne m ime ihe ọ chọrọ ime, nke gụnyekwara izulite ụmụ ha anọ—ụmụnne m ndị nwanyị abụọ, Gwen na Ivy; nwanne m nwoke bụ́ Alec; na mụ onwe m—n’ụzọ nke eziokwu. Stanley Rogers na Ndịàmà ndị ọzọ na-ekwesị ntụkwasị obi nọ na Liverpool na-abịa ekwu okwu ihu ọha ndị dabeere na Bible na Runcorn, bụ́ ebe e guzobere ọgbakọ ọhụrụ n’oge na-adịghị anya. Ezinụlọ anyị so ọgbakọ na-eme nke ọma n’ụzọ ime mmụọ.
Gwen nọ na-aga ọmụmụ ihe maka ịkwọ aka n’isi na Chọọchị England, ma kwụsị ịga ozugbo ma ya ma nne m malitere ịmụ Bible. Mgbe ụkọchukwu nke chọọchị ahụ bịara n’ụlọ anyị ịmata ihe mere na ọ dịkwaghị abịa maka ihe ọmụmụ ahụ, a jụrụ ya ọtụtụ ajụjụ ndị ọ na-amaghị azịza ha. Gwen jụrụ ya ihe Ekpere Onyenwe anyị pụtara, mesịakwa kọwaara ya! O mechiri okwu ya site n’ihota ihe e kwuru ná 1 Ndị Kọrint 10:21, na-eme ka ọ pụta ihe na ya agaghị anọgide ‘na-eri ihe na tebụl abụọ.’ Mgbe ọ na-ala, ụkọchukwu ahụ sịrị na ọ ga-ekpere Gwen ekpere ma laghachite ịbịa zaa ya ajụjụ ndị ọ jụrụ, bụ́ ihe ọ na-emeghị ruo taa. Mgbe e mesịrị ya baptizim, n’oge na-adịghị anya Gwen ghọrọ onye na-ezisa ozi ọma oge nile.
Ụzọ e si na-elebara ndị na-eto eto anya n’ọgbakọ anyị kwesịrị nṅomi. Echetara m mgbe m gere okwu ihu ọha nke otu okenye si esi bịa kwuru mgbe m dị afọ asaa. Ka e mesịrị, ọ bịara ka mụ na ya kwurịta okwu. Agwara m ya na anọwo m na-agụ banyere Ebreham na otú o siri chọọ iji nwa ya bụ́ Aịzik chụọ àjà. “Gaa nọrọ n’elu ikpo okwu kọọrọ m ihe nile ị gụrụ banyere ya,” ka o kwuru. Lee obi ụtọ m nwere iguzo ebe ahụ kwuo “okwu ihu ọha” mbụ m!
E mere m baptizim mgbe m dị afọ 15 na 1931, bụ́ afọ nne m nwụrụ, akwụsịkwara m ịga akwụkwọ iji mụọ ọrụ idozi ngwá eletrik. N’afọ 1936, a na-akpọ okwu ihu ọha ndị dabeere na Bible bụ́ ndị e tinyere na teepu n’ihu ọha, otu nwanna nwanyị nke meworo agadi gbakwara mụ na nwanne m nwoke ume ikere òkè n’ọrụ a. Ya mere, mụ na Alec gara Liverpool ịga zụta ịnyịnya ígwè na ịrụnye ebe mmadụ na-anọ n’akụkụ ya maka iji ya na-ebu ígwè anyị na-eji akpọ okwu. A rụnyere otu ígwè okwu na-eme ka okwu na-adasikwu ụda ike n’azụ ebe ahụ mmadụ na-anọ, n’elu otu ihe yiri paịpụ nke a pụrụ ịpịaji apịaji, nke dị mita abụọ n’ịdị elu. Onye odozi ụgbọala gwara anyị na ya arụtụbeghị ụdị ihe ahụ, ma nke a gara nnọọ nke ọma! Anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-arụzu ókèala anyị, na-enwe
ekele maka agbamume nwanna nwanyị ahụ nyere anyị nakwa maka ihe ùgwù ije ozi ndị e nyere anyị.Agha Ụwa nke Abụọ—Oge Ule
Ka agha na-eru dị ka mmiri, mụ na Stanley Rogers nọ na-akpọsa okwu ihu ọha nke isiokwu ya bụ “Nakwere nke Bụ́ Eziokwu,” nke a gaje ikwu n’ụlọ nzukọ bụ́ Royal Albert Hall nke London na September 11, 1938. Ka oge na-aga, eso m kesaa okwu ihu ọha ahụ n’ụdị akwụkwọ nta ya na akwụkwọ nta bụ́ Fascism or Freedom (Ọchịchị Aka Ike Fascism Ka Ọ Bụ Nnwere Onwe), nke e bipụtara n’afọ na-eso ya. Akwụkwọ nta abụọ ahụ kpughere oké ọchịchọ Germany, nke Hitler na-achị, nwere ịchị ọchịchị aka ike. Ka ọ na-erule n’oge a, a marawo m nke ọma na Runcorn n’ihi nkwusa m na-eme n’ihu ọha, a na-akwanyekwara m ùgwù n’ihi ya. N’ezie, eziokwu ahụ bụ́ na m na-ebutekarị ụzọ n’ọrụ ọchịchị Chineke mere ka m nwee ike ịbụ onye e ji eme ihe.
Ụlọ ọrụ m na-arụrụ ọrụ nwetara ọrụ ngo nke itinye ọkụ eletrik n’otu ụlọ ọrụ na-emepụta ihe, bụ́ nke dị ná mpụga obodo ahụ. Mgbe m chọpụtara na ọ bụ ụlọ ọrụ ga na-emepụta ngwá agha, emere m ka ha mara na mụ apụghị ịrụ ọrụ ebe ahụ. Ọ bụ ezie na o wutere ndị were m n’ọrụ, onyeisi ọrụ m kwuchiteere m, e nyekwara m ọrụ ọzọ. Emesịrị m chọpụta na nwanne nne nwoke ahụ bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova.
Otu onye ọrụ ibe m gbara m ume nke ukwuu mgbe o kwuru, sị: “Reg, ihe i mere bụ nnọọ ihe anyị tụrụ anya ya n’aka gị ebe ọ bụ na ị nọwo na-arụ ọrụ Bible eri ọtụtụ afọ.” Otú ọ dị, aghaghị m ịnọ na nche n’ihi na ọtụtụ n’ime ndị ọrụ ibe m chọrọ itinye m ná nsogbu.
Na June 1940, ụlọikpe dị na Liverpool kwetara idebanye aha m n’akwụkwọ dị ka onye jụrụ ije agha n’ihi akọ na uche ya ma ọ bụrụ na m ga-anọgide na-arụ ọrụ m. N’ezie, nke a mere ka m nwee ike ịnọgide n’ozi Ndị Kraịst m.
Ịbanye n’Ozi Oge Nile
Mgbe agha biri, ekpebiri m ịhapụ ọrụ m ma sonyere Irene n’ozi oge nile. Na 1946, arụrụ m ụlọ ụgbọala na-adọkpụ nke dị mita ise, nke ghọrọ ebe obibi anyị, n’afọ na-esokwa ya, e zigara anyị Alveston, bụ́ obodo nta dị na Gloucestershire. Mgbe nke ahụ gasịrị, anyị sụrụ ụzọ na Cirencester nakwa n’obodo Bath. Na 1951, a gwara m ka m na-aga eleta ọgbakọ ndị dị n’ebe ndịda Wales dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, ma ihe na-erughị afọ abụọ mgbe nke ahụ gasịrị, anyị gawara Watchtower Bible School of Gilead ịga ịnara ọzụzụ maka ozi ala ọzọ .
Klas nke 21 nke ụlọ akwụkwọ ahụ nọ na South Lansing, n’ebe ugwu New York gụọ akwụkwọ, e mekwara ememe ngụsị akwụkwọ anyị na 1953 ná Mgbakọ Òtù Ụwa Ọhụrụ e nwere na
New York City. Mụ na Irene amaghị ebe a ga-ekenye anyị ọrụ ruo ụbọchị ahụ anyị mere ememe ngụsị akwụkwọ. Lee obi ụtọ anyị nwere ịnụ na anyị ga-eje Peru. N’ihi gịnị? N’ihi na nwanne Irene nke nwoke, bụ́ Sidney Fraser, onye otu nne ji ya na ya, na nwunye ya bụ́ Margaret anọwo na eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ dị na Lima ruo ihe karịrị otu afọ kemgbe ha gụsịrị akwụkwọ na klas nke 19 nke Gilead!Ka anyị nọ na-echere visa anyị, anyị rụtụrụ ọrụ na Betel dị na Brooklyn, ma n’oge na-adịghị anya, anyị hapụrụ gawa Lima. Ebe mbụ n’ime ebe iri anyị jere ozi ala ọzọ na ha bụ Callao, bụ́ ọdụ ụgbọ mmiri bụ́ isi nke Peru, nke dị kpọmkwem n’ọdịda anyanwụ Lima. Ọ bụ ezie na anyị amụtala ihe ndị bụ́ isi n’asụsụ Spanish, mụ na Irene apụghị iji ya kparịta ụka n’oge ahụ. Gịnịkwanụ ka anyị ga-eme?
Nsogbu na Uru nke Ime Nkwusa
Na Gilead, a gwara anyị na nne anaghị akụziri nwa ya asụsụ. Kama nke ahụ, nwa ahụ na-amụta ya mgbe nne ya na-asụrụ ya asụsụ ahụ. Ya mere ndụmọdụ e nyere anyị bụ: “Malitenụ ime nkwusa ozugbo, mụtawazie asụsụ ahụ site n’aka ọha na eze. Ha ga-enyere unu aka.” Ka m na-agbalị ịmụta asụsụ ọhụrụ a, cheedị echiche otú ọ dị m mgbe a họpụtara m ịbụ onyeisi oche ndị nlekọta nke ọgbakọ Callao n’ime izu abụọ anyị rutere! Ejere m hụ Sidney Fraser, ma ndụmọdụ o nyere m na nke e nyere anyị na Gilead bụ otu ihe ahụ—soro ndị nọ n’ọgbakọ na ndị nọ n’ókèala gị na-akpakọ. Ekpebiri m ịgbaso ndụmọdụ a.
Otu ụtụtụ Saturday, ezutere m otu onye kapịnta n’ụlọ ọrụ ya. “M ga na-arụ ọrụ m,” ka o kwuru, “ma biko nọrọ ala zie m ozi ọma.” Agwara m ya na m ga-eme otú ahụ ma o kweta ime otu ihe: “Mgbe ọ bụla m kwuhiere ihe, biko gbazie m olu. Iwe agaghị ewe m.” Ọ chịrị ọchị ma kweta ime ihe m rịọrọ ya. Anọ m na-aga na nke ya ugboro abụọ n’izu ma chọpụta na nke a bụ ụzọ magburu onwe ya isi mụta asụsụ ọhụrụ m, dị nnọọ ka a gwara m.
Ná ndabata, ezutere m onye kapịnta ọzọ n’Ica, bụ́ ebe nke abụọ anyị jere ozi ala ọzọ, ma kọọrọ ya ndokwa ahụ m mere na Callao. O kwetara inyere m aka n’otu ụzọ ahụ, ya mere m nọgidere na-amụtakwu asụsụ Spanish nke ọma karị, ọ bụ ezie na o were m afọ atọ tupu m nwee ike ịdị na-asụ ya nke ọma. Nwoke a na-ejikarị ọrụ n’aka, ma ejisiri m ike na-eduziri ya ọmụmụ Bible site n’ịgụpụta Akwụkwọ Nsọ na ịkọwara ya ihe ha pụtara. Otu izu mgbe m gara ịhụ ya, onye were ya n’ọrụ gwara m na ọ chọtawo ọrụ ọzọ na Lima. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, mgbe mụ na Irene gara mgbakọ na Lima, ahụrụ m nwoke a ọzọ. Lee obi ụtọ m nwere ịnụ na ọ chọtara Ndịàmà nọ n’ógbè ahụ iji nọgide na-amụ ihe, nakwa na ya na ezinụlọ ya nile aghọwo ndị ohu Jehova raara onwe ha nye!
N’otu ọgbakọ, anyị chọpụtara na otu nwoke na nwanyị na-akatabeghị ahụ́ na-ebikọ ọnụ n’alụghị di na nwunye ma e mewo ha baptizim. Ka anyị na ha na-ekwurịta ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị metụtara ya, ha kpebiri ime ka alụmdi na nwunye ha bụrụ nke iwu kwadoro, nke ga-eme ka ha ruo eruo ịbụ Ndịàmà e mere baptizim. Ya mere, emere m ndokwa ịkpọrọ ha gaa n’ụlọ nzukọ obodo ịga debanye alụmdi na nwunye ha n’akwụkwọ. Ma otu nsogbu bilitere n’ihi na ha amụọla ụmụ anọ ndị a na-edebabeghịkwa aha ha n’akwụkwọ, nke bụkwa ihe iwu chọrọ. Anyị malitere iche ihe onyeisi obodo ga-eme. “Ebe ọ bụ na ndị ọma a, ndị enyi unu bụ́ Ndịàmà Jehova, emeela ndokwa ịhụ na unu lụrụ di na nwunye n’ụzọ iwu kwadoro,” ka onyeisi obodo ahụ kwuru, “agaghị m agba unu akwụkwọ m kwesịrị ịgba unu maka nwatakịrị nke ọ bụla, m ga-edebanyekwa aha ha n’akwụkwọ n’anaghị unu ego ọ bụla.” Lee ekele anyị nwere, ebe ọ bụ na ezinụlọ a dara ogbenye, iri ha nhá ọ bụla gaara abụrụ ha nnukwu ibu arọ!
Ka oge na-aga, Albert D. Schroeder, nke si n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn letara anyị ma tụọ aro ka e nwee ebe obibi ọhụrụ maka ndị ozi ala ọzọ n’akụkụ ọzọ nke Lima. Ya mere, mụ na Irene, tinyere ụmụnna nwanyị abụọ ọzọ, bụ́ Frances na Elizabeth Good, ndị si United States, nakwa otu di na nwunye bụ́ ndị Canada kwagara n’ógbè San Borja. N’ime afọ abụọ ma ọ bụ atọ, e ji otu ọgbakọ ọzọ na-enwe ihe ịga nke ọma gọzie anyị.
Mgbe anyị na-eje ozi na Huancayo, nke dị ihe
karịrị mita 3,000 n’elu n’ebe ugwu nke dị n’etiti obodo ahụ, anyị nọ n’ọgbakọ dị n’ebe ahụ nke nwere Ndịàmà 80. N’ebe ahụ, eso m wuo Ụlọ Nzukọ Alaeze nke abụọ e wuru ná mba ahụ. A họpụtara m ịbụ onye nnọchiteanya Ndịàmà Jehova n’okwu ndị metụtara iwu, ebe anyị na-aghaghị ije n’ụlọikpe ugboro atọ iji nweta ikike iwu kwadoro maka ala anyị zụtara. Ihe ndị dị otú ahụ, tinyekwara nnukwute ọrụ ime ndị na-eso ụzọ nke ọtụtụ ndị ozi ala ọzọ na-ekwesị ntụkwasị obi n’oge ahụ na-arụ, bụ ihe tọrọ ntọala siri ike maka mmụba magburu onwe ya anyị na-enwe ugbu a na Peru—malite ná Ndịàmà 283 n’afọ 1953 ruo ihe karịrị 83,000 taa.Ọlịla Dị Mwute
Anyị na ndị ozi ala ọzọ ibe anyị nọ n’ebe obibi ndị ozi ala ọzọ nile anyị biri, bụ́ ebe ndị m na-enwekarị ihe ùgwù m nke ije ozi dị ka onye nlekọta ebe obibi, nwere mmekọrịta magburu onwe ya. N’ụtụtụ Monday ọ bụla, anyị na-agbakọta ọnụ ikwurịta ihe anyị ga-eme n’izu ahụ, nakwa ike ọrụ ilekọta ebe obibi anyị. Anyị nile ghọtara na ihe bụ́ isi bụ ime nkwusa, n’iburu nke ahụ n’uche, anyị nile rụkọrọ ọrụ ọnụ n’ịdị n’otu. Eji m obi ụtọ na-echeta na ọ dịghị mgbe anyị nwere nnukwu nghọtahie na nke ọ bụla n’ebe obibi anyị nile.
Ebe ikpeazụ anyị jere ozi bụ na Breña, bụ́ ógbè ọzọ dịpụrụ adịpụ na Lima. Ọgbakọ dị n’ebe ahụ nke ịhụnanya dị na ya, nke dị Ndịàmà 70, mụbara nnọọ ngwa ngwa wee gafee 100 mmadụ, n’ihi ya e guzobere ọgbakọ ọzọ na Palominia. Ọ bụ n’oge a ka Irene dara ọrịa. Ebu m ụzọ chọpụta na mgbe ụfọdụ, ọ dịghị echeta ihe o kwuru, mgbe ụfọdụkwa, ọ na-esiri ya ike icheta ụzọ isi laa n’ụlọ anyị. Ọ bụ ezie na ọ natara ezigbo ọgwụgwọ, ọnọdụ ya ji nke nta nke nta kawanye njọ.
N’ụzọ dị mwute, na 1990, aghaghị m ime ndokwa ka anyị laghachi England, bụ́ ebe nwanne m nwanyị bụ́ Ivy ji obiọma nabata anyị n’ụlọ ya. Afọ anọ ka e mesịrị, Irene nwụrụ, mgbe ọ nọ n’afọ nke 81 ya. Anọgidere m n’ozi oge nile, na-eje ozi dị ka okenye n’otu n’ime ọgbakọ atọ dị n’obodo m. Site n’oge ruo n’oge, ana m agakwa Manchester ịga gbaa ìgwè nọ n’ebe ahụ na-asụ asụsụ Spanish ume.
Na nso nso a, enwere m ahụmahụ na-enye obi ụtọ nke malitere ọtụtụ iri afọ gara aga, mgbe m na-akpọrọ ndị nwe ụlọ okwu ihu ọha na-ewe minit ise n’ígwè phonograph m. Ana m echeta nke ọma otu nwatakịrị nwanyị ka na-aga akwụkwọ, onye guzo n’akụkụ nne ya n’ọnụ ụzọ ha, na-ege ntị n’ozi ahụ.
Nwatakịrị nwanyị ahụ mechara kwaga Canada, ya na otu enyi ya nke ka bi na Runcorn, onye bụkwa Onyeàmà ugbu a nọgidekwara na-ederịta akwụkwọ ozi. O detaara m akwụkwọ ozi na nso nso a ma kwuo na Ndịàmà abụọ kpọtụụrụ ya ma gwa ya okwu ndị chetaara ya, n’ụzọ ọ na-atụghị anya ya, ihe ndị ọ nụrụ n’okwu ndị ahụ na-ewe minit ise m na-akpọ. Ebe ọ ghọtara na ọ bụ eziokwu ahụ, ọ bụ ohu Jehova raara onwe ya nye ugbu a, ọ sịkwara ka e keleere ya nwa okorobịa ahụ bịara n’ụlọ nne ya ihe karịrị afọ 60 gara aga! N’ezie, anyị amaghị otú mkpụrụ nke eziokwu ga-esi agbanye mkpọrọgwụ ma too.—Eklisiastis 11:6.
Ee, eji m nnukwute obi ekele na-eleghachi anya azụ ná ndụ m nke m tinyere n’ozi Jehova nke dị oké ọnụ ahịa. Kemgbe m raara onwe m nye na 1931, ahapụtụbeghị m mgbakọ nke ndị Jehova. Ọ bụ ezie na mụ na Irene amụtaghị nwa ọ bụla n’onwe anyị, obi dị m ụtọ inwe ihe karịrị ụmụ ndị nwoke na ndị nwanyị dị ihe karịrị nnọọ 150 n’ụzọ ime mmụọ, ha nile na-ejekwara Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova, ozi. Dị nnọọ ka nwunye m m hụrụ n’anya si kwuo ya, ihe ùgwù ndị anyị nwere bụ n’ezie ọṅụ na-enweghị atụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 9 Akụkọ ndụ Hilda Padgett, nke bụ́ “Ịgbaso Nzọụkwụ nke Ndị Mụrụ M,” pụtara n’Ụlọ Nche nke October 1, 1995, peeji nke 19-24.
^ par. 12 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 24]
Nne m ná mmalite afọ ndị 1900
[Foto dị na peeji nke 24, 25]
N’aka ekpe: Hilda Padgett, mụ, Irene, na Joyce Rowley na Leeds, England, n’afọ 1940
[Foto dị na peeji nke 25]
N’elu: Mụ na Irene n’ihu ụlọ anyị nke ụgbọala na-adọkpụgharị
[Foto dị na peeji nke 27]
Ịkpọsa okwu ihu ọha na Cardiff, Wales, n’afọ 1952