Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ọ̀ dị njọ igbu anụ e ji mere enyi mgbe ọ na-arịasi ọrịa ike ma ọ bụ mgbe ọ kara nká?

Anụmanụ dịgasị iche iche na-amasị ọtụtụ ndị ma na-enye ha obi ụtọ. Ụfọdụ anụ ụlọ na-abụ ezigbo enyi. Dị ka ihe atụ, a ma nkịta ama dị ka anụ na-erubere ndị nwe ya isi ma na-ahụ ha n’anya. N’ihi ya, o kwere nghọta na ndị mmadụ pụrụ ịhụ anụmanụ ndị dị otú ahụ n’anya nke ukwuu, karịsịa anụ ha jiworo mere enyi ruo ọtụtụ afọ.

Otú ọ dị, ihe ka ọtụtụ n’anụ ndị e ji mere enyi anaghị adịte ndụ aka. Nkịta pụrụ ịdịru ndụ afọ 10 ruo 15 ma ọ bụ ihe dị ka ya, otú ahụ ka ọ dịkwa nwamba, na-adabere n’ụdị ha. Ọ bụrụ na anụ ndị e ji mere enyi akaa nká, ha pụrụ ịda ọrịa ma gharazie ịdị ike, bụ́ nke pụrụ iwute ndị nwe ha, bụ́ ndị ga na-echeta oge anụmanụ ndị a na-akabeghị nká, bụ́kwa oge ha gbasiri ike. Ọ̀ ga-abụ ihe dị njọ ime ka ụmụ anụmanụ ndị dị otú a kwụsị ịta ahụhụ site n’igbu ha?

Onye Kraịst kwesịrị ime ihe kwekọrọ n’uche Chineke mgbe ọ na-emeso ụmụ anụmanụ ihe. Imekpọ ha ọnụ megidere uche Chineke n’ezie, n’ihi na Okwu ya na-ekwu, sị: “Onye ezi omume maara [“na-elekọta,” NW] ndụ anụ ụlọ ya.” (Ilu 12:10) Otú ọ dị, nke a apụtaghị na Chineke na-ele ụmụ anụmanụ anya otú o si ele ụmụ mmadụ. Mgbe Chineke kere ụmụ mmadụ, o gosiri na e nwere nnukwu ọdịiche dị n’etiti ha na ụmụ anụmanụ. Dị ka ihe atụ, o nyere ụmụ mmadụ olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi, ma ọ dịghị mgbe o nyere ụmụ anụmanụ olileanya a. (Ndị Rom 6:23; 2 Pita 2:12) Ebe ọ bụ Onye Okike, o ruuru ya ikwu mmekọrịta kwesịrị ịdị n’etiti ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ.

Jenesis 1:28 na-agwa anyị mmekọrịta dị n’etiti ha. Chineke gwara mmadụ abụọ mbụ, sị: “Nweekwanụ ike n’ahụ́ azụ̀ nke oké osimiri, na n’ahụ́ anụ ufe nke eluigwe, na n’ahụ́ anụ nile ọ bụla dị ndụ nke na-akpụ akpụ n’elu ụwa.” N’otu aka ahụ, Abụ Ọma 8:6-8 na-ekwu, sị: “Ihe nile ka I [Chineke] doro n’okpuru ụkwụ ya [mmadụ] abụọ: ewu na atụrụ na ehi, ha nile, ha na anụ ọhịa; nnụnụ eluigwe, na azụ̀ nile nke oké osimiri.”

Chineke mere ka o doo anya na mmadụ pụrụ iji anụmanụ mee ihe ma gbuo ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Dị ka ihe atụ, a pụrụ iji akpụkpọ ahụ́ ha mere uwe. Chineke nyekwara ikike ka ụmụ mmadụ riwe anụ ụmụ anụmanụ mgbe Iju Mmiri nke oge Noa gasịrị, ka ha na-eri ya na akwụkwọ nri bụ́ nke e bu ụzọ nye ha.—Jenesis 3:21; 4:4; 9:3.

Nke a adịghị enye ikike igbu ụmụ anụmanụ aghara aghara dị ka ihe e ji egwuri egwu. Na Jenesis 10:9 (NW), Bible na-akọwa Nimrọd dị ka “dike n’ịchụ nta.” Ma otu amaokwu ahụ na-ekwu na nke a mere ka ọ bụrụ onye “na-emegide Jehova.”

N’ihi ya, ọ bụ ezie na mmadụ nwere ikike n’ebe ụmụ anụmanụ nọ, o kwesịghị iji ikike ahụ mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, kama o kwesịrị iji ya mee ihe n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ndị dị n’Okwu Chineke. Nke a pụrụ ịgụnye ịghara ikwe ka anụ o ji mere enyi taa ahụhụ na-enweghị isi n’ihi ịka nká, mmerụ ahụ́ dị ukwuu, ma ọ bụ ọrịa ga-egbu ya. N’ọnọdụ dị otú ahụ, ọ bụ Onye Kraịst ahụ ka ọ dịịrị ikpebi ihe ọ ga-eme. Ọ bụrụ na o kpebie na ọ ga-abụ igosi obi ebere ịghara ịhapụ anụmanụ ahụ ka ọ nọgide na-ata ahụhụ n’enweghị olileanya ọ bụla ezi uche dị na ya na ọ ga-agbake, mgbe ahụ, ọ pụrụ ịhọrọ igbu ya.