‘E Yikwasịghị Solomọn Uwe Dị Ka Otu n’Ime Ndị A’
‘E Yikwasịghị Solomọn Uwe Dị Ka Otu n’Ime Ndị A’
OKOOKO ọhịa ndị dị ka ndị ị na-ahụ ebe a juru eju n’okporo ụzọ ndị dị n’ebe ndịda Africa. A na-akpọ ha cosmos, ebe e sikwa nweta ha bụ n’ebe okpomọkụ nke America. Ọmarịcha okooko osisi ndị dị otú ahụ pụrụ ichetara anyị otu ihe Jizọs kụziri. Ọtụtụ n’ime ndị na-ege ya ntị dara ogbenye, ha nọkwa na-echegbu onwe ha banyere mkpa anụ ahụ́ ha, ihe ha ga-eri na ihe ha ga-eyi.
“N’ihe banyere uwe,” Jizọs jụrụ, sị, “gịnị mere unu ji na-echegbu onwe unu? Mụtanụ ihe site n’okooko lili nke ọhịa, otú ha si eto; ha adịghị adọgbu onwe ha n’ọrụ, ha adịghịkwa akpa ogho; ma asị m unu na e yikwasịghị ọbụna Solomọn uwe, n’ebube ya nile, dị ka otu n’ime ndị a.”—Matiu 6:28, 29.
A tụwo aro dịgasị iche iche banyere kpọmkwem ụdị okooko ọhịa Jizọs bu n’uche. Otú ọ dị, Jizọs gara n’ihu iji ya tụnyere ihe ọkụkụ nkịtị, na-asị: “Ma ọ bụrụ na Chineke na-eyikwasị ihe ọkụkụ nke ubi uwe, nke dị ebe a taa ma echi [a tụba] ya n’ekwú ọkụ, ọ́ gaghị eyikwasị unu uwe karị, unu ndị okwukwe nta?”—Matiu 6:30.
Ọ bụ eziokwu na a maghị okooko osisi cosmos n’Izrel, n’ezie, ha na-akwado ihe Jizọs nọ na-akụzi. Ma à nọ n’ebe dị anya ma ọ bụ n’ebe dị nso na-ele ha, ha na-ama mma dị egwu, ndị na-ese foto na ndị na-ese ihe osise na-esekarịkwa ha. N’eziokwu, Jizọs anọghị na-ekwubiga okwu ókè mgbe ọ sịrị, “e yikwasịghị ọbụna Solomọn uwe, n’ebube ya nile, dị ka otu n’ime ndị a.”
Gịnị ka anyị na-amụta site na ya taa? Ọ bụ na ndị na-ejere Chineke ozi pụrụ ijide n’aka na ọ ga-enyere ha aka inweta ihe ndị na-akpa ha ọbụna n’oge ihe isi ike. Jizọs kọwara, sị: “Nọgidenụ na-achọ alaeze [Chineke], a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a [dị ka ihe oriri na uwe ndị dị mkpa].” (Luk 12:31) Ee, a na-erite ezigbo uru site n’ịchọ Alaeze Chineke. Ma ị̀ maara ihe Alaeze Chineke bụ na ihe ọ ga-emere ihe a kpọrọ mmadụ? Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ inyere gị aka ịchọta azịza ya n’ime Bible.