Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Na-eme Ọrụ Ebere?

Gịnị Na-eme Ọrụ Ebere?

Gịnị Na-eme Ọrụ Ebere?

MGBE mwakpo ahụ e mere na September 11, 2001 na New York City na Washington, D.C., gasịrị, nkwado ndị mmadụ n’ozuzu ha nyere ndị ọdachi ahụ dakwasịrị dị ịrịba ama. Nde $2.7 e nyere òtù ọrụ ebere dị iche iche n’onyinye iji nye aka lekọta ezinụlọ ndị ọdachi ahụ dakwasịrị riri ha ọnụ. N’ịbụ ndị ókè ihe e bibiri haruru wụrụ akpata oyi n’ahụ́, ndị mmadụ nọ n’ebe nile chọrọ inye aka.

Otú ọ dị, iwe were ụfọdụ ndị ngwa ngwa ha nụrụ na òtù ọrụ ebere ndị a ma ama ji ego ndị e nyere na-eme ihe masịrị ha. Iwe juru ndị mmadụ obi mgbe a kọrọ na otu nnukwu òtù ọrụ ebere mere atụmatụ ijichi ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara nke nde $546 ọ natara ma jiri ya mee ihe ọzọ. Ọ bụ ezie na òtù ahụ mesịrị gbanwee mkpebi ya ma rịọ mgbaghara, otu onye nta akụkọ kwuru, sị: “Ndị nkatọ lere mgbanwe mkpebi a anya dị ka ihe bịara n’azụ oge n’ime ka ndị mmadụ nweghachi ntụkwasị obi ha nweburu n’ebe òtù ọrụ ebere ahụ dị” tupu e mee mwakpo ndị ahụ. Gịnị banyere gị? Ị̀ malitela inwe obi abụọ n’oge na-adịbeghị anya n’ebe òtù ọrụ ebere dị?

Ọ̀ Bara Uru Ka Ọ̀ Bụ Ịla Ego n’Iyi?

A na-elekarị inye òtù ọrụ ebere onyinye anya dị ka àgwà ọma. Otú ọ dị, ọ bụghị mmadụ nile si otú ahụ ele ya anya. Ihe karịrị afọ 200 gara aga, Samuel Johnson, bụ́ onye England na-ede edemede, dere, sị: “Obi na-aka nnọọ esi gị ike na ị na-eme ihe dị mma mgbe ị na-enye ndị na-arụ ọrụ ego dị ka ụgwọ ọrụ ha, karịa mgbe ị na-enye ego nanị maka ọrụ ebere.” Ụfọdụ ndị taa nwere mmetụta yiri nke ahụ, akụkọ banyere òtù ọrụ ebere ndị na-eji ego onyinye eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi adịghịkwa eme ka ndị mmadụ tụkwasị ha obi. Tụlee ihe atụ abụọ mere n’oge na-adịbeghị anya.

A chụrụ otu onyeisi nke otu òtù ọrụ ebere okpukpe guzobere bụ́ nke dị na San Francisco n’ọrụ mgbe e bosịrị ya ebubo na o nyere ụlọ ọrụ ya akwụkwọ mmefu ego ka ha kwụọ ihe ndị o mefuru n’ahụ́ a wara ya maka ịchọ mma nakwa ihe o riri n’afọ abụọ n’otu ụlọ nri a na-akwụ $500 kwa izu na ya. Na Britain, ndị haziri ihe omume maka ọrụ ebere nke e gosiri na telivishọn nwere mwute mgbe ha chọpụtara na n’ime nde pound 6.5 (ihe dị ka nde $10 U.S.) e zigara iji nye aka n’iwu ogige ụmụ mgbei dị iche iche na Romania, ọ bụ nanị ụlọ 12 na-enweghị isi ka e wuru, a maghịkwa ebe ọtụtụ narị puku dollar gara. N’ụzọ kwesịrị ekwesị, akụkọ ndị na-adịghị mma dị ka ndị a emewo ka ụfọdụ ndị na-enye onyinye na-akpachapụkwuru anya banyere ego ole ha na-enye na onye ha na-enye ya.

Inye Ma Ọ Bụ Ịghara Inye

Otú ọ dị, ọ ga-abụ ihe ihere ikwe ka omume nke ụfọdụ ndị ma ọ bụ òtù ụfọdụ mee ka anyị gharazie inwe nchegbu na ọmịiko maka ndị ọzọ. Bible na-asị: “Ụdị ofufe nke dị ọcha, nke a na-emerụghịkwa emerụ site n’ụzọ Chineke na Nna anyị si ele ihe anya bụ nke a: ilekọta ụmụ mgbei na ụmụ nwanyị di ha nwụrụ ná mkpagbu ha.” (Jems 1:27) Ee, imere ndị ogbenye na ndị ọ na-enweghị ka ọ ha ha ihe ọma bụ akụkụ dị mkpa nke Iso Ụzọ Kraịst.

Otú ọ dị, ị pụrụ iche, sị, ‘M̀ kwesịrị ịnọgide na-enye òtù ọrụ ebere onyinye, ka m̀ kwesịrị nnọọ ịgbalị inye aka site n’iji aka m na-enye ndị mmadụ onyinye?’ Olee ụdị inye ihe Chineke na-atụ anya ya n’aka anyị? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị a.