Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Guzo, Hụ Nzọpụta Jehova!

Guzo, Hụ Nzọpụta Jehova!

Guzo, Hụ Nzọpụta Jehova!

“Guzonụ onwe unu, guzo, hụ nzọpụta Jehova n’etiti unu.” —2 Ihe E Mere 20:17.

1, 2. N’ihi gịnị ka ihe ga-esi ná mwakpo “Gọg, nke ala Megọg” ga-eme n’isi nso pụta ga-eji dị njọ karịa ihe si n’egwu a na-eyi ọha ná mba nile apụta?

ỤFỌDỤ ndị akọwawo iyi ọha egwu dị ka mwakpo a na-awakpo ụwa dum, na ọbụna mmepeanya n’onwe ya. N’ụzọ kwere nghọta, a ghaghị iji iyi egwu dị otú ahụ kpọrọ ihe. N’aka nke ọzọ, ihe ga-esi ná mwakpo ọzọ nke ụwa dum na-ejichaghị ma ọ bụ na-ejighịdị akpọrọ ihe pụta ga-akadị nke ahụ njọ. Gịnị ka ọ bụ?

2 Ọ bụ mwakpo “Gọg, nke ala Megọg” ga-eme, bụ́ nke Bible kwuru banyere ya n’Ezikiel isi 38. Ikwu na ihe ga-esi ná mwakpo a pụta ga-adị njọ karịa ihe si n’egwu a na-eyi ọha ná mba nile apụta ọ̀ bụ ikwubiga okwu ókè? Ọ dịghị ma ọlị, n’ihi na mwakpo Gọg karịrị mwakpo a na-awakpo ọchịchị ụmụ mmadụ. Ọ na-awakpo ọchịchị eluigwe nke Chineke! Otú ọ dị, n’adịghị ka ụmụ mmadụ, bụ́ ndị ihe ịga nke ọma ha na-enwe n’ịhụ banyere mwakpo a na-awakpo ha pụrụ ipe nnọọ mpe, Onye Okike nwere ikike zuru ezu ime ihe banyere ajọ mwakpo nke Gọg.

Mwakpo A Na-awakpo Ọchịchị Chineke

3. Gịnị ka a gbaworo ndị ọchịchị ụwa ume ime kemgbe 1914, oleekwa otú ha siworo meghachi omume?

3 Ọgụ Eze Chineke nke na-achị achị ugbu a na ajọ usoro ihe Setan na-alụ anọworị na-aga n’ihu kemgbe e guzobere Alaeze Chineke n’eluigwe na 1914. N’oge ahụ, a gwara ndị ọchịchị bụ́ mmadụ ka ha doo onwe ha n’okpuru Onye Ọchịchị Chineke họpụtara. Ma ha ajụwo ime otú ahụ, dị ka e buru n’amụma, sị: “Ndị eze nke ụwa na-eguzo onwe ha, ndị isi na-agbakọtakwa izu, imegide Jehova, na imegide onye Ya e tere mmanụ, sị, Ka anyị tijie agbụ nile ha, tụfuo ụdọ nile ha n’ahụ́ anyị.” (Abụ Ọma 2:1-3) Nguzogide a na-eguzogide ịchịisi Alaeze ga-eru n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu n’ụzọ doro anya n’oge Gọg nke ala Megọg ga-eme mwakpo ya.

4, 5. Olee otú ụmụ mmadụ pụrụ isi na-alụso ọchịchị eluigwe a na-adịghị ahụ anya nke Chineke ọgụ?

4 Anyị pụrụ ịdị na-eche otú ụmụ mmadụ pụrụ isi na-alụso ọchịchị eluigwe a na-adịghị ahụ anya ọgụ. Bible na-ekpughe na ndị ga-eso n’ọchịchị a bụ “narị puku na iri puku anọ na anọ ahụ, bụ́ ndị a zụtaworo n’ụwa,” nakwa “Nwa Atụrụ ahụ,” bụ́ Kraịst Jizọs. (Mkpughe 14:1, 3; Jọn 1:29) N’ịbụ nke dị n’eluigwe, a kpọrọ ọchịchị ọhụrụ ahụ “eluigwe ọhụrụ,” ebe a kpọrọ ndị ọ ga-achị n’ụwa, “ụwa ọhụrụ,” n’ụzọ ezi uche dị na ya. (Aịsaịa 65:17; 2 Pita 3:13) Ihe ka ọtụtụ n’ime 144,000 ahụ bụ́ ndị ga-eso Kraịst chịa ejechaworị ozi elu ala ha n’ikwesị ntụkwasị obi. N’ụzọ dị otú ahụ, ha egosipụtawo na ha ruru eru ịmalite ozi ọhụrụ e kenyere ha n’eluigwe.

5 Otú ọ dị, mmadụ ole na ole fọdụrụnụ n’ime 144,000 ahụ ka nọ n’ụwa. N’ime mmadụ 15,000,000 gara ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị na 2002, ọ bụ nanị mmadụ 8,760 gosipụtara olileanya ha nke ịbụ ndị a họrọwooro maka ozi eluigwe a. Onye ọ bụla nke nwara anwa na-awakpo ihe fọdụrụnụ n’ime ndị a gaje iso n’Alaeze ahụ na-awakpo Alaeze Chineke n’ezie.—Mkpughe 12:17.

Eze ahụ Enwezuo Mmeri Ya

6. Olee otú Jehova na Kraịst si ele mmegide a na-emegide ndị Chineke anya?

6 E buru amụma otú Jehova ga-esi emeghachi omume ná mmegide a na-emegide Alaeze o guzobere, sị: “Onye na-anọdụ n’eluigwe na-achị ọchị: Onyenwe anyị na-akwa ha emo. Mgbe ahụ Ọ ga-agwa ha okwu n’iwe Ya, ọ bụkwa n’iwe Ya dị ọkụ ka Ọ ga-eme ka ha maa jijiji [na-asị]: . . . Mụ onwe m emewo ka eze m guzosie ike n’elu Zaịọn, bụ́ ugwu nsọ m.” (Abụ Ọma 2:4-6) Oge eruola ka Kraịst, n’okpuru nduzi Jehova, “nwezuo mmeri ya.” (Mkpughe 6:2) Olee otú Jehova si ele mmegide a na-emegide ndị ya n’oge mmeri ikpeazụ a anya? Ọ na-ewere ya na ọ bụ ya onwe ya na Eze ya na-achị achị ka a na-emegide. “Onye na-emetụ unu aka na-emetụ nwa anya [m],” ka Jehova na-ekwu. (Zekaraịa 2:8) Jizọs kwusikwara ya ike na ya na-ewere ihe ndị mmadụ meere ma ọ bụ na-emeghịrị ụmụnna ya e tere mmanụ dị ka ihe e meere ya ma ọ bụ ihe a na-emeghịrị ya.—Matiu 25:40, 45.

7. N’ihi gịnị ka Gọg ji ewesa ndị so ‘n’oké ìgwè mmadụ’ ahụ a kọwara ná Mkpughe 7:9 iwe?

7 N’ezie, ndị na-akwadosi ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ ike ga-abụkwa ndị Gọg ga-ewesa iwe. Ndị a bụ́ ndị na-atụ anya iso ‘n’ụwa ọhụrụ’ Chineke bụ “oké ìgwè mmadụ” e “si ná mba na ebo na ndị na asụsụ nile” kpọta. (Mkpughe 7:9) E kwuru na ha “na-eguzo n’ihu ocheeze ahụ na n’ihu Nwa Atụrụ ahụ, na-eyi uwe mwụda ọcha.” N’ụzọ dị otú a, ha na Chineke na Kraịst Jizọs dị ná mma. N’iji ‘igu nkwụ n’aka ha,’ ha na-eto Jehova dị ka onye o ruuru ịbụ Eze eluigwe na ala, bụ́ onye ọchịchị nke Eze o mere ka ọ nọkwasị n’ocheeze, bụ́ Jizọs Kraịst, “Nwa Atụrụ Chineke,” na-anọchi anya ịchịisi ya.—Jọn 1:29, 36.

8. Gịnị ka mwakpo Gọg ga-akpali Kraịst ime, gịnị ga-esikwa na ya pụta?

8 Mwakpo Gọg ga-akpali Eze Chineke mere ka ọ nọkwasị n’ocheeze ime ihe ma lụọ agha Amagedọn. (Mkpughe 16:14, 16) A ga-ebibi ndị jụrụ ịnakwere ọbụbụeze Jehova. N’aka nke ọzọ, ndị tachiworo obi ná mkpagbu n’ihi iguzosi ike n’ihe nye Alaeze Chineke ga-enweta ahụ́ efe na-adịgide adịgide. Pọl onyeozi dere banyere nke a, sị: “Nke a bụ ihe àmà nke ikpe ezi omume Chineke, na-eduga n’unu ịbụ ndị a na-agụ ná ndị ruru eru maka alaeze Chineke, bụ́ n’ezie nke unu na-atara ahụhụ. Nke a na-egosi na ọ bụ ezi omume n’ebe Chineke nọ iji mkpagbu kwụghachi ndị ahụ na-eme ka unu nwee mkpagbu, ma, nye unu ndị na-enwe mkpagbu, iwetara anyị na unu ahụ́ efe ná mkpughe nke Onyenwe anyị Jizọs site n’eluigwe ya na ndị mmụọ ozi ya dị ike, n’ọkụ na-enwu enwu, ka ọ na-eweta ịbọ ọbọ n’isi ndị na-amaghị Chineke na ndị na-adịghị erube isi n’ozi ọma banyere Onyenwe anyị Jizọs.”—2 Ndị Tesalonaịka 1:5-8.

9, 10. (a) Olee otú Jehova si mee ka Juda merie ajọ ndị iro ha? (b) Gịnị ka Ndị Kraịst taa na-aghaghị ịnọgide na-eme?

9 Ná mkpagbu ukwu ahụ na-abịanụ, bụ́ nke ga-ejedebe n’Amagedọn, Kraịst ga-ebuso ihe ọjọọ nile agha. Ma ọ gaghị adị mkpa ka ụmụazụ ya lụọ ọgụ, ọbụna dị ka nke a na-adịghị mkpa nye ndị bi n’alaeze ebo abụọ nke Juda ọtụtụ puku afọ gara aga. Ọ bụ Jehova nwe agha ahụ, o mekwara ka e nwee mmeri. Ihe ndekọ ahụ na-agụ, sị: “Jehova tinyere ndị na-eru mbì imegide ụmụ Amọn na Moab na ugwu Sia, bụ́ ndị na-abakwuru Juda; e wee tigbuo ha. Ụmụ Amọn na Moab wee guzo imegide ndị bi n’ugwu Sia, iwezụga ha ka e bibie ha na ikpochapụ ha: mgbe ha mere ka ndị bi na Sia gwụsịa, ha wee nyere onwe ha aka, nwoke na ibe ya, ibibi onwe ha. Juda wee bịaruo ụlọ nche, ruo ọzara, ha wee lee ìgwè mmadụ ahụ anya; ma, lee, ha bụ ozu ozu daworo n’ala, ọ dịghịkwa onye gbapụrụ agbapụ.”—2 Ihe E Mere 20:22-24.

10 O mere kpọmkwem otú Jehova si buo ya n’amụma: “Ọ bụghị unu ga-enwe ibu agha” a. (2 Ihe E Mere 20:17) Nke a na-esetịpụrụ Ndị Kraịst ụkpụrụ ha ga-agbaso mgbe Jizọs Kraịst ga-aga “inwezu mmeri ya.” Ka ọ dịgodị, ha na-anọgide na-eji ngwá agha ime mmụọ, ọ bụghị nke nkịtị, na-alụso ihe ọjọọ ọgụ. N’ụzọ dị otú a, ha ‘nọgidere na-eji ezi ihe emeri ihe ọjọọ.’—Ndị Rom 6:13; 12:17-21; 13:12; 2 Ndị Kọrint 10:3-5.

Ònye Ga-eme Mwakpo Gọg?

11. (a) Olee òtù ndị Gọg ga-eji eme mwakpo ya? (b) Gịnị ka ịmụ anya n’ụzọ ime mmụọ na-agụnye?

11 A kọwara Gọg nke ala Megọg dị ka Setan bụ́ Ekwensu n’ọnọdụ ya dị ala kemgbe 1914. Dị ka mmụọ e kere eke, ọ pụghị ime mwakpo ahụ n’onwe ya, kama ọ ga-eji òtù ụmụ mmadụ mezuo uche ya. Olee òtù ụmụ mmadụ ndị ọ ga-eji mee ihe? Bible enyeghị anyị nkọwa zuru ezu, ma ọ na-enye anyị ihe ndị pụrụ inyere anyị aka ịmata ndị ha ga-abụ. Ka ihe omume ụwa na-ewere ọnọdụ ná mmezu nke amụma Bible, anyị ga-eji nke nta nke nta ghọtakwuo ya nke ọma. Ndị Jehova na-ezere ịkọ nkọ ma nọgide na-amụ anya n’ụzọ ime mmụọ, na-amara nke ọma banyere ihe omume ndị metụtara ọchịchị na okpukpe bụ́ ndị na-egosi mmezu nke amụma Bible.

12, 13. Olee otú Daniel si buo amụma banyere mwakpo ikpeazụ a ga-awakpo ndị Chineke?

12 Daniel onye amụma na-enyekwu nkọwa banyere mwakpo ikpeazụ a ga-awakpo ndị Chineke, na-ede, sị: “Ọ [eze ugwu] ga-ejikwa oké ọnụma pụọ ikpochapụ na iwezụga ọtụtụ mmadụ ka e bibie ha. Ọ ga-amakwa ụlọikwuu nile nke ụlọukwu ya n’etiti oké osimiri nile na ugwu nsọ ahụ mara mma.”—Daniel 11:44, 45.

13 N’oge Bible, “oké osimiri” ahụ bụ Oké Osimiri Ukwu, ma ọ bụ Oké Osimiri Mediterenian, “ugwu nsọ ahụ” bụkwa Zaịọn, bụ́ nke Jehova kwuru banyere ya, sị: “Mụ onwe m emewo ka eze m guzosie ike n’elu Zaịọn, bụ́ ugwu nsọ m.” (Abụ Ọma 2:6; Joshua 1:4) N’ihi ya, n’ụzọ ime mmụọ, ala dị “n’etiti oké osimiri nile na ugwu nsọ ahụ” na-anọchi anya ala ime mmụọ na-enwe ihe ịga nke ọma nke Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ na ya. Ha esoghịzi n’oké osimiri nke ụmụ mmadụ e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ, ha na-atụkwa anya iso Kraịst Jizọs chịa n’Alaeze eluigwe. N’ụzọ doro anya, ndị ohu Chineke e tere mmanụ, nakwa ndị enyi ha na-eguzosi ike n’ihe bụ́ oké ìgwè mmadụ ahụ, ga-abụ ndị eze ugwu ga-awakpo mwakpo ọjọọ ná mmezu nke amụma Daniel.—Aịsaịa 57:20; Ndị Hibru 12:22; Mkpughe 14:1.

Olee Otú Ndị Chineke Ga-esi Emeghachi Omume?

14. Olee ihe atọ ndị Chineke ga-eme mgbe a wakporo ha?

14 Gịnị ka a ga-atụ anya ka ndị ohu Chineke mee ozugbo a wakporo ha? Ọzọkwa, ihe mba ihe atụ nke Chineke mere n’oge Jehoshafat na-esetịpụ ụkpụrụ ha ga-agbaso. Rịba ama na e nyere ụmụ amaala ya iwu ime ihe atọ: (1) iguzo onwe ha, (2) iguzo, na (3) ịhụ nzọpụta Jehova. Olee otú ndị Chineke taa ga-esi eme ihe n’ụzọ kwekọrọ n’okwu ndị a?—2 Ihe E Mere 20:17.

15. Gịnị ka ndị Jehova iguzo onwe ha pụtara?

15 Iguzo onwe ha: N’akụdaghị aka, ndị Chineke ga-anọgide na-akwadosi Alaeze Chineke ike. Ha ga-anọgide na-anọpụ iche dị ka Ndị Kraịst. Ha ga-abụ “ndị na-eguzosi ike, ndị a na-apụghị ịkwapụ akwapụ” n’ozi ha ji iguzosi ike n’ihe na-ejere Jehova, ha ga-anọgidekwa na-eto Jehova n’ihu ọha n’ihi ebere ya. (1 Ndị Kọrint 15:58; Abụ Ọma 118:28, 29) Ọ dịghị nrụgide a na-enwe n’oge a ma ọ bụ nke a ga-enwe n’ọdịnihu ga-akwapụ ha n’ọnọdụ a Chineke nakweere.

16. N’ụzọ dị aṅaa ka ndị ohu Jehova ga-eguzo?

16 Iguzo: Ndị ohu Jehova agaghị anwa ichebe onwe ha kama ha ga-atụkwasị Jehova obi kpam kpam. Ọ bụ nanị ya nwere ikike ịnapụta ndị ohu ya n’ọgba aghara ụwa nọ na ya, o kwewokwa nkwa ime otú ahụ. (Aịsaịa 43:10, 11; 54:15; Abụ Ákwá 3:26) Ịtụkwasị Jehova obi ga-agụnye ịtụkwasị obi n’òtù a na-ahụ anya n’oge a nke o jiworo na-emezu nzube ya n’ụzọ doro anya eri ọtụtụ iri afọ. Ọ ga-adị ezi Ndị Kraịst mkpa n’oge ahụ karịa mgbe ọ bụla ọzọ inwe obi ike n’ebe ndị ha na ha na-efekọ ofufe bụ́ ndị Jehova na Eze ya na-achị achị nyere ikike idu ndú, nọ. Ndị ikom a na-ekwesị ntụkwasị obi ga-eduzi ndị Chineke. Ileghara nduzi ha anya pụrụ ịkpata ọdachi.—Matiu 24:45-47; Ndị Hibru 13:7, 17.

17. N’ihi gịnị ka ndị ohu Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi ga-eji hụ nzọpụta Jehova?

17 Ịhụ nzọpụta Jehova: Nzọpụta ka a ga-eji akwụghachi ndị nile nọgidere na-eguzosi ike n’ihe dị ka Ndị Kraịst na ndị tụkwasịrị Jehova obi maka nnapụta, ụgwọ. Ruo n’awa ikpeazụ—ruokwa ókè ike kwere ha—ha ga-akpọsa ọbịbịa nke ụbọchị ikpe Jehova. Ihe nile e kere eke aghaghị ịmara na Jehova bụ ezi Chineke ahụ nakwa na o nwere ndị ohu na-ekwesị ntụkwasị obi n’ụwa. Ọ gaghịzi adị mkpa ma ọlị ịnọgide na-ese okwu banyere oruru o ruuru Jehova ịbụ eze.—Ezikiel 33:33; 36:23.

18, 19. (a) Olee otú abụ mmeri ahụ dị n’Ọpụpụ isi 15 si egosipụta mmetụta nke ndị ga-alanahụ mwakpo Gọg? (b) Gịnị ka ndị Chineke kwesịrị ịdị na-eme ugbu a?

18 N’ịbụ ndị nwetakwuru ume, ndị Chineke ga-abanye n’ụwa ọhụrụ ahụ, dị nnọọ njikere ịbụ abụ mmeri, ọbụna dị ka ụmụ Izrel oge ochie bụrụ mgbe a napụtasịrị ha n’Oké Osimiri Uhie. N’inwe ekele ruo mgbe ebighị ebi n’ebe Jehova nọ maka nchebe ya, ha ga-ekwughachi, n’otu n’otu nakwa n’ìgwè, okwu ndị e kwuru ogologo oge gara aga, sị: “Ka m bụkuo Jehova abụ, n’ihi na O biliwo elu nke ukwuu . . . Jehova bụ onye agha: Jehova bụ aha Ya. . . . Jehova, aka nri Gị na-etipịa onye iro. N’ịdị ọtụtụ nke mbili elu Gị ka Ị na-akwada ndị na-ebili megide Gị: Ị na-ezipụ iwe Gị dị ọkụ, o richapụ ha dị ka ahịhịa ọka. . . . N’ebere Gị ka I duworo ndị nke Ị gbapụtaworo: n’ike Gị ka I duworo ha nwayọọ ruo ebe obibi Gị dị nsọ. . . . Ị ga-eme ka ha bata, Ị ga-akụkwa ha n’ugwu nke ihe nketa Gị, bụ́ ọnọdụ guzosiri ike I meworo, ka o wee bụrụ ebe Ị ga-ebi, Jehova, ebe dị nsọ, Onyenwe anyị, nke aka Gị abụọ meworo ka o guzosie ike. Jehova ga-abụ eze ruo mgbe nile ebighị ebi.”—Ọpụpụ 15:1-19.

19 Ugbu a oge inweta ndụ ebighị ebi na-eruwanye nso karịa mgbe ọ bụla ọzọ, lee ohere ọma ndị ohu Chineke nwere iji gosipụta nrara ha raara onwe ha nye Jehova na iji mee ka mkpebi ha mere ijere ya ozi dị ka Eze mgbe ebighị ebi ha sikwuo ike!—1 Ihe E Mere 29:11-13.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Gịnị mere o ji bụrụ ndị e tere mmanụ na atụrụ ọzọ ahụ ka Gọg ga-awakpo?

• Olee otú ndị Chineke ga-esi eguzo onwe ha?

• Gịnị ka iguzo pụtara?

• Olee otú ndị Chineke ga-esi ahụ nzọpụta Jehova?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 18]

Jehova nyere Jehoshafat na ndị ya mmeri, ọ dịghị mkpa na ha ga-alụ ọgụ

[Foto dị na peeji nke 20]

Ndị e tere mmanụ na atụrụ ọzọ ahụ na-ekere òkè n’ịkwado ọbụbụeze Jehova

[Foto dị na peeji nke 22]

Dị ka ụmụ Izrel oge ochie, ndị Chineke ga-abụ abụ mmeri n’oge na-adịghị anya