Inye Ihe nke Na-amasị Chineke
Inye Ihe nke Na-amasị Chineke
JIZỌS na ndị na-eso ụzọ ya nakwa ụfọdụ ezi ndị enyi ha, gụnyere Meri, Mata, na Lazarọs a ka si n’ọnwụ kpọlite, nọ na-eri nri dị ụtọ na Betani. Mgbe Meri weere mmanụ dị oké ọnụ ahịa nke dị otu paụnd n’ịdị arọ tee Jizọs n’ụkwụ, Judas Iskarịọt were iwe ma kwupụta iwe ya. “Gịnị mere na e reghị mmanụ a na-esi ísì ụtọ narị mkpụrụ ego dinarịọs atọ ma nye ya ndị ogbenye?” ka o mere ná mkpesa. Ndị ọzọ mekwara mkpesa yiri nke ahụ ngwa ngwa.—Jọn 12:1-6; Mak 14:3-5.
Otú ọ dị, Jizọs zara, sị: “Hapụnụ ya. . . . N’ihi na unu na ndị ogbenye nọ mgbe nile, mgbe ọ bụla unu chọkwara, unu pụrụ imere ha ihe ọma mgbe nile, ma mụ na unu anọghị mgbe nile.” (Mak 14:6-9) Ndị ndú okpukpe nke ndị Juu kụziri na ọ bụghị nanị na inye onyinye bụ àgwà ọma kama na ọ pụrụ ọbụna ikpuchi mmehie. N’aka nke ọzọ, Jizọs mere ka o doo anya na inye ihe nke na-amasị Chineke abụghị nanị inye ndị ogbenye onyinye ebere.
Ilebatụ anya n’otú e si nye ihe n’ọgbakọ Ndị Kraịst oge mbụ ga-egosi ụzọ ụfọdụ dị irè anyị pụrụ isi gosipụta nchegbu anyị nwere ma si otú ahụ na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ site n’inye ihe. Ọ ga-emekwa ka a mata ụdị inye ihe pụrụ iche bụ́ nke kasị aba uru.
“Nye Onyinye Ebere”
Jizọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ọtụtụ mgbe ‘inye onyinye ebere,’ ma ọ bụ dị ka nsụgharị ọzọ si sụgharịa ya ‘ịrụ ọrụ ebere.’ (Luk 12:33; Bible Nsọ nke Union Version) Otú ọ dị, Jizọs dọrọ aka ná ntị megide oké ngosipụta nke a na-eme nanị iji nye onye ahụ na-enye ihe otuto kama inye Chineke otuto. “Mgbe ị na-aga inye onyinye ebere,” ka o kwuru, “afụla opi mgbe ị na-aga, dị nnọọ ka ndị ihu abụọ na-eme n’ụlọ nzukọ na n’okporo ámá, ka ndị mmadụ wee nye ha otuto.” (Matiu 6:1-4) N’itinye ndụmọdụ a n’ọrụ, Ndị Kraịst oge mbụ zeere oké ngosipụta nke ndị ndú okpukpe na-eme nsọ nsọ nke oge ha ma họrọ inyere ndị nọ ná mkpa aka site n’ijere ha ozi n’onwe ha ma ọ bụ inye ha onyinye na nzuzo.
Dị ka ihe atụ, na Luk 8:1-3, a gwara anyị na Meri Magdalin, Joana, Suzana na ndị ọzọ “sitere n’ihe ndị ha nwere” hụ maka mkpa Jizọs na ndịozi ya n’emeghị ka mmadụ mara. Ọ bụ ezie na ndị ikom ndị a abụghị ndị ụwa na-atụ n’ọnụ, ha ahapụwo ihe ha ji akpata ego iji tinye mgbalị ha nile n’ozi ahụ. (Matiu 4:18-22; Luk 5:27, 28) Site n’inyere ha aka ịrụzu ọrụ Chineke nyere ha, ndị inyom ndị a nyere Chineke otuto dị ka a pụrụ isi kwuo ya. Chineke gosipụtakwara ekele o nwere site n’ikwe ka e dekọọ mmesapụ aka ha ji obi ebere gosipụta n’ime Bible ka ọgbọ nile a ga-enwe n’ọdịnihu na-agụ ya.—Ilu 19:17; Ndị Hibru 6:10.
Dọkas bụ nwanyị obiọma ọzọ nke “jupụtara n’ezi ọrụ na onyinye ebere.” N’obodo ya bụ́ Jọpa nke dị n’akụkụ oké osimiri, ọ na-akwara ndị inyom di ha nwụrụ bụ́ ndị nọ ná mkpa ákwà. Anyị amaghị ma ọ bụ ya na-azụta ákwà ndị o ji akwa uwe ndị ahụ ka ihe ọ na-eme ọ̀ bụ nanị ịkwa ha akwa. Otú o sina dị, ezi ọrụ ya mere ka ndị o nyeere aka hụ ya n’anya, o mekwara ka Chineke hụ ya n’anya, bụ́ onye ji obi ebere gọzie ọrụ ọma ya.—Ọrụ 9:36-41.
Ezi Ebumnobi Dị Oké Mkpa
Gịnị kpaliri ndị a inye ihe? Ihe kpaliri ha abụghị nanị obi ọmịiko ha nwere n’ihi arịrịọ na-emetụ n’ahụ́ a rịọrọ ha maka enyemaka. Ha chere n’onwe ha na o kwesịrị ekwesị ha ime ihe ha pụrụ ime kwa ụbọchị iji nyere ndị dara ogbenye, ndị nsogbu dakwasịrị, ndị ọrịa, na ndị ihe na-esiri ike n’ụzọ ndị ọzọ, aka. (Ilu 3:27, 28; Jems 2:15, 16) Nke a bụ ụdị inye ihe na-amasị Chineke. Ihe bụ́ isi na-akpali nke a bụ ịhụnanya miri emi e nwere n’ebe Chineke nọ na ọchịchọ nke iṅomi àgwà ya nke ịdị obi ebere na imesapụ aka.—Matiu 5:44, 45; Jems 1:17.
Jọn onyeozi mere ka akụkụ a dị oké mkpa nke inye ihe pụta ìhè mgbe ọ jụrụ, sị: “Onye ọ bụla nwere ihe ụwa a ndị e ji akwado ndụ ma hụ nwanna ya ka ọ nọ ná mkpa ma mechibidokwa ya ọnụ ụzọ nke obi ọmịiko ya, n’ụzọ dị aṅaa ka ịhụnanya maka Chineke si adịgide n’ime ya?” (1 Jọn 3:17) Azịza ya doro anya. Ịhụnanya e nwere n’ebe Chineke nọ na-akpali ndị mmadụ ịrụ ọrụ ebere. Chineke ji ndị na-egosipụta mmụọ mmesapụ aka dị ka ọ na-eme kpọrọ ihe ma na-akwụghachi ha ụgwọ. (Ilu 22:9; 2 Ndị Kọrint 9:6-11) Ànyị na-ahụ ụdị mmesapụ aka a taa? Tụlee ihe mere n’oge na-adịbeghị anya n’otu ọgbakọ Ndịàmà Jehova.
Ụlọ otu agadi nwanyị bụ́ Onye Kraịst chọrọ nnọọ nrụzi. Ọ bụ nanị ya bi, o nweghịkwa ezinụlọ nke ga-enyere ya aka. Ruo ọtụtụ afọ, ụlọ ya abụwo mgbe nile ebe a na-anọ enwe nzukọ Ndị Kraịst, mgbe mgbe kwa, ọ na-akpọ òkù ka onye ọ bụla chọrọnụ bịa soro ya rie nri. (Ọrụ 16:14, 15, 40) Mgbe ndị nọ n’ọgbakọ hụrụ ọnọdụ ọjọọ ọ nọ na ya, ha gbakọtara inyere ya aka. Ụfọdụ nyere ego, ndị ọzọ nyere ike ọkpụkpụ aka ha. N’ime ngwụsị izu ole na ole, ndị ọrụ afọ ofufo ji gbam gbam ọhụrụ kụchiere ya elu ụlọ ya, rụọrọ ya ụlọ ịsa ahụ́ ọhụrụ, tee okpukpu mbụ nke ụlọ ahụ simenti na ágbá, ma rụnye kọbọdụ ọhụrụ na kichin ya. Ọ bụghị nanị na ihe ha nyere gboro mkpa nwanyị ahụ kamakwa o mere ka ndị nọ n’ọgbakọ ahụ na-akpachikwu anya, meekwa ka ndị agbata obi ha na-ele ya anya dị ka ihe atụ nke ezi inye ihe nke Ndị Kraịst.
E nwere ọtụtụ ụzọ anyị pụrụ isi nyere ndị ọzọ aka n’onwe anyị. Ànyị pụrụ iwepụta oge soro nwa na-enweghị nna nọkọọ? Ànyị pụrụ ịga zụtatụrụ nwanyị di ya nwụrụ nke meworo agadi anyị maara ihe ma ọ bụ kwaara ya ákwà? Ànyị pụrụ isi nri bugara onye ọ na-enwechaghị ka ọ ha ya ma ọ bụ nyetụ ya ego? Ọ dịghị mkpa na anyị ga-abarịrị ọgaranya iji nyere ndị ọzọ aka. Pọl onyeozi dere, sị: “Ọ bụrụ na ịdị njikere ahụ bu ụzọ dịrị, a na-anara ya nke ọma karịsịa dị ka ihe mmadụ nwere si dị, ọ bụghị dị ka ihe mmadụ na-enweghị si dị.” (2 Ndị Kọrint 8:12) Otú ọ dị, mmadụ iji aka ya enye ihe otú ahụ ọ̀ bụ nanị ụdị inye ihe nke Chineke ga-agọzi? Ee e.
Gịnị Banyere Ihe Enyemaka Ndị A Haziri Ahazi?
Mgbe ụfọdụ, mmadụ iji aka ya enye ndị nọ ná mkpa ihe ezughị. N’ezie, Jizọs na ndịozi ya nwere ihe ha ji atụkọta ego maka ndị ogbenye, ha natakwara onyinye site n’aka ndị nwere obiọma bụ́ ndị ha zutere n’ọrụ ha. (Jọn 12:6; 13:29) N’otu aka ahụ, ọgbakọ dị iche iche nke narị afọ mbụ nakọtara onyinye mgbe e nwere mkpa ma hazie ihe enyemaka n’ọ̀tụ̀tụ̀ buru ibu.—Ọrụ 2:44, 45; 6:1-3; 1 Timoti 5:9, 10.
Otu n’ime oge ndị ahụ bụ n’ihe dị ka 55 O.A. Ọgbakọ ndị dị na Judia bịara daa ogbenye, ikekwe n’ihi oké ụnwụ nri nke ka mepụrụ n’ebe ahụ. (Ọrụ 11:27-30) Pọl onyeozi, n’ịbụ onye na-egosi nchegbu mgbe nile banyere ndị ogbenye, rịọrọ ọgbakọ ndị dị na Masedonịa nke dị n’ebe dị anya ka ha nye aka. O ji aka ya hazie ịnakọta ihe ma bunye ya ndị ikom a nwapụtara anwapụta ka ha bugara ya ndị Judia. (1 Ndị Kọrint 16:1-4; Ndị Galeshia 2:10) Ma ya ma ndị ọzọ soro ya rụọ ọrụ ahụ adịghị onye a kwụrụ ụgwọ maka ọrụ ọ rụrụ.—2 Ndị Kọrint 8:20, 21.
Ndịàmà Jehova taa na-adịkwa ngwa inye aka mgbe e nwere ọdachi. Dị ka ihe atụ, n’oge ọkọchị nke afọ 2001, oké mmiri ozuzo kpatara oké idei mmiri na Houston, Texas, U.S.A. N’ozuzu, ebe obibi 723 nke Ndịàmà mebiri ruo n’ókè ụfọdụ, ọtụtụ n’ime ha mebiri n’ụzọ dị njọ. E guzobere kọmitii enyemaka maka ọdachi ozugbo, bụ́ nke ndị okenye bụ́ Ndị Kraịst ruru eru mejupụtara, iji chọpụta mkpa nke ndị mmadụ n’otu n’otu nwere na izigara Ndịàmà nọ n’ebe ahụ ego iji nyere ha aka ịhụ maka ọnọdụ ahụ na iji rụzie ebe obibi ha. Ndị ọrụ afọ ofufo dị njikere ịrụ ọrụ bụ́ ndị sitere n’ọgbakọ ndị dị nso rụrụ ọrụ nile e nwere. Otu Onyeàmà nwere nnọọ ekele maka aka e nyeere ya nke na mgbe ọ natara ego site n’ụlọ ọrụ inshọransị iji rụzie ụlọ ya, o nyere ya ozugbo dị ka ego enyemaka ka e wee jiri ya nyere ndị ọzọ nọ ná mkpa aka.
Ilu 14:15 na-asị: “Onye na-enweghị uche na-ekwere okwu nile ọ bụla: ma onye nwere ezi uche na-aghọta ijeụkwụ ya.” Ya mere, ọ bụ ihe amamihe dị na ya inyocha ihe nile nke ọma.
Otú ọ dị, mgbe a bịara n’ọrụ ebere a haziri ahazi, ọ dị mkpa ka anyị kpachara anya ka anyị na-enyocha ọtụtụ arịrịọ ndị a na-arịọ maka enyemaka. Ụfọdụ òtù ọrụ ebere na-emefu ego dị ukwuu n’ịkwụ ndị ọrụ ha ụgwọ ọnwa ma ọ bụ n’ịgba ndị mmadụ ume inye onyinye, na-eme ka ego ga-afọdụzi iji mee ihe e bu n’uche nye onyinye ahụ pee nnọọ mpe.Inye Ihe nke Kasị Aba Uru
E nwere ụdị inye ihe nke dị mkpa ọbụna karịa ịrụ ọrụ ebere. Jizọs zoro aka na nke a mgbe otu nwa okorobịa bụ́ onye ọchịchị bara ọgaranya jụrụ ya ihe ọ na-aghaghị ime iji nweta ndụ ebighị ebi. Jizọs gwara ya, sị: “Gaa ree ihe i nwere nye ndị ogbenye, ị ga-enwekwa akụ̀ n’eluigwe, bịakwa bụrụ onye na-eso ụzọ m.” (Matiu 19:16-22) Rịba ama na ihe Jizọs kwuru abụghị nanị, ‘Nye ndị ogbenye ihe, ị ga-enwetakwa ndụ ebighị ebi.’ Kama nke ahụ, ọ gbakwụnyere, sị, “Bịakwa bụrụ onye na-eso ụzọ m.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọ bụ ezie na ịrụ ọrụ ebere kwesịrị ịja mma ma baa uru, ịbụ onye na-eso ụzọ Kraịst gụnyere ihe karịrị nke ahụ.
Nchegbu bụ́ isi Jizọs nwere bụ inyere ndị ọzọ aka n’ụzọ ime mmụọ. Obere oge tupu ọnwụ ya, ọ gwara Paịlet, sị: “Ọ bụ n’ihi nke a ka e jiworo mụọ m, ọ bụkwa n’ihi nke a ka m jiworo bịa n’ụwa, ka m wee gbaara eziokwu àmà.” (Jọn 18:37) Ọ bụ ezie na Jizọs butere ụzọ n’inyere ndị ogbenye aka, n’ịgwọ ndị ọrịa, na n’inye ndị agụụ na-agụ nri, isi ihe mere o ji nye ndị na-eso ụzọ ya ọzụzụ bụ ime nkwusa. (Matiu 10:7, 8) N’ezie, otu n’ime ntụziaka ndị ikpeazụ o nyere ha bụ iwu bụ́: “Ya mere gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.”—Matiu 28:19, 20.
N’ezie, ime nkwusa agaghị agwọta nsogbu nile e nwere n’ụwa. N’agbanyeghị nke ahụ, izi ụdị mmadụ nile ozi ọma nke Alaeze Chineke na-ewetara Chineke otuto n’ihi na ime nkwusa na-emezu uche Chineke ma na-eme ka o kwe ndị nabatara ozi Chineke omume irite uru ndị na-adịru ebighị ebi. (Jọn 17:3; 1 Timoti 2:3, 4) Gịnị ma i gee ntị n’ihe Ndịàmà Jehova nwere ikwu mgbe ọzọ ha bịara na nke gị? Ha ji onyinye ime mmụọ na-abịa. Ha makwaara na nke a bụ ụzọ kasị mma ha pụrụ isi nye gị ihe.
[Foto ndị dị na peeji nke 6]
E nwere ọtụtụ ụzọ anyị pụrụ isi gosi na anyị na-eche banyere ndị ọzọ
[Foto dị na peeji nke 7]
Anyị ikwusa ozi ọma na-enye Chineke obi ụtọ ma na-eme ka o kwe anyị omume irite uru ndị na-adịru ebighị ebi