Isure Ihe Nsure Ọkụ Na-esi Ísì Ụtọ—Ò Nwere Ọnọdụ n’Ezi Ofufe?
Isure Ihe Nsure Ọkụ Na-esi Ísì Ụtọ—Ò Nwere Ọnọdụ n’Ezi Ofufe?
“ÍSÌ ụtọ na-amasị ndị bụ́ chi.” Nke ahụ bụ ihe a na-ekwukarị n’Ijipt oge ochie. Nye ha, isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ bụ nnọọ akụkụ nke ofufe ha. N’ihi ikwere na ndị bụ́ chi nọ ha nso, ndị Ijipt surere ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ kwa ụbọchị n’ụlọ nsọ ha, n’ebe ịchụàjà dị n’ụlọ ha, na ọbụna mgbe ha na-azụ ahịa. Mba ndị ọzọ nwere omenala ndị yiri nke ahụ.
Gịnị bụ ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ? Okwu ahụ pụrụ izo aka n’anwụrụ ọkụ nke ihe nsure ọkụ ma ọ bụ n’ihe ahụ a na-esure n’ọkụ. A na-eji ihe na-esi ísì ọma na mgba, dị ka frankinsens na balsam, eme ya. A na-egweri ha egweri ka ha dịrị ntụ ntụ, a na-etinyekarịkwa ha ihe ndị dị ka ihe ndị na-eme ka ihe sie ísì ụtọ, ụgbụgbọ osisi, na okooko osisi iji mee ka ọ na-esi ụdị ísì ọma ụfọdụ bụ́ nke ga-ekwekọ n’ihe e bu n’uche na-akwadebe ya.
Ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ bụ nnọọ ihe a na-achọsi ike n’oge ochie, n’ihi ya kwa, bụrụ ihe bara nnọọ uru nke na ihe ndị e ji eme ya bịara ghọọ ihe ndị na-aga ahịa. Ndị ahịa na-esi n’ebe ndị dị anya ebubata ihe ndị a. Ị pụrụ icheta na ndị e resịrị nwa Jekọb bụ́ Josef bụ ndị Ishmael na-azụ ahịa bụ́ ndị si “[Gilied] na-abịa, [kamel] ha na-ebukwa ụda na balm ma myrrh, na-eje iweda ya n’Ijipt.” (Jenesis 37:25) Ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ ghọrọ ihe a na-achọsi ike nke na ụzọ ndị na-agba ahịa frankinsens na-esi, nke ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na ọ bụ ndị ahịa ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ mepere ya, mere ka a malite isi Eshia na-aga Europe.
Ọtụtụ okpukpe taa ka na-esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ mgbe ha na-eme ememe. Tụkwasị na nke ahụ, ọtụtụ ndị na-ahọrọ isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ụlọ ha nanị iji nụrụ ísì ọma ya. Olee otú Ndị Kraịst kwesịrị isi na-ele isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ anya? Chineke ọ̀ na-anakwere ya n’ofufe? Ka anyị tụlee ihe Bible nwere ikwu n’okwu ahụ.
‘Nsọ Ka Ọ Ga-adị n’Ebe Jehova Nọ’
N’etiti ndị Izrel oge ochie, isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ so n’ọrụ ndị bụ́ isi ndị nchụàjà rụrụ n’ụlọikwuu ahụ. Cyclopedia nke McClintock na Strong dere na-ekwu, sị: “N’ezie, o yiri ka ndị Hibru hà lere nnọọ isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ anya dị ka ife ofufe ma ọ bụ ịchụ àjà dị nsọ nke na ọ dịghị ihe ọzọ anyị na-agụta na ha ji ya mee ma ọ́ bụghị iji ya na-efe ofufe.”
Jehova Chineke kwuru ihe anọ a ga-agwakọta ma suree n’ọkụ n’ụlọikwuu ahụ: “Chịrị n’onwe gị ụda ụtọ dị iche iche, stacte, na onycha, na galbanum; bụ́ ụda ụtọ, ha na [frankinsens] a na-agwaghị agwa: ha ga-aha n’ọ̀tụ̀tụ̀; ị ga-eme ya ka ọ bụrụ ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, mmanụ otite na-esi ísì ụtọ a sụgwara asụgwa, bụ́ ọrụ onye na-asụgwa mmanụ otite na-esi ísì ụtọ, nke e tinyere nnu, nke a na-agwaghị agwa, dịkwa nsọ: ị ga-esukwa ụfọdụ n’ime ya ka ọ dị imurimu, were ụfọdụ n’ime ya tinye n’ihu ihe àmà ahụ n’ụlọikwuu nzute.” (Ọpụpụ 30:34-36) Ndị ọkà mmụta na-ekwu na ndị rabaị bụ́ ndị Juu mesịrị tinye ihe ndị ọzọ n’ime ya maka iji ya eme ihe n’ụlọ nsọ ahụ.
Ihe nsure ọkụ e surere n’ụlọikwuu ahụ dị nsọ, Ọpụpụ 30:37, 38) Ndị nchụàjà surere ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ ugboro abụọ n’ụbọchị n’elu ebe ịchụàjà e mere maka ya. (2 Ihe E Mere 13:11) N’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie kwa, nnukwu onye nchụàjà na-esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile.—Levitikọs 16:12, 13.
e ji ya mee ihe nanị n’ofufe nke Chineke. Jehova nyere iwu, sị: “Ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nke ị ga-eme, unu emerela onwe unu nke dị ka ya n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya: nsọ ka ọ ga-adịrị gị n’ebe Jehova nọ. Onye ọ bụla nke ga-eme nke dị ka ya, ịnụ ísì ya, a ga-ebipụkwa ya n’etiti ụmụnna ya.” (Ọ bụghị àjà ihe nsure ọkụ nile na-esi ísì ụtọ ka Chineke na-anabata. O nyere ndị na-abụghị ndị nchụàjà ntaramahụhụ bụ́ ndị ji mpako suree ya dị ka a ga-asị na ha bụ ndị nchụàjà. (Ọnụ Ọgụgụ 16:16-18, 35-40; 2 Ihe E Mere 26:16-20) Ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nke mba ndị Juu surere bụ ihe arụ n’anya Jehova mgbe ha nọ n’otu oge ahụ na-ekere òkè n’ofufe ụgha ma bụrụ ndị aka ha jupụtara n’ọbara. Ihu abụọ ha mere ka Jehova kwuo, sị: “Ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, ihe arụ ka ọ bụụrụ m.” (Aịsaịa 1:13, 15) Ndị Izrel leghaara nnọọ ihe ndị e kwuru banyere ofufe Jehova anya nke na ha mechiri ụlọ nsọ ahụ ma suree ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ebe ịchụàjà ndị ọzọ. (2 Ihe E Mere 28:24, 25) Mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, ọbụna e ji ihe nsure ọkụ dị nsọ mee ihe n’ofufe rụrụ arụ nke chi ụgha dị iche iche. Omume ndị dị otú ahụ bụ inupụrụ Jehova isi.—Ezikiel 16:2, 17, 18.
Ihe Nsure Ọkụ Na-esi Ísì Ụtọ na Ndị Kraịst Oge Mbụ
Ọgbụgba ndụ iwu ahụ, gụnyere iwu e nyere ndị nchụàjà ka ha na-esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ bịara ná njedebe mgbe Kraịst guzobere ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ na 33 O.A. (Ndị Kọlọsi 2:14) E nweghị ihe ndekọ ọ bụla na-egosi na Ndị Kraịst oge mbụ surere ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ihi ihe ndị metụtara okpukpe. Banyere nke a, Cyclopedia nke McClintock na Strong dere na-ekwu, sị: “O doro anya na [Ndị Kraịst oge mbụ] ejighị ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ mee ihe. N’ezie, iji ya eme ihe bụ ihe e ji amata ikpere arụsị . . . Onye ji okpukpe kpọrọ ihe ịtụsa ụmụ irighiri ihe ndị e ji esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ebe a na-achụrụ arụsị àjà bụ omume na-egosi ofufe.”
Ndị Kraịst oge mbụ jụkwara isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ iji gosi na ha kweere na eze ukwu nke ndị Rom bụ “chi,” n’agbanyeghị na a pụrụ igbu ha n’ihi ya. (Luk 4:8; 1 Ndị Kọrint 10:14, 20) N’ihi otú e si jiri ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ na-eme ihe n’ikpere arụsị n’oge ahụ, ọ bụghị ihe ijuanya na Ndị Kraịst oge mbụ azụghị ahịa ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ.
Isure Ihe Nsure Ọkụ Na-esi Ísì Ụtọ Taa
Olee otú e si eji ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ eme ihe taa? N’ọtụtụ chọọchị nke Krisendọm, a na-esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ememe okpukpe dị iche iche. N’Eshia, ọtụtụ ezinụlọ na-esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ụlọ nsọ ma ọ bụ n’ebe ịchụàjà nke ezinụlọ iji sọpụrụ chi ha ma chebe ndị nwụrụ anwụ. N’ihe omume okpukpe, e jiwo ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ mee ihe n’ụzọ dịgasị iche iche ime ka ísì ya jupụta n’ụlọ, iji gwọọ ọrịa, iji mee ka ihe dị ọcha, na iji chebe ihe.
N’oge na-adịbeghị anya, ọtụtụ mmadụ, ọbụna
ndị na-abụghị ndị okpukpe, amaliteghachiwo isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ. Ụfọdụ na-esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ mgbe ha na-atụgharị uche. Otu akwụkwọ nduzi na-atụ aro iji ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ eme ihe iji na-eru “n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị omimi nke ịmata onwe” na iji na-enweta “ike” karịrị nke nkịtị. Iji chọta ihe ngwọta nke nsogbu ndị a na-enwe ná ndụ, ọ na-atụkwa aro ka a na-eme ememe isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ bụ́ nke na-agụnye iso “ndị karịrị mmadụ ike” na-emekọ ihe. Omume ndị dị otú ahụ hà bụ maka Ndị Kraịst?Jehova katọsiri ndị chọrọ ịgwakọta ihe omume okpukpe ụgha na ofufe dị ọcha ike. Pọl onyeozi hotara amụma Aịzaịa ma jiri ya mee ihe n’ebe Ndị Kraịst nọ, na-agba ha ume ka ha zere mmetụta na-adịghị ọcha nke okpukpe ụgha. O dere, sị: “‘Sinụ n’etiti ha pụọ, kewapụkwanụ onwe unu,’ ka Jehova na-asị, ‘kwụsịkwanụ ibitụ ihe na-adịghị ọcha aka’; ‘m ga-anabatakwa unu.’” (2 Ndị Kọrint 6:17; Aịsaịa 52:11) Ezi Ndị Kraịst na-elezi anya ịhụ na ha zeere ihe ọ bụla ya na ofufe ụgha ma ọ bụ mgbaasị nwere njikọ.—Jọn 4:24.
Eziokwu ahụ bụ́ na e ji ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ eme ihe n’ememe okpukpe nakwa ná mgbaasị ọ̀ pụtara na ọ dị njọ isure ihe nsure ọkụ ọ bụla na-esi ísì ụtọ? Ọ bụchaghị otú ahụ. Mmadụ nwere ike chọọ isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ụlọ ya nanị iji nụrụ ísì ọma ya. (Ilu 27:9) Ya bụrụgodị otú ahụ, mgbe Onye Kraịst na-ekpebi ma ọ ga-esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ ma ọ bụ na ọ gaghị eme otú ahụ, o kwesịrị ịtụle ihe ụfọdụ. Ndị bi n’ógbè unu hà ga-ewere ya na ị na-ekpe okpukpe ụgha mgbe ị na-esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ? N’ógbè unu, à na-ewerekarị isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ dị ka ime mgbaasị? Ka à na-ejikarị ya eme ihe ndị na-emetụtaghị okpukpe?
Ọ bụrụ na mmadụ ahọrọ isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, o kwesịrị ichebara ma akọ na uche ya ma mmetụta nke ndị ọzọ echiche mgbe ọ na-eme mkpebi. (1 Ndị Kọrint 10:29) Okwu Pọl onyeozi gwara ndị Rom metụtara nke a. O dere, sị: “Ka anyị na-achụso ihe ndị na-akpata udo na ihe ndị na-ewuli ibe anyị elu. Kwụsịnụ ibibi ọrụ Chineke nanị n’ihi ihe oriri. N’eziokwu, ihe nile dị ọcha, ma ọ bụụrụ onye na-eri ihe n’ọnọdụ na-akpata ịsụ ngọngọ ihe ọjọọ. Ọ dị mma ịghara iri anụ ma ọ bụ ịṅụ mmanya ma ọ bụ ime ihe ọ bụla nke na-eme ka nwanna gị sụọ ngọngọ.”—Ndị Rom 14:19-21.
Ekpere Ndị ‘E Doziri Dị Ka Ihe Nsure Ọkụ Na-esi Ísì Ụtọ’
Ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nke ndị Izrel na-esure bụ ihe atụ dabara adaba nke ekpere ndị Chineke na-anụ. N’ihi ya, ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid bụkuru Jehova abụ, sị: “Ka e dozie ekpere m dị ka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ihu Gị.”—Abụ Ọma 141:2.
Ndị Izrel kwesịrị ntụkwasị obi eleghị isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ anya dị ka ihe e ji emezu iwu. Ha ji nlezianya kwadebe ma suree ya n’ụzọ Jehova kwuru ka e si na-eme ya. Kama iji ihe nsure ọkụ nkịtị na-esi ísì ụtọ na-eme ihe, Ndị Kraịst taa na-ekpe ekpere ndị na-egosipụta ekele na nkwanye ùgwù miri emi ha nwere n’ebe Nna anyị nke eluigwe nọ. Dị ka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nke ndị nchụàjà na-arụ ọrụ n’ụlọ nsọ ahụ surere, Okwu Chineke na-emesi anyị obi ike, sị: “Ekpere ndị ziri ezi bụ ihe na-atọ Ya ụtọ.”—Ilu 15:8.
[Foto ndị dị na peeji nke 29]
Ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ ndị e surere n’ụlọikwuu nakwa n’ụlọ nsọ ahụ dị nsọ
[Foto dị na peeji nke 30]
Ò kwesịrị ka Ndị Kraịst na-esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ mgbe ha na-atụgharị uche?