“Unu Atụla Egwu, Unu Atụkwala Ụjọ”
“Unu Atụla Egwu, Unu Atụkwala Ụjọ”
“Unu atụla egwu, unu atụkwala ụjọ: . . . Jehova nọnyekwaara unu.”—2 IHE E MERE 20:17.
1. Olee mmetụta iyi ọha egwu na-enwe n’ahụ́ ndị mmadụ, n’ihi gịnịkwa ka egwu ha na-atụ ji kwe nghọta?
IYI ỌHA EGWU! Okwu a na-amapụ obi, na-eme ka e nwee mmetụta nke anọghị ná nchebe na enweghị enyemaka. Ọ na-akpali ụjọ, iru újú, na iwe n’otu mgbe. Ọ bụkwa okwu na-akọwa ihe ọtụtụ mmadụ na-atụ egwu na ọ ga-emekpa ihe a kpọrọ mmadụ ahụ́ ruo ọtụtụ afọ na-abịanụ. Eziokwu ahụ bụ́ na ruo ọtụtụ iri afọ, ụfọdụ mba enwebeghị ezigbo ihe ịga nke ọma n’ịhụ na a kwụsịrị ụdị nile nke iyi ọha egwu na-eme ka egwu dị otú ahụ ha na-atụ bụrụ nke kwesịrị ekwesị.
2. Olee otú Ndịàmà Jehova si emeghachi omume ná nsogbu nke iyi ọha egwu, na-eduga n’ajụjụ ndị dị aṅaa?
2 Otú o sina dị, e nwere ezi ihe mere a ga-eji nwee olileanya. Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị na-arụsi ọrụ nkwusa ike n’ala na n’ókèala 234 nke ụwa, na-enwe nchekwube n’ụzọ dị ịrịba ama. Kama ịtụ egwu na ọ dịghị mgbe a ga-akwụsị iyi ọha egwu, obi siri ha ike na a ga-akwụsị ya—ọ ga-abụkwa n’oge na-adịghị anya. Ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya iso ha nwee nchekwube dị otú ahụ? Ònyedị ga-enweli ihe ịga nke ọma
n’ikpochapụ ihe otiti a n’ụwa, oleekwa otú nke a ga-esi mee? Ebe ọ bụ na, ma eleghị anya, e mesowo anyị nile ihe ike n’ụzọ ụfọdụ, ọ ga-adị mma inyocha ihe ndabere maka nchekwube dị otú ahụ.3. Olee ihe ndị na-emenye ndị mmadụ egwu, oleekwa ihe ndị e buru n’amụma banyere oge anyị?
3 Taa, e nwere ihe ndị dịgasị iche iche na-emenye ndị mmadụ egwu ma na-atụ ha ụjọ. Chegodị banyere imerime ndị na-enweghịzi ike ilekọta onwe ha n’ihi nká, ndị ọrịa na-adịghị ala ala na-amịkpọ, na ezinụlọ ndị na-adọga ịkpata ihe e ji ebi ndụ. N’ezie, chegodị banyere otú ndụ n’onwe ya si bụrụ ihe a na-ejighị n’aka! Ọ pụrụ iyi ka ọnwụ mberede site n’ihe ọghọm ma ọ bụ ọdachi ọ̀ na-eche anyị mgbe nile, dịrị njikere ibibi ihe nile anyị ji kpọrọ ihe. Egwu na nchegbu dị otú ahụ, nakwa ọtụtụ nsogbu na ndakpọ olileanya ndị anyị na-enwe n’onwe anyị, emewo ka oge anyị bụrụ kpọmkwem ihe Pọl onyeozi kọwara: “Mara nke a, na n’ụbọchị ikpeazụ, oge pụrụ iche nke siri ike obibi gaje ịdị. N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ onwe ha n’anya, . . . ndị na-enweghị obi mmadụ, ndị na-adịghị njikere ime nkwekọrịta ọ bụla, ndị nkwutọ, ndị na-enweghị njide onwe onye, ndị na-eme ihe ike ike, ndị na-enweghị ịhụnanya maka ezi ihe.”—2 Timoti 3:1-3.
4. Olee ozi ọma dịnụ maka ọnọdụ ọjọọ a kọwara na 2 Timoti 3:1-3?
4 Ọ bụ ezie na akụkụ Akwụkwọ Nsọ a na-akọwa ọnọdụ ọjọọ, ka o sina dị, ọ na-eme ka e nwee olileanya. Rịba ama na oge ahụ pụrụ iche gaje ịdị “n’ụbọchị ikpeazụ” nke ajọ usoro ihe Setan nke dị ugbu a. Nke a na-apụta na a ga-enwe ahụ́ efe n’oge na-adịghị anya nakwa na a gaje iji ịchịisi nke Alaeze Chineke zuru okè, bụ́ nke Jizọs kụziiri ụmụazụ ya ikpe ekpere maka ya, dochie ajọ ụwa a n’isi nso. (Matiu 6:9, 10) Alaeze ahụ bụ ọchịchị eluigwe nke Chineke, bụ́ nke “a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi,” ka Daniel onye amụma na-ekwu, kama “ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile [nke mmadụ] mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”—Daniel 2:44.
Nnọpụiche Ndị Kraịst na Iyi Ọha Egwu
5. Olee otú mba dị iche iche siworo meghachi omume n’oge na-adịbeghị anya banyere egwu a na-eyi ọha?
5 Ruo ọtụtụ iri afọ, iyi ọha egwu eriwo isi ọtụtụ puku mmadụ. A matakwuru banyere ihe ize ndụ a n’ụzọ zuru ụwa ọnụ mgbe a wakposịrị New York City na Washington, D.C., na September 11, 2001. N’ihi otú iyi ọha egwu si baa ụba ma zuo ụwa ọnụ, mba ndị dị gburugburu ụwa jikọrọ aka ozugbo ịhụ na a kwụsịrị ya. Dị ka ihe atụ, na December 4, 2001, dị ka ozi ndị si n’aka ụlọ ọrụ mgbasa ozi si kwuo, “ndị minista na-ahụ maka ihe ndị na-eme ná mba ọzọ bụ́ ndị si ná mba 55 dị na Europe, Ebe Ugwu America na Ebe Etiti Eshia ji otu olu nakwere otu atụmatụ” e mere iji hụ na mgbalị ha ga-aga nke ọma. Otu onye nọ n’ọkwá dị elu n’ọchịchị United States toro ihe a e mere dị ka ime ka mgbalị a na-eme iji kwụsị iyi ọha egwu “sikwuo ike.” Na mberede, ọtụtụ narị nde mmadụ tinyere nnọọ aka n’ihe The New York Times Magazine kpọrọ “mmalite nke agha kpụ ọkụ n’ọnụ.” A mabeghị otú mgbalị ndị dị otú ahụ ga-esi gaa nke ọma. Otú ọ dị, ihe ga-esi n’agha dị otú ahụ a na-alụ megide iyi ọha egwu pụta emewo ka egwu na ụjọ jide ọtụtụ mmadụ, ma ọ bụghị ndị tụkwasịrị Jehova obi.
6. (a) N’ihi gịnị ka ọ pụrụ iji siere ụfọdụ ndị ike mgbe ụfọdụ ịnabata nnọpụiche Ndị Kraịst nke Ndịàmà Jehova? (b) Olee ihe nlereanya Jizọs setịpụụrụ ụmụazụ ya n’ihe ndị metụtara ọchịchị?
Jọn 15:19; 17:14-16; 18:36; Jems 4:4) Nke a na-achọ na ha ga-anọgide na-anọpụ iche n’ihe ndị metụtara ọchịchị ma ọ bụ ọha na eze. Jizọs n’onwe ya setịpụrụ ihe nlereanya kwesịrị ekwesị. N’ihi amamihe zuru okè na ikike dị ịrịba ama o nwere, ọ gaara emewo ka ihe omume ụmụ mmadụ nke oge ya ka mma. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ jụrụ itinye aka n’ihe ndị metụtara ọchịchị. Ná mmalite ozi ya, ọ jụrụ kpam kpam ịbụ onye ga na-achị alaeze nile nke ụwa, bụ́ nke Setan kwuru na ya ga-enye ya. Mgbe e mesịrị, o zeere nnọọ ịbụ onye e chiri eze.—Matiu 4:8-10; Jọn 6:14, 15.
6 A maara Ndịàmà Jehova nke ọma maka nnọpụiche ha n’ihe ndị metụtara ọchịchị. Ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ pụrụ ịdị njikere ịnabata nguzo a n’oge udo dị, ha adịchaghị anabata ya mgbe ọnọdụ ndị pụrụ iche bilitere. Egwu na ejighị ndụ n’aka nke agha na-akpata na-akpalikarị mmetụta siri ike nke ịhụ mba n’anya. Nke a pụrụ ime ka o siere ụfọdụ ndị ike ịghọta ihe mere mmadụ ọ bụla ga-eji na-ala azụ ịkwado mgbalị ndị nọ ná mba ya na-eme. Otú o sina dị, ezi Ndị Kraịst maara na ha aghaghị irube isi n’iwu Jizọs nke ịghara ịbụ “akụkụ nke ụwa.” (7, 8. (a) Gịnị ka nnọpụiche Ndịàmà Jehova n’ihe metụtara ọchịchị na-apụtaghị, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? (b) Olee otú Ndị Rom 13:1, 2 si akatọ ikere òkè n’imeso gọọmenti ihe ike?
7 E kwesịghị ịghọtahie nnọpụiche Ndịàmà Jehova ịpụta na ha na-akwado ma ọ bụ na-anabata ime ihe ike. Ha ime otú ahụ ga-abụ ime ihe megidere nzọrọ ha na-azọrọ na ha bụ ndị ohu “Chineke nke ịhụnanya na nke udo.” (2 Ndị Kọrint 13:11) Ha amatawo otú ime ihe ike na-adị Jehova. Ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Jehova na-anwa onye ezi omume: ma onye na-emebi iwu na onye na-ahụ ihe ike n’anya ka mkpụrụ obi Ya na-akpọ asị.” (Abụ Ọma 11:5) Ha makwaara ihe Jizọs gwara Pita onyeozi, bụ́: “Mịghachi mma agha gị n’ọnọdụ ya, n’ihi na ndị nile na-ebu mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.”—Matiu 26:52.
8 Ọ bụ ezie na akụkọ ihe mere eme na-egosi nke ọma na Ndị Kraịst adịgboroja ejiriwo “mma agha” mee ihe mgbe mgbe, Ndịàmà Jehova emebeghị otú ahụ. Ha na-ezere ihe omume nile dị otú ahụ. Ndịàmà na-eji ikwesị ntụkwasị obi erube isi na ndụmọdụ dị ná Ndị Rom 13:1, 2: “Ka mkpụrụ obi ọ bụla doo onwe ya n’okpuru ikike ndị ka elu [ndị ọchịchị], n’ihi na ikike ọ bụla adịghị ma ọ́ bụghị site na Chineke; Chineke debere ikike ndị dị adị n’ọkwá ha ndị ka ala. Ya mere, onye na-emegide ikike ahụ eguzogidewo ndokwa nke Chineke; ndị guzogideworo ya ga-anata ikpe nye onwe ha.”
9. Olee ụzọ abụọ Ndịàmà Jehova si ahụ na a kwụsịrị iyi ọha egwu?
9 Otú ọ dị, ebe iyi ọha egwu bụ ihe jọgburu onwe ya, ọ̀ bụ na Ndịàmà Jehova ekwesịghị inye aka iji hụ na a kwụsịrị ya? Ee, ha kwesịrị, ha na-emekwa otú ahụ. Nke mbụ, ha na-ezere ikere òkè n’ihe omume ọ bụla dị otú ahụ. Nke abụọ, ha na-akụziri ndị mmadụ ụkpụrụ Ndị Kraịst ndị ọ ga-abụ, ọ bụrụ na a gbasoo ha, ga-eme ka ụdị ihe ike nile kwụsị. * N’afọ gara aga, Ndịàmà ji awa 1,202,381,302 nyere ndị mmadụ aka ịmụta ụzọ Ndị Kraịst a. Nke a abụghị oge a lara n’iyi, n’ihi na n’ihi ọrụ a, e mere mmadụ 265,469 baptizim dị ka Ndịàmà Jehova, si otú a na-egosi n’ihu ọha na ha ajụwo ime ihe ike kpam kpam.
10. Olee otú a na-atụ anya na a ga-esi ekpochapụ ime ihe ike n’ụwa taa?
10 Ọzọkwa, Ndịàmà Jehova na-aghọta na ọ dịghị mgbe ha pụrụ ime ka ihe ọjọọ kwụsị n’ụwa n’onwe ha. Ọ bụ ya mere ha ji atụkwasị obi kpam kpam n’ebe onye pụrụ ime otú ahụ nọ—Jehova Chineke. (Abụ Ọma 83:18) N’agbanyeghị mgbalị ndị ụmụ mmadụ ji ezi obi na-eme, ha apụghị ime ka ime ihe ike kwụsị. Otu onye ji ike mmụọ nsọ soro dee Bible eburuwo ụzọ dọọ anyị aka ná ntị banyere oge anyị, bụ́ ‘ụbọchị ikpeazụ,’ ma na-asị: “Ndị ajọ mmadụ na ndị nduhie ga-anọgide na-ajọwanye njọ, na-eduhie ma bụrụ ndị a na-eduhie.” (2 Timoti 3:1, 13) E buru ọnọdụ a n’obi lee ya anya, a gaghị atụ anya na ụmụ mmadụ ga-emeri n’agha a a na-ebuso ihe ọjọọ. N’aka nke ọzọ, anyị pụrụ ịdabere n’ebe Jehova nọ iwepụ ihe ike kpam kpam n’ụzọ na-adịgide adịgide.—Abụ Ọma 37:1, 2, 9-11; Ilu 24:19, 20; Aịsaịa 60:18.
Ndị Na-adịghị Atụ Egwu n’Agbanyeghị Mwakpo Na-abịanụ
11. Olee ihe Jehova merela iji kpochapụ ime ihe ike?
11 Ebe ọ bụ na Chineke nke udo kpọrọ ime ihe ike asị, anyị pụrụ ịghọta ihe mere o jiworo buru ụzọ mee ihe iji bibie isi sekpụ ntị na-akpata ya, bụ́ Setan Ekwensu. N’ezie, O meworị ka onyeisi ndị mmụọ ozi bụ́ Maịkel—onye Chineke chiri Eze ọhụrụ, bụ́ Kraịst Jizọs—merie Setan n’ụzọ na-emenye ihere. Lee otú Bible si kọwaa ya: “Agha wee daa n’eluigwe: Maịkel na ndị mmụọ ozi ya busoro dragọn ahụ agha, dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya bukwara agha ma dragọn ahụ emerighị, e nwekwaghị ọnọdụ maka ha n’eluigwe. Otú ahụ ka e si chụda dragọn ukwu ahụ, bụ́ agwọ mbụ ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie ụwa dum mmadụ bi; a chụdara ya n’ụwa, chụdakwa ya na ndị mmụọ ozi ya.”—Mkpughe 12:7-9.
12, 13. (a) Gịnị dị ịrịba ama banyere afọ 1914? (b) Gịnị ka amụma Izikiel kwuru banyere ndị na-akwado Alaeze Chineke?
12 Ọgụgụ oge Bible na ihe ndị na-eme n’ụwa kwekọrọ n’ịrụtụ aka n’afọ 1914 dị ka oge a lụrụ agha ahụ n’eluigwe. Kemgbe ahụ, ọnọdụ ụwa anọgidewo na-aka njọ. Mkpughe 12:12 na-akọwa ihe kpatara ya, na-asị: “N’ihi nke a na-aṅụrịnụ ọṅụ, unu eluigwe nile na unu ndị bi n’ime ha! Ahụhụ ga-adịrị ụwa, dịkwara oké osimiri, n’ihi na Ekwensu arịdakwuruwo unu, na-ewe oké iwe, ebe ọ maara na o nwere oge dị mkpirikpi.”
13 N’ụzọ kwere nghọta, ndị Ekwensu na-eweso iwe n’ụzọ bụ́ isi bụ ndị e tere mmanụ na-efe Chineke ofufe na ndị ibe ha bụ́ “atụrụ ọzọ” ahụ. (Jọn 10:16; Mkpughe 12:17) Mmegide a ga-eru n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu mgbe Ekwensu ga-eji ajọ iwe wakpo ndị na-akwado Alaeze Chineke e guzobere eguzobe nakwa ndị na-atụkwasị obi na ya. N’Ezikiel isi 38, a kpọrọ mwakpo a ga-akpụ ọkụ n’ọnụ mwakpo “Gọg, nke ala Megọg” ga-eme.
14. Olee mgbalị ndị e meworo n’oge ndị gara aga iji chebe Ndịàmà Jehova, nke a ọ̀ ga-anọgide na-adị otú ahụ?
14 Kemgbe a chụpụrụ Setan n’eluigwe, mgbalị òtù ọchịchị ụfọdụ, bụ́ ndị a kọwara n’ụzọ ihe atụ ná Mkpughe 12:15, 16, na-eme echebewo ndị Chineke mgbe ụfọdụ pụọ ná mwakpo Setan. N’ụzọ dị iche, Bible na-egosi na n’oge Setan ga-eme mwakpo ikpeazụ ya, ọ dịghị òtù ụmụ mmadụ guzobere nke ga-agbachitere ndị tụkwasịrị Jehova obi. Nke a ò kwesịrị ime ka Ndị Kraịst tụwa egwu ma ọ bụ ụjọ? Ọ dịghị ma ọlị!
15, 16. (a) Olee nchekwube okwu ndị na-emesi obi ike Jehova gwara ndị ya n’oge Jehoshafat na-eme ka Ndị Kraịst taa na-enwe? (b) Olee ụkpụrụ Jehoshafat na ndị ahụ setịpụụrụ ndị ohu Chineke taa?
15 Chineke ga-adụnyere ndị ya úkwù dị 2 Ihe E Mere 20:15-17.
nnọọ ka ọ kwadoro mba ihe atụ ya n’oge Eze Jehoshafat. Anyị na-agụ, sị: “Ṅaanụ ntị, Juda nile, na ndị bi na Jeruselem, na eze anyị, bụ́ Jehoshafat, otú a ka Jehova sịrị unu, Unu onwe unu atụla egwu, unu atụkwala ụjọ n’ihu ìgwè mmadụ a bara ụba; n’ihi na ọ bụghị unu nwe agha nke a, kama ọ bụ Chineke nwe. . . . Ọ bụghị unu ga-enwe ibu agha n’agha nke a: guzonụ onwe unu, guzo, hụ nzọpụta Jehova n’etiti unu, Juda na Jeruselem: unu atụla egwu, unu atụkwala ụjọ: echi pụkwurunụ ha; Jehova nọnyekwaara unu.”—16 E mesiri ndị Juda obi ike na ọ gaghị adị mkpa ka ha lụọ ọgụ n’agha ahụ. N’otu aka ahụ, mgbe Gọg nke ala Megọg ga-awakpo ndị Chineke, ha agaghị ebuli ngwá agha iji chebe onwe ha. Kama nke ahụ, ha ‘ga-eguzo, hụ nzọpụta Jehova’ n’etiti ha. N’ezie, iguzo adịghị egosi ịnọ nnọọ nkịtị, ọbụna dị ka ndị Chineke n’oge Jehoshafat na-anọghị nnọọ nkịtị. Anyị na-agụ, sị: “Jehoshafat wee rube isi kpuchie ihu ya n’ala: Juda nile na ndị bi na Jeruselem dakwara n’ala n’ihu Jehova, ịkpọ isiala nye Jehova. . . . [Jehoshafat] wee mee ka ndị ya dụọ ya ọdụ, o wee guzo ndị na-abụku Jehova abụ, ndị na-etokwa ịma mma nke ịdị nsọ, mgbe ha na-apụ n’obodo n’ihu ndị e jikeere agha, sị, Keleenụ Jehova; n’ihi na ruo mgbe ebighị ebi ka ebere Ya dị.” (2 Ihe E Mere 20:18-21) Ee, ọbụna mgbe ndị iro na-achọ ịwakpo ha, ndị ahụ nọgidesiri ike na-eto Jehova. Nke a na-esetịpụ ụkpụrụ Ndịàmà Jehova ga-agbaso mgbe Gọg ga-awakpo ha.
17, 18. (a) Olee àgwà ọma Ndịàmà Jehova taa na-enwe banyere mwakpo Gọg? (b) Olee ihe ncheta e nyere ndị ntorobịa bụ́ Ndị Kraịst n’oge na-adịbeghị anya?
17 Ruo mgbe Gọg ga-amalite mwakpo ya—na ọbụna mgbe ọ malitesịrị—Ndịàmà Jehova ga-anọgide na-akwado Alaeze Chineke. Ha ga-anọgide na-enweta ume na nchebe site n’iso ihe karịrị ọgbakọ 94,600 e nwere gburugburu ụwa na-akpakọrịta. (Aịsaịa 26:20) Lee ka nke a si bụrụ oge kwesịrị ekwesị iji jiri obi ike na-eto Jehova! Ee e, ịtụ anya mwakpo Gọg adịghị eme ka ha sụlaa azụ n’ụjọ. Kama nke ahụ, ọ na-akpali ha ịmụba àjà otuto ha ruo nnọọ ókè ha nwere ike.—Abụ Ọma 146:2.
18 Ọtụtụ puku ndị na-eto eto n’ụwa nile bụ́ ndị banyeworo n’ozi oge nile na-egosipụta àgwà ọma a n’ụzọ kwesịrị nnọọ ekwesị. Iji gosi otú ịhọrọ ụzọ ndụ dị otú ahụ si bụrụ nke ka mma, e wepụtara traktị bụ́ Ndị Ntorobịa—Gịnị Abụ Ọma 119:14, 24, 99, 119, 129, 146.
Ka Unu Ga-eji Ndụ Unu Mee? ná mgbakọ distrikti ndị e nwere na 2002. Ndị Kraịst, ma ndị na-eto eto ma ndị agadi, nwere ekele maka ihe ncheta dị otú ahụ bịara n’oge ya.—19, 20. (a) Gịnị mere Ndị Kraịst na-ejighị nwee ihe mere ha ga-eji tụọ egwu ma ọ bụ ụjọ? (b) Gịnị ka isiokwu na-esonụ dịịrị ọmụmụ ga-eme?
19 N’agbanyeghị ọnọdụ ndị e nwere n’ụwa, ọ dịghị mkpa ka Ndị Kraịst na-atụ egwu ma ọ bụ ụjọ. Ha maara na, n’oge na-adịghị anya, Alaeze Jehova ga-eme ka ime ihe ike n’ụdị ya nile kwụsị kpam kpam. Ha na-enwetakwa nkasi obi n’ịmara na mbilite n’ọnwụ ga-eme ka ọtụtụ ndị e gburu n’ihe ike dịghachi ndụ. Ọ bụ ezie na nke a ga-eme ka ụfọdụ ndị nwee ohere mbụ ịmụ banyere Jehova, ọ ga-eme ka ndị ọzọ nwee ike ịnọgide n’ụzọ ndụ ha nke ijere ya ozi dị ka ndị raara onwe ha nye ya.—Ọrụ 24:15.
20 Dị ka ezi Ndị Kraịst, anyị na-aghọta mkpa ọ dị ịnọgide na-anọpụ iche dị ka Ndị Kraịst, anyị kpebisikwara ike ime otú ahụ. Anyị chọrọ ịnọgide na-enwe atụmanya dị ebube nke inwe ike ‘iguzo hụ nzọpụta Jehova.’ Isiokwu na-esonụ ga-ewusikwu okwukwe anyị ike site n’ime ka anyị mara ihe ndị na-eme n’oge a bụ́ ndị ji nwayọọ nwayọọ eme ka anyị na-aghọtakwu mmezu nke amụma Bible.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 9 Maka ihe atụ nke ndị kwụsịrị ibi ndụ ime ihe ike iji ghọọ Ndịàmà, lee mbipụta Teta! (Bekee) nke March 22, 1990, peeji nke 21; August 8, 1991 (Bekee), peeji nke 18; na mbipụta Ụlọ Nche nke January 1, 1996, peeji nke 5; August 1, 1998, peeji nke 5.
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
• Gịnị mere ọtụtụ ndị taa na-ejighị nnọọ enwe nchekwube?
• Gịnị mere Ndịàmà Jehova ji enwe nchekwube banyere ọdịnihu?
• Gịnị ka Jehova merela banyere ihe na-akpata ihe ike nile?
• Gịnị mere na anyị enweghị ihe mere anyị ga-eji na-atụ mwakpo Gọg egwu?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 13]
Jizọs setịpụrụ ihe nlereanya kwesịrị ekwesị banyere nnọpụiche Ndị Kraịst
[Foto ndị dị na peeji nke 16]
Ọtụtụ puku Ndịàmà na-eto eto ejiriwo ọṅụ banye n’ozi oge nile
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 12]
UN PHOTO 186226/M. Grafman