Ọ̀ Bụ Ihe Mgbe Ochie nke Na-agba Akaebe na Jizọs Biri n’Ụwa?
Ọ̀ Bụ Ihe Mgbe Ochie nke Na-agba Akaebe na Jizọs Biri n’Ụwa?
“IHE E Dere na Nkume nke Na-agba Akaebe Banyere Jizọs.” Ihe a ka e dere n’ihu magazin bụ́ Biblical Archaeology Review (November/December 2002). N’ihu magazin ahụ, e gosiri foto nke otu igbe ọkpụkpụ, ma ọ bụ ihe ndebe ọkpụkpụ, e ji nkume limestone mee, bụ́ nke a hụrụ n’Izrel. Ndị Juu ji ihe ndebe ọkpụkpụ mee ihe nke ukwuu n’obere oge dịrị n’agbata narị afọ mbụ T.O.A. na 70 O.A. Ihe mere igbe nke a ji dị ịrịba ama karịsịa bụ ihe e dere n’asụsụ Aramaic n’otu akụkụ ya. Ndị ọkà mmụta kwuru na ihe e dere na ya bụ: “Jems, nwa Josef, nwanne Jizọs.”
Dị ka Bible si kwuo, Jizọs nke Nazaret nwere nwanne aha ya bụ Jems bụ́ onye e weere dị ka nwa Josef, bụ́ di Meri. Mgbe Jizọs Kraịst kụziri ihe n’obodo ya, ndị gere ya ntị bụ́ ndị ozizi ya tụrụ n’anya jụrụ sị: “Onye a ọ́ bụghị nwa ọkwá nkà ahụ? Ọ́ bụghị nne ya ka a na-akpọ Meri, ọ̀ bụkwa na ụmụnne ya ndị ikom abụghị Jems na Josef na Saịmọn na Judas? Ụmụnne ya ndị inyom kwa, ọ̀ bụ na anyị na ha nile anọghị?”—Matiu 13:54-56; Luk 4:22; Jọn 6:42.
Ee, ihe e dere n’ihe ndebe ọkpụkpụ ahụ kwekọrọ ná nkọwa e nyere banyere Jizọs nke Nazaret. Ọ bụrụ na Jems e kwuru banyere ya n’ihe odide ahụ bụ nke otu nne ji ya na Jizọs Kraịst, mgbe ahụ, ọ ga-abụ “ihe kasị ochie, bụ́kwa nke na-esiteghị na Bible, nke na-agba akaebe banyere Jizọs,” ka André Lemaire, bụ́ ọkachamara n’ihe odide oge ochie, bụrụkwa onye dere isiokwu ahụ e kwuburu banyere ya na magazin bụ́ Biblical Archaeology Review, kwuru. Hershel Shanks, bụ́ editọ magazin ahụ, na-ekwu na ihe ndebe ọkpụkpụ ahụ “bụ ihe gbara ọkpụrụkpụ na ihe a na-ahụ anya nke malitere ịdị laa azụ n’oge nke otu onye kasị mkpa nke biworo n’ụwa.”
Otú ọ dị, aha atọ nile ahụ a gụtaliri n’ihe a e dere n’ihe ndebe ọkpụkpụ bụcha aha ọtụtụ mmadụ zara na narị afọ mbụ. N’ihi ya, ọ bụ ihe kwere omume na a ga-enwe ezinụlọ ọzọ na-abụghị nke Jizọs Kraịst nke e nwere ndị zara Jems, Josef, na Jizọs na ya. Lemaire na-eme atụmatụ, sị: “Na Jeruselem, n’ime ọgbọ abụọ ndị dịrị tupu 70 O.A., e nwere . . . ma eleghị anya mmadụ 20 a pụrụ ịkpọ ‘‘Jems ma ọ bụ Jekọb nwa Josef nwanne Jizọs.’” Otú o sina dị, ọ na-eche na e nwere ohere dị pasent 90 na Jems e dere n’ihe ndebe ọkpụkpụ ahụ bụ nke otu nne ji ya na Jizọs Kraịst.
Ọ dị ihe ọzọ na-eme ka ụfọdụ ndị kwere na Jems nke e dere banyere ya bụ nke otu nne ji ya na Jizọs Kraịst. Ọ bụ ezie na a na-edenyekarị aha nna onye nwụrụ anwụ n’ihe odide dị otú ahụ, a dịkebeghị edenye aha nwanne onye ahụ. N’ihi ya, ụfọdụ ndị ọkà mmụta kweere na Jizọs a aghaghị ịbụwo onye dị nnọọ mkpa, na-eme ka ha na-eche na ọ bụ Jizọs Kraịst, bụ́ onye guzobere Iso Ụzọ Kraịst.
Ihe Ndebe Ọkpụkpụ ahụ Ọ̀ Bụ nke Ezigbo Ya?
Gịnị bụ ihe ndebe ọkpụkpụ? Ọ bụ igbe, ma ọ bụ akpati, ebe a na-etinye ọkpụkpụ onye nwụrụ anwụ mgbe anụ ahụ́ ya rekasịrịla n’ọgba e liri ya. Ndị ohi zuuru ọtụtụ ihe ndebe ọkpụkpụ n’ebe ndị e liri mmadụ gburugburu Jeruselem. Ebe a hụrụ igbe ahụ e dere ihe banyere Jems na ya bụ n’ahịa a na-ere ihe mgbe ochie, ọ bụghị n’ebe a na-egwupụta ihe mgbe ochie. E kwuru na onye nwe ihe ndebe ọkpụkpụ ahụ zụrụ ya narị dollar ole na ole n’afọ ndị 1970. N’ihi ya, a mabeghị ebe ihe ndebe ọkpụkpụ ahụ sitere. “Ọ bụrụ na ị pụghị ikwu ebe a chọtara ihe mgbe ochie na ebe ọ dịrịla ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000, ị pụghị ịnwa ikwu njikọ dị n’etiti ihe ahụ na ndị aha ha pụrụ ịdị na ya,” ka Prọfesọ Bruce Chilton nke Kọleji Bard, New York, na-ekwu.
Iji mee ka a kwụsị ịrụ ụka na igbe ahụ abụghị ihe mgbe ochie, André Lemaire wegara ya n’Ebe Nnyocha Ala nke Izrel. Ndị na-eme nchọpụta n’ebe ahụ chọpụtara na e ji nkume limestone nke narị afọ mbụ ma ọ bụ nke abụọ O.A., mee ihe ndebe ọkpụkpụ ahụ. Ha kọrọ na “ọ dịghị ihe àmà gosiri na e ji ngwá ọrụ ọgbara ọhụrụ mee ya.” N’agbanyeghị nke ahụ, ndị ọkà mmụta Bible a gbara ajụjụ ọnụ n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times kwupụtara echiche bụ́ na “ihe akaebe na-agbachaghị ọkpụrụkpụ ndị na-akwado na ọ dị ihe jikọrọ igbe a na Jizọs siri ike ma eleghị anya, ka o sina dị, ha bụ ndị na-agbachaghị ọkpụrụkpụ.”
Magazin bụ́ Time na-ekwu na “ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọ dịghị onye gụrụ akwụkwọ n’oge a nke na-arụ ụka na Jizọs biri n’ụwa.” N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ndị na-eche na e kwesịrị inwe ihe akaebe ọzọ na-abụghị nke Bible nke na-egosi na Jizọs biri n’ụwa. Nkà mmụta ihe ochie ò kwesịrị ịbụ ihe mmadụ ga-adabere na ya kwere na Jizọs Kraịst? Olee ihe akaebe anyị nwere banyere ịdị adị nke “otu onye kasị mkpa nke biworo n’ụwa”?
[Ebe E Si Nweta Foto Ndi dị na peeji 3]
N’aka ekpe, Ihe Ndebe Ọkpụkpụ Jems: FOTO AFP/J.P. Moczulski; n’aka nri, ihe e dere na ya: FOTO AFP/HO