Ọ̀ Bụ Nanị Ihe A Na-emekarị Ka Ọ̀ Bụ Inye Aka Azụ?
Ọ̀ Bụ Nanị Ihe A Na-emekarị Ka Ọ̀ Bụ Inye Aka Azụ?
N’ỤFỌDỤ ụlọ akwụkwọ kọleji ndị e nwere na Poland, ụmụ akwụkwọ na-anatakarị ego iji zụta ihe ha ga-enye ndị nkụzi ha n’onyinye, na-atụ anya ịgafe n’ule. Ka a sịkwa ihe mere otu Onye Kraịst na-eto eto aha ya bụ Katarzyna ji chee ọnọdụ tara akpụ ihu. “Ọ̀ bụ m nye ego ka ọ̀ bụ m hapụ inye?” ka ọ jụrụ onwe ya. Ndị ọgbọ ya gwara ya, sị: “Onye ọ bụla na-eme ya. Ọ dịghị ihe ga-efunahụ gị, kama ị ga-enweta ọtụtụ ihe, ya mere, gịnị ka ị na-enwere obi abụọ?”
“Aghaghị m ikweta na n’afọ mbụ m gụrụ akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ, ekeere m òkè n’ịnata ego,” ka Katarzyna na-ekwu. “Ọ bụ nnọọ n’ikpeazụ ka m bịara ghọta na esi m otú a na-akwado inye aka azụ, bụ́ nke a katọrọ n’ime Bible.” O chetara akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị gosiri na Jehova katọrọ inye aka azụ kpam kpam. (Deuterọnọmi 10:17; 16:19; 2 Ihe E Mere 19:7) Katarzyna na-ekwu, sị: “Aghọtara m otú o si adị mfe mmadụ ịda mgbe ndị ọgbọ ya na-arụgide ya. Echebaara m ya echiche, kemgbe ahụ kwa, ekereghị m òkè ọzọ ma ọlị n’omenala a.” N’ime afọ atọ gara aga, n’agbanyeghị emo ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ kwara ya, ọ bịara nwee ike ịkọwara ụfọdụ ndị na ya adịghị ekere òkè n’ịnata “onyinye” ahụ n’ihi nkwenkwe ya ndị dabeere na Bible.
Ụfọdụ boro Katarzyna ebubo na o nwere àgwà ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na nke enweghị mmetụta maka ndị ọzọ. “Ihe anabeghị adabara mụ na ụfọdụ n’ime ha,” ka ọ na-ekwu. “N’aka nke ọzọ, ọtụtụ na-akwanyere echiche m ùgwù, bụ́ nke na-eme m obi ụtọ.” A bịara mara Katarzyna dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, bụ́ onye na-agbaso ụkpụrụ Bible ná ndụ ọ na-adị kwa ụbọchị.