Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ṅomie Jehova, Bụ́ Chineke Anyị nke Na-adịghị Ele Mmadụ Anya n’Ihu

Ṅomie Jehova, Bụ́ Chineke Anyị nke Na-adịghị Ele Mmadụ Anya n’Ihu

Ṅomie Jehova, Bụ́ Chineke Anyị nke Na-adịghị Ele Mmadụ Anya n’Ihu

“Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu.”—NDỊ ROM 2:11.

1, 2. (a) Gịnị bụ nzube Jehova banyere ndị Kenan n’ozuzu ha? (b) Gịnị ka Jehova mere, ajụjụ ndị dịkwa aṅaa ka nke a na-akpalite?

KA ỤMỤ Izrel mara ụlọikwuu n’Ọzara Moab na 1473 T.O.A., ha gere Mozis ntị nke ọma. Ihe ịma aka nọ na-echere ha n’ofe nke ọzọ nke Osimiri Jọdan. Mozis kwupụtara nzube Jehova nke bụ́ ime ka Izrel merie mba Kenan asaa dị ike bụ́ ndị dị n’Ala Nkwa ahụ. Lee ka okwu Mozis si bụrụ ihe na-emesighachi obi ike: “Jehova, bụ́ Chineke gị, ga-ararakwa ha nye n’ihu gị, i wee tigbuo ha”! Izrel agaghị eso ha gbaa ndụ, ha ekwesịghịkwa ka e nwee ihu ọma n’ebe ha nọ.—Deuterọnọmi 1:1; 7:1, 2.

2 N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova chebere otu ezinụlọ sitere n’obodo mbụ Izrel wakporo. Chineke chebekwara ndị sitere n’obodo anọ ọzọ. N’ihi gịnị ka o ji mee nke a? Gịnị ka ihe omume ndị dị ịrịba bụ́ ndị metụtara nlanarị nke ndị Kenan a na-akụziri anyị banyere Jehova? Oleekwa otú anyị pụrụ isi ṅomie ya?

Mmeghachi Omume n’Ebe Aha Ukwu Jehova Dị

3, 4. Mmetụta dị aṅaa ka akụkọ banyere mmeri ndị ụmụ Izrel nwere nwere n’ahụ́ ndị bi na Kenan?

3 N’oge Izrel nọrọ afọ 40 n’ọzara tupu ha abanye n’Ala Nkwa ahụ, Jehova chebere ndị ya ma lụọrọ ha agha. N’ebe ndịda nke Ala Nkwa ahụ, Izrel chere eze obodo Arad bụ́ onye Kenan ihu. Site n’enyemaka Jehova, ndị Izrel meriri ya na ndị ya na Họma. (Ọnụ Ọgụgụ 21:1-3) Mgbe e mesịrị, Izrel si n’azụ Idọm gafere, chee ihu n’ebe ugwu gawa n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Nwụrụ Anwụ. Ọ bụ ndị Amọraịt bizi n’ebe a bụ́ ebe ndị Moab biburu. Eze Saịhọn nke Amọraịt ekweghị ka Izrel si n’ókèala ya gafee. Agha biiri ọkụ na Jahaz, bụ́ nke ihe àmà na-egosi na ọ dị n’ebe ugwu nke Ndagwurugwu Mmiri Iyi Anọn, bụ́ ebe a nọ gbuo Saịhọn. (Ọnụ Ọgụgụ 21:23, 24; Deuterọnọmi 2:30-33) N’ime ime ebe ugwu, Ọg nọ na-achị ndị Amọraịt ndị ọzọ bi na Beshan. Ọ bụ ezie na Ọg bụ dike, Jehova karịrị ya. E gburu Ọg n’Edraị. (Ọnụ Ọgụgụ 21:33-35; Deuterọnọmi 3:1-3, 11) Akụkọ banyere mmeri a, tinyere akụkọ banyere Ọpụpụ Izrel site n’Ijipt nwere mmetụta dị ike n’ahụ́ ndị bi na Kenan. *

4 Mgbe mbụ ụmụ Izrel banyere na Kenan ka ha gafesịrị Jọdan, ha mara ụlọikwuu na Gilgal. (Joshua 4:9-19) Obodo Jeriko nke e ji mgbidi gbaa gburugburu dị n’ebe na-adịghị anya site n’ebe ahụ. Ihe Rehab bụ́ onye Kenan nụrụ banyere ihe ndị Jehova mere kpaliri ya iji okwukwe mee ihe. N’ihi ya, mgbe Jehova bibiri Jeriko, o chebere ya na ndị nọ n’ụlọ ya.—Joshua 2:1-13; 6:17, 18; Jems 2:25.

5. Gịnị kpaliri ndị Gibiọn iji aghụghọ mee ihe?

5 Mgbe nke ahụ gasịrị, Izrel si n’ebe dị nso n’osimiri ahụ gbagoo n’ugwu ndị dị n’ime ime ógbè ahụ. N’ịgbaso ntụziaka Jehova, Jọshụa mere ka ụfọdụ ndị agha zoo ezoo iji chebiri obodo Aị. (Joshua, isi 8) Akụkọ banyere oké mmeri si na ya pụta kpaliri ọtụtụ ndị eze Kenan ịchịkọta onwe ha maka ibu agha. (Joshua 9:1, 2) Ndị bi n’obodo Gibiọn dị nso nke dị na Haịvaịt meghachiri omume n’ụzọ dị iche. “Ha wee were aghụghọ mee ihe, ọbụna ndị ahụ,” ka Joshua 9:4 na-akọ. Dị ka Rehab, ha anụwo banyere nnapụta Jehova napụtara ndị ya n’oge Ọpụpụ ahụ nakwa n’oge e meriri Saịhọn na Ọg. (Joshua 9:6-10) Ndị Gibiọn ghọtara na ọ baghị uru isiwe ọnwụ. N’ihi ya, n’aha Gibiọn na obodo atọ ndị ọzọ dị ha nso—Kefaịra, Beirọt, na Kiriat-jiarim—ha zigara ndị ozi mere ka ha si n’ala dị anya, jekwuru Jọshụa n’obodo Gilgal. Atụmatụ ha gara nke ọma. Jọshụa soro ha gbaa ndụ nke mere ka ha jiri n’aka na a gaghị ebibi ha. Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, Jọshụa na ndị Izrel chọpụtara na a ghọgbuola ha. Otú o sina dị, ha ejiwo Jehova ṅụọ iyi imezu ọgbụgba ndụ ahụ n’ihi ya kwa, ha mere otú ahụ. (Joshua 9:16-19) Jehova ò kwere?

6. Olee otú Jehova si meghachi omume n’ọgbụgba ndụ Jọshụa so ndị Gibiọn gbaa?

6 E kwere ka ndị Gibiọn ghọọ ndị na-awa nkụ na ndị na-esete mmiri maka ndị Izrel, ọbụna ‘maka ebe ịchụàjà Jehova’ n’ụlọikwuu ahụ. (Joshua 9:21-27) E wezụga nke ahụ, mgbe ndị eze ise nke mba ndị dị n’Amọraịt na usuu ndị agha ha yiri ndị Gibiọn egwu, Jehova mere ihe n’ụzọ ọrụ ebube. Akụ̀ mmiri igwe gburu ọtụtụ n’ime ndị iro ahụ karịa ka ndị agha Jọshụa gburu. Ọbụna Jehova nabatara arịrịọ Jọshụa rịọrọ ka anyanwụ na ọnwa guzoro otu ebe iji nye ha ohere igbuchapụ ndị iro ha. “Ọ dịghịkwa ụbọchị dị ka ụbọchị ahụ n’ihu ya ma ọ bụ n’azụ ya,” ka Jọshụa kwuru, “na Jehova gere ntị olu mmadụ: n’ihi na Jehova na-eburu Izrel agha.”—Joshua 10:1-14.

7. Eziokwu dị aṅaa Pita kwuru ka e gosipụtara n’ebe ụfọdụ ndị Kenan nọ?

7 Rehab bụ́ onye Kenan na ezinụlọ ya, tinyere ndị Gibiọn, tụrụ egwu Jehova ma mee ihe kwekọrọ na nke ahụ. Ihe mere ha na-egosipụta n’ụzọ doro anya otu eziokwu nke Onye Kraịst bụ́ Pita onyeozi mesịrị kwuo: “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anara nke ọma.”—Ọrụ 10:34, 35.

Ụzọ O Si Mesoo Ebreham na Izrel Ihe

8, 9. Olee otú Jehova si gosipụta àgwà eleghị mmadụ anya n’ihu n’ụzọ o si mesoo Ebreham na mba Izrel ihe?

8 Jems onye na-eso ụzọ dọọrọ uche gaa n’obiọma na-erughịrị mmadụ nke Chineke gosipụtara n’ụzọ O si mesoo Ebreham na ụmụ ya ihe. Ọ bụ okwukwe Ebreham, ọ bụghị agbụrụ o si na ya, mere ka ọ bụrụ “enyi Jehova.” (Jems 2:23) Okwukwe Ebreham na ịhụnanya o nwere n’ebe Jehova nọ wetaara ụmụ ya ọtụtụ ngọzi. (2 Ihe E Mere 20:7) Jehova kwere Ebreham nkwa, sị: “N’ịgọzi M ga-agọzi gị, n’ime ka a baa ụba M ga-emekwa ka mkpụrụ gị baa ụba dị ka kpakpando nke eluigwe, na dị ka ájá nke dị n’ụsọ oké osimiri.” Ma, rịba ama nkwa e kwere n’amaokwu na-esonụ: “Ná mkpụrụ gị ka mba nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha; n’ihi na i gewo ntị n’olu m.”—Jenesis 22:17, 18; Ndị Rom 4:1-8.

9 Ụzọ Jehova si mesoo Izrel ihe adịghị egosi na ọ na-ele mmadụ anya n’ihu kama ọ na-egosi ihe ọ pụrụ imere ndị na-erubere ya isi. Mmeso ndị dị otú ahụ bụ ihe atụ nke ụzọ Jehova si egosipụta ịhụnanya na-eguzosi ike n’ihe n’ebe ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi nọ. Ọ bụ ezie na Izrel bụ “ihe nke aka” Jehova, nke a apụtaghị na a gụpụrụ ndị ọzọ ná ndị Chineke ga-emere ihe ọma. (Ọpụpụ 19:5; Deuterọnọmi 7:6-8) N’eziokwu, Jehova gbapụtara Izrel pụọ n’ịbụ ohu n’Ijipt, n’ihi ya kwa, ọ sịrị: “Nanị unu ka M mawooro n’etiti agbụrụ nile nke ụwa.” Ma site n’ọnụ Emọs onye amụma na ndị ọzọ, Jehova kwekwara “mba nile” nkwa inweta atụmanya dị ebube.—Emọs 3:2; 9:11, 12; Aịsaịa 2:2-4.

Jizọs, Onye Ozizi nke Na-adịghị Ele Mmadụ Anya n’Ihu

10. Olee otú Jizọs si ṅomie Nna ya n’igosipụta àgwà eleghị mmadụ anya n’ihu?

10 N’oge o jere ozi n’ụwa, Jizọs, onye bụ́ kpọmkwem ihe nnọchianya nke Nna ya, ṅomiri àgwà eleghị mmadụ anya n’ihu nke Jehova. (Ndị Hibru 1:3) Nchegbu ya bụ́ isi n’oge ahụ bụ ịchọta “atụrụ furu efu nke ụlọ Izrel.” N’agbanyeghị nke ahụ, ọ laghị azụ ịgbara nwanyị Sameria àmà n’olulu mmiri. (Matiu 15:24; Jọn 4:7-30) Ọ rụkwara ọrụ ebube mgbe otu onyeisi ndị agha, onye o doro anya na ọ bụghị onye Juu, rịọrọ ya ka o mee otú ahụ. (Luk 7:1-10) Nke ahụ bụ tụkwasị n’iji omume ya gosipụta ịhụnanya o nwere n’ebe ndị Chineke nọ. Ndị na-eso ụzọ Jizọs mekwara nkwusa n’ọtụtụ ebe. Ọ bịara doo anya na ihe ndabere maka inweta ngọzi Jehova abụghị mba mmadụ si na ya, kama ọ bụ àgwà onye ahụ. Ndị dị umeala n’obi ma nwee obi eziokwu bụ́ ndị agụụ eziokwu ahụ na-agụ nabatara ozi ọma nke Alaeze ahụ. N’ụzọ dị iche, ndị dị mpako ledara Jizọs na ozi ya anya. “Ana m enye gị otuto n’ihu ọha, Nna, Onyenwenụ nke eluigwe na ala,” ka Jizọs kwuru, “n’ihi na i zonahụwo ndị maara ihe na ndị nwere ọgụgụ isi ihe ndị a nke ọma, i kpughewokwa ha nye ụmụ ọhụrụ. Ee, Nna, n’ihi na ime otú ahụ abụrụwo ụzọ ị kwadoro.” (Luk 10:21) Ee, mgbe anyị na-emeso ndị ọzọ ihe n’ihi ịhụnanya na okwukwe, anyị adịghị ele mmadụ anya n’ihu, na-amara na nke a bụ ụzọ Jehova kwadoro.

11. Olee otú e si gosipụta àgwà eleghị mmadụ anya n’ihu n’ọgbakọ Ndị Kraịst oge mbụ?

11 N’ọgbakọ Ndị Kraịst oge mbụ, ndị Juu na ndị na-abụghị ndị Juu ha nhata. “Ebube na nsọpụrụ na udo maka onye ọ bụla na-eme ezi ihe,” ka Pọl kọwara “mbụ, maka onye Juu nakwa maka onye Grik. N’ihi na Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu.” * (Ndị Rom 2:10, 11) Ihe kpebiri ma ha ga-enweta obiọma na-erughịrị mmadụ nke Jehova abụghị agbụrụ ha si na ya, kama ọ bụ mmeghachi omume ha mgbe ha mụtara banyere Jehova na atụmanya nke ihe mgbapụta nke Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, mere ka ha nwee. (Jọn 3:16, 36) Pọl dere, sị: “Onye Juu n’elu ahụ́ abụghị ya bụ onye Juu, ibi úgwù abụghịkwa nke ahụ e biri n’elu anụ ahụ́. Ma onye Juu n’ime ahụ́ bụ ya bụ onye Juu, ibi úgwù ya bụkwa nke obi site na mmụọ, ọ bụghịkwa site n’usoro iwu e dere ede.” N’ijizi okwu ndị yitewere okwu ahụ bụ́ “Juu” (nke pụtara “nke Juda,” ya bụ, onye e toro ma ọ bụ onye a jara mma) mee ihe n’ụzọ nkà, Pọl gbakwụnyere, sị: “Otuto nke onye ahụ na-abịa, ọ bụghị site n’aka mmadụ, kama site n’aka Chineke.” (Ndị Rom 2:28, 29) Jehova na-enye otuto n’eleghị mmadụ anya n’ihu. Ànyị na-eme otú ahụ?

12. Gịnị ka Mkpughe 7:9 na-eme ka a na-atụ anya ya, oleekwa ndị ga-atụ anya ihe ahụ?

12 Mgbe e mesịrị, n’ọhụụ, Jọn onyeozi hụrụ Ndị Kraịst e tere mmanụ na-ekwesị ntụkwasị obi bụ́ ndị a kọwara dị ka mba ime mmụọ nke mmadụ 144,000 mejupụtara, bụ́ ndị “a kara akara site n’ebo ọ bụla nke ụmụ Izrel.” Mgbe Jọn hụsịrị ndị a, ọ hụrụ “oké ìgwè mmadụ . . . ndị si ná mba na ebo na ndị na asụsụ nile pụta, na-eguzo n’ihu ocheeze ahụ na n’ihu Nwa Atụrụ ahụ, na-eyi uwe mwụda ọcha; igu nkwụ dịchakwa n’aka ha.” (Mkpughe 7:4, 9) Ya mere, ọ dịghị agbụrụ ma ọ bụ asụsụ a na-agụpụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst nke oge a. Ndị sitere n’ebe nile na-atụ anya ịlanarị “oké mkpagbu” na-abịanụ na ịṅụ mmiri sitere “n’isi iyi nke mmiri nke ndụ ahụ” n’ime ụwa ọhụrụ.—Mkpughe 7:14-17.

Ezi Ihe Ndị Si na Ya Apụta

13-15. (a) Olee otú anyị pụrụ isi merie ihe mgbochi ndị a na-enwe n’ihi ndịrịta iche nke agbụrụ na nke ọdịbendị? (b) Nye ihe atụ nke uru ndị a pụrụ irite site n’igosipụta omume enyi.

13 Jehova maara anyị nke ọma, dị ka ezigbo nna si mara ụmụ ya. N’otu aka ahụ, mgbe anyị bịara ghọta ndị ọzọ site n’igosi mmasị n’ọdịbendị ha na n’otú e si zụlite ha, ndịrịta iche anyị na ha na-aghọ ihe na-adịchaghị ihe ọ bụ. Anyị na-akwụsị inwe ihe mgbochi n’ihi agbụrụ, ọbụbụenyi anyị na ha na ịhụnanya anyị nwere n’ebe ha nọ na-esiwanyekwa ike. Ịdị n’otu anyị na ha na-esikwu ike. (1 Ndị Kọrint 9:19-23) Ndị ozi ala ọzọ bụ́ ndị na-eje ozi ná mba ọzọ na-egosipụta nke a nke ọma. Ha na-egosi mmasị n’ebe ndị bi n’ebe ha gara nọ, n’ihi ya kwa, ha na-achọpụta n’oge na-adịghị anya na ọgbakọ ndị dị n’ebe ha gara na-amara ha ahụ́.—Ndị Filipaị 2:4.

14 Ihe ndị dị mma àgwà eleghị mmadụ anya n’ihu na-arụpụta na-apụta ìhè n’ọtụtụ ala. Aklilu, bụ́ onye si Etiopia, hụtara onwe ya dị ka onye owu na-ama n’isi obodo Britain bụ́ London. Ihe yiri ka ọ bụ enweghị omume enyi nke ọtụtụ mmadụ n’ozuzu na-enwe n’ebe ndị si mba ọzọ nọ, bụ́ ihe a na-ahụ n’ọtụtụ obodo ukwu ndị dị na Europe nke oge a, mere ka owu na-ama ya ka njọ. Lee ka Aklilu si hụ ihe dị iche mgbe ọ gara nzukọ Ndị Kraịst n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova! Ndị bịara nzukọ ahụ nabatara ya, o teghịkwa aka tupu ahụ́ eruo ya ala. O nwere ọganihu ngwa ngwa n’ịghọtakwu Onye Okike ahụ. N’oge na-adịghị anya, ọ chọrọ ohere iji kere okè n’izisara ndị ọzọ ozi ọma Alaeze ahụ n’ógbè ahụ. N’ezie, otu ụbọchị, mgbe onye ya na Aklilu so na-ekwusa ozi ọma jụrụ ya ihe ndị bụ́ ihe mgbaru ọsọ o nwere ná ndụ ugbu a, Aklilu zara ya ngwa ngwa na ya na-atụ anya otu ụbọchị ịnọ n’ọgbakọ nke na-asụ asụsụ ya, bụ́ Amharic. Mgbe ndị okenye nke ọgbakọ Bekee dị n’ebe ahụ nụrụ nke a, ha ji obi ụtọ mee ndokwa maka okwu ihu ọha dabeere na Bible nke a ga-eji asụsụ obodo Aklilu kwuo. Òkù a kpọrọ ndị mmadụ ịbịa mere ka ọtụtụ ndị mba ọzọ na ndị ógbè ahụ zukọta iji kwadoo nzukọ ihu ọha mbụ a na-enwe n’asụsụ Amharic na Britain. Taa, e nwere ịdị n’otu n’etiti ndị Etiopia na ndị ọzọ nọ n’otu ọgbakọ na-enwe ọganihu nke dị n’ógbè ahụ. Ọtụtụ ndị nọ n’ebe ahụ achọpụtawo na ọ dịghị ihe na-egbochi ha ịkwụnyere Jehova na igosipụta nke a site n’ịbụ ndị e mere baptizim dị ka Ndị Kraịst.—Ọrụ 8:26-36.

15 Àgwà na otú e si zụlite mmadụ dịrịtara iche. Ha abụghị ihe e ji amata onye ka ibe ya elu ma ọ bụ onye dị ala; ha bụ nanị ndịrịta iche. Mgbe Ndịàmà nọ n’àgwàetiti Mọlta na-ekiri ka a na-eme ndị ohu Jehova raara onwe ha nye ọhụrụ baptizim, ha nwere oké ọṅụ, ebe anya mmiri nke ọṅụ gbara ndị ọbịa si Britain. Ma ndị si Britain ma ndị Mọlta gosipụtachara mmetụta ha nwere, ma ha mere ya n’ụzọ dịgasị iche, ịhụnanya siri ike ha nwekwara n’ebe Jehova nọ mere ka nkekọ ha nwere dị ka Ndị Kraịst sikwuo ike.—Abụ Ọma 133:1; Ndị Kọlọsi 3:14.

Imeri Ajọ Mbunobi

16-18. Kọọ ahụmahụ nke na-egosi otú a pụrụ isi merie ajọ mbunobi n’ọgbakọ Ndị Kraịst.

16 Ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova na ụmụnna anyị bụ́ Ndị Kraịst nọ na-emiwanye emi, anyị pụrụ iṅomikwu Jehova nke ọma n’ụzọ anyị si ele ndị ọzọ anya. Anyị pụrụ imeri ajọ mbunobi ọ bụla ọ pụrụ ịbụ na anyị nweburu n’ebe mba, agbụrụ, ma ọ bụ ọdịbendị ụfọdụ dị. Were dị ka ihe atụ, ihe banyere Albert, bụ́ onye jere ozi n’Òtù Ndị Agha Britain n’oge Agha Ụwa nke Abụọ ma bụrụ onye ndị Japan jidere mgbe ha meriri Singapore na 1942. O mesịrị rụọ ọrụ ruo ihe dị ka afọ atọ ‘n’ụzọ okporo ígwè nke ọnwụ,’ na nso ebe a bịara mara dị ka àkwà mmiri nke osimiri Kwai. Mgbe a tọhapụrụ ya mgbe agha biri, ọ dị kilogram 32 n’arọ, bụrụ onye a kụwara agbà na imi, na-anyụ ọbara, nwee ọkpụ isi eri ngo, ma na-arịa ịba. Ọnọdụ nke ọtụtụ puku ndị mkpọrọ ibe ya ka njọ; ọtụtụ n’ime ha nwụrụ. N’ihi oké ihe ọjọọ Albert hụrụ na ndị dakwasịrị ya, ọ ghọrọ nwoke iwe juru obi mgbe ọ lọtara ụlọ na 1945, o nweghịkwa mmasị ọ bụla n’ebe Chineke nọ ma ọ bụ n’ebe okpukpe dị.

17 Nwunye Albert, bụ́ Irene, ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Iji mee ka obi dị nwunye ya ụtọ, Albert gara nzukọ ole na ole nke ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ógbè ha. Otu Onye Kraịst na-eto eto nke na-eje ozi oge nile aha ya bụ Paul, bịara na-amụrụ Albert Bible. N’oge na-adịghị anya, Albert bịara ghọta na Jehova na-ele ndị mmadụ anya dị ka ọnọdụ obi ha si dị. Ọ raara ndụ ya nye Jehova, e meekwa ya baptizim.

18 Mgbe e mesịrị, Paul kwagara London, mụọ asụsụ Japanese, ma sonyere ọgbakọ na-asụ Japanese. Mgbe ọ tụrụ aro ịkpọrọ ụfọdụ Ndịàmà bụ́ ndị Japan bịara nleta gaa n’ọgbakọ mbụ ya, ụmụnna nọ n’ebe ahụ chetara ajọ mbunobi Albert nwere n’ebe ndị si obodo ahụ nọ. Kemgbe Albert lọghachiri Britain, ọ nọwo na-ezere izute onye ọ bụla si Japan, n’ihi ya, ụmụnna ahụ nọ na-eche otú ọ ga-esi emeghachi omume ma ọ hụ ha. Ha agaraghị echegbuwe onwe ha—Albert ji obi nwanne nabata ndị ọbịa ahụ.—1 Pita 3:8, 9.

‘Na-agbasapụnụ’

19. Olee ndụmọdụ Pọl onyeozi nyere nke pụrụ inyere anyị aka ma ọ bụrụ na o nwetụrụ otú anyị si egosipụta àgwà nke ile mmadụ anya n’ihu?

19 “Ile mmadụ anya n’ihu adịghị mma,” ka Eze Solomọn maara ihe dere. (Ilu 28:21, NW) Ọ dị mfe iso ndị anyị maara nke ọma na-akpakọrịta. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, anyị adịchaghị egosi mmasị n’ebe ndị anyị na-amaghị nke ọma nọ. Ile mmadụ anya n’ihu otú ahụ ekwesịghị ohu Jehova. N’ezie, anyị nile kwesịrị ịgbaso ndụmọdụ doro anya nke Pọl bụ́ ‘ịgbasapụ’—ee, ịgbasapụ n’ịhụnanya anyị nwere n’ebe Ndị Kraịst ibe anyị a zụlitere n’ụzọ dịgasị iche iche nọ.—2 Ndị Kọrint 6:13.

20. N’akụkụ ndị dị aṅaa nke ndụ ka anyị kwesịrị iṅomi Jehova, bụ́ Chineke anyị nke na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu?

20 Ma ànyị nwere ihe ùgwù nke ịnata ọkpụkpọ eluigwe ma ọ̀ bụ na-atụ anya ibi ndụ ebighị ebi n’ụwa, anyị ịbụ ndị na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu na-enyere anyị aka ịnụ ụtọ ịdị n’otu nke otu ìgwè atụrụ, otu Onye Ọzụzụ Atụrụ. (Ndị Efesọs 4:4, 5, 16) Ịgbalịsi ike iṅomi Jehova, bụ́ Chineke anyị nke na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu, pụrụ inyere anyị aka n’ozi Ndị Kraịst anyị, n’ime ezinụlọ anyị, na n’ọgbakọ, n’ezie, n’akụkụ nile nke ndụ anyị. N’ụzọ dị aṅaa? Isiokwu na-esonụ ga-atụle nke a.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Aha ukwu Jehova mesịrị ghọọ ihe e ji abụ abụ dị nsọ.—Abụ Ọma 135:8-11; 136:11-20.

^ par. 11 N’ebe a, okwu bụ́ “onye Grik” na-ezo aka n’ebe ndị Jentaịl n’ozuzu ha nọ.—Insight on the Scriptures, nke Ndịàmà Jehova bipụtara, Mpịakọta nke 1, peeji nke 1004.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

Olee otú Jehova si gosipụta àgwà eleghị mmadụ anya n’ihu n’ebe Rehab na ndị Gibiọn nọ?

Olee otú Jizọs si gosipụta àgwà eleghị mmadụ anya n’ihu n’ozizi ya?

Gịnị pụrụ inyere anyị aka imeri ajọ mbunobi ọ bụla e nwere n’ihi ọdịbendị na agbụrụ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 13]

Mmeri Izrel meriri Kenan amalite

[Foto dị na peeji nke 15]

Jizọs alaghị azụ n’ịgbara nwanyị Sameria àmà

[Foto dị na peeji nke 16]

Nzukọ ihu ọha e mere n’asụsụ Amharic na Britain

[Foto dị na peeji nke 16]

Ịhụnanya Albert nwere n’ebe Jehova nọ nyeere ya aka imeri ajọ mbunobi