Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Alexander nke Isii—Popu nke Ndị Rom Na-adịghị Echezọ Echezọ

Alexander nke Isii—Popu nke Ndị Rom Na-adịghị Echezọ Echezọ

Alexander nke Isii—Popu nke Ndị Rom Na-adịghị Echezọ Echezọ

“A BỊA n’otú onye Katọlik si ele ihe anya, ọ gaghị ekwe omume ịkatọru Alexander nke Isii otú ihe ọjọọ ya ha.” (Geschichte der Päpste seit dem Ausgang des Mittelalters [Akụkọ Ihe Mere Eme Banyere Ndị Popu Site ná Ngwụsị Oge Ụwa Na-emepechabeghị Anya) “Ọ dịtụghị otú ọ ga-esi gọpụrụ ihe ndị o metara ná ndụ . . . Anyị aghaghị ikweta na popu a asọpụrụghị Chọọchị. Ndị ha na ezinụlọ Borgia dịkọrọ ndụ, ọ bụ ezie na arụrụala yiri nke ahụ abụghịrị ha ihe ọhụrụ, ji oké ụjọ kirie mpụ ndị ha mere, bụ́ ndị a ka na-ahụ mmetụta ha ka ihe karịrị narị afọ anọ gasịrị.”—L’Église et la Renaissance (1449-1517)(Chọọchị ahụ na Oge Ntụte).

N’ihi gịnị ka akwụkwọ ndị a na-akwanyere ùgwù bụ́ ndị na-akọ ihe ndị mere na Chọọchị Roman Katọlik ji ekwu okwu ndị siri ike otú ahụ banyere otu popu na ezinụlọ ya? Gịnị ka ha mere e ji na-akatọ ha otú ahụ? Otu ihe ngosi e mere na Rom (October 2002–February 2003), nke isiokwu ya bụ I Borgia—l’arte del potere (Ezinụlọ Borgia—Nkà nke Ike), mere ka e nwee ohere nke ịtụgharị uche n’ike a na-akparaghị ókè nke ndị popu na-asị na ha nwere, karịsịa n’ụzọ Rodrigo Borgia, ma ọ bụ Alexander nke Isii (popu 1492-1503), si jiri ya mee ihe.

Ịrịgo n’Ọkwá

A mụrụ Rodrigo Borgia na 1431 n’ime ezinụlọ a ma ama na Játiva, n’alaeze Aragon, nke dịzi na Spen. Nwanne mama ya nke nwoke bụ́ Alfonso de Borgia, bụ́ bishọp Valencia, zụrụ Rodrigo n’ụlọ akwụkwọ ma hụ na e nyere ya ọkwá na chọọchị (ọkwá chọọchị nke a na-akwụ ụgwọ na ya) mgbe ọ ka dị afọ iri na ụma. Mgbe Rodrigo dị afọ 18, site n’ikike nke Alfonso, onye bụ́zi kadinal, ọ kwagara Ịtali, bụ́ ebe ọ nọ mụọ nkà iwu. Mgbe Alfonso ghọrọ Popu Calixtus nke Atọ, o mere Rodrigo na nwa nwanne ya ọzọ kadinal. E mere Pere Lluís Borgia gọvanọ nke obodo dịgasị iche iche. N’oge na-adịghị anya, a họpụtara Rodrigo ịbụ osote onyeisi chọọchị, bụ́ ọkwá ọ nọrọ na ya n’okpuru popu dịgasị iche iche, nke mere ka o nwee ike inweta ọtụtụ ọkwá a na-akwụ ezi ụgwọ na ha na chọọchị, oké akụ̀ na ụba, ikike dị ukwuu, ma bie ndụ ndị oké ozu dị ka nwa eze.

Rodrigo bụ onye ụbụrụ na-aghọ nkọ, ezigbo ọkà okwu, onye na-akwalite ọrụ nkà, na onye nwere ikike nke inweta ihe ndị ọ chọrọ. Otú ọ dị, o nwere ọtụtụ ndị iko nwanyị, nwanyị nke ya na ya mere enyi ogologo ndụ ya nile mụọrọ ya ụmụ anọ, ndị nke ọzọ mụọrọ ya ọtụtụ ụmụ ndị ọzọ. Ọ bụ ezie na Popu Pius nke Abụọ baara ya mba n’ihi oké ọchịchọ o bu pụta ụwa nke “enwetụghị ike ijide onwe” ya n’ihe banyere mkpori ndụ nakwa nke inwe “ihe ụtọ n’ụzọ a na-achịkwaghị achịkwa,” Rodrigo agbanweghị omume ya.

Mgbe Popu Innocent nke Asatọ nwụrụ na 1492, ndị kadinal nke chọọchị ahụ zukọtara ịhọpụta onye ga-anọchi ya. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Rodrigo Borgia, site n’ikwe ọtụtụ nkwa na ịtụchasị ndị mmadụ n’ezoghị ọnụ, mere ka ndị kadinal ibe ya tụnyere ya vootu zurunụ nke mere o ji bụrụzie Popu Alexander nke Isii mgbe o si n’ụlọ ahụ a na-anọ ahọpụta ndị popu pụta. Olee otú o si kwụọ ndị kadinal ahụ ụgwọ maka vootu ha tụnyeere ya? Ọ bụ site n’ibuli ha n’ọkwá Chọọchị, inye ha obí, akatamkpo ụlọ, obodo ukwu, ebe obibi ndị mọnk, na dayọsis, bụ́cha ndị a ga na-akwụ ha ego buru ibu na ha. Ị pụrụ ịghọta ihe mere otu onye na-akọ ihe ndị mere na chọọchị ji kpọọ ọchịchị Alexander nke Isii “oge nke arụrụala na akụkọ ọjọọ nye Chọọchị Rom.”

Ọ Kaghị Ndị Eze Nkịtị Mma

N’ihi ike ime mmụọ o nwere dị ka onyeisi chọọchị, Alexander nke Isii nyere aka dozie esemokwu dị n’etiti Spen na Portugal n’ihe banyere ókèala ndị a chọtara ọhụrụ n’America. Ike ọchịchị ya mere ka ọ bụrụ onyeisi steeti ndị dị n’aka Chọọchị Roman Katọlik bụ́ ndị ókèala ha dị n’ebe etiti Ịtali, ọ chịkwara alaeze ya nnọọ otú eze ọ bụla ọzọ nọ n’Oge Ntụte ahụ si chịa. E ji ịna aka azụ, imelara ndị òtù ezinụlọ ihe, na ịbụ onye a na-enyo enyo na o gburu ihe karịrị otu onye mara ọchịchị Alexander nke Isii, dị nnọọ ka e ji ha mara ọchịchị nke ndị bu ya ụzọ bụrụ popu na ndị o bu ụzọ.

Ndị ọchịchị na-asọrịta mpi zọrọ ókèala ndị dị n’Ịtali n’oge a dị egwu, popu a sokwa na ha. Ihe mere o ji gwuo wayo ndị o gwuru n’ihe banyere ọchịchị ma soro ndị ọchịchị ọzọ jikọọ aka, bụ́ ndị ọ na-emesị tisaa, bụ iji mee ka ike ya gbagotekwuo, mee ka ụmụ ya rịa n’ọkwá, ma mee ka ezinụlọ Borgia dị elu karịa ezinụlọ nile ọzọ. E chiri nwa ya nwoke bụ́ Juan, bụ́ onye lụrụ nwa nwanne eze Castile, echichi ịbụ eze Gandía, nke dị na Spen. Nwa ya nwoke ọzọ bụ́ Jofré lụrụ nwa nwa eze Naples.

Mgbe ọ dị popu ahụ mkpa inweta onye ya na ya ga-ejikọ aka iji mee ka mmekọrịta ya na France sikwuo ike, ọ kagburu nkwa o kwere na otu nwoke a ma ama n’Aragon ga-alụ ada ya dị afọ 13, bụ́ Lucrezia, ma kpọnyezie ya onye ikwu nke eze Milan. Mgbe alụmdi na nwunye ahụ na-adịghịzi uru ọ baara ya n’ọchịchị ya, ọ chọtara ihe o jidere aka wee tisaa ya, onye so n’usoro ndị eze ya na ha na-asọrịta mpi, bụ́ Alfonso nke Aragon, lụkwara Lucrezia. Ka ọ dị mgbe ahụ, nwanne Lucrezia nke nwoke nwere oké ọchịchọ, obi tara mmiri, bụ́ Cesare Borgia, sooro Louis nke Iri na Abụọ nke France jikọọ aka, ọlụlụ nwanne ya nwanyị lụrụ onye Aragon na nso nso ahụ malitekwara ime ya ihere. Gịnị ka o mere? Otu akwụkwọ na-ekwu na “mmadụ anọ merụrụ [Alfonso nke nwere ihe ndabara ọjọọ] ahụ́ na steepụ nke chọọchị St. Peter’s Basilica ka ha na-achọ igbu ya. Ka ọ nọ na-agbake, otu n’ime ndị ohu Cesare nyagburu ya.” Popu ahụ, n’ịchọ iso onye ọzọ jikọọ aka iji gaa n’ihu n’atụmatụ ya, mere ndokwa ka Lucrezia, bụ́ onye dịzi afọ 21, lụọ di nke atọ ya, bụ́ nwa eze dị ike nke Ferrara.

A kọwawo ọrụ Cesare dị ka “akụkọ na-egosi enweghị ụkpụrụ, nke e ji ọbara tetọọ.” Ọ bụ ezie na nna Cesare họpụtara ya ịbụ kadinal mgbe ọ dị afọ 17, ihe ka kwesị ya bụ ọrụ agha ọ bụghị ọrụ chọọchị, n’ihi ịbụ onye akọ, onye oké ọchịchọ, na onye nrụrụ aka, dị ka mmadụ ole na ole ndị ọzọ bụ. Mgbe ọ gbara arụkwaghịm n’ọrụ chọọchị, ọ lụrụ ada eze France, si otú ahụ nweta ọkwá nke ịbụ eze Valentinois. E mesịa, site ná nkwado nke ndị agha France, ọ malitere ọrụ nnọchibido na igbu ọchụ iji mee ka ọ chịwa ebe ugwu Ịtali.

Iji jide n’aka na ndị agha France ga-akwado Cesare n’atụmatụ ọ na-eme, popu ahụ kwenyere n’ịgba alụkwaghịm na-enyeghị nsogbu, ma o butere akụkọ ọjọọ, bụ́ nke Louis nke Iri na Abụọ nke France rịọrọ ka ya gbaa, nke mere ka o nwee ike ịlụ Anne nke Brittany ma mee ka ókèala Anne sonye n’alaeze ya. Otu akwụkwọ na-ekwu na, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, popu ahụ “rere ùgwù Chọọchị na ụkpụrụ dị elu iji nwetara ndị òtù ezinụlọ ya ọkwá ọchịchị.”

Nkatọ A Katọrọ Imebiga Ihe Ókè nke Popu

Ihe ezinụlọ Borgia mebigara ókè buteere ha iro na nkatọ. N’ozuzu, popu ahụ leghaara ndị na-akatọ ya anya, ma onye nke ọ na-apụghị ileghara anya bụ Girolamo Savonarola. Ọ bụ onye mọnk Dominic, ụkọchukwu na-anụ ọkụ n’obi, na onyeisi ọchịchị nke Florence. Ọ katọrọ omume ọjọọ ndị a na-eme n’obí popu ahụ, katọọkwa popu ahụ n’onwe ya nakwa usoro ọchịchị ya, na-ekwu ka a chụtuo ya ma dozigharịa chọọchị ahụ. Savonarola ji oké olu kwuo, sị: “Ndị ndú chọọchị, . . . n’abalị unu agakwuru ndị iko unu nwanyị, n’ụtụtụ kwa unu agawa sakramenti unu.” O mesịrị kwuo, sị: “[Ndị ndú ahụ] nwere ihu akwụna, ọmụma a maara aha ha ghọrọ Chọọchị ahịa. Ana m agwa unu na ndị a ekwenyeghị n’ozizi Ndị Kraịst.”

N’ịnwa imechi Savonarola ọnụ, popu ahụ kwere nkwa inye ya ọkwá kadinal, bụ́ nke ọ jụrụ ịnara. Ma ọ bụ nkatọ ọ na-akatọ popu ma ọ bụkwanụ okwuchukwu ya tinyere ya ná nsogbu, n’ikpeazụ a chụpụrụ Savonarola na chọọchị, jide ya, ma mekpọgide ya ọnụ ruo mgbe o kwupụtara mmehie ya, e mesịakwa kwụgbuo ya ma kpọọ ya ọkụ.

Ajụjụ Ndị Gbara Ọkpụrụkpụ

Ihe ndị a mere n’oge gara aga na-ewelite ajụjụ ndị dị mkpa. À pụrụ isi aṅaa kọwaa aghụghọ na omume dị otú ahụ popu mere? Olee otú ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme si akọwa ha? Ha na-eji ụzọ arụmụka dị iche iche eme ihe.

Ọtụtụ kweere na a ghaghị ile Alexander nke Isii anya na-adabere n’ọnọdụ ndị e nwere n’oge ya. O yiri ka ihe mere o ji mee ihe ndị o mere n’ọchịchị nakwa n’okpukpe ọ̀ bụ ọchịchọ o nwere ịhụ na udo dị, na e doziri esemokwu nke mba ndị na-ese okwu, na mba ndị ga-echebe ọkwá ndị popu dịkwu ná mma, nakwa na ndị eze Krisendọm jikọtara aka guzogide iyi egwu ndị Turkey.

Gịnịkwanụ banyere omume ya? “Ọ dịghị mgbe a na-enweghị Ndị Kraịst ọjọọ na ndị ụkọchukwu na-erughị eru na Chọọchị,” ka otu ọkà mmụta na-ekwu. “Ka o wee ghara ịdị onye nke a ga-eju anya, Kraịst n’onwe ya buru ya n’amụma; ọbụna o ji Chọọchị ya tụnyere ubi nke ezigbo ọka wit na ata na-eto na ya, ma ọ bụ ụgbụ nke e nwere azụ̀ ndị dị mma na ndị na-adịghị mma na ya, dị nnọọ ka o si gbachie nkịtị ka e nwee Judas n’etiti ndịozi ya.” *

Otu ọkà mmụta ahụ gara n’ihu, sị: “Dị nnọọ ka ọla ịbụ nke na-adịzighị adịzi na-adịghị eme ka uru ya belata, n’ụzọ dị otú ahụ, mmehie onye ụkọchukwu apụghị, n’ụzọ bụ́ isi, ime ka e lewe . . . ozizi ya anya ọjọọ. . . . Ọlaedo bụ ọlaedo, ma aka e ji jide ya ọ dị ọcha ma ọ bụ na ọ dịghị.” Otu onye Katọlik na-akọ akụkọ ihe mere eme na-ekwu na ụkpụrụ ndị Katọlik nwere ezi obi kwesịrị ịgbasowo n’ihe banyere Alexander nke Isii bụ ndụmọdụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya banyere ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii: ‘Meenụ ihe ha kwuru, ma unu emela ihe ha mere.’ (Matiu 23:2, 3) Otú ọ dị, n’ikwu eziokwu, echiche dị otú ahụ ọ̀ na-eme ka i kwere ihe ha na-ekwu?

Nke A Ọ̀ Bụ Ezi Iso Ụzọ Kraịst?

Jizọs nyere ụkpụrụ nduzi dị mfe a ga-eji na-anwale ezi obi nke ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst: “Unu ga-amata ha site ná mkpụrụ ha. Ọ dịghị mgbe ndị mmadụ na-aghọrọ mkpụrụ vaịn n’ogwu ma ọ bụ mkpụrụ fig n’uke, ka hà na-eme otú ahụ? N’otu aka ahụ, osisi ọma ọ bụla na-amị ezi mkpụrụ, ma osisi ọ bụla rere ure na-amị mkpụrụ na-abaghị uru; osisi ọma apụghị ịmị mkpụrụ na-abaghị uru, osisi rere ure apụghịkwa ịmị ezi mkpụrụ. Ya mere, n’ezie unu ga-amata ndị ahụ site ná mkpụrụ ha.”—Matiu 7:16-18, 20.

N’ozuzu, olee otú ndị ndú okpukpe n’ime narị afọ ndị gara aga siworo mee ihe banyere ihe ezi Iso Ụzọ Kraịst nke Jizọs guzobere na nke ezi ụmụazụ ya setịpụrụ ihe nlereanya ya, chọrọ ha n’aka, oleekwa otú ha na-esi eme ugbu a? Ka anyị tụlee nanị ụzọ abụọ—itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ụzọ ibi ndụ.

Jizọs abụghị eze n’ụwa. O biri ndụ dị nnọọ mfe nke na, dị ka o kwetara, o nweghị ọbụna ebe “ịtọgbọ isi ya.” Alaeze ya “abụghị akụkụ nke ụwa a,” ndị na-eso ụzọ ya agajeghịkwa ịbụ “akụkụ nke ụwa, dị nnọọ ka [ọ] na-abụghị akụkụ nke ụwa.” N’ihi ya, Jizọs jụrụ itinye aka n’ihe ndị metụtara ọchịchị nke oge ya.—Matiu 8:20; Jọn 6:15; 17:16; 18:36.

Otú ọ dị, ọ́ bụghị eziokwu na ruo ọtụtụ narị afọ, òtù okpukpe dị iche iche emewo ka ọ bụrụ ihe e ji mara ha bụ́ iso ndị ọchịchị na-akpakọrịta iji na-enweta ikike na akụ̀ na ụba, n’agbanyeghị na nke a akpataworo ndị nkịtị nhụjuanya? Ọ́ bụghịkwa eziokwu na ọtụtụ n’ime ndị ụkọchukwu ha na-ebi ndụ ndị oké ozu, n’agbanyeghị na imerime ndị ha kwesịrị ijere ozi nwere ike bụrụ ndị ogbenye?

Onye otu nne ji ya na Jizọs bụ́ Jems kwuru, sị: “Ndị na-akwa iko, ùnu amaghị na ịbụ ndị enyi nke ụwa bụ ịbụ ndị iro nke Chineke? Ya mere, onye ọ bụla chọrọ ịbụ enyi nke ụwa na-edebe onwe ya n’ọnọdụ ịbụ onye iro nke Chineke.” (Jems 4:4) N’ihi gịnị ka o ji bụrụ “onye iro nke Chineke”? Ọ bụ n’ihi na 1 Jọn 5:19 na-ekwu, sị: “Ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ.”

Banyere omume Alexander nke Isii, otu ọkọ akụkọ ihe mere eme nke dịrị ndụ n’oge Borgia dere, sị: “O nwetụghị njide onwe onye ná ndụ. Ihere adịtụghị eme ya, o nweghịkwa ezi obi ma ọlị, ọ maghị nkwenkwe ma ọ bụ okpukpe. O nwere akpịrị ogologo, nwee oké ọchịchọ gabigara ókè, obi tara ya nnọọ mmiri, o nwekwara oké ọchịchọ maka ọganihu nke ọtụtụ ụmụ ọ mụrụ.” N’ezie, ọ bụghị nanị Borgia bụ onye ndú okpukpe mere ihe otú ahụ.

Gịnị ka Akwụkwọ Nsọ na-ekwu banyere akparamàgwà dị otú ahụ? “Ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị ajọ omume agaghị eketa alaeze Chineke?” ka Pọl onyeozi jụrụ. “Ka a ghara iduhie unu. Ndị na-akwa iko, ma ọ bụ . . . ndị bụ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko, ma ọ bụ . . . ndị anyaukwu . . . agaghị eketa alaeze Chineke.”—1 Ndị Kọrint 6:9, 10.

Otu n’ime ihe ndị e kwuru mere e ji mee ihe ngosi ahụ e mere na Rom banyere ezinụlọ Borgia bụ “iji ghọta ndị oké mmadụ a, na-eburu n’uche oge ha dịrị ndụ . . . , iji ghọta ha, ma ọ bụtụghị iji gọpụrụ ma ọ bụ katọọ ha.” N’ezie, a hapụrụ ndị bịara ikiri ya ka ha ruo nkwubi okwu nke ha. Ya mere, olee nkwubi okwu i rurula?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 20 Maka nkọwa ziri ezi banyere ilu ndị a, lee Ụlọ Nche February 1, 1995, peeji nke 5-6, na June 15, 1992, peeji nke 17-22.

[Foto dị na peeji nke 26]

Rodrigo Borgia, Popu Alexander nke Isii

[Foto dị na peeji nke 27]

Nna Lucrezia Borgia ji ya mee ka ọkwá ya gbagotekwuo

[Foto dị na peeji nke 28]

Cesare Borgia nwere oké ọchịchọ ma bụrụ onye nrụrụ aka

[Foto dị na peeji nke 29]

Ebe ọ bụ na e mechilighị Girolamo Savonarola ọnụ, a kwụgburu ya ma kpọọ ya ọkụ