Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Anụ Ufe Pụrụ Ịkụziri Anyị

Ihe Anụ Ufe Pụrụ Ịkụziri Anyị

Ihe Anụ Ufe Pụrụ Ịkụziri Anyị

“LERUONỤ anụ ufe nke eluigwe anya nke ọma, n’ihi na ha adịghị akụ mkpụrụ ma ọ bụ na-aghọrọ ma ọ bụ na-ekpokọta ihe n’ụlọ nkwakọba ihe; ma Nna unu nke eluigwe na-enye ha nri. Ọ̀ bụ na unu adịghị oké ọnụ karịa ha?” (Matiu 6:26) Jizọs Kraịst kwuru ihe a n’ozizi a ma ama o ziri n’akụkụ ugwu dị nso n’Oké Osimiri Galili. Ọ bụghị nanị ụmụazụ ya nọ na-ege ya ntị. Oké ìgwè mmadụ ndị pụrụ ịghọ ndị na-eso ụzọ ya bụ́ ndị si n’ebe nile n’ala ahụ, nọ n’ebe ahụ. Ọtụtụ n’ime ha bụ ndị ogbenye bụ́ ndị kpọtara ndị na-arịa ọrịa ka Jizọs gwọọ ha.—Matiu 4:23–5:2; Luk 6:17-20.

Mgbe Jizọs gwọsịrị ndị ọrịa nile nọ ebe ahụ, o lebaara mkpa ime mmụọ ha, bụ́ nke ka mkpa, anya. Otu n’ime ihe ndị ọ kụziri bụ ihe ahụ e kwuru n’elu.

E nwewo anụ ufe nke eluigwe eri ogologo oge. Ụfọdụ n’ime ha na-eri ụmụ ahụhụ, ndị ọzọ na-eri mkpụrụ osisi na mkpụrụ ọghịgha. Ọ bụrụ na Chineke mere ka anụ ufe nwee nri n’ụba otú ahụ, n’ezie o nwere ike nke inyere ndị ohu ya bụ́ mmadụ aka inweta ihe ha ga na-eri kwa ụbọchị. Ọ pụrụ ime nke a site n’inyere ha aka inweta ọrụ iji na-akpata ego maka nri. Ma ọ bụ ọ pụrụ ime ka ha nwee ihe ịga nke ọma n’ịkọ nri. A bịa n’ihe banyere oge e nwere ọnọdụ mberede, Chineke pụrụ ịkpali obi ndị agbata obi na ndị enyi nwere obiọma iso ndị nọ ná mkpa kerịta nri ọ bụla ha nwere.

E nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ anyị pụrụ ịmụta site n’iji nlezianya na-ekiri ndụ anụ ufe. Chineke kenyere ha amamihe ebumpụta ụwa ndị dị ịtụnanya iji na-ewu ụlọ ndị ha pụrụ ịnọ na-azụ ụmụ ha. Tụlee ụdị ụlọ abụọ. Foto dị n’aka ekpe bụ nke ụlọ nnụnụ Africa a na-akpọ rock martin. Ọ na-arụ ụlọ ya n’ahụ́ oké nkume ma ọ bụ n’ahụ́ ụlọ. Nnụnụ a na-arụ ụlọ ya otú ọ ga-esi jiri ebe pụtara apụta nke oké nkume ma ọ bụ, dị ka e gosiri na foto a, elu ụlọ, mere elu ụlọ ya. Ọ na-eji ụmụ irighiri ụrọ a kpụkọtara ka o yie iko na-arụ ebe ala nke ụlọ ya. Ma oké ma nne nnụnụ a na-arụsi ọrụ ike iweta ụmụ irighiri ụrọ, ọ pụkwara iwe ha ihe karịrị otu ọnwa iji rụchaa ụlọ ha. E mesịa, ha na-atụkwasị ahịhịa na ábụ́bà ha n’elu ụrọ ahụ. Ha abụọ na-ekere òkè n’inye ụmụ ha nri. Foto nke dị n’okpuru bụ nke akwụ́ oké asha. Nnụnụ Africa a na-agba mbọ na-eji ahịhịa akpa akwụ́ ya. Ọ pụrụ ịkpacha otu akwụ́ n’otu ụbọchị, ọ pụkwara ịkpa ihe karịrị akwụ́ 30 n’otu oge ọrụ ha!

Gịnị ka anyị na-amụta na ya? Ọ bụrụ na Chineke na-enye anụ ufe nkà na ngwá ọrụ dị otú ahụ bara ụba ha ji akpa akwụ́, n’ezie ọ pụrụ inyere ndị ohu ya bụ́ mmadụ aka inweta ụlọ dị ha mkpa. Otú ọ dị, Jizọs gosiri na ọ dị ihe ọzọ dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova Chineke nyere anyị aka inweta ihe ndị na-akpa anyị. Jizọs kwere nkwa, sị: “Ya mere, nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ọzọ ndị a nile.” (Matiu 6:33) Ị pụrụ iche n’echiche, sị, ‘Gịnị ka ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke na-agụnye?’ Obi ga-adị Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị na-ekesa magazin a, ụtọ ịza ajụjụ ahụ.