Jizọs Kraịst—Ihe Akaebe nke Na-egosi na O Biri n’Ụwa
Jizọs Kraịst—Ihe Akaebe nke Na-egosi na O Biri n’Ụwa
IHE ka ọtụtụ ná ndị mmadụ ezutebeghị ọkà mmụta sayensị ahụ a ma ama aha ya bụ Albert Einstein. Ná mba ụfọdụ, ihe ka ọtụtụ amaghịdị onye ọ bụ. Ma, ihe ndekọ a pụrụ ịtụkwasị obi banyere ihe ndị ọ rụzuru na-egosi na ọ dịrị adị n’ezie. A na-ahụ mmetụta nke ịdị adị ya site n’itinye ihe ndị ọ chọpụtara n’ọrụ na nkà mmụta sayensị. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị na-erite uru n’ike eletrik, bụ́ nke a na-emepụta, n’ọnọdụ ụfọdụ, na-adabere n’ihe ndị ọ chọpụtara.
A pụrụ iji otu echiche ahụ mee ihe n’ebe Jizọs Kraịst nọ, bụ́ onye a maara dị ka nwoke kasị nwee mmetụta n’ahụ́ ndị mmadụ kemgbe ụwa. Ihe e dere banyere ya na ihe ndị a na-ahụ anya
bụ́ ndị na-agba akaebe banyere mmetụta ndị o nwere n’ahụ́ ndị mmadụ na-egosi n’ụzọ obi abụọ na-adịghị na ya na o biri n’ụwa. N’agbanyeghị otú ihe mgbe ochie ahụ a chọtara n’oge na-adịbeghị anya e dere banyere Jems na ya, bụ́ nke e kwuru banyere ya n’isiokwu bu ụzọ, pụrụ isi bụrụ ihe na-akpali mmasị, ịbụ eziokwu nke ịdị adị Jizọs adịghị adabere na ya ma ọ bụ n’ihe mgbe ochie ọ bụla ọzọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị pụrụ ịhụ ihe akaebe na-egosi na Jizọs biri n’ụwa n’ihe ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kwuru banyere ya na ụmụazụ ya.Akaebe nke Ndị Ọkọ Akụkọ Ihe Mere Eme
Dị ka ihe atụ, tụlee akaebe nke Flavius Josephus, bụ́ onye Juu kọrọ akụkọ ihe mere eme na narị afọ mbụ, bụrụkwa onye Farisii. Ọ kpọrọ Jizọs Kraịst aha n’akwụkwọ bụ́ Jewish Antiquities. Ọ bụ ezie na ụfọdụ na-arụ ụka banyere izi ezi nke ebe mbụ Josephus kwuru banyere Jizọs bụ́ ebe ọ kpọrọ ya Mezaịa, Prọfesọ Louis H. Feldman nke Mahadum Yeshiva na-ekwu na ọ bụ mmadụ ole na ole rụrụla ụka banyere izi ezi nke ebe nke abụọ ọ kpọtụrụ ya aha. N’ebe ahụ, Josephus kwuru, sị: “[Ananus bụ́ nnukwu onye nchụàjà] kpọrọ ndị ọkàikpe Sanhedrin nzukọ ma kpọta n’ihu ha otu nwoke aha ya bụ Jems, bụ́ nwanne Jizọs onye a na-akpọ Kraịst.” (Jewish Antiquities, Mpịakọta nke 20, 200) Ee, onye Farisii, onye so n’ịrọ òtù nke ọtụtụ ndị nọ na ya bụ ajọ ndị iro Jizọs, kwetara na “Jems, bụ́ nwanne Jizọs,” dịrị adị.
A hụrụ mmetụta nke ịdị adị Jizọs n’ihe ụmụazụ ya mere. Mgbe a tụrụ Pọl onyeozi mkpọrọ na Rom n’ihe dị ka 59 O.A., ndị isi ndị Juu gwara ya, sị: “N’ihe metụtara ịrọ òtù a, anyị maara na a na-ekwugide ya n’ebe nile.” (Ọrụ 28:17-22) Ha kpọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs “ịrọ òtù a.” Ọ bụrụ na a na-ekwugide ha n’ebe nile, o yiri ka ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme hà ga-akọ banyere ha, ọ́ bụghị ya?
Tacitus, bụ́ onye a mụrụ n’ihe dị ka 55 O.A., bụrụkwa onye e weere dị ka otu n’ime ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kasị ukwuu n’ụwa, kwuru banyere Ndị Kraịst n’akwụkwọ ya bụ́ Annals. N’ihe o dekọrọ banyere ebubo Nero boro na ọ bụ ha mụnyere ọkụ ahụ gbara Rom na 64 O.A., o dere, sị: “Nero kere ndị ahụ e boro ebubo agbụ ma jiri obi ịta mmiri kasịnụ mekpọọ òtù a kpọrọ asị n’ihi arụ ha na-akpa, bụ́ nke ọha na eze na-akpọ Ndị Kraịst, ọnụ. Otu n’ime ndị isi anyị, bụ́ Pontius Pilatus gburu Christus, bụ́ onye e si n’aha ya nweta aha bụ́ Ndị Kraịst, n’oge ọchịchị Taịbiriọs.” Nkọwa zuru ezu e nyere n’ihe ndekọ a kwekọrọ n’ihe ọmụma e nyere banyere Jizọs nke Bible.
Onye edemede ọzọ nke dere banyere ụmụazụ Jizọs bụ Pliny nke Nta, bụ́ onye ọchịchị Bitinia. N’ihe dị ka n’afọ 111 O.A., Pliny degaara Eze Ukwu Trajan akwụkwọ, na-ajụ ya otú ya ga-esi mesoo Ndị Kraịst ihe. Pliny dere na ndị e boro ebubo ụgha na ha bụ Ndị Kraịst na-akpọku ndị bụ́ chi ma na-efe ihe oyiyi nke Trajan, nanị iji gosi na ha abụghị Ndị Kraịst. Pliny gara n’ihu, sị: “A na-ekwu na a dịghị amanye ndị bụ́ Ndị Kraịst n’ezie ikwere ime nke ọ bụla n’ime ihe ndị a.” Nke ahụ na-agba akaebe banyere ịdị adị nke Kraịst, bụ́ onye ụmụazụ ya dị njikere ịnwụ n’ihi na ha kweere na ya.
Ka akwụkwọ bụ́ The Encyclopædia Britannica (mbipụta nke 2002) chịkọtasịrị ihe ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme nke narị afọ abụọ mbụ kwuru banyere Jizọs Kraịst na ụmụazụ ya, o kwubiri, sị: “Ihe ndekọ ndị a ndị mmadụ n’otu n’otu dere na-egosi na n’oge ochie, ọbụna ndị na-emegide Iso Ụzọ Kraịst adịghị mgbe ha nwere obi abụọ banyere ịdị adị Jizọs, bụ́ nke a rụrụ ụka ya nke mbụ ya, n’enweghịkwa ihe ndabere zuru ezu, ná ngwụsị nke narị afọ nke 18, na narị afọ nke 19, nakwa ná mmalite narị afọ nke 20.”
Akaebe nke Ụmụazụ Jizọs
“Agba Ọhụrụ na-enye ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe nile a chọrọ iji mepụtaghachi ndụ na ọnwụ Jizọs nakwa nkọwa Ndị Kraịst oge mbụ nyere banyere mkpa ọ dị,” ka akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia Americana na-ekwu. Ndị na-arụ ụka nwere ike ghara ịnakwere Bible dị ka ihe na-agba akaebe na Jizọs biri n’ụwa. Ma, ụzọ arụmụka abụọ ndị dabeere n’ihe ndị e dekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ na-enyere anyị aka kpọmkwem igosipụta na Jizọs biri ndụ n’ụwa n’ezie.
Dị ka anyị kwuworo, ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ Einstein chepụtara na-egosi na ọ dịrị adị. N’ụzọ yiri nke ahụ, ihe ndị Jizọs kụziri na-egosi n’ezie na o biri n’ụwa. Were dị ka ihe atụ, Ozizi Elu Ugwu ahụ, bụ́ ozizi a ma ama nke Jizọs ziri. (Matiu, isi nke 5-7) Matiu onyeozi dere banyere mmetụta ozizi a nwere n’ahụ ndị mmadụ, sị: “Ụzọ o si ezi ihe juru ìgwè mmadụ ahụ anya; n’ihi na ọ nọ na-ezi ha ihe dị ka onye nwere ikike.” (Matiu 7:28, 29) Banyere mmetụta ozizi ahụ nweworo n’ahụ́ ndị mmadụ n’ime narị afọ ndị gafeworonụ, Prọfesọ Hans Dieter Betz kwuru, sị: “Mmetụta Ozizi Elu Ugwu ahụ nwere n’ozuzu ya karịrị nnọọ nke okpukpe ndị Juu na Iso Ụzọ Kraịst, ma ọ bụ ọbụna ọdịbendị nke Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, na-enwe.” Ọ gbakwụnyere na ozizi a “na-amasị ndị nọ n’ebe nile n’ụzọ pụrụ iche.”
Tụlee okwu amamihe ndị na-esonụ bụ́ ndị dị irè, a kapịrị ọnụ, e kwuru n’Ozizi Elu Ugwu ahụ: “Onye ọ bụla mara gị ụra na ntì aka nri, tụgharịakwara ya nke ọzọ.” “Lezienụ anya nke ọma ka unu ghara ịdị na-eme ezi omume unu n’ihu ndị mmadụ.” “Unu echegbula onwe unu ma ọlị maka echi, n’ihi na ụbọchị na-esonụ ga-enwe nchegbu nke ya.” “Unu atụpụkwarala ézì nkume pel unu.” “Nọgidenụ na-arịọ, a ga-enyekwa unu.” “Ihe nile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.” “Sinụ n’ọnụ ụzọ ámá dị warara banye.” “Unu ga-amata ha site ná mkpụrụ ha.” “Osisi ọma ọ bụla na-amị ezi mkpụrụ.”—Matiu 5:39; 6:1, 34; 7:6, 7, 12, 13, 16, 17.
Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị nụwo ụfọdụ n’ime okwu ndị a ma ọ bụ isi ihe ha na-ekwu. Ikekwe ha aghọọla ilu n’asụsụ gị. Ọ bụ n’Ozizi Elu Ugwu ahụ ka e si nweta ha nile. Mmetụta ozizi a nweworo n’ahụ́ ọtụtụ mmadụ nakwa ọdịbendị na-agbasi akaebe ike banyere ịdị adị nke “onye ozizi ahụ bụ́ ọkà.”
Ka anyị were ya na mmadụ chepụtara onye aha ya bụ Jizọs Kraịst. Ka e were ya na onye ahụ maara ihe nke ukwuu nke ichepụta ozizi ndị a sịrị na ọ bụ Jizọs ziri n’ime Bible. Ọ́ gaghị echepụta ihe ga-eme ka Jizọs na ozizi ya masị ndị mmadụ n’ozuzu ha ruo ókè o kwere mee? Ma Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ndị Juu na-ekwu ka e nye ha ihe ịrịba ama, ndị Grik na-achọkwa amamihe; ma anyị na-ekwusa Kraịst a kpọgidere n’osisi, nye ndị Juu ọ bụ ihe na-eme ka a sụọ ngọngọ, ma nye ndị mba ọzọ ọ bụ ihe nzuzu.” (1 Ndị Kọrint 1:22, 23) Ozi banyere Kraịst a kpọgidere n’osisi amasịghị ma ndị Juu ma ndị mba ọzọ. Otú ọ dị, nke ahụ bụ Kraịst ahụ Ndị Kraịst narị afọ mbụ kwusara banyere ya. Gịnị mere e ji dee banyere Kraịst a kpọgidere n’osisi? Nanị nkọwa ga-eju afọ bụ na ndị dere Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst dekọrọ ihe ndị bụ́ eziokwu banyere ndụ na ọnwụ Jizọs.
A na-ahụ arụmụka ọzọ nke na-akwado na Jizọs biri n’ụwa ná nkwusa ụmụazụ ya kwusara ozizi ya n’adaghị mbà. Nanị ihe dị ka afọ 30 mgbe Jizọs malitesịrị ozi ya, Pọl pụrụ ikwu na ‘e kwusara ozi ọma ahụ n’etiti ihe nile e kere Ndị Kọlọsi 1:23) Ee, ozizi Jizọs gbasara n’ebe nile n’ụwa oge ochie ahụ n’agbanyeghị mmegide. Pọl, bụ́ onye a kpagburu ya onwe ya dị ka Onye Kraịst, dere, sị: “Ọ bụrụ na a kpọlitebeghị Kraịst, nkwusa anyị na-eme bụ ihe efu n’ezie, okwukwe anyị bụkwa ihe efu.” (1 Ndị Kọrint 15:12-17) Ọ bụrụ na ikwusa banyere Kraịst nke a na-akpọlitebeghị n’ọnwụ ga-abụ ihe efu, ikwusa banyere Kraịst nke ọ na-adịghị mgbe o biri n’ụwa ga-abụ ihe efu ọbụna karị. Dị ka anyị gụrụ n’akụkọ ahụ Pliny nke Nta dere, Ndị Kraịst narị afọ mbụ dị njikere ịnwụ n’ihi ikwere na Kraịst Jizọs. Ha tinyere ndụ ha n’ihe ize ndụ n’ihi Kraịst n’ihi na ọ dị adị; o biri ndụ n’ụwa dị ka e dekọrọ n’Oziọma ndị ahụ.
eke dị n’okpuru eluigwe.’ (Ị Hụwo Ihe Akaebe
Ikwere ná mbilite n’ọnwụ Jizọs Kraịst bụ ihe a chọrọ n’aka Onye Kraịst iji na-ekwusa ozi ọma. Gị onwe gị kwa pụrụ iji anya nke uche gị na-ahụ Jizọs ahụ a kpọlitere n’ọnwụ site n’ịhụ mmetụta ọ na-enwe n’ebe ụwa dị taa.
N’oge na-adịghị nnọọ anya tupu a kpọgbuo Jizọs, o buru amụma gbara ọkpụrụkpụ banyere ọnụnọ ya n’ọdịnihu. O gosikwara na a ga-akpọlite ya n’ọnwụ nakwa na ọ ga-anọdụ n’aka nri Chineke na-echere oge ọ ga-emesi ndị iro ya ike. (Abụ Ọma 110:1; Jọn 6:62; Ọrụ 2:34, 35; Ndị Rom 8:34) Nke ahụ gasịa, ọ ga-eme ihe ma chụpụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’eluigwe.—Mkpughe 12:7-9.
Olee mgbe ihe a nile ga-ewere ọnọdụ? Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ‘ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya nakwa nke ngwụsị nke usoro ihe a?’ Ihe ịrịba ama a ga-eji mata ọnụnọ ya a na-adịghị ahụ anya gụnyere agha ukwu, ụkọ nri, ala ọma jijiji, mpụta nke ndị amụma ụgha, ịba ụba nke mmebi iwu, na ajọ ọrịa na-efe efe. E kwesịrị ịtụ anya ihe omume ndị dị otú ahụ na-eweta ọdachi, n’ihi na ịchụpụ Setan bụ́ Ekwensu n’eluigwe pụtara na “ahụhụ ga-adịrị ụwa.” Ekwensu arịdatawo n’ụwa “na-ewe oké iwe, ebe ọ maara na o nwere oge dị mkpirikpi.” Tụkwasị na nke ahụ, ihe ịrịba ama ahụ na-agụnye ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ “n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile.”—Matiu 24:3-14; Mkpughe 12:12; Luk 21:7-19.
Ihe ndị ahụ Jizọs buru n’amụma emezuwo. Kemgbe Agha Ụwa Mbụ tiwapụrụ na 1914, anyị ahụwo ihe ịrịba àmà ọtụtụ ihe mejupụtara nke na-egosi ọnụnọ a na-adịghị ahụ anya nke Jizọs Kraịst. Ọ na-achị dị ka Eze nke Alaeze Chineke ma na-enwe mmetụta dị ukwuu n’ahụ́ ụmụ mmadụ. Na i ji magazin a n’aka gị bụ ihe àmà na-egosi na a na-arụ ọrụ nkwusa Alaeze ahụ taa.
Iji ghọtakwuo mmetụta ịdị adị Jizọs na-enwe, ọ dị gị mkpa ịmụ Bible. Gịnị ma ị jụọ Ndịàmà Jehova banyere nkọwa zuru ezu nke ọnụnọ Jizọs?
[Foto ndị dị na peeji nke 5]
Josephus, Tacitus, na Pliny nke Nta zochara aka n’ebe Jizọs Kraịst na ụmụazụ ya nọ
[Ebe E Si Nweta Foto]
Foto atọ a dum: © Bettmann/CORBIS
[Foto dị na peeji nke 7]
Ndị Kraịst oge mbụ kwenyesiri ike na Jizọs dị adị