Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịhụnanya—Dị Oké Mkpa

Ịhụnanya—Dị Oké Mkpa

Ịhụnanya—Dị Oké Mkpa

N’AGBANYEGHỊ afọ ndụ, ọdịbendị, ma ọ bụ agbụrụ, ịhụnanya dị mmadụ nile mkpa nke ukwuu. Ọ bụrụ na e gboghị mkpa ahụ, ha adịghị enwe obi ụtọ. Otu onye na-eme nnyocha n’ihe banyere ọgwụ na ahụ́ ike dere, sị: “Ịhụnanya na mkpakọrịta chiri anya so n’isi ihe ndị na-eme ka anyị na-arịa ọrịa na ndị na-eme ka ahụ́ dị anyị mma, ihe ndị na-akpasu anyị iwe na ndị na-enye anyị obi ụtọ, ihe ndị na-eme ka anyị na-ata ahụhụ na ndị na-eme ka anyị kwụsị ịta ahụhụ. Ọ bụrụ na ọgwụ ọhụrụ si otú a akpa ike, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị dọkịta nile nọ ná mba a ga na-agwa ndị ọrịa ha ka ha na-aṅụ ya. Ọ ga-abụ ime ihe na-ezighị ezi ịghara ịgwa onye ọrịa ka ọ na-aṅụ ya.”

N’agbanyeghị nke ahụ, ọha mmadụ nke oge a, karịsịa usoro mgbasa ozi ya na ndị nlereanya ya a ma ama, na-ekwusikarị okwu ike banyere akụ̀ na ụba, ike, ịbụ onye a ma ama, na mmekọahụ karịa ka ha na-eme banyere mkpa mmadụ nwere inwe mmekọrịta ịhụnanya na-ekpo ọkụ. Ọtụtụ ndị nkụzi na-ekwusi okwu ike banyere isetịpụ ihe mgbaru ọsọ n’ihe nke ụwa nakwa ịrụ ọrụ nke ụwa, jiri ha mere ihe bụ́ isi ha ji ekpebi onye nwere ihe ịga nke ọma. N’eziokwu, agụmakwụkwọ na mmadụ ịzụlite nkà ya dị mkpa, ma mmadụ ò kwesịrị ịchụso ha ọnwụ ọnwụ nke na ọ gaghị enwe ohere iso ndị ezinụlọ na ndị enyi ya na-anọkọ? Otu onye edemede oge ochie gụrụ akwụkwọ bụ́ onye ji amamihe nyochaa ọdịdị mmadụ, ji onye nwere nkà ma o nweghị ịhụnanya tụnyere “ngwá egwú bras na-ada ụda ma ọ bụ ngwá egwú simbal na-akụkọta ọnụ.” (1 Ndị Kọrint 13:1) Ndị dị otú ahụ pụrụ ịba ọgaranya, ọbụna bụrụ ndị a ma ama, ma ha adịtụghị enwe obi ụtọ n’ezie.

Jizọs Kraịst, bụ́ onye ghọtara ọdịdị ụmụ mmadụ nke ọma ma nwee mmasị pụrụ iche n’ebe ha nọ, weere ịhụ Chineke na ndị agbata obi n’anya dị ka ihe bụ́ isi n’ozizi ya. O kwuru, sị: “Ị ghaghị iji obi gị dum, jirikwa mkpụrụ obi gị dum, jirikwa uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya. . . . Ị ghaghị ịhụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” (Matiu 22:37-39) Ọ bụ nanị ndị na-eme ihe kwekọrọ n’okwu ndị a ga-abụ ndị na-eso ụzọ Jizọs n’ezie. N’ihi ya, o kwuru, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.”—Jọn 13:35.

Otú ọ dị, olee otú mmadụ si azụlite ịhụnanya n’ụwa taa? Oleekwa otú ndị nne na nna pụrụ isi kụziere ụmụ ha banyere ịhụnanya? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị a.

[Foto ndị dị na peeji nke 3]

Ọ bụ ihe ịma aka ịzụlite ịhụnanya n’ụwa nke e ji anyaukwu mara