Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụdị Ịhụnanya nke Kasị Mma

Ụdị Ịhụnanya nke Kasị Mma

Ụdị Ịhụnanya nke Kasị Mma

N’ỌTỤTỤ ebe n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, ma ọ bụ n’Agba Ọhụrụ, okwu bụ́ “ịhụnanya” bụ nsụgharị nke okwu Grik bụ́ a·gaʹpe.

N’ịkọwa ihe okwu ahụ pụtara, akwụkwọ ntụaka bụ́ Insight on the Scriptures * na-ekwu, sị: “[A·gaʹpe] abụghị oké mkpali, nke dabeere n’ọbụbụenyi nkịtị, dị ka a na-echekarị na ọ bụ, kama ọ bụ ịhụnanya kwekọrọ n’omume ọma ma ọ bụ nke a na-egosipụta n’ebe ọha mmadụ nọ, bụ́ nke mmadụ kpachapụrụ anya na-egosipụta n’ihi na ọ bụ ụkpụrụ ọ na-agbaso, ọrụ dịịrị ya, na ihe kwesịrị ekwesị ka o mee, iji ezi obi na-achọ ọdịmma nke ndị ọzọ n’ụzọ kwekọrọ n’ihe ziri ezi. A·gaʹpe (ịhụnanya) adịtụghị achọ ịma ma mmadụ na ibe ya hà dị n’iro, ọ dịtụghịkwa ekwe ka ibu iro mee ka mmadụ gbahapụ ụkpụrụ ziri ezi ma megwara ihe e mere ya.”

A·gaʹpe pụkwara ịgụnye mmetụta miri emi. “Nweenụ ịhụnanya siri ike [a·gaʹpe] maka ibe unu,” ka Pita onyeozi dụrụ n’ọdụ. (1 Pita 4:8) Ya mere a pụrụ ikwu na a·gaʹpe na-esite ma n’obi ma n’uche. Gịnị ma ị tụlee akụkụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ bụ́ ndị na-egosi ike ụdị ịhụnanya a magburu onwe ya nwere na otú ọ saruru na mbara? Akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-esonụ pụrụ inyere gị aka: Matiu 5:43-47; Jọn 15:12, 13; Ndị Rom 13:8-10; Ndị Efesọs 5:2, 25, 28; 1 Jọn 3:15-18; 4:16-21.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.