Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ndị Hibru 2:14, n’ihi gịnị ka e ji kpọọ Setan “onye ahụ nke nwere ihe e ji akpata ọnwụ”?

N’igbu ya nkenke, ihe Pọl bu n’uche bụ na Setan pụrụ iji aka ya ma ọ bụ si n’aka ndị ozi ya mee ka mmadụ nwụọ. N’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ, Jizọs sịrị na Setan bụ “ogbu mmadụ mgbe ọ malitere.”—Jọn 8:44.

A pụrụ ịghọtahie Ndị Hibru 2:14 n’ihi otú ụfọdụ nsụgharị si sụgharịa ya, na-asị na Setan nwere “ike nke ọnwụ” ma ọ bụ “ike n’ebe ọnwụ dị.” (Bible Nsọ nke Union Version; King James Version; Revised Standard; New International Version; Jerusalem Bible) Nsụgharị ndị dị otú ahụ pụrụ ime ka o yie ka Setan ò nwere ikike a na-akparaghị ókè nke igbu onye ọ bụla ọ chọrọ. Otú ọ dị, o doro anya na ọ dịghị otú ahụ. A sị na ọ dị otú ahụ, o yikarịrị ka ọ gaara ekpochapụwo ndị na-efe Jehova n’ụwa ogologo oge gara aga.—Jenesis 3:15.

Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “ike n’ebe ọnwụ dị” ná nsụgharị ụfọdụ na “ihe e ji akpata ọnwụ” ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ bụ “kraʹtos tou tha·naʹtou.” Tou tha·naʹtou bụ ụdị nke okwu pụtara “ọnwụ.” Kraʹtos pụtara n’ụzọ bụ́ isi “ikike, ume, ike.” Dị ka akwụkwọ bụ́ Theological Dictionary of the New Testament si kwuo, ọ na-egosi “inwe ikike ma ọ bụ ume na mkpa ọ dị kama ịbụ iji ya eme ihe.” N’ihi ya, ná Ndị Hibru 2:14, Pọl adịghị ekwu na Setan nwere ike a na-akparaghị ókè n’ebe ọnwụ dị. Kama nke ahụ, ọ na-ekwu banyere ikike Setan nwere ịkpata ọnwụ.

Olee otú Setan si eji “ihe e ji akpata ọnwụ” eme ihe? N’akwụkwọ Job, anyị na-agụ banyere otu ihe atụ nke pụrụ ịbụ ihe a na-adịghị anụkebe. Ihe ndekọ ahụ na-ekwu na Setan ji oké ifufe ‘kpata ọnwụ’ nke ụmụ Job. Otú ọ dị, rịba ama na Setan mere nke a nanị mgbe ọ natara ikike n’aka Chineke, bụ́ nke e nyere ya n’ihi na a nọ na-edozi otú ihe iseokwu dị mkpa. (Job 1:12, 18, 19) N’ezie, Setan enweghị ike igbu Job n’onwe ya. E nyeghị ya ikike ime otú ahụ. (Job 2:6) Nke a na-egosi na n’agbanyeghị na n’oge ụfọdụ, Setan enwewo ike ịkpata ọnwụ nke ụmụ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi, ọ dịghị anyị mkpa ịtụwa ụjọ na ọ ga-anapụ anyị ndụ anyị mgbe ọ bụla ọ chọrọ.

Setan esiwokwa n’aka ndị ozi ya bụ́ mmadụ kpata ọnwụ. N’ihi ya, ọtụtụ Ndị Kraịst anwụwo maka okwukwe ha, ụfọdụ bụ ndị ìgwè ndị iwe ji gburu ma ọ bụkwanụ bụrụ ndị ndị ọrụ gọọmenti ma ọ bụ ndị ọkàikpe na-arụrụ aka nyere iwu, n’ụzọ na-ezighị ezi, ka e gbuo.—Mkpughe 2:13.

Ọzọkwa, Setan akpatawo ọnwụ mgbe ụfọdụ site n’iji adịghị ike mmadụ mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Laa azụ n’oge ụmụ Izrel, Belam onye amụma nyere ndị Moab ndụmọdụ ka ha rata ụmụ Izrel ime “ihe na-eweta mmekpu megide Jehova.” (Ọnụ Ọgụgụ 31:16) Nke ahụ kpatara ọnwụ nke ihe karịrị mmadụ 23,000 bụ́ ndị Izrel. (Ọnụ Ọgụgụ 25:9; 1 Ndị Kọrint 10:8) Taa, a na-eji “nzupụta ọjọọ dị iche iche” nke Setan eduhie ụfọdụ ndị ma na-araba ha n’omume rụrụ arụ ma ọ bụ n’omume ndị ọzọ na-adịghị ewetara Chineke nsọpụrụ. (Ndị Efesọs 6:11) N’eziokwu, ndị dị otú ahụ adịghị anwụ ozugbo. Ma ha na-anọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị ndụ ebighị ebi ga-akwa, n’ụzọ dịkwa otú ahụ, Setan na-akpata ọnwụ ha.

Ọ bụ ezie na anyị na-aghọta na Setan nwere ikike nke imerụ anyị ahụ́, ọ dịghị mkpa ka anyị na-atụ ya egwu na-enweghị isi. Mgbe Pọl sịrị na Setan nwere ihe e ji akpata ọnwụ, o kwukwara na Kraịst nwụrụ ka o wee “mee ka [Setan] ghara ịdị . . . ; ka o wee tọhapụkwa ndị nile ji maka egwu ọnwụ bụrụ ndị e doro ịnọ n’ohu ná ndụ ha nile.” (Ndị Hibru 2:14, 15) Ee, Jizọs kwụrụ ihe mgbapụta ahụ ma si otú ahụ mee ka ihe a kpọrọ mmadụ kwere ekwe nwere onwe ha pụọ n’ịbụ ohu nke mmehie na ọnwụ.—2 Timoti 1:10.

N’ezie, ọ bụ ihe na-akpata nchegbu iche na Setan nwere ihe e ji akpata ọnwụ, ma obi siri anyị ike na Jehova pụrụ imezi ihe ọ bụla Setan na ndị ozi ya mebiri. Jehova na-emesi anyị obi ike na Jizọs ahụ e si n’ọnwụ kpọlite ‘ga-etipịasị ọrụ Ekwensu.’ (1 Jọn 3:8) N’ike Jehova, Jizọs ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ ma si otú ahụ mee ka ọnwụ n’onwe ya ghara ịdị irè. (Jọn 5:28, 29) N’ikpeazụ, Jizọs ga-agba ókè ike Setan haruru n’anwụ n’ụzọ pụtara ìhè site n’ịtụba ya n’ime abis. A ga-ebibi Setan n’ikpeazụ ruo mgbe ebighị ebi.—Mkpughe 20:1-10.