“Chineke Bụ Ịhụnanya”
“Chineke Bụ Ịhụnanya”
“Onye na-adịghị ahụ n’anya amabeghị Chineke, n’ihi na Chineke bụ ịhụnanya.”—1 JỌN 4:8.
1-3. (a) Gịnị ka Bible kwuru banyere àgwà Jehova bụ́ ịhụnanya, n’ụzọ dịkwa aṅaa ka okwu a si pụọ iche? (b) N’ihi gịnị ka Bible ji kwuo na “Chineke bụ ịhụnanya”?
ÀGWÀ nile nke Jehova enweghị atụ, ha zuru okè ma na-adọrọ adọrọ. Ma àgwà Jehova nke kasị adọta anyị n’ebe ọ nọ bụ ịhụnanya. Ọ dịghị ihe ọ bụla ọzọ nke na-adọta anyị n’ebe Jehova nọ karịa ịhụnanya ya. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ịhụnanya bụkwa àgwà ya kasịnụ. Olee otú anyị si mara?
2 Ọ dị ihe Bible kwuru banyere ịhụnanya nke ọ na-adịtụghị mgbe o kwuru ya banyere àgwà ndị ọzọ bụ́ isi nke Jehova. Akwụkwọ Nsọ ekwughị na Chineke bụ ike ma ọ bụ na Chineke bụ ikpe ziri ezi ma ọ bụ ọbụna na Chineke bụ amamihe. O nwere àgwà ndị ahụ, ọ bụkwa n’ebe ọ nọ ka ha atọ sitere n’ụzọ bụ́ isi. Otú ọ dị, e kwuru ihe gbara ọkpụrụkpụ karị banyere ịhụnanya na 1 Jọn 4:8: “Chineke bụ ịhụnanya.” Ee, Jehova jupụtara nnọọ n’ịhụnanya. Ọ bụ ọdịdị ya. N’ikwu ya n’ozuzu, anyị pụrụ isi otú a chee ya: ike Jehova na-eme ka o nwee ike ime ihe. Ikpe ziri ezi na amamihe ya na-eduzi ụzọ o si eme ihe. Otú ọ dị, ịhụnanya Jehova na-akpali ya ime ihe. A na-ahụkwa ịhụnanya ya mgbe nile n’ụzọ o si eji àgwà ya ndị ọzọ eme ihe.
3 A na-ekwukarị na Jehova bụ ịhụnanya n’onwe ya. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị chọrọ ịmụta ihe banyere ịhụnanya, anyị aghaghị ịmụ banyere Jehova. Ya mere, ka anyị nyochaa ụfọdụ n’ime akụkụ nke ịhụnanya na-enweghị atụ nke Jehova.
Omume Ịhụnanya Kasịnụ
4, 5. (a) Gịnị bụ omume ịhụnanya kasịnụ n’akụkọ ihe mere eme nile? (b) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na ihe nkekọ kasị ike e nwetụrụla nke ịhụnanya mere ka Jehova na Ọkpara ya dị n’otu?
4 Jehova egosipụtawo ịhụnanya n’ọtụtụ ụzọ, ma ọ dị otu ụzọ nke pụtara ìhè karịa ndị ọzọ nile. Olee nke ọ bụ? Ọ bụ nzite o zitere Ọkpara ya ịta ahụhụ ma nwụọ n’ihi anyị. Anyị pụrụ ikwu n’ụzọ ziri ezi na nke a bụ omume ịhụnanya kasịnụ n’akụkọ ihe mere eme nile. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo otú ahụ?
5 Bible kpọrọ Jizọs, “onye e buru ụzọ mụọ n’ime ihe nile e kere eke.” (Ndị Kọlọsi 1:15) Chegodị echiche—Ọkpara Jehova dị adị tupu eluigwe na ala nkịtị amalite ịdị. Mgbe ahụ, ogologo oge ha aṅaa ka Nna ahụ na Ọkpara ahụ nọkọworo? Ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị na-eche na eluigwe na ala dị ijeri afọ 13. Ma, ọ bụrụgodị na echiche a ziri ezi, ọ gaghị ezu iji gosi ogologo oge Ọkpara Jehova buru ụzọ mụọ dịworo ndụ! Gịnị ka ọ nọ na-arụ n’afọ ndị ahụ nile? Ọkpara ahụ ji ọṅụ jee ozi dị ka “onye ọkà” nke Nna ya. (Ilu 8:30; Jọn 1:3) Jehova na Ọkpara ya rụkọrọ ọrụ ọnụ iji mee ka ihe ndị ọzọ nile dịrị. Lee oge obi ụtọ, na-akpali akpali nke ha nwere! Mgbe ahụ, ònye n’ime anyị pụrụ ịghọta n’ezie otú nkekọ e nweworo n’ime ogologo oge buru ibu otú ahụ siruru n’ike? N’ụzọ doro anya, ihe nkekọ kasị ike e nwetụrụla nke ịhụnanya mere ka Jehova Chineke na Ọkpara ya dị n’otu.
6. Mgbe e mere Jizọs baptizim, olee otú Jehova si gosipụta mmetụta o nwere n’ebe Ọkpara Ya nọ?
6 Ka o sina dị, Jehova zitere Ọkpara ya n’ụwa ka a mụọ ya dị ka nwa ọhụrụ bụ́ mmadụ. Ime otú ahụ pụtara na ruo iri afọ ole na ole, Jehova aghaghị ịkwụsị iso Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya na-enwe mmekọrịta chiri anya n’eluigwe. O ji oké mmasị na-ekiri site n’eluigwe ka Jizọs na-etolite ma ghọọ nwoke zuru okè. Mgbe Jizọs dị ihe dị ka afọ 30, e mere ya baptizim. N’oge ahụ, Nna ya n’onwe ya si n’eluigwe kwuo okwu, sị: “Nke a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye m nwapụtaworo.” (Matiu 3:17) Nna Jizọs aghaghị inwewo obi ụtọ ịhụ ka o ji ikwesị ntụkwasị obi mezuo ihe nile e buru n’amụma, ihe nile a chọrọ n’aka ya!—Jọn 5:36; 17:4.
7, 8. (a) Gịnị ka Jizọs gabigara na Naịsan 14, 33 O.A., oleekwa otú o si metụta Nna ya nke eluigwe? (b) N’ihi gịnị ka Jehova ji kwe ka Ọkpara ya taa ahụhụ ma nwụọ?
Matiu 26:14-16, 46, 47, 56, 59, 67; 27:26, 38-44, 46; Jọn 19:1.
7 Otú ọ dị, olee mmetụta Jehova nwere na Naịsan 14, 33 O.A., mgbe a raara Jizọs nye, ìgwè na-eme ihe ike bụ́ ndị iwe ji ejidekwa ya? Mgbe a kwara ya emo, bụọ ya asọ, ma suo ya ọkpọ? Mgbe a pịara ya ihe, pịarisie ya azụ? Mgbe e ji ntú kpọgide ụkwụ na aka ya n’otu ogologo osisi e gwunyere n’ala ma hapụ ya n’elu ebe ahụ ka ndị mmadụ nọ na-akwa ya emo? Olee otú ọ dị Nna ya mgbe Ọkpara ọ hụrụ n’anya tikuru ya n’ihi oké ihe mgbu? Olee otú ọ dị Jehova mgbe Jizọs kubiri ume nakwa mgbe Ọkpara Ya ọ hụrụ n’anya na-adịkwaghị ndụ, nke mbụ ya kemgbe a malitere ike ihe?—8 Ebe ọ bụ na Jehova nwere mmetụta, mwute ọ na-aghaghị inwewo n’ihi ọnwụ nke Ọkpara ya karịrị ihe ọnụ anyị nwere ike ikwu. Ihe a pụrụ ikwu bụ nzube Jehova nke mere o ji kwe ka o mee. N’ihi gịnị ka Nna ya ji tinye onwe ya n’ọnọdụ ga-eme ka o nwee mwute dị otú ahụ? Jehova na-eme ka anyị mata otu ihe magburu onwe ya na Jọn 3:16—amaokwu Bible nke dị oké mkpa nke na a kpọwo ya Oziọma n’ụdị dị ntakịrị. Ọ na-ekwu, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” Ya mere, nzube Chineke ji mee ya bụ nke a: ịhụnanya. E gosipụtatụbeghị ịhụnanya karịrị nke ahụ.
Otú Jehova Si Emesi Anyị Obi Ike na Ya Hụrụ Anyị n’Anya
9. Gịnị ka Setan na-achọ ime ka anyị kwere banyere ụzọ Jehova si ele anyị anya, ma gịnị ka Jehova na-emesi anyị obi ike banyere ya?
9 Otú ọ dị, otu ajụjụ dị mkpa na-ebilite: Chineke ọ̀ hụrụ mụ onwe m n’anya? Ụfọdụ pụrụ ikweta na Chineke hụrụ ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu ha n’anya, dị ka Jọn 3:16 na-ekwu. Ma ha na-eche, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, sị, ‘Chineke apụghị ịhụ mụ onwe m n’anya ma ọlị.’ Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ na-agụsi Setan bụ́ Ekwensu agụụ ike ime ka anyị kwere na Jehova ahụghị anyị n’anya, nke o ji eji anyị akpọrọ ihe. N’aka nke ọzọ, otú ọ sọkwara anyị cheruo na anyị bụ ndị a na-ahụghị n’anya ma ọ bụ ndị na-abaghị uru, Jehova na-emesi anyị obi ike na ya ji onye ọ bụla n’ime ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi kpọrọ ihe.
10, 11. Olee otú ihe atụ Jizọs banyere nza si egosi na anyị dị oké ọnụ ahịa n’anya Jehova?
10 Dị ka ihe atụ, tụlee okwu Jizọs e dekọrọ na Matiu 10:29-31. N’ime ihe atụ otú ndị na-eso ụzọ ya dịruru oké ọnụ ahịa, Jizọs sịrị: “Ọ̀ bụ na a dịghị ere nza abụọ otu mkpụrụ ego nke ga-azụta nanị ihe dị nta? Ma o nweghị otu n’ime ha ga-ada n’ala Nna unu aghara ịma. Ma a gụwo ntutu nile nke isi unu ọnụ. Ya mere unu atụla egwu: Unu dị oké ọnụ ahịa karịa ọtụtụ nza.” Tụlee ihe okwu ndị ahụ pụtara nye ndị gere Jizọs ntị na narị afọ mbụ.
11 N’oge Jizọs, nza bụ nnụnụ a na-eri eri kasị ọnụ ala a na-ere n’ahịa. Mmadụ na-eji otu mkpụrụ ego nke ga-azụta nanị ihe dị nta azụta nza abụọ. Ma Jizọs mesịrị kwuo, dị ka e dekọrọ na Luk 12:6, 7, na ọ bụrụ na mmadụ ejiri mkpụrụ ego abụọ, ọ bụghị nza anọ ka ọ na-azụta, kama nza ise. A na-eji otu nnụnụ emezi ya dị ka a ga-asị na ọ baghị uru ọ bụla ma ọlị. Ikekwe nnụnụ ndị dị otú ahụ abaghị uru n’anya mmadụ, ma olee otú Onye Okike si ele ha anya? Jizọs kwuru, sị: “A dịghị echefu otu n’ime ha [ọbụnadị nke ahụ e ji mezie ya] n’ihu Chineke.” Ugbu a, anyị pụrụ ịmalite ịghọta isi ihe Jizọs na-ekwu. Ebe ọ bụ na Jehova weere otu nza dị ka ihe bara uru otú ahụ, lee ka mmadụ ga-esi baa uru karị! Dị ka Jizọs kwuru, Jehova maara ihe nile banyere anyị. Leenụ, a gụrụ ọbụna ntutu dị n’isi anyị ọnụ!
12. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na Jizọs kwuru eziokwu mgbe ọ sịrị na a gụrụ ntutu isi anyị ọnụ?
12 Ụfọdụ pụrụ iwere ya na Jizọs kwubigara okwu ókè n’ebe a. Otú ọ dị, chegodị echiche banyere mbilite n’ọnwụ. Lee ka Jehova na-aghaghị isiwo mara anyị nke ọma iji nwee ike ikeghachi anyị! O ji anyị kpọrọ ihe nke ukwuu nke na ọ na-echeta ihe nile, gụnyere ụkpụrụ ihe ndị mejupụtara mkpụrụ ndụ ebumpụta ụwa anyị dị mgbagwoju anya na ihe nile anyị na-echeta na ahụmahụ nile anyị nwere n’ime ọtụtụ afọ. Ịgụ ntutu isi anyị ọnụ—nke ihe na-etopụta n’isi otu onye bụ ihe dị ka 100,000—ga-abụ ihe dị mfe omume ma e jiri ya tụnyere nke ahụ. Lee ụzọ magburu onwe ya okwu Jizọs si emesi anyị obi ike na Jehova na-eche banyere anyị n’otu n’otu!
13. Olee otú ihe banyere Eze Jehoshafat si egosi na Jehova na-achọ ebe anyị na-emezi emezi n’agbanyeghị na anyị ezughị okè?
13 Bible na-ekpughe ihe ọzọ nke na-emesi anyị obi ike na Jehova hụrụ anyị n’anya. Ọ na-achọ ebe anyị na-emezi emezi ma na-eji ya akpọrọ ihe. Were ezigbo Eze Jehoshafat dị ka ihe atụ. Mgbe eze ahụ mere omume nzuzu, onye amụma Jehova gwara ya, sị: “N’ihi ihe a iwe dịkwasịrị gị site n’ihu Jehova.” Lee okwu na-akpata nchegbu nke ahụ bụ! Ma ozi Jehova akwụsịghị n’ebe ahụ. Ọ gara n’ihu, sị: “Otú ọ dị, a chọtawo ezi ihe n’aka gị.” (2 Ihe E Mere 19:1-3) Ya mere, iwe ezi omume Jehova emeghị ka ọ ghara ịhụta “ezi ihe” nke dị n’ime Jehoshafat. Ọ́ bụghị ihe na-emesighachi obi ike ịmara na Chineke anyị na-achọ ebe anyị na-emezi emezi n’agbanyeghị na anyị ezughị okè?
Chineke nke “Na-agbaghara Mmehie”
14. Mgbe anyị mere mmehie, olee mmetụta dị mwute anyị pụrụ inwe, ma olee otú anyị pụrụ isi bụrụ ndị Jehova gbaghaara mmehie ha?
14 Mgbe anyị mere mmehie, mmechuihu, ihere, na obi amamikpe anyị na-enwe pụrụ ime ka anyị na-eche na ọ dịghị mgbe anyị ga-eru eru ijere Jehova ozi ọzọ. Otú ọ dị, cheta na Jehova “na-agbaghara mmehie.” (Abụ Ọma 86:5) Ee, ọ bụrụ na anyị echegharịa ná mmehie anyị ma na-agbalịsi ike ịghara imeghachi ha, anyị pụrụ ịbụ ndị Jehova ga-agbaghara mmehie ha. Tụlee otú Bible si kọwaa akụkụ a magburu onwe ya nke ịhụnanya Jehova.
15. Ruo ókè ha aṅaa ka Jehova na-eme ka mmehie anyị dịrị anyị n’ebe dị anya?
15 Ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid ji okwu doro anya kọwaa mgbaghara Jehova: “Dị ka ọwụwa anyanwụ si dị anya site n’ọdịda anyanwụ, otú ahụ ka O meworo ka njehie anyị dị anya n’ebe anyị nọ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche; Abụ Ọma 103:12, The Amplified Bible) Olee otú ọwụwa anyanwụ dịruru n’anya site n’ọdịda anyanwụ? N’otu echiche, ọwụwa anyanwụ bụ ihe kasị dị anya site n’ọdịda anyanwụ; ọ dịghị mgbe ha abụọ pụrụ izute. Otu ọkà mmụta na-ekwu na okwu a pụtara “ịdị anya ruo ókè o kwere mee; ịdị anya ruo ókè anyị pụrụ ichetụ n’echiche.” Okwu Devid ndị sitere n’ike mmụọ nsọ na-agwa anyị na mgbe Jehova gbaghaara anyị mmehie anyị, ọ na-eme ka mmehie anyị dịrị anyị n’ebe dị nnọọ anya.
16. Mgbe Jehova gbaghaara anyị mmehie anyị, n’ihi gịnị ka obi pụrụ iji sie anyị ike na ọ na-ele anyị anya dị ka ndị dị ọcha mgbe nke ahụ gasịrị?
16 Ị̀ gbalịtụla ihichapụ ntụpọ dị n’uwe ụcha ya gbachapụrụ agbachapụ? Ikekwe, n’agbanyeghị mgbalị kasị mma i mere, a ka na-ahụ ntụpọ ahụ anya. Rịba ama otú Jehova si kọwaa ókè ọ na-agbagharuru mmehie: “Ọ bụrụ na mmehie unu adị ka uwe uhie, ọ bụ dị ka snow ka ha ga-adị ọcha; ọ bụrụ na ha achaa uhie uhie dị ka ogho uhie, ọ bụ dị ka ajị ọcha ka ha ga-adị.” (Aịsaịa 1:18, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Okwu ahụ bụ́ “uhie” na-apụta àgwà na-acha nnọọ ọbara ọbara. * “Uhie” bụ otu n’ime àgwà ndị guru egu e ji eteji ákwà. Anyị apụghị ma ọlị ihichapụ ntụpọ nke mmehie site ná mgbalị nke onwe anyị. Ma Jehova pụrụ ime ka mmehie ndị dị ka uhie dị ọcha ka snow ma ọ bụ ogho a na-etejighị eteji. Ya mere, mgbe Jehova gbaghaara anyị mmehie anyị, ọ dịghị anyị mkpa ichewe na ntụpọ nke mmehie ahụ ga-adịgide n’ahụ́ anyị ruo ogologo ndụ anyị fọdụrụnụ.
17. N’echiche dị aṅaa ka Jehova na-atụfu mmehie anyị n’azụ ya?
17 N’abụ ekele na-akpali akpali nke Hezekaịa rọrọ mgbe a napụtara ya n’ọrịa gaara igbu ya, ọ gwara Jehova, sị: “Ị tụfuru mmehie m nile n’azụ Gị.” (Aịsaịa 38:17, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) A kọwara Jehova n’ebe a dị ka onye na-ewere mmehie nke onye mmehie nwere nchegharị ma na-atụfu ha n’azụ Ya, ebe Ọ na-agaghị ahụ ha ma ọ bụ mara banyere ha ọzọ. Dị ka otu akwụkwọ si kwuo, a pụrụ isi otú a kwuo echiche a na-enye n’ebe a: “I mewo ka [mmehie m] dị ka a ga-asị na e mebeghị ha.” Nke ahụ ọ́ dịghị akasi obi?
18. Olee otú Maịka onye amụma si gosi na mgbe Jehova gbaghaara anyị, Ọ na-ewepụ mmehie anyị kpam kpam?
18 N’otu nkwa mweghachi, Maịka onye amụma kwupụtara nkwenye o kwenyere na Jehova ga-agbaghara ndị ya nwere nchegharị, sị: “Ònye bụ Chineke dị ka Gị, . . . na-agabigakwa njehie nke dịịrị ndị ala nketa Ya fọdụrụ? . . . Ị ga-atụbakwa mmehie nile ha n’ebe dịkarịsịrị omimi nke oké osimiri.” (Maịka 7:18, 19, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Cheedị ihe okwu ndị ahụ pụtaara ndị biri ndụ n’oge e dere Bible. Ò nwere otú ọ bụla ọ pụrụ isi kwe omume ịgụpụta ihe a tụbara “n’ebe dịkarịsịrị omimi nke oké osimiri”? N’ụzọ dị otú a, okwu Maịka na-egosi na mgbe Jehova gbaghaara anyị, ọ na-ewepụ mmehie anyị n’ụzọ na-adịgide adịgide.
“Obi Ọmịiko nke Chineke Anyị”
19, 20. (a) Gịnị ka ngwaa Hibru a sụgharịrị ịbụ “mee ebere” ma ọ bụ “nwee obi ebere” pụtara? (b) Olee otú Bible si jiri mmetụta nne na-enwe n’ebe nwa ọhụrụ ya nọ na-akụziri anyị banyere ọmịiko Jehova?
19 Ọmịiko bụ akụkụ ọzọ nke ịhụnanya Jehova. Gịnị bụ ọmịiko? N’ime Bible, ọmịiko na ebere nwere njikọ chiri anya. Ọtụtụ okwu Hibru na okwu Grik na-enye echiche nke ọmịiko. Dị ka ihe atụ, a na-asụgharịkarị ngwaa Hibru bụ́ ra·chamʹ ịbụ “mee ebere” ma ọ bụ “nwee obi ebere.” Okwu Hibru a, bụ́ nke Jehova ji eme ihe n’ebe ya onwe ya nọ, na okwu e ji eme ihe maka “akpa nwa” nwere njikọ, a pụkwara ịkọwa ya dị ka “ụdị ọmịiko nne na-enwe.”
20 Bible ji mmetụta nne na-enwe n’ebe obere nwa ya nọ mee ihe iji kụziere anyị banyere ọmịiko Jehova. Aịsaịa 49:15 na-ekwu, sị: “Nwanyị ọ̀ pụrụ ichefu nwa ya ka na-aṅụ ara, nke na ọ gaghị enwe ọmịiko [ra·chamʹ] n’ahụ́ nwa ọ mụrụ? Ee, ha pụrụ ichefu, ma agaghị m echefu gị.” (The Amplified Bible) O siri ike iche n’echiche na nne ga-echefu inye nwa ya ka na-aṅụ ara ara na ilekọta ya. E kwuwerị, nwa ọhụrụ apụghị inyere onwe ya aka; ma n’ehihie ma n’abalị mmetụta ịhụnanya na nlekọta nke nne ya na-adị nwa ọhụrụ mkpa. Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, a na-anụ banyere ndị nne na-eleghara ụmụ ha anya, karịsịa ‘n’oge ndị a pụrụ iche.’ (2 Timoti 3:1, 3) “Ma,” ka Jehova na-ekwu, “agaghị m echefu gị.” Obi ọmịiko Jehova nwere n’ebe ndị na-ejere ya ozi nọ siri ike nke ukwuu karịa mmetụta kasị dị nro e bu pụta ụwa nke anyị pụrụ ichetụ n’echiche—ọmịiko nke nne na-enwekarị n’ebe nwa ọhụrụ ya nọ.
21, 22. Olee ahụmahụ ụmụ Izrel nwere n’Ijipt oge ochie, oleekwa ihe Jehova mere banyere iti mkpu ha?
21 Olee otú Jehova, dị ka nna na-ahụ n’anya, si egosi ọmịiko? A na-ahụ àgwà a nke ọma n’ụzọ o si mesoo mba Izrel oge ochie ihe. Ka ọ na-erule ná ngwụsị nke narị afọ nke 16 T.O.A., ọtụtụ nde ndị Izrel bụ ohu n’Ijipt, bụ́ ebe e megburu ha nke ukwuu. (Ọpụpụ 1:11, 14) Ka ha nọ na-ata ahụhụ, ụmụ Izrel tikuru Jehova maka enyemaka. Olee otú Chineke nke ọmịiko si meghachi omume?
22 O metụrụ Jehova n’obi. Ọ sịrị: “Ahụwo m n’ezie mweda n’ala nke ndị m nke dị n’Ijipt, anụwokwa m iti mkpu ha; . . . amawo m ihe mgbu ha nile.” (Ọpụpụ 3:7) Jehova enweghị ike ịhụ ahụhụ ndị ya na-ata ma ọ bụ nụ mkpu ákwá ha ma ghara imetere ha ebere. Jehova bụ Chineke nke nwere mmetụta ọmịiko. E jikọtakwara mmetụta ọmịiko—ikike nke ịbụ onye ihe mgbu ndị ọzọ na-enwe na-emetụ n’obi—na ọmịiko n’ụzọ chiri anya. Otú ọ dị, ọ bụghị nanị na Jehova meteere ndị ya ebere; a kpaliri ya ime ihe n’ihi ha. Aịsaịa 63:9 na-ekwu, sị: “N’ịhụnanya Ya na n’ọmịiko Ya Ya onwe ya gbapụtara ha.” O ji ‘aka dị ike’ napụta ndị Izrel n’Ijipt. (Deuterọnọmi 4:34) Mgbe nke ahụ gasịrị, o nyere ha ihe oriri n’ụzọ ọrụ ebube ma mee ka ha baa n’ala nke ha, ala nke na-amị mkpụrụ n’ụba.
23. (a) Olee otú okwu ọbụ abụ ahụ si emesi anyị obi ike na Jehova na-enwe nchegbu miri emi banyere anyị n’otu n’otu? (b) N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Jehova si enyere anyị aka?
23 Jehova adịghị enwe ọmịiko n’ebe ndị ya nọ nanị dị ka otu ìgwè. Chineke anyị na-ahụ n’anya na-enwe nchegbu miri emi maka anyị n’otu n’otu. Ọ maara nke ọma banyere nhụjuanya ọ bụla anyị pụrụ ịdị na-enwe. Ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Anya abụọ nke Jehova dị n’ahụ́ ndị ezi omume, ntị Ya abụọ ghekwaara oghe ná mkpu ha na-etiku Ya. Jehova nọ nso ndị obi ha tiwara etiwa, Ọ na-azọpụtakwa ndị a zọpịaworo n’ime mmụọ ha.” (Abụ Ọma 34:15, 18) Olee otú Jehova si enyere anyị aka n’otu n’otu? Ọ bụchaghị na ọ na-ewepụ ihe na-akpatara anyị nhụjuanya. Kama o mewo ndokwa bara ụba maka ndị na-etiku ya maka enyemaka. Okwu ya na-enye ndụmọdụ dị irè nke pụrụ ime ka e nwee ọdịiche pụtara ìhè. N’ime ọgbakọ, ọ na-enye anyị ndị nlekọta ruru eru n’ụzọ ime mmụọ, bụ́ ndị na-agbalị igosipụta ọmịiko ahụ o nwere mgbe ha na-enyere ndị ọzọ aka. (Jems 5:14, 15) Dị ka “Onye na-anụ ekpere,” Jehova na-enye “ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ.” (Abụ Ọma 65:2; Luk 11:13) Ndokwa nile dị otú ahụ na-egosipụta “obi ọmịiko nke Chineke anyị.”—Luk 1:78.
24. Olee otú ị ga-esi emeghachi omume n’ịhụnanya Jehova?
24 Ọ́ bụghị ihe na-akpali akpali ịtụgharị uche n’ịhụnanya nke Nna anyị nke eluigwe? N’isiokwu bu ụzọ, e chetaara anyị na Jehova ji ike ya, ikpe ziri ezi ya, na amamihe ya eme ihe n’ụzọ ịhụnanya maka ọdịmma anyị. N’isiokwu a kwa, anyị ahụwo na Jehova egosipụtawo ịhụnanya ya kpọmkwem n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ—nakwa anyị n’otu n’otu—nọ n’ụzọ dị ịrịba ama. Ugbu a, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ, sị, ‘Olee otú m ga-esi emeghachi omume n’ebe ịhụnanya Jehova dị?’ Mee ihe banyere ya site n’iji obi gị dum, uche gị dum, mkpụrụ obi gị dum, na ike gị dum hụ ya n’anya. (Mak 12:29, 30) Ka ụzọ i si ebi ndụ gị kwa ụbọchị na-egosipụta na i nwere ọchịchọ sitere n’obi nke ịbịaru Jehova nso mgbe nile. Ka Jehova, bụ́ Chineke nke bụ́ ịhụnanya, nọgidekwa na-abịaru gị nso—ruo mgbe nile ebighị ebi!—Jems 4:8.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 16 Otu ọkà mmụta na-ekwu na uhie “bụ àgwà na-egbu ihe, ma ọ bụ nke na-adịghị apụ apụ. Ma igirigi, ma mmiri ozuzo, ma ịsa ya mmiri, ma iji ya eme ihe ruo ogologo oge, adịghị nke ga-eme ka ọ pụọ.”
Ị̀ Na-echeta?
• Olee otú anyị si mara na ịhụnanya bụ àgwà kasịnụ nke Jehova?
• N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na Jehova izite Ọkpara ya ịta ahụhụ ma nwụọ n’ihi anyị bụ omume ịhụnanya kasịnụ nke e gosipụtatụrụla?
• Olee otú Jehova si emesi anyị obi ike na ya hụrụ anyị n’anya n’otu n’otu?
• N’ụzọ ndị dị aṅaa doro anya ka Bible si akọwa ụzọ Jehova si agbaghara mmehie?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 15]
“Chineke . . . nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya”
[Foto dị na peeji nke 16, 17]
“Unu dị oké ọnụ ahịa karịa ọtụtụ nza”
[Ebe E Si Nweta Foto]
© J. Heidecker/VIREO
[Foto dị na peeji nke 18]
Mmetụta nne na-enwe n’ebe nwa o ku n’aka nọ pụrụ ịkụziri anyị ihe banyere ọmịiko Jehova