Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Ha?

Gịnị Mere Ha?

Gịnị Mere Ha?

NOF na No bụ aha ndị Bible kpọrọ ebe ndị bụbu isi obodo a ma ama nke Ijipt bụ́ Memphis na Thebes. Nof (Memphis) dị ihe dị ka kilomita 23 site n’ebe ndịda Cairo, n’akụkụ ebe ọdịda anyanwụ nke Osimiri Naịl. Otú ọ dị, ka oge na-aga, Memphis kwụsịrị ịbụ isi obodo Ijipt. Ka ọ na-erule ná mmalite narị afọ nke 15 T.O.A., Ijipt nwere isi obodo ọhụrụ, bụ́ No (Thebes), bụ́ nke dị ihe dị ka kilomita 500 site n’ebe ndịda Memphis. Ụlọ nsọ nke Karnak, bụ́ nke e weere dị ka ihe owuwu kasị buo ibu e jitụworo ogidi wuo, bụ otu n’ime ọtụtụ ụlọ nsọ ndị e bibiri na Thebes. Thebes na ụlọ nsọ Karnak dị na ya bụ ebe a nọ fee Amọn ofufe, bụ́ chi bụ́ isi nke ndị Ijipt.

Gịnị ka Bible buru n’amụma banyere Memphis na Thebes? A mara Fero nke Ijipt na chi dị iche iche nke Ijipt ikpe, karịsịa chi ya bụ́ isi, bụ́ “Amọn nke No.” (Jeremaịa 46:25, 26) A ‘ga-ebipụ’ ìgwè ndị na-efe ofufe bụ́ ndị gbakọtara n’ebe ahụ. (Ezikiel 30:14, 15) Otú ahụkwa ka o mere. Nanị ihe metụtara ofufe Amọn nke fọdụrụnụ bụ ụlọ nsọ e bibiri ebibi. Obodo oge a bụ́ Luxor dị n’akụkụ ụfọdụ ebe Thebes oge ochie dịbu, obodo nta ndị ọzọ dịkwa n’ebe ọ dịbu.

Banyere Memphis, ihe fọrọ na ya bụ nanị ebe ili ozu e nwere na ya. Ọkà mmụta Bible bụ́ Louis Golding na-ekwu, sị: “Ruo ọtụtụ narị afọ, ndị Arab bụ́ ndị meriri Ijipt si ná nnukwu ikpo nkume ndị si n’ụlọ ndị e bibiri na Memphis nweta nkume ndị ha ji wuo isi obodo ha [bụ́ Cairo] bụ́ nke dị n’ofe nke ọzọ nke osimiri ahụ. Naịl na ndị Arab na-ewu ihe rụrụ ọrụ ha nke ọma nke na ruo ọtụtụ kilomita gburugburu obodo ochie ahụ, ọ dịghị nkume ọ bụla guzo n’elu ala ojii ahụ.” N’ezie, dị ka e buru n’amụma na Bible, Memphis ghọrọ ‘ebe tọgbọrọ n’efu, o nweghịkwa onye obibi.’—Jeremaịa 46:19.

Nke a bụ nanị abụọ n’ime ọtụtụ ihe atụ ndị na-egosi izi ezi nke amụma ndị dị na Bible. Mbibi nke Thebes na Memphis na-eme ka e nwee ihe gbara ọkpụrụkpụ mere a ga-eji nwee obi ike n’amụma Bible ndị a na-emezubeghị.—Abụ Ọma 37:10, 11, 29; Luk 23:43; Mkpughe 21:3-5.

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji 32]

Foto e sere site n’ikike British Museum