Ijere Ndị Ọzọ Ozi Na-eme Ka Nhụjuanya Belata
Akụkọ Ndụ
Ijere Ndị Ọzọ Ozi Na-eme Ka Nhụjuanya Belata
DỊ KA JULIÁN ARIAS SI KỌỌ
N’afọ 1988, mgbe m dị afọ 40, o yiri ka ọ dịghị ihe pụrụ ime ka m kwụsị ọrụ m. Abụ m onyeisi nke na-ahụ maka otu mpaghara n’otu ụlọ ọrụ nke nwere ngalaba n’ọtụtụ mba. E nyere m otu obere ụgbọala mara mma, na-akwụ m ụgwọ ọnwa buru ibu, nyekwa m ọfịs mara mma n’etiti Madrid, Spen. Ụlọ ọrụ ahụ kwutetụrụ ọbụna na ha ga-eme m onyeisi kasị elu nke ụlọ ọrụ ahụ ná mba ahụ. Amaghị m na ndụ m na-aga ịgbanwe kpam kpam.
OTU ụbọchị n’afọ ahụ, dọkịta m gwara m na m nwere ọrịa na-ebibi akwara bụ́ multiple sclerosis, bụ́ ọrịa a na-apụghị ịgwọ agwọ. Isi ghasara m. Ka e mesịrị, mgbe m gụrụ ihe ọrịa a na-ebibi akwara bụ́ multiple sclerosis pụrụ ime mmadụ, ụjọ jidere m. * O yiri nnọọ ka m ga-anwụ mgbe ọ bụla. Olee otú m ga-esi lekọta nwunye m bụ́ Milagros, na nwa m nwoke dị afọ atọ, bụ́ Ismael? Olee otú anyị pụrụ isi merie nsogbu a? Ka m nọ na-achọgharị azịza nye ajụjụ ndị a, ihe ọjọọ ọzọ dakwasịrị m.
Ihe dị ka otu ọnwa mgbe dọkịta m gwasịrị m banyere ọrịa m, onyeisi ọrụ m kpọrọ m n’ọfịs ya wee gwa m na ụlọ ọrụ anyị chọrọ ndị nwere “ọdịdị dị mma n’anya.” Onye nwekwara ọrịa na-eji nke nta nke nta ebibisị ahụ́ mmadụ—ọbụna mgbe ọ ka na-amalite amalite—adịghị enwe ọdịdị dị otú ahụ. Ozugbo ahụ, onyeisi m chụrụ m n’ọrụ. N’otu ntabi anya, ọrụ ego m kwụsịrị!
Agbalịrị m ịgbasapụ ihu mgbe mụ na ndị
ezinụlọ m nọ, ma ọ na-agụsi m agụụ ike ịnọ nanị m, iche echiche banyere ọnọdụ ọhụrụ m nọ na ya, na ịtụgharị uche banyere ọdịnihu m. Agbalịrị m ịgbaso mmetụta ịda mbà n’obi na-akawanye njọ m na-enwe mgba. Ihe kasị ewute m bụ na n’otu ntabi anya, ụlọ ọrụ m nọ na-arụrụ ọrụ weere m dị ka onye na-abakwaghị uru ọ bụla.Inweta Ume Site n’Adịghị Ike M
Ọ bụ ihe obi ụtọ na n’oge a tara akpụ, e nwere ọtụtụ ihe ndị m pụrụ isi na ha nweta ume. Afọ 20 tupu mgbe ahụ, aghọrọ m otu n’ime Ndịàmà Jehova. N’ihi ya, eji m ezi obi kpegara Jehova ekpere maka mmetụta ndị m na-enwe, nakwa maka ejighị ihe ọdịnihu ga-abụ n’aka. Nwunye m, bụ́ onye mụ na ya nọ n’otu okpukpe, bụụrụ m ezigbo isi iyi nke ume, ụfọdụ n’ime ezigbo ndị enyi anyị nyekwaara m aka, bụ́ ndị obiọma na ọmịiko ha baara m oké uru.—Ilu 17:17.
Inwe echiche bụ́ na m nwere ibu ọrụ n’ebe ndị ọzọ nọ nyekwaara m aka. Achọrọ m izulite nwa m nwoke nke ọma, izi ya ihe, isoro ya gwurie egwu, na ịzụ ya n’ọrụ ime nkwusa. N’ihi ya, apụghị m ịda mbà. Ọzọkwa, abụ m okenye n’otu n’ime ọgbakọ Ndịàmà Jehova, ụmụnna m Ndị Kraịst, ndị nwoke na ndị nwanyị nọ n’ebe ahụ chọkwara enyemaka m. Ọ bụrụ na m kwere ka nsogbu m mebie okwukwe m, ihe nlereanya dị aṅaa ka m ga-abụrụ ndị ọzọ?
N’ụzọ a na-apụghị izere ezere, ndụ m gbanwere ma n’anụ ahụ́ ma n’ụzọ akụ̀ na ụba—n’ụzọ ụfọdụ o mere ka ndụ m ka njọ ma n’ụzọ ndị ọzọ o mere ka ọ ka mma. N’otu oge anụrụ m mgbe otu dọkịta kwuru, sị: “Ọrịa anaghị egbu mmadụ; kama, ọ na-agbanwe ya.” Amụtawokwa m na ọ bụghị mgbanwe nile ọrịa kpatara na-adịcha njọ.
Nke mbụ, ‘ogwu m nwere n’anụ ahụ́’ nyeere m aka ịghọta nsogbu ahụ́ ike nke ndị ọzọ nke ọma karị na imere ha ebere. (2 Ndị Kọrint 12:7) Abịara m ghọta ihe ahụ e kwuru n’Ilu 3:5 nke ọma otú m na-aghọtatụbeghị ya: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala [ná] nghọta gị.” Karịsịa, ọnọdụ ọhụrụ m nọ na ya kụziiri m ihe ndị dị mkpa n’ezie ná ndụ, na ihe na-enye ezi afọ ojuju na mmetụta nke inwe ùgwù onwe onye. Ọ dị ọtụtụ ihe m ka nwere ike ime n’ọgbakọ Jehova. Achọpụtara m ihe okwu Jizọs pụtara n’ezie: “A na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35.
Ibi Ụdị Ndụ Ọhụrụ
Ngwa ngwa a chọpụtasịrị ọrịa m, a kpọrọ m òkù iso gaa otu nzukọ ọmụmụ ihe a ga-enwe na Madrid, bụ́ ebe a na-akụziri Ndị Kraịst wepụtara onwe ha n’afọ ofufo ụzọ isi wulite mmekọrịta n’etiti ndị na-agwọ ọrịa na ndị ọrịa bụ́ Ndịàmà. Ka e mesịrị, a haziri ndị ahụ wepụtara onwe ha n’afọ ofufo ịghọ Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ dị iche iche. Nye m, nzukọ ọmụmụ ihe ahụ bịara nnọọ n’ezi oge. Enwetara m ọrụ ka mma, nke ga-ewetara m afọ ojuju karịa nnọọ ọrụ ego ọ bụla.
Ná nzukọ ọmụmụ ihe ahụ, anyị mụtara na Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ ahụ e hiwere ọhụrụ ga na-aga n’ụlọ ọgwụ dị iche iche, na-agba ndị dọkịta ajụjụ ọnụ, ma na-agwa ndị ọrụ ahụ́ ike okwu, ihe a nile bụ n’ebumnobi nke iwulite ezi mmekọrịta na izere esemokwu. Kọmitii ndị a na-enyere Ndịàmà ibe ha aka ịchọta ndị dọkịta dị njikere ịgwọ ha n’ejighị ọbara. N’ezie, dị ka onye na-amaghị nke a na-akọ n’ihe banyere nkà ọgwụ, amụtara m ọtụtụ okwu ndị ọrụ ahụ́ ike na-eji eme ihe, iwu na-achị ndị ọrụ ahụ́ ike, na ihe banyere ụlọ ọgwụ. Ka o sina dị, mgbe nzukọ ọmụmụ ihe ahụ gasịrị, aghọrọ m onye dị iche ka m na-ala, nwee ihe ịma aka ọhụrụ nke na-enye m obi ụtọ.
Ịga Nleta n’Ụlọ Ọgwụ —Ihe Na-enye Afọ Ojuju
Ọ bụ ezie na ọrịa m ji nke nta nke nta na-eme ka m ghara inwekwa ike imegharị ahụ́ nke ọma n’ụzọ na-enweghị mbelata, ọrụ m dị ka onye nọ na Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ mụbara. A na-akwụ m ụgwọ a na-akwụ ndị nwere nkwarụ, n’ihi ya enwere m ohere ịdị na-aga nleta n’ụlọ ọgwụ. N’agbanyeghị na mgbe ụfọdụ ihe anaghị agacha dị ka e si chee ya, nleta ndị ahụ na-adị nnọọ mfe ma na-arụpụta ihe karịa otú m tụrụ anya ya. Ọ bụ ezie na m na-ejizi oche nkwagharị agagharị ugbu a, nke a abụghị oké ihe mgbochi. Mụ na onye ọzọ mụ na ya nọ na kọmitii na-eso aga mgbe nile. Ọzọkwa, ọ maara ndị dọkịta ahụ́ iso ndị nọ n’oche nkwagharị ekwurịta okwu, mgbe ụfọdụkwa ọ na-eyi ka ha na-eji nkwanye ùgwù ka ukwuu ege m ntị mgbe ha hụrụ mgbalị m na-eme ịga hụ ha.
N’ime afọ iri gara aga, eletawo m ọtụtụ narị ndị dọkịta. Ụfọdụ n’ime ha dị njikere inyere anyị aka ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ site ná mmalite. Dr. Juan Daurte—bụ́ ọkà n’ịwa obi na Madrid, onye na-enwe obi ụtọ ịkwanyere akọ na uche onye ọrịa ùgwù—kwetara ozugbo inye aka. Kemgbe ahụ, ọ wawo ihe karịrị ndị ọrịa 200 bụ́ Ndịàmà si n’akụkụ dị iche iche nke Spen ahụ́ n’ejighị ọbara. N’afọ ndị gafeworonụ, ndị dọkịta ndị ọzọ amalitela ịwa ahụ́ n’ejighị ọbara. Nleta anyị na-eme mgbe nile tụnyere ụtụ na nke a, ma ihe ọzọ sokwa mee ka e nwee ọganihu ahụ bụ ọganihu e nweworo na nkà ọgwụ na ịgwọ ọrịa nakwa ihe ọma ndị a rụpụtaworo n’ịwa ahụ́ n’ejighị ọbara. Anyị kwenyesikwara ike na Jehova agọziwo mgbalị anyị.
Mmeghachi omume nke ụfọdụ ndị dọkịta na-awa obi, ndị bụ́ ọkà n’ịgwọ ụmụaka enyewo m agbamume dị ukwuu. N’ime afọ abụọ, anyị letara otu ìgwè nke gụnyere mmadụ abụọ na-awa ahụ́ na ndị ọkà ha n’ịkụnwụ ahụ́. Anyị nyere ha akwụkwọ ọgụgụ banyere nkà ọgwụ na ịgwọ ọrịa bụ́ nke kọwara ihe ndị dọkịta ndị ọzọ na-eme n’ihe banyere ịgwọ ọrịa. Anyị nwetara ụgwọ ọrụ maka mgbalị anyị na 1999 n’oge e nwere Nnọkọ Nkwurịta Okwu Ndị Ọrụ Ahụ́ Ike Nwere Banyere Ịwa Ụmụaka Ahụ́ n’Obi. Ndị ọwa ahụ́ abụọ ahụ—ndị otu onye ọwa ahụ́ si England nke kwetara ịwa ahụ́ n’ejighị ọbara bụ onyeisi ha—wara otu nwa ọhụrụ bụ́ nwa Onyeàmà ahụ́ nke sibigara ike ókè, bụ́ onye valvụ akwara ya nke na-esi n’obi ebupụ ọbara chọrọ ndozigharị. * Eso m ndị mụrụ nwa ahụ ṅụrịa ọṅụ mgbe otu n’ime ndị ọwa ahụ́ si n’ime ụlọ ebe a na-awa ahụ́ pụta ma kwuo na ịwa ahụ́ ahụ gara nke ọma, nakwa na a kwanyeere akọ na uche nke ezinụlọ ahụ ùgwù. Ugbu a, ndị dọkịta abụọ ahụ na-anabata ndị ọrịa bụ́ Ndịàmà site n’akụkụ nile nke Spen mgbe nile.
Ihe na-enye m obi ụtọ n’ezie n’ọnọdụ ndị dị otú a bụ ịmata na m pụrụ inyere ụmụnna m Ndị Kraịst aka. Dị ka ọ na-adịkarị, mgbe ha kpọtụụrụ Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ, ọ na-abụ oge ihe kasị siere ha ike ná ndụ. Ha na-achọ ịwa ahụ́, ndị dọkịta nọ n’ụlọ ọgwụ dị n’ógbè ha adịghịkwa njikere ma ọ bụkwanụ ha apụghị ịgwọ ha n’ejighị ọbara. Otú ọ dị, mgbe ụmụnna nụrụ na e nwere ndị ọwa ahụ́ n’ụdị nsogbu ahụ́ ike ọ bụla n’ebe a na Madrid, bụ́ ndị dị njikere ịgwọ ha n’ejighị ọbara, obi na-eru ha ala. Ahụwo m
ka ihu otu nwanna nwoke gbanwere site n’ịbụ onye na-enwe nchegbu gaa n’ịbụ onye obi ruru ala, nanị n’ihi na anyị nọ ya n’akụkụ n’ụlọ ọgwụ.Ndị Ọkàikpe na Iwu Na-achị Ndị Ọrụ Ahụ́ Ike
N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ndị nọ na Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ agawokwa leta ndị ọkàikpe. N’oge nleta ndị ahụ, anyị na-enye ha mbipụta a na-akpọ Family Care and Medical Management for Jehovah’s Witnesses, bụ́ nke a kwadebere kpọmkwem iji mee ka ndị dị otú ahụ mara ihe bụ́ echiche anyị n’ihe banyere iji ọbara eme ihe na otú a pụrụ inwetaru ihe ndị na-abụghị ọbara ndị a pụrụ iji mee ihe n’ọnọdụ ọbara. Nleta ndị a dị oké mkpa n’ihi na n’oge mbụ na Spen, ndị ọkàikpe na-enyekarị ndị dọkịta ikike ịmịnyere mmadụ ọbara n’ụzọ megidere ọchịchọ onye ọrịa ahụ.
Ọfịs ndị ọkàikpe na-adị ebube, mgbe mbụ m banyere na ya, ọ dị m nnọọ ka a ga-asị na o nweghị ihe m bụ ka m ji oche nkwagharị m na-aga na paseji. Ihe mere ka ọ ka njọ bụ na anyị nwere obere ihe mberede, esikwa m n’elu oche m daa gbuo ikpere n’ala. Ndị ọkàikpe nakwa ndị ọkàiwu ole na ole hụrụ ihe merenụ ji obiọma bịa nyere m aka, ma ọ dị m ka m mechuru onwe m ihu n’ihu ha.
Ọ bụ ezie na ndị ọkàikpe ahụ amachaghị ihe mere anyị jiri bịa ịhụ ha, ihe ka ọtụtụ n’ime ha mesoro anyị ihe n’obiọma. Ọkàikpe mbụ m gara hụ anọworị na-atụgharị uche ná nguzo anyị, o kwukwara na ya ga-achọ ka anyị na ya nwee nkwurịta okwu dị ogologo. Ná nleta anyị ọzọ, o ji aka ya kwara m banye n’ọfịs ya ma gee ntị nke ọma. Ihe ọma ndị si ná nleta mbụ anyị pụta nyeere mụ na ndị ibe m aka imeri egwu anyị na-atụ, n’oge na-adịghị anya anyị hụkwara ihe ọma ndị ọzọ si na ya pụta.
N’ime otu afọ ahụ, anyị nyere ọkàikpe ọzọ ji obiọma nabata anyị otu akwụkwọ Family Care, o kwekwara nkwa ịgụ ya. Enyere m ya nọmba telifon m ka o wee nwee ike ịkpọtụrụ anyị mgbe o nwere ọnọdụ mberede. Mgbe izu abụọ gasịrị, ọ kpọrọ m na fon iji gwa m na otu onye ọwa ahụ́ nọ n’ógbè ahụ gwara ya ka ya nye ya ikike ịmịnye Onyeàmà chọrọ ịwa ahụ́ ọbara. Ọkàikpe ahụ gwara anyị na ya chọrọ ka anyị nyere ya aka ịchọta ụzọ a ga-esi kwanyere ọchịchọ Onyeàmà ahụ chọrọ izere mmịnye ọbara ùgwù. O sighịrị anyị ike nke ukwuu ịchọta ụlọ ọgwụ ọzọ, bụ́ ebe ndị ọwa ahụ́ wara ahụ́ ahụ n’ụzọ gara nke ọma n’ejighị ọbara. Ọkàikpe ahụ nwere obi ụtọ mgbe ọ nụrụ ihe siri na ya pụta, o mesikwara anyị obi ike na ya ga-achọta ihe ngwọta yiri nke ahụ n’ọdịnihu.
Mgbe m na-aga nleta n’ụlọ ọgwụ, okwu banyere iwu na-achị ndị ọrụ ahụ́ ike bilitere ọtụtụ ugboro, ebe anyị chọrọ ka ndị dọkịta na-akwanyere ikike ndị onye ọrịa nwere nakwa akọ na uche ya ùgwù. Otu ụlọ ọgwụ dị na Madrid nke kwetara ịdị na-agwọ anyị n’ejighị ọbara kpọrọ m ka m soro bịa maka ihe ọmụmụ ha ji akụzi iwu na-achị ndị ọrụ ahụ́ ike. Ihe ọmụmụ a nyeere m aka ịkọwara ọtụtụ ndị ọkachamara n’okwu metụtara ọgwụ na ahụ́ ike echiche anyị dabeere na Bible. O nyekwaara m aka ịghọta ọtụtụ mkpebi ndị siri ike ndị dọkịta na-aghaghị ime.
Otu n’ime ndị so kụzie ihe n’ihe ọmụmụ ahụ, bụ́ Prọfesọ Diego Gracia, na-ahazi site n’oge ruo n’oge ihe ọmụmụ ọkaibe banyere iwu na-achị ndị ọrụ ahụ́ ike maka ndị dọkịta nọ na Spen, ọ ghọwokwa onye nkwado siri ike nke echiche anyị bụ́ na onye ọrịa nwere ikike ime mkpebi dabeere n’ihe ọmụma o nwere n’okwu banyere mmịnye ọbara. * Nzirịta ozi anyị bụ́ nke chiri anya dugara n’ịkpọ òkù ka ụfọdụ ndị nnọchiteanya si n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Spen bịa kọwaara ụmụ akwụkwọ Prọfesọ Gracia, bụ́ ndị gụsịworo akwụkwọ na mahadum, ndị e weere ụfọdụ n’ime ha dị ka ndị dọkịta kasị mma e nwere ná mba ahụ, ihe bụ́ nguzo anyị.
Iche Ihe Bụ́ Eziokwu Ihu
N’ezie, ọrụ a na-eweta afọ ojuju m na-arụ n’ihi ndị kwere ekwe ibe m emebeghị ka nsogbu m nile laa. Ọrịa m na-akawanye njọ n’esepụghị aka. Otú ọ dị, dị ka ihe ndabara ọma, uche m dị nkọ. N’ihi enyemaka nke nwunye m na nwa m nwoke, bụ́ ndị na-adịghị eme mkpesa ma ọlị, m ka na-enwe ike ịrụ ọrụ m. E wezụga enyemaka na nkwado ha, nke a agaraghị ekwe m omume. Apụghị m ọbụna ịkpọchi traụza m ma ọ bụ yiri uwe elu m. Ana m enwe ọṅụ karịsịa iso nwa m nwoke bụ́ Ismael, bụ́ onye na-akwagharị m ebe nile ka m wee nwee ike izi ndị nwe ụlọ ozi ọma, eme nkwusa na Saturday ọ bụla. M ka na-arụkwa ọrụ m dị ka okenye ọgbakọ.
N’ime afọ 12 gara aga, ọ dịwo mgbe ụfọdụ m nwere oge ndị tara akpụ. Mgbe ụfọdụ, ịhụ otú nkwarụ m si na-emetụta ezinụlọ m na-egbu m mgbu n’obi karịa ọrịa ahụ n’onwe ya. Amaara m na ha na-ata ahụhụ, ọ bụ ezie na ha adịghị ekwupụta ya. N’oge na-adịbeghị anya, n’ime otu afọ, ọgọ m nwanyị na nna m nwụrụ. N’otu afọ ahụkwa, achọtara m onwe m dị ka onye na-apụghị ịgagharị agagharị n’ejighị oche nkwagharị. Nna m, bụ́ onye anyị na ya bi nwụrụ n’ihi ọrịa ọzọ na-eji nke nta nke nta ebibi ahụ́ mmadụ. Ọ dị nnọọ Milagros, bụ́ onye lekọtara ya, ka ọ na-ahụ ihe gaje ime m n’ọdịnihu.
Otú ọ dị, n’ikwu akụkụ ndị dị mma, ezinụlọ anyị dị n’otu ka anyị na-agbasokọ ihe isi ike mgba. Esiwo m n’oche onyeisi gaa n’oche nkwagharị, ma ndụ m ka mma ugbu a n’ezie n’ihi na m tinyere ya n’ụzọ zuru ezu n’ijere ndị ọzọ ozi. Inye ihe pụrụ ibelata nhụjuanya, Jehova na emezukwa nkwa ya nke bụ́ iwusi anyị ike n’oge mkpa. Dị ka Pọl, apụrụ m ikwu n’ezie, sị: “Maka ihe nile enwere m ume site n’onye ahụ nke na-enye m ike.”—Ndị Filipaị 4:13.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 5 Ọrịa multiple sclerosis bụ ọrịa na-akpaghasị usoro ịrụ ọrụ nke ụbụrụ na akwara. Ọ na-akpatakarị mmadụ iji nke nta nke nta ghara ịdị na-eguzosi ike, enwekwaghị ike iji aka na ụkwụ na-eme ihe, na mgbe ụfọdụ, ahụchaghị ụzọ nke ọma, nsogbu ikwu okwu, ma ọ bụ nsogbu ịghọta ihe nke ọma.
^ par. 19 A maara ịwa ahụ́ a dị ka usoro nke Ross.
^ par. 27 Lee Ụlọ Nche nke February 15, 1997, peeji nke 19-20.
[Igbe dị na peeji nke 24]
Echiche Nwunye M
Nye onye bụ́ nwunye, ya na di na-arịa ọrịa multiple sclerosis ibi siri ike—n’uche, n’ụzọ mmetụta uche, nakwa n’ụzọ anụ ahụ́. Aghaghị m iji ezi uche na-eme ihe n’ihe m na-eme atụmatụ ime ma dị njikere ileghara nchegbu na-enweghị isi banyere ọdịnihu anya. (Matiu 6:34) Otú ọ dị, ịdị na-ebi ndụ nhụjuanya pụrụ ime ka ezi àgwà mmadụ nwere pụta ìhè. Alụmdi na nwunye anyị siri ike ugbu a karịa ka ọ dị na mbụ, mmekọrịta mụ na Jehova chikwara anya karị. Akụkọ ndụ nke ndị ọzọ nọ n’ụdị ọnọdụ tara akpụ otú a ewusiwokwa m ike nke ukwuu. Enwere m ụdị afọ ojuju ahụ Julián nwere n’ihi ozi bara uru ọ na-ejere ụmụnna, achọpụtawokwa m na ọ dịghị mgbe Jehova na-ahapụ anyị, ọ bụ ezie na ụbọchị nke ọ bụla pụrụ iweta ihe ịma aka ọhụrụ.
[Igbe dị na peeji nke 24]
Echiche Nwa M Nwoke
Ná ntachi obi nna m na obi ike ya, achọtara m ihe nlereanya magburu onwe ya, ana m enwekwa mmetụta nke ịbụ onye bara uru mgbe m na-akwagharị ya. Amaara m na apụghị m ịdị na-eme ihe ndị m ga-achọ ime mgbe nile. Adị m afọ iri na ụma ugbu a, ma mgbe m mekwuru okenye, m ga-achọ ije ozi dị ka onye òtù Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ. Amaara m site ná nkwa ndị Bible kwere na nhụjuanya agaghị adịte aka nakwa na ọtụtụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị na-ahuju anya karịa anyị.
[Foto dị na peeji nke 22]
Nwunye m bụụrụ m isi iyi nke ike
[Foto dị na peeji nke 23]
Mgbe mụ na onye ọwa ahụ́ bụ́ Dr. Juan Duarte na-ekwurịta okwu
[Foto dị na peeji nke 25]
Mụ na nwa m nwoke na-enwe obi ụtọ ijekọ ozi