Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Lee, Chineke Anyị Ka Nke A Bụ”

“Lee, Chineke Anyị Ka Nke A Bụ”

“Lee, Chineke Anyị Ka Nke A Bụ”

Ihe ọmụma ndị a tụlere n’isiokwu abụọ a dịịrị ọmụmụ dabeere n’akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso, bụ́ nke e wepụtara ná mgbakọ distrikti ndị e nwere gburugburu ụwa n’afọ 2002/2003.—Lee isiokwu bụ́ “O Gbooro M Mkpa,” na peeji nke 20.

“Lee, Chineke anyị ka Nke a bụ; anyị elewo anya Ya, Ọ ga-azọpụtakwa anyị: Nke a bụ Jehova.”—AỊSAỊA 25:9.

1, 2. (a) Gịnị ka Jehova kpọrọ nna ochie ahụ bụ́ Ebreham, gịnịkwa ka nke a pụrụ ime ka anyị chewe? (b) Olee otú Bible si emesi anyị obi ike na o kwere omume iso Chineke na-enwe mmekọrịta chiri anya?

“ENYI M.” Ihe a ka Jehova, bụ́ Onye kere eluigwe na ala, kpọrọ nna ochie ahụ bụ́ Ebreham. (Aịsaịa 41:8) Chegodị echiche—mmadụ nkịtị ịbụ enyi Eze Nwe eluigwe na ala! Ị pụrụ iche, sị, ‘Ọ̀ ga-ekwe omume mụ na Chineke ịbụ enyi otú ahụ?’

2 Bible na-emesi anyị obi ike na ọ ga-ekwe omume anyị iso Chineke na-enwe mmekọrịta chiri anya. Ebreham na Jehova nwere mmekọrịta dị otú ahụ n’ihi na o “tinyere okwukwe na Jehova.” (Jems 2:23) Taakwa, Jehova ‘na ndị ziri ezi na-enwe mmekọrịta chiri anya.’ (Ilu 3:32, NW) Na Jems 4:8, Bible na-agba anyị ume, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” N’ụzọ doro anya, ọ bụrụ na anyị emee ihe iji bịaruo Jehova nso, ọ ga-eme ihe. N’ezie, ọ ga-abịaru anyị nso. Ma, okwu ndị a sitere n’ike mmụọ nsọ ọ̀ na-apụta na ọ bụ anyị—ụmụ mmadụ na-ezughị okè, na-emehie emehie—ga-ebu ụzọ mee ihe? Ọ dịghị ma ọlị. Iso Jehova nwee mmekọrịta chiri anya kwere omume nanị n’ihi na Chineke anyị na-ahụ n’anya emewo ihe abụọ dị mkpa.—Abụ Ọma 25:14.

3. Olee ihe abụọ Jehova meworo iji mee ka o kwe anyị omume ịbụ enyi ya?

3 Nke mbụ, Jehova mere ndokwa ka Jizọs “nye mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Matiu 20:28) Àjà mgbapụta ahụ na-eme ka o kwe anyị omume ịbịaru Chineke nso. Bible na-ekwu, sị: “Ma anyị onwe anyị, anyị na-ahụ n’anya, n’ihi na o bu ụzọ hụ anyị n’anya.” (1 Jọn 4:19) Ee, ebe Chineke “bu ụzọ hụ anyị n’anya,” ọ tọrọ ntọala ka anyị na ya bụrụ enyi. Nke abụọ, Jehova ekpugheworo anyị onwe ya. N’ọbụbụenyi ọ bụla anyị malitere, njikọ ahụ na-adabere n’ịmata onye nke ọzọ ahụ n’ezie, inwe mmasị n’àgwà ndị e ji mara ya na iji ha kpọrọ ihe. Tụlee ihe nke a pụtara. A sị na Jehova bụ Chineke zoro ezo, nke a na-apụghị ịmata amata, ọ dịghị mgbe anyị pụrụ ịbịaru ya nso. Ma, kama izo onwe ya ezo, Jehova chọrọ ka anyị bịa mara ya. (Aịsaịa 45:19) N’Okwu ya, bụ́ Bible, o ji okwu ndị anyị pụrụ ịghọta na-ekpughe onwe ya—ihe àmà nke na-egosi, ọ bụghị nanị na ọ hụrụ anyị n’anya, kamakwa na ọ chọrọ ka anyị mara ya ma hụ ya n’anya dị ka Nna anyị nke eluigwe.

4. Olee mmetụta anyị ga-enwe banyere Jehova ka anyị na-amatakwu àgwà ya nke ọma?

4 Ị̀ hụtụla ebe obere nwa na-atụrụ ndị enyi ya aka n’ebe nna ya nọ ma jirizie ezi ọṅụ na obi ụtọ kwuo, sị, “Lee papa m”? Ndị na-efe Chineke nwere ọtụtụ ihe mere ha ga-eji na-enwe mmetụta dị otú ahụ banyere Jehova. Bible na-ebu amụma banyere oge ndị na-ekwesị ntụkwasị obi ga-eji oké olu kwuo, sị: “Lee, Chineke anyị ka Nke a bụ.” (Aịsaịa 25:8, 9) Ka anyị na-aghọtakwu àgwà dị iche iche nke Jehova, otú ahụ ka anyị ga na-enwekwu mmetụta na anyị nwere Nna kasị mma na Enyi kasịkwa nọrọ nso a pụrụ ichetụ n’echiche. Ee, ịghọta àgwà Jehova na-eme ka anyị nwee ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji bịarukwuo ya nso. Ya mere, ka anyị nyochaa otú Bible si ekpughe àgwà ndị bụ́ isi nke Jehova—ike, ikpe ziri ezi, amamihe, na ịhụnanya. N’isiokwu a, anyị ga-atụle atọ ndị mbụ n’ime àgwà ndị ahụ.

“Ọ Dị Ukwuu n’Ike”

5. N’ihi gịnị ka o ji daba adaba na ọ bụ nanị Jehova ka a na-akpọ “Onye Pụrụ Ime Ihe Nile,” n’ụzọ ndị dịkwa aṅaa ka o si eji ike ya dị ebube eme ihe?

5 Jehova “dị ukwuu n’ike.” (Job 37:23) Jeremaịa 10:6 na-ekwu, sị: “Ọ dịghị nke dị ka Gị ma ọlị, Jehova; Onye ukwu ka Ị bụ, ihe dị ukwuu ka aha Gị dịkwa n’ịdị ike.” N’adịghị ka ihe ọ bụla e kere eke, Jehova nwere ike a na-akparaghị ókè. N’ihi ya, ọ bụ nanị ya ka a na-akpọ “Onye Pụrụ Ime Ihe Nile.” (Mkpughe 15:3) Jehova na-eji ike ya dị ebube eke ihe, na-ebibi ihe, na-enye nchebe, ma na-eweghachi ihe. Tụlee nanị ihe atụ abụọ—ike o nwere ike ihe na ike o nwere inye nchebe.

6, 7. Olee otú anyanwụ dịruru n’ike, oleekwa eziokwu dị mkpa ọ na-agba akaebe ya?

6 Ọ bụrụ na i guzoro n’èzí n’ụbọchị anwụ na-achasi ike, mmetụta dị aṅaa ka ị na-enwe n’akpụkpọ ahụ́ gị? Ị na-enwe mmetụta nke okpomọkụ anyanwụ. Otú ọ dị, n’ezie ị na-enwe mmetụta nke ihe sitere n’ike Jehova nwere ike ihe. Olee otú anyanwụ dịruru n’ike? N’etiti ya, ọ̀tụ̀tụ̀ ikpo ọkụ ya dị ihe dị ka 15,000,000 degrees Celsius. Ọ bụrụ na ị ga-enwe ike isi n’etiti anyanwụ wepụta ihe ga-aha ka isi ndụdụ ma tụsa ya n’ụwa ebe a, ị gaghị enwe ike ịnọ ihe dị ka kilomita 140 site n’ebe ị tụsara ntakịrị ihe ahụ i si n’etiti anyanwụ wepụta n’enweghị ihe ga-eme gị! Kwa sekọnd, anyanwụ na-emepụta ike ha ka nke mgbawa ọtụtụ narị nde bọmbụ nuklia. Ma, ụwa nọ n’ebe kwesịrị nnọọ ekwesị site n’ebe nnukwute ite ọkụ ahụ dị ma na-agba ya gburugburu. Ọ bụrụ na ụwa anọdewe ya nke ukwuu, ọ ga-eme ka mmiri nile dị n’ụwa ghọọ uzu ọkụ wee kupụsịa; ọ bụrụ na ọ nọrọ ya n’ebe dị anya nke ukwuu, mmiri nile dị na ya ga-akpụkọta. Ma ịnọdewe ya nso gabiga ókè ma ịnọ ya n’ebe dị anya gabiga ókè ga-eme ka a ghara inwe ihe dị ndụ n’ụwa anyị.

7 Ọ bụ ezie na ndụ ọtụtụ mmadụ dabeere n’anyanwụ, ha ejighị ya akpọrọ ihe. N’ihi ya, ha adịghị amụta ihe anyanwụ pụrụ ịkụziri anyị. Abụ Ọma 74:16 na-ekwu banyere Jehova, sị: “Gị onwe gị edoziwo ihe na-enye ìhè na anyanwụ.” Ee, anyanwụ na-ewetara Jehova, bụ́ “Onye meworo eluigwe na ụwa,” otuto. (Abụ Ọma 146:6) Ya bụrụgodị otú ahụ, ọ bụ nanị otu n’ime imerime ihe okike ndị na-akụziri anyị banyere ike dị ukwuu Jehova nwere. Ka anyị na-amụtakwu banyere ike Jehova nwere ike ihe, otú a ka egwu anyị na-atụ ya na-ebuwanye ibu.

8, 9. (a) Olee okwu ihe atụ na-emetụ n’ahụ́ nke na-egosi anyị njikere Jehova dị ichebe na ilekọta ndị na-efe ya? (b) Olee otú onye ọzụzụ atụrụ nke oge Bible si elekọta atụrụ ya, gịnịkwa ka nke a na-akụziri anyị banyere Onye Ọzụzụ Atụrụ Ukwu anyị?

8 Jehova na-ejikwa ike ya dị ukwuu echebe ndị ohu ya ma na-elekọta ha. Bible ji ihe atụ ụfọdụ doro anya ma na-emetụ n’ahụ́ akọwa nkwa ndị Jehova kwere ilekọta ha n’ụzọ ga-echebe ha. Dị ka ihe atụ, rịba ama ihe e kwuru n’Aịsaịa 40:11. N’ebe ahụ Jehova ji onwe ya tụnyere Onye Ọzụzụ Atụrụ, jirikwa ndị ya tụnyere atụrụ. Anyị na-agụ, sị: “Dị ka onye ọzụzụ atụrụ ka Ọ ga-azụ ìgwè atụrụ Ya, n’ogwe aka Ya ka Ọ ga-achịkọta ụmụ atụrụ, ọ bụkwa n’obi Ya ka Ọ ga-ekuru ha, Ọ ga-ewere nwayọọ na-edu ndị na-enye ụmụ ara.” Ị̀ pụrụ iji anya nke uche gị hụ ihe a kọwara n’amaokwu ahụ?

9 Anụ ndị na-enweghị ike ichebe onwe ha, dị ka atụrụ, dị ole na ole. Onye ọzụzụ atụrụ n’oge Bible aghaghị inwe obi ike iji chebe atụrụ ya pụọ n’aka nkịta ọhịa, anụ ọhịa bea, na ọdụm. (1 Samuel 17:34-36; Jọn 10:10-13) Ma, e nwere mgbe ichebe na ilekọta atụrụ na-achọ ka a dị nro. Dị ka ihe atụ, mgbe atụrụ mụrụ nwa n’ebe dị anya site n’ebe ogige atụrụ dị, olee otú onye ọzụzụ atụrụ ga-esi hụ na ọ dịghị ihe ga-eme nwa atụrụ ahụ a mụrụ ọhụrụ bụ́ nke na-apụghị ichebe onwe ya? Ọ ga na-eku ya “n’obi” ya—ebe ndị fụkọrọ afụkọ n’uwe elu ya—ruo ọtụtụ ụbọchị ma eleghị anya. Otú ọ dị, olee otú nwa atụrụ si abịa nọrọ “n’obi” onye ọzụzụ atụrụ? Nwa atụrụ pụrụ ịbịakwute onye ọzụzụ atụrụ, ọbụnakwa chitụ ya ahụ́ n’ụkwụ. Otú ọ dị, ọ bụ onye ọzụzụ atụrụ ahụ bụ onye na-aghaghị ihulata ma kuru nwa atụrụ ahụ, kukwasịzie ya n’ebe ọ ga-anọ ná nchebe n’obi ya. Lee ihe atụ na-emetụ n’ahụ́ nke njikere Onye Ọzụzụ Atụrụ Ukwu anyị dị ichebe na ilekọta ndị ohu ya nke ahụ bụ!

10. Olee nchebe Jehova na-enye taa, n’ihi gịnịkwa ka nchebe dị otú ahụ ji dị mkpa karịsịa?

10 Jehova emewo ihe karịrị nnọọ ikwe nkwa nchebe. N’oge Bible, o gosipụtara n’ụzọ ọrụ ebube na ya nwere ike ‘ịgbapụta ndị na-asọpụrụ Chineke n’ọnwụnwa.’ (2 Pita 2:9) Gịnị banyere taa? Anyị maara na ọ dịghị eji ike ya echebe anyị pụọ n’ọdachi nile ugbu a. Otú ọ dị, ọ na-enye anyị ihe ka mkpa—nchebe ime mmụọ. Chineke anyị na-ahụ n’anya na-echebe anyị pụọ ná mmerụ ahụ́ ime mmụọ site n’iji ihe ndị dị anyị mkpa na-akwadebe anyị ịtachi obi n’ọnwụnwa na ichebe mmekọrịta anyị na ya. Dị ka ihe atụ, Luk 11:13 na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na unu, ọ bụ ezie na unu bụ ndị ajọ omume, maara ụzọ isi nye ụmụ unu ezi onyinye, lee ka Nna unu nke nọ n’eluigwe ga-esi nye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ karị!” Ikike ahụ dị ike pụrụ ime ka anyị nwee ike ịnagide ọnwụnwa ma ọ bụ nsogbu ọ bụla anyị pụrụ iche ihu. (2 Ndị Kọrint 4:7) Jehova si otú ahụ na-eme ihe iji na-echebe ndụ anyị, ọ bụghị nanị ruo afọ ole na ole dị mkpirikpi, kama ruo mgbe ebighị ebi. N’iburu atụmanya ahụ n’uche, anyị pụrụ n’ezie ile ahụhụ ọ bụla anyị na-ata n’usoro ihe a anya dị ka ihe “na-adịru nwa oge, dịkwa mfe.” (2 Ndị Kọrint 4:17) Ọ̀ bụ na a dịghị adọta anyị nso n’ebe Chineke nke na-eji ike ya eme ihe n’ịhụnanya maka ọdịmma anyị nọ?

“Jehova Na-ahụ Ezi Ikpe n’Anya”

11, 12. (a) N’ihi gịnị ka ikpe ziri ezi Jehova ji adọta anyị n’ebe ọ nọ? Gịnị ka Devid kwubiri banyere ikpe ziri ezi Jehova, oleekwa otú okwu ndị a sitere n’ike mmụọ nsọ pụrụ isi kasie anyị obi?

11 Jehova na-eme ihe ziri ezi, ọ na-emekwa ya mgbe nile, n’eleghị mmadụ anya n’ihu. Ikpe ziri ezi nke Chineke abụghị àgwà obi ịta mmiri na nke obi ọjọọ nke na-eme ka anyị na-agbara ya ọsọ, kama ọ bụ àgwà na-adọrọ adọrọ nke na-eme ka anyị bịaruo Jehova nso. Bible na-akọwa ọdịdị na-akpali akpali nke àgwà a n’ụzọ doro anya. Ka anyị tụlezie ụzọ atọ Jehova si egosipụta ikpe ziri ezi ya.

12 Nke mbụ, ikpe ziri ezi Jehova na-akpali ya ikwesị ntụkwasị obi na iguzosi ike n’ihe nye ndị ohu ya. Ọbụ abụ bụ́ Devid ghọtara akụkụ a nke ikpe ziri ezi Jehova site n’ahụmahụ o nwere n’onwe ya. Gịnị ka Devid kwubiri site n’ahụmahụ o nwere nakwa site n’ịmụ banyere ụzọ Chineke? O kwuru, sị: “Jehova na-ahụ ezi ikpe n’anya, Ọ dịghị ahapụkwa ndị ebere Ya; ruo mgbe ebighị ebi ka a na-edebe ha.” (Abụ Ọma 37:28) Lee mmesi obi ike na-akasi obi nke ahụ bụ! Ọ dịtụghị mgbe Chineke anyị ga-agbahapụ ndị na-eguzosi ike n’ihe nye ya. Ya mere, anyị pụrụ ijide n’aka na ọ ga-anọ anyị nso ma jiri ịhụnanya na-elekọta anyị. Ikpe ziri ezi ya na-eme ka e jide nke a n’aka!—Ilu 2:7, 8.

13. Olee otú nchegbu Jehova na-enwe maka ndị ụwa na-atụ n’ọnụ si pụta ìhè n’Iwu ahụ o nyere Izrel?

13 Nke abụọ, ikpe ziri ezi nke Chineke na-agụnye ịmata mkpa nke ndị na-ata ahụhụ. A pụrụ ịhụ na Jehova na-eche banyere ndị ụwa na-atụ n’ọnụ site n’Iwu ahụ o nyere Izrel. Dị ka ihe atụ, Iwu ahụ mere ndokwa iji hụ na e lekọtara ụmụ mgbei na ndị inyom di ha nwụrụ. (Deuterọnọmi 24:17-21) N’ịmata otú ihe pụrụ isi siere ezinụlọ ndị dị otú ahụ ike, Jehova n’onwe ya ghọrọ Onyeikpe na Onye Nchebe ha dị ka nna. (Deuterọnọmi 10:17, 18) Ọ dọrọ ụmụ Izrel aka ná ntị na ọ bụrụ na ha emegbuo ndị inyom na ụmụaka na-apụghị ịzọ onwe ha, na ya ga-anụ mkpu ákwá nke ndị dị otú ahụ. “Iwe m ga-adị ọkụ,” ka o kwuru, dị ka e dekọrọ n’Ọpụpụ 22:22-24. Ọ bụ ezie na iwe esoghị n’àgwà ndị bụ́ isi nke Chineke, a na-akpali ya iwe iwe ezi omume ma ọ bụrụ na a mara ụma mee omume ikpe na-ezighị ezi, karịsịa mgbe ndị e mesoro ya bụ ndị na-enweghị onye inyeaka.—Abụ Ọma 103:6.

14. Gịnị bụ otu ihe àmà dị ịrịba ama n’ezie nke na-egosi na Jehova adịghị ele mmadụ anya n’ihu?

14 Nke atọ, na Deuterọnọmi 10:17, Bible na-emesi anyị obi ike na Jehova adịghị ‘ahụ mmadụ ihu ọma n’ikpe, ọ dịghịkwa anara ihe iri ngo.’ N’adịghị ka ọtụtụ ụmụ mmadụ bụ́ ndị nwere ike ma ọ bụ ndị a na-akwanyere ùgwù, ihe onwunwe ma ọ bụ ọdịdị elu ahụ́ adịghị emegharị Jehova anya. Ọ dịghị enwe ajọ mbunobi ma ọ bụ na-emelara otu onye ihe. Otu ihe àmà dị nnọọ ịrịba ama n’ezie nke na-egosi na ọ dịghị ele mmadụ anya n’ihu bụ nke a: Ọ bụghị nanị mmadụ ole na ole nọ n’ọkwá dị elu nwere ohere nke ịghọ ndị na-efe ya ezi ofufe, na-enwe olileanya nke ndụ na-enweghị ọgwụgwụ. Kama nke ahụ, Ọrụ 10:34, 35 na-ekwu, sị: “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anara nke ọma.” Ohere a dịịrị mmadụ nile n’agbanyeghị ọnọdụ ha ná ndụ, ụcha akpụkpọ ahụ́ ha, ma ọ bụ mba ha bi na ya. Nke ahụ ọ́ bụghị ikpe ziri ezi kasị ukwuu? N’ezie, ịghọta ikpe ziri ezi nke Jehova nke ọma karị na-eme ka anyị bịaruo ya nso!

“Lee Ịdị Omimi nke . . . Amamihe . . . nke Chineke!”

15. Gịnị bụ amamihe, oleekwa otú Jehova si egosipụta ya?

15 A kpaliri Pọl onyeozi iji oké olu kwuo, dị ka e dekọrọ ná Ndị Rom 11:33, sị: “Lee ịdị omimi nke . . . amamihe na ihe ọmụma . . . nke Chineke!” Ee, ka anyị na-atụgharị uche n’akụkụ dịgasị iche iche nke amamihe dị ukwuu nke Jehova, ọ na-anwụ anyị ibobo n’ahụ́. Otú ọ dị, olee otú anyị pụrụ isi kọwaa àgwà a? Amamihe na-ejikọta ihe ọmụma na nghọta ma jiri ha na-eme ihe iji rụzuo ihe a chọrọ. N’iji ihe ọmụma dị ukwuu na nghọta miri emi o nwere eme ihe, Jehova na-eme mkpebi ndị kasị mma mgbe nile, na-emezu ihe ndị ahụ o kpebiri n’ụzọ kasị mma a pụrụ ichetụ n’echiche.

16, 17. Olee otú ihe ndị Jehova kere eke si agba àmà banyere amamihe sara mbara o nwere? Nye otu ihe atụ.

16 Olee ihe àmà ụfọdụ a kapịrị ọnụ bụ́ ndị na-egosi na Jehova nwere amamihe sara mbara? Abụ Ọma 104:24 na-asị: “Lee ka ọrụ Gị si baa ụba nke ukwuu, Jehova! N’amamihe ka I meworo ha nile: ụwa jupụtara n’ihe I nwetara.” N’ezie, ka anyị na-amụkwu banyere ihe ndị Jehova kere, otú ahụ ka amamihe ya na-anwụkwu anyị ibobo n’ahụ́. Leenụ, ndị ọkà mmụta sayensị amụtawo ihe dị ukwuu site n’ịmụ banyere ihe ndị Jehova kere! Ọbụna e nwere ngalaba nke ọrụ injinia a na-akpọ nkà nṅomi ihe ndị dị ndụ iji mepụta ụdị ha, bụ́ nke na-anwa iṅomi ihe ndị a hụrụ n’ihe ndị e kere eke.

17 Dị ka ihe atụ, ikekwe i jiwo ijuanya kirie ọnyà ududo. N’ezie, ọ bụ nkà dị ebube. Ụfọdụ ha, bụ́ ndị yiri ka hà esighị ike, na-esi nnọọ ike karịa ígwè, sie ike karịa ihe e ji eme uwe ndị mgbọ égbè na-adịghị atụpu. Gịnị kpọmkwem ka nke ahụ pụtara? Cheedị banyere ọnyà ududo e mere ka ọ saa mbara ruo mgbe ọ bịara hara ka ụgbụ e ji egbu azụ̀ n’ụgbọ mmiri. Ọnyà ududo dị otú ahụ pụrụ isi nnọọ ike nke na ọ pụrụ ijichi ụgbọelu na-efesi ike n’elu! Ee, Jehova ejiriwo “amamihe” mee ihe nile dị otú ahụ.

18. Olee otú e si ahụ amamihe Jehova n’ụzọ o si jiri ụmụ mmadụ dee Okwu ya, bụ́ Bible?

18 A pụrụ ịhụ ihe àmà kasịnụ nke amamihe Jehova n’Okwu ya, bụ́ Bible. Ndụmọdụ ndị amamihe dị na ha a na-achọta n’ime ya na-egosi anyị n’ezie ụzọ kasị mma isi bie ndụ. (Aịsaịa 48:17) Ma a na-ahụkwa amamihe na-enweghị atụ nke Jehova n’ụzọ e si dee Bible. N’ụzọ dị aṅaa? Jehova ji amamihe ya họrọ iji ụmụ mmadụ dekọọ Okwu ya. A sị na o ji ndị mmụọ ozi dee Okwu ya sitere n’ike mmụọ nsọ, Bible ọ̀ gaara na-akpali akpali otú o si akpali? N’eziokwu, ndị mmụọ ozi gaara ejiwo ụzọ dị elu ha si ele ihe anya kọwaa Jehova, ha gaara ekwuwokwa banyere nrara ha raara onwe ha nye ya. Ma, ànyị gaara enwe ike ịghọta n’ezie ụzọ ndị mmụọ e kere eke zuru okè si eche echiche, bụ́ ndị ihe ọmụma, ahụmahụ, na ike ha karịrị nnọọ nke anyị?—Ndị Hibru 2:6, 7.

19. Olee ihe atụ na-egosi na ojiji e ji ndị edemede bụ́ mmadụ mee ihe mere ka Bible na-adọrọ mmasị ma na-akpali akpali nke ukwuu?

19 Ojiji e ji ndị edemede bụ́ mmadụ dee Bible mere ka ọ na-adọrọ mmasị ma na-akpali akpali nke ukwuu. Ndị dere ya bụ ndị ikom nwere mmetụta dị ka anyị. N’ịbụ ndị na-ezughị okè, ha nwetara ule na nrụgide ndị yiri ndị anyị na-enweta. N’ọnọdụ ụfọdụ, ha ji okwu ndị onye na-ede banyere onwe ya ji eme ihe dee banyere mmetụta nke ha na ihe ndị ha na ha na-alụ. (2 Ndị Kọrint 12:7-10) N’ihi ya, ha dere okwu ọ na-adịghị mmụọ ozi pụrụ isiwo otú ahụ dee ha. Were dị ka ihe atụ okwu Devid ndị e dekọrọ n’Abụ Ọma nke 51. Dị ka ihe e dekwasịrị n’elu ya si kwuo, Devid dere abụ ọma a mgbe o mesịrị mmehie dị oké njọ. O kwupụtara obi ya, na-egosipụta mwute dị ukwuu ma na-arịọ Chineke mgbaghara. Amaokwu nke 2 na nke 3, na-asị: “Sụchaa m nke ọma dị ka ákwà ka ajọ omume m pụọ n’ime m, meekwa ka m si ná mmehie m dị ọcha. N’ihi na mụ onwe m maara njehie m nile: mmehie m dịkwa n’ihu m mgbe nile.” Rịba amaokwu nke 5 ama: “Lee, n’ajọ omume ka a mụpụtara m; ọ bụkwa ná mmehie ka nne m tụụrụ ime m.” Amaokwu nke 17 na-agbakwụnye, sị: “Àjà nile nke Chineke bụ mmụọ tiwara etiwa: obi tiwara etiwa na nke e gwepịara egwepịa, Chineke, Ị dịghị eleda ya anya.” Ọ̀ bụ na ị pụghị ịhụ nhụjuanya nke onye dere ihe ndị ahụ nọ na ya? Olee onye ọzọ pụrụ ikwupụta echiche dị otú ahụ ma e wezụga mmadụ na-ezughị okè?

20, 21. (a) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na Bible bu amamihe Jehova n’agbanyeghị na e ji ndị mmadụ dee ya? (b) Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

20 Site n’iji mmadụ ndị dị otú ahụ na-ezughị okè mee ihe, Jehova nyere anyị nnọọ ihe dị anyị mkpa—ihe ndekọ nke “sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke” ma nwee ihe ndị gosiri na e ji ụmụ mmadụ dee ya. (2 Timoti 3:16) Ee, mmụọ nsọ duziri ndị ahụ dere ya. N’ihi ya, ha dekọrọ amamihe Jehova, ọ bụghị nke ha. Amamihe ahụ bụ nke a pụrụ ịtụkwasị obi kpam kpam. Ọ karịrị nnọọ amamihe anyị nke na Chineke ji ịhụnanya na-agba anyị ume, sị: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala [ná] nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezie.” (Ilu 3:5, 6) Site n’ịṅa ntị na ndụmọdụ ahụ amamihe dị na ya, anyị na-abịarukwu Chineke anyị kasị mara ihe nso.

21 Nke kasị adọrọ adọrọ nakwa nke kasị maa mma n’ime àgwà nile nke Jehova bụ ịhụnanya. A ga-atụle otú Jehova siworo gosipụta ịhụnanya n’isiokwu na-esonụ.

Ị̀ Pụrụ Icheta?

Olee ihe ndị Jehova meworo iji mee ka o kwe anyị omume iso ya na-enwe mmekọrịta chiri anya?

Olee ihe atụ ụfọdụ nke ike Jehova nwere ike ihe na nke o nwere ichebe ihe?

N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Jehova si egosipụta ikpe ziri ezi ya?

Olee otú e si ahụ amamihe Jehova n’ihe ndị o kere eke nakwa na Bible?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 10]

Dị ka onye ọzụzụ atụrụ nke na-eku nwa atụrụ n’obi ya, Jehova na-elekọta atụrụ Ya n’ụzọ dị nro

[Foto dị na peeji nke 13]

A na-ahụ amamihe Jehova n’ụzọ e si dee Bible