Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Si N’ezinụlọ Ndị Na-abaghị Ọgaranya Asụgharịa Bible

Ndị Si N’ezinụlọ Ndị Na-abaghị Ọgaranya Asụgharịa Bible

Ndị Si N’ezinụlọ Ndị Na-abaghị Ọgaranya Asụgharịa Bible

NA 1835, Henry Nott, bụ́ onye England na-edo blọkụ, na John Davies, bụ́ onye Wales nke na-amụ ahịa ngwá nri, rụchapụrụ otu nnukwu ọrụ. Mgbe ha rụsịworo ọrụ ike ruo ihe karịrị afọ 30, ha mesịrị sụgharịchaa Bible dum gaa n’asụsụ Tahitian. Ihe ịma aka ndị dị aṅaa ka ndị ikom abụọ a bụ́ ndị si n’ezinụlọ ndị na-abaghị ọgaranya chere ihu, gịnịkwa si n’ọrụ ha ji ịhụnanya rụọ pụta?

Òtù Okpukpe Bụ́ “Great Awakening”

N’ọkara nke abụọ nke narị afọ nke 18, ndị òtù okpukpe Protestant a na-akpọ Great Awakening, ma ọ bụ nanị Awakening, nọ na-eme nkwusa n’ámá obodo nakwa n’ebe ndị dị nso n’ebe a na-egwupụta ihe na ụlọ mmepụta ihe ndị dị na Britain. Nzube ha bụ iji ozi ọma ha jekwuru ndị na-arụ ọrụ. Ndị nkwusa ahụ nọ n’òtù Awakening ji ịnụ ọkụ n’obi gbaa ume ka a na-ekesa Bible.

Onye guzobere òtù ahụ, bụ́ onye Baptist aha ya bụ William Carey, keere òkè n’iguzobe òtù London Missionary Society (LMS), bụ́ nke e guzobere na 1795. Òtù LMS zụrụ mmadụ ndị dị njikere ịmụ asụsụ ndị a na-asụ n’Ebe Ndịda Pacific na ije ozi dị ka ndị ozi ala ọzọ n’ebe ahụ. Nzube nke ndị ozi ala ọzọ a bụ iji asụsụ nke ndị ebe ahụ na-aghọta na-ekwusa Oziọma ahụ.

Àgwàetiti Tahiti, bụ́ nke a chọpụtarala na nso nso ahụ, ghọrọ ebe mbụ òtù LSM jere ozi ala ọzọ. Nye ndị òtù Awakening, àgwàetiti ndị a bụ ‘ebe ndị nọ n’ìsì’ a na-ekpere arụsị na ha, ubi ndị chaworo acha ka e were ihe ubi ha.

Ndị Si n’Ezinụlọ Ndị Na-abaghị Ọgaranya Ejikere Maka Ọrụ Tara Akpụ

Iji wekọta ihe ubi ndị ahụ, ihe dị ka ndị ozi ala ọzọ 30 a họọrọ ọkụ ọkụ bụ́ ndị na-ejikereghị nke ọma, banyere na Duff, bụ́ ụgbọ mmiri ndị òtù LMS zụtara. Otu akụkọ dere na ndị so na ha bụ “ndị pastọ anọ e chiri echichi, [ndị a na-enyeghị ọzụzụ nke ọma], ndị kapịnta isii, mmadụ abụọ na-arụ akpụkpọ ụkwụ, mmadụ abụọ na-edo blọkụ, mmadụ abụọ na-akpa ihe, mmadụ abụọ na-akwa ákwà, otu onye na-agba mgbere ahịa, otu onye na-ere ihe e ji agba ịnyịnya, otu onye na-elekọta ụlọ, otu onye na-elekọta ubi, otu onye dọkịta, otu onye ọkpụ ụzụ, otu onye na-arụ ihe e ji etinye anụmanụ ndị pere mpe, otu onye na-emepụta ogho, otu onye na-arụ okpu, otu onye na-emepụta ákwà, otu onye ọkwa nkà, ndị inyom ise lụrụ di, na ụmụaka atọ.”

Nanị ngwá ọrụ ndị ndị ozi ala ọzọ a nwere iji mụta asụsụ ndị mbụ e ji dee Bible bụ otu akwụkwọ ọkọwa okwu na-akọwa okwu site na Grik gaa na Bekee nke dị n’otu mpịakọta na otu Bible nke a kọwara okwu Hibru na ya. N’ime ọnwa asaa ha nọrọ n’oké osimiri, ndị ozi ala ọzọ ahụ butere okwu Tahitian ụfọdụ n’isi bụ́ ndị ndị mbụ bịara n’ógbè ahụ depụtara, karịsịa ndị ndị nnupụisi nke ụgbọ mmiri bụ́ Bounty depụtara. N’ikpeazụ, ụgbọ mmiri Duff ahụ ruru Tahiti, na March 7, 1797 kwa, ndị ozi ala ọzọ ahụ si n’ụgbọ ahụ rịtuo. Otú ọ dị, mgbe otu afọ gasịrị, ọtụtụ n’ime ha dara mbà n’obi ma laa. Ọ bụ nanị ndị ozi ala ọzọ asaa fọdụrụ.

N’ime ha asaa, Henry Nott, onye bụ́bu onye na-edo blọkụ, dị nanị afọ 23. Ọ bụrụ na e jiri akwụkwọ ozi mbụ o dere tụlee ya, a na-achọpụta na o nwere nanị agụmakwụkwọ bụ́ isi. Otú o sina dị, site ná mmalite, o gosipụtara na ya nwere nkà n’ịmụta asụsụ Tahitian. A kọwara ya dị ka onye nwere ezi obi, onye na-adịghị enye onwe ya nsogbu, na onye nwere omume enyi.

Na 1801, a họọrọ Nott ịkụziri ndị ozi ala ọzọ itoolu bịara ọhụrụ asụsụ Tahitian. Onye Wales dị afọ 28, bụ́ John Davies, onye ghọrọ ezigbo nwata akwụkwọ na onye na-arụsi ọrụ ike nke dị nwayọọ n’obi ma na-emesapụ aka, so n’ime ha. N’oge na-adịghị anya, ndị ikom abụọ a kpebiri ịsụgharị Bible gaa n’asụsụ Tahitian.

Ọrụ Tara Akpụ

Otú ọ dị, ịsụgharị ihe gaa n’asụsụ Tahitian bịara ghọọ ọrụ tara akpụ, n’ihi na ka ọ dị mgbe ahụ, asụsụ Tahitian abụghị asụsụ a na-ede ede. Ndị ozi ala ọzọ ahụ aghaghị ịmụ ya nanị site n’ige ntị. Ha enweghị ma akwụkwọ ọkọwa okwu ma akwụkwọ ụtọ asụsụ. Otú okwu a na-ekwu n’asụsụ ahụ si ada ka nke onye a pịchiri aka n’imi, ọtụtụ ụdaume ndị na-esochikarị ibe ha n’otu okwu (ihe dị ka ụdaume ise n’otu okwu), na mgbochiume ole na ole e nwere n’asụsụ ahụ mere ka ndị ozi ala ọzọ ahụ nwee nnọọ nkụda mmụọ. “Ọtụtụ okwu nwere nanị ụdaume, nke ọ bụla n’ime ha nwekwara ụda nke ya,” ka ha ji arịrị kwuo. Ha kwuru na ha enweghị ike “ịnụ ụda okwu ndị ahụ nke ọma, kpọmkwem dị ka o kwesịrị.” Ọbụna ha chere na ha nụrụ ụda okwu na-adịghịdị adị!

Nke ka njọ bụ na, site n’oge ruo n’oge, a na-enye iwu ka a ghara iji okwu ụfọdụ eme ihe n’asụsụ Tahitian, ma ọ bụ na-ele ha anya dị ka okwu ndị rụrụ arụ, n’ihi ya kwa, a ghaghị ịgbanwe ha. Okwu ndị pụtara otu ihe bụkwa ihe ọzọ nyere ha nsogbu. E nwere ihe karịrị okwu 70 maka okwu bụ́ “ekpere” n’asụsụ Tahitian. Otú e si ahazi okwu Tahitian, bụ́ nke dị nnọọ iche ná ndị nke Bekee, bụ ihe ịma aka ọzọ. N’agbanyeghị ihe isi ike ndị a, nke nta nke nta, ndị ozi ala ọzọ ahụ depụtara ọtụtụ mkpụrụ okwu bụ́ ndị Davies mesịrị bipụta ka afọ 50 gasịrị dị ka akwụkwọ ọkọwa okwu nke nwere okwu 10,000.

Tụkwasị na nke ahụ, e nwere ihe ịma aka nke ide asụsụ Tahitian ede. Ndị ozi ala ọzọ ahụ gbalịrị ime otú ahụ site n’iji ụkpụrụ ide okwu nke asụsụ Bekee mee ihe. Otú ọ dị, otú Bekee si eji mkpụrụ akwụkwọ Latin eme ihe adabaghị n’ụda okwu Tahitian. N’ihi ya, e nwere ọtụtụ arụmụka banyere otú e si akpọpụta okwu na otú e si asụpe ya. Ọtụtụ mgbe, ndị ozi ala ọzọ ahụ na-echepụta ụzọ ọhụrụ a ga-esi na-asụpe okwu ụfọdụ, ebe ha bụ ndị mbụ malitere ide asụsụ ahụ ede n’ógbè ndị dị n’Oké Osimiri nke Ebe Ndịda Ụwa. Ha amaghị na a ga-emesị jiri ọrụ ha mere ihe nlereanya maka ọtụtụ asụsụ ndị e nwere n’Ebe Ndịda Pacific.

Ha Enwechaghị Ngwá Ọrụ Ma Ha Dị Nnọọ Nkọ n’Ichepụta Ihe

Ndị nsụgharị ahụ nwere nanị akwụkwọ ntụaka ole na ole. Òtù LSM nyere ha ntụziaka iji Textus Receptus na King James Version mere ihe nlereanya. Nott gwara òtù LMS ka o zitekwuo akwụkwọ ọkọwa okwu Hibru na Grik nakwa Bible n’asụsụ abụọ ahụ. A maghị ma o nwetara akwụkwọ ndị ahụ ma ọ bụ na o nwetaghị ha. Ma Davies nwetara akwụkwọ ọgụgụ ụfọdụ site n’aka ndị enyi ya bụ́ ndị Wales. Ihe ndekọ na-egosi na o nwere ma ọ dịkarịa ala otu akwụkwọ ọkọwa okwu Grik, Bible Hibru, Agba Ọhụrụ n’asụsụ Grik, na Septuagint.

Ka ọ dị mgbe ahụ, ọrụ nkwusa nke ndị ozi ala ọzọ ahụ na-arụ nọgidere bụrụ nke na-adịghị amịpụta mkpụrụ. Ọ bụ ezie na ndị ozi ala ọzọ ahụ anọwo afọ 12 na Tahiti, ọ dịghị ọbụna otu onye obodo ahụ e mere baptizim. N’ikpeazụ, agha obodo nke na-achọghị ịkwụsị akwụsị manyere ndị ozi ala ọzọ ahụ nile ịlaghachi Australia ma e wezụga Nott bụ́ onye nọgidesiri ike. Ruo oge ụfọdụ, ọ bụ nanị ya bụ onye ozi ala ọzọ nke fọdụrụ na Windward Islands nke dị na Society Islands, ma o so Eze Pomare nke Abụọ gbapụ mgbe eze ahụ gbagara n’àgwàetiti Moorea bụ́ nke dị nso.

Otú ọ dị, ọpụpụ Nott pụrụ akwụsịghị ọrụ nsụgharị ahụ, mgbe Davies nọsịkwara afọ abụọ n’Australia, o sonyeghachiiri Nott. Ka ọ dị mgbe ahụ, Nott amụwo asụsụ Grik na Hibru ma mụtakwa ha nke ọma. N’ihi ya, ọ malitere ịsụgharị akụkụ ụfọdụ nke Akwụkwọ Nsọ Hibru gaa n’asụsụ Tahitian. Ọ họọrọ akụkụ Bible ndị a kọrọ akụkọ ndị obodo ahụ ga-aghọta ngwa ngwa na ha.

Site n’iso Davies rụkọọ ọrụ, Nott maliteziri ịsụgharị Oziọma Luk, bụ́ nke a sụgharịchara na September 1814. Ọ sụgharịrị okwu ya kpọmkwem otú e si ekwu ha n’asụsụ Tahitian, ebe Davies nyochara ma ihe ndị ọ sụgharịrị ha kwekọrọ n’ihe odide e si na ha sụgharịa ha. Na 1817, Eze Pomare nke Abụọ jụrụ ma ya nwere ike ibipụta peeji nke mbụ nke Oziọma Luk n’onwe ya. O ji otu ntakịrị ígwè obibi akwụkwọ nke e ji ike ọkpụkpụ aka eduzi bụ́ nke ndị ozi ala ọzọ bubatara na Moorea bipụta ya. Akụkọ banyere nsụgharị a sụgharịrị Bible gaa n’asụsụ Tahitian agaghị ezu ezu ma ọ bụrụ na a kpọtụghị onye Tahiti kwesịrị ntụkwasị obi aha ya bụ́ Tuahine aha, bụ́ onye nọnyeere ndị ozi ala ọzọ ahụ n’ime afọ nile ha nọrọ n’ebe ahụ ma nyere ha aka ịghọta asụsụ ahụ nke ọma.

A Sụgharịchaa Ya

Na 1819, ka afọ isii nke ịrụsi ọrụ ike gasịrị, a sụgharịchara Oziọma ndị ahụ, Ọrụ Ndịozi, na akwụkwọ Abụ Ọma. Ígwè obibi akwụkwọ, bụ́ nke ndị ozi ala ọzọ bịara ọhụrụ butere, mere ka ọrụ mbipụta na nke nkesa akwụkwọ Bible ndị a gaa ngwa ngwa.

Oge ịrụsi ọrụ ike n’ịsụgharị, ịgụgharị, na idegharị ihe sochiri. Mgbe Nott nọsịrị na Tahiti ruo afọ 28, ọ dara ọrịa na 1825, ndị òtù LMS kwekwara ka ọ laghachi England. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ka ọ na-erule mgbe ahụ, ọ fọrọ nke nta ka a sụgharịchaa Akwụkwọ Nsọ Grik. Ọ nọgidere na-asụgharị akụkụ ndị ọzọ nke Bible mgbe ọ na-alaghachi England na mgbe ọ nọ n’ebe ahụ. Nott laghachiri Tahiti na 1827. Afọ asatọ ka e mesịrị, na December 1835, ọ kwụsịrị ọrụ. Ka ihe karịrị afọ 30 nke ịrụsi ọrụ ike gasịrị, a sụgharịchara Bible dum.

Na 1836, Nott laghachiri England iji hụ na e bipụtara akwụkwọ nile nke Bible n’asụsụ Tahitian, na London. Na June 8, 1838, Nott, bụ́ onye obi dị ụtọ, nyere Eze Nwanyị Victoria Bible Tahitian mbụ e biri ebi. N’ụzọ kwere nghọta, nke a bụ oge na-akpali nnọọ akpali nye onye a bụ́bu onye na-edo blọkụ bụ́ onye ji ụgbọ mmiri bụ́ Duff mee njem afọ 40 tupu mgbe ahụ ma mụọ nnọọ ọdịbendị ndị Tahiti iji rụchaa nnukwu ọrụ a were ogologo oge.

Ọnwa abụọ ka e mesịrị, Nott bu katọn 27 nke mkpụrụ 3,000 nke Bible Tahitian mbụ zuru ezu dị n’ime ha laghachi n’Ebe Ndịda Pacific. Mgbe ọ kwụsịsịrị na Sydney, ọ dara ọrịa ọzọ, ma ọ jụrụ ịhapụ katọn ya ndị ahụ dị oké ọnụ ahịa. Mgbe ọ gbakesịrị, o rutere Tahiti na 1840, bụ́ ebe ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọtụtụ ndị obodo ahụ wakporo ụgbọ mmiri ya, ka ha na-achọ inweta Bible Tahitian. Nott nwụrụ na Tahiti na May 1844 mgbe ọ dị afọ 70.

Mmetụta Dị Ukwuu

Otú ọ dị, ọrụ Nott nọgidere na-akpa ike. Nsụgharị ya nwere mmetụta dị ukwuu n’asụsụ dị iche iche nke ndị Polynesia. Site n’ide Tahitian ede, ndị ozi ala ọzọ ahụ chebere asụsụ ahụ. Otu onye edemede kwuru, sị: “Nott chebere ụtọ asụsụ bụ́ ịgba nke Tahitian. Ọ ga-adị mkpa mgbe nile ịga na Bible ahụ iji mụta ezigbo asụsụ Tahitian.” Nrụsi ọrụ ike nke ndị nsụgharị a mere ka a ghara ichefu ọtụtụ puku okwu kpam kpam. Otu narị afọ ka e mesịrị, otu onye edemede kwuru, sị: “Bible Tahitian ahụ dị ịrịba ama bụ́ nke Nott sụgharịrị bụ akwụkwọ na-enweghị atụ e nwere n’asụsụ Tahitian—mmadụ nile kweere nke ahụ.”

Ọ bụghị nanị na ọrụ a dị mkpa baara ndị Tahiti uru kamakwa o setịpụrụ ụkpụrụ a gbasoro sụgharịa ihe ndị ọzọ gaa n’asụsụ ndị ọzọ nke Ebe Ndịda Pacific. Dị ka ihe atụ, ndị nsụgharị nọ na Cook Islands na Samoa jiri ya mere ihe nlereanya. “Agbasochiwo m Maazị Nott anya, bụ́ onye m jiworo nlezianya nyochaa nsụgharị ya,” ka otu onye nsụgharị kwuru. E kwuru na onye nsụgharị ọzọ ‘ji akwụkwọ Abụ Ọma nke e dere n’asụsụ Hibru na nke Bekee nakwa nsụgharị ya n’asụsụ Tahitian mee ihe’ ka ọ ‘na-asụghrị otu n’ime abụ ọma David gaa n’asụsụ Samoan.’

N’ịgbaso ihe nlereanya nke ndị òtù okpukpe Awakening n’England, ndị ozi ala ọzọ nọ na Tahiti ji ịnụ ọkụ n’obi kụziere ọtụtụ mmadụ ịgụ na ide ihe. N’ezie, ruo ihe karịrị otu narị afọ, Bible ahụ bụ nanị akwụkwọ ndị Tahiti nwere. N’ihi ya, ọ ghọrọ ihe dị oké mkpa n’ọdịbendị ndị Tahiti.

Ọtụtụ ugboro aha Chineke pụtara n’Akwụkwọ Nsọ Hibru na nke Grik bụ otu n’ime ihe ndị kasị maa mma banyere nsụgharị Nott Version. N’ihi ya, taa, a maara aha Jehova nke ọma na Tahiti na n’àgwàetiti ndị dị na ya. Ọbụna e dere ya na chọọchị Protestant ụfọdụ. Otú ọ dị, taa, ndị e ji aha Chineke mara n’ụzọ bụ́ isi bụ Ndịàmà Jehova na ọrụ nkwusa ha ji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ, bụ́ nke ha ji Bible nke Nott na ndị òtù ya sụgharịrị na-eme ihe nke ọma na ya. Mgbalị siri ike ndị nsụgharị dị ka Henry Nott mere na-echetakwara anyị otú anyị si kwesị inwe ekele na e mere ka ọ dịrị ihe ka ukwuu n’ihe a kpọrọ mmadụ mfe inweta Okwu Chineke taa.

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Nsụgharị ndị mbụ nke Bible gaa n’asụsụ Tahitian, 1815. Aha Jehova pụtara na ha

Henry Nott (1774-1844), onye nsụgharị bụ́ isi nke Bible Tahitian

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Bible Tahitian: British Library (3070.a.32) ji ikike mbipụtaghachị ya; Henry Nott na akwụkwọ ozi: Collection du Musée de Tahiti et de ses Îles, Punauia, Tahiti; katkizim: Site n’ikike nke London Missionary Society Papers, Alexander Turnbull Library, Wellington, New Zealand

[Foto dị na peeji nke 28]

Katkizim nke 1801 bụ́ nke dị n’asụsụ Tahitian na nke Welsh, bụ́ ebe aha Chineke pụtara

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’ikike London Missionary Society Papers, Alexander Turnbull Library, Wellington, New Zealand

[Foto dị na peeji nke 29]

Chọọchị Protestant nke e dere aha Jehova n’ihu ya, àgwàetiti Huahine, French Polynesia

[Ebe E Si Nweta Foto]

Avec la permission du Pasteur Teoroi Firipa