Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“O Gbooro M Mkpa”

“O Gbooro M Mkpa”

“O Gbooro M Mkpa”

“EJI M obi m nile na-ekele unu maka ọmarịcha onyinye ahụ bụ́ Bịaruo Jehova Nso. O gbooro m mkpa—mkpa nke inwe mmetụta nke ịbụ onye Jehova hụrụ n’anya ma jiri kpọrọ ihe. Ana m enwezi nnọọ mmetụta nke ịbụ onye ya na Jehova na Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya na-akpachi anya. Achọrọ m ịgwa onye ọ bụla banyere akwụkwọ a na inye ndị nile m hụrụ n’anya otu.” Ihe a bụ mmetụta otu n’ime Ndịàmà Jehova nwere banyere akwụkwọ ọhụrụ ahụ dị peeji 320 nke e wepụtara ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Nkwusa Alaeze Na-anụ Ọkụ n’Obi” e nwere na 2002/2003. Ka anyị nyochaa ihe ụfọdụ ndị dị n’akwụkwọ ọhụrụ a na ihe mere e ji bipụta ya.

Ihe Ụfọdụ Ndị Dị n’Akwụkwọ Ọhụrụ Ahụ

Olee ihe ndị dị n’akwụkwọ ọhụrụ a? Ọ bụ ihe a nile a tụlere n’isiokwu abụọ dịịrị ọmụmụ n’Ụlọ Nche a—na ọtụtụ ihe ndị ọzọ! Akwụkwọ a nwere isiakwụkwọ 31, nke ọ bụla n’ime ha hà ka isiokwu dịịrị ọmụmụ n’Ụlọ Nche. A gafesịa okwu mmalite na isiakwụkwọ atọ ndị mbụ, e kewara akwụkwọ a gaa ná nkebi anọ, nke ọ bụla na-ekwu banyere otu n’ime àgwà Jehova ndị bụ́ isi. Nkebi nke ọ bụla ji ntụle dị mkpirikpi nke àgwà ọ na-ekwu banyere ya malite. Isiakwụkwọ ole na ole na-eso ya tụlere otú Jehova si egosipụta àgwà ahụ. Nkebi nke ọ bụla nwere otu isiakwụkwọ na-ekwu banyere Jizọs. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Jizọs kwuru, sị: “Onye hụrụ m ahụwokwa Nna m.” (Jọn 14:9) N’ịbụ onye na-egosipụta àgwà Jehova n’ụzọ zuru ezu, Jizọs na-enye anyị ihe atụ doro anya banyere otú Chineke si egosipụta àgwà ya. Nkebi nke ọ bụla ji otu isiakwụkwọ nke na-akụziri anyị otú anyị ga-esi ṅomie Jehova n’igosipụta àgwà a na-atụle, mechie. N’ịtụle àgwà Jehova, akwụkwọ ọhụrụ a zoro aka n’akwụkwọ nile nke Bible.

Akwụkwọ a bụ́ Bịaruo Jehova Nso nwekwara ihe ụfọdụ ndị pụrụ iche. Malite n’Isi nke 2, isiakwụkwọ nke ọ bụla nwere igbe bụ́ “Ajụjụ Maka Ntụgharị Uche.” E bughị n’uche ka akụkụ Akwụkwọ Nsọ na ajụjụ ndị dị na ya bụrụ ntụleghachi nke isiakwụkwọ ahụ. Kama, e mere ha iji nyere gị aka iji Bible tụgharịa uche n’ụzọ miri emi n’isiokwu ahụ. A na-atụ aro ka ị gụọ nke ọ bụla n’ime akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ahụ nke ọma. Mgbe i mesịrị, tụgharịa uche n’ajụjụ a jụrụ, ma gbalịa ịhụ otú ị ga-esi etinye ya n’ọrụ n’onwe gị. Ntụgharị uche dị otú ahụ pụrụ ịkpali obi gị, na-enyere gị aka ịnọgide na-abịaru Jehova nso.—Abụ Ọma 19:14.

E nyochara ihe osise ndị dị n’akwụkwọ Bịaruo Jehova Nso nke ọma ma kwadebe ha iji kụzie ihe na iji kpalie mmadụ ime ihe. Isiakwụkwọ 17 nwere ihe osise ndị mara mma nke ihe ndị a kọrọ banyere ha na Bible bụ́ ndị weere otu peeji n’otu n’otu.

Gịnị Mere E Ji Bipụta Ya?

Gịnị mere e ji bipụta akwụkwọ a bụ́ Bịaruo Jehova Nso? Nzube bụ́ isi nke akwụkwọ ọhụrụ a bụ inyere anyị aka ịmata Jehova nke ọma ka anyị wee nwee ike iso Chineke anyị na-enwe mmekọrịta chiri anya karị.

Ị̀ pụrụ icheta onye pụrụ irite uru n’akwụkwọ a bụ́ Bịaruo Jehova Nso, ikekwe onye ị na-amụrụ Bible ma ọ bụ ọbụna nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị na-adịghị ejekwa ozi? Gịnị banyere gị—ị̀ malitela ịgụ akwụkwọ ọhụrụ a? Ọ bụrụ na ị malitebeghị, gịnị ma ị hazie oge gị iji malite ịgụ ya ozugbo? Wepụta oge iji tụgharịa uche n’ihe ị na-agụ. Ka akwụkwọ ọhụrụ a nyere gị aka ịbịarukwu Jehova Chineke nso, ka i wee jiri ọṅụ na ịnụ ọkụ n’obi ka ukwuu na-akpọsa ozi ọma Alaeze ya!