Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Nwere “Àgwà Nke Ichere”?

Ì Nwere “Àgwà Nke Ichere”?

Ì Nwere “Àgwà Nke Ichere”?

“Lee ụdị mmadụ unu kwesịrị ịbụ n’àgwà dị nsọ na omume nke ịsọpụrụ Chineke, na-echere ma na-eburu ọnụnọ nke ụbọchị Jehova n’uche!” —2 PITA 3:11, 12.

1, 2. Olee otú anyị pụrụ isi mee ihe atụ banyere inwe ‘àgwà nke ichere’ ụbọchị Jehova?

WERE anya nke uche gị hụ otu ezinụlọ nke na-atụ anya ndị ọbịa ha kpọrọ iso ha rie nri. Oge a gwara ha bịa ji ọsọ na-eru. Onye nke bụ́ nwunye fọrọ obere ka o sichaa nri. Di ya na ụmụ ha anọrọ na-enye aka ịhụ na ihe nile dị n’usoro. Obi dị onye ọ bụla ụtọ. Ee, onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ahụ nọ na-echesi ọbịbịa nke ndị ọbịa ha ike ma na-atụ anya iri nri dị ụtọ na inwe mkpakọrịta dị mma.

2 Dị ka Ndị Kraịst, anyị na-eche ihe dị mkpa ọbụna karị. Gịnị ka anyị na-eche? Anyị nile na-eche “ụbọchị Jehova”! Ruo mgbe ọ ga-abịa, ọ dị mkpa ka anyị dịrị ka Maịka onye amụma, bụ́ onye kwuru, sị: “N’ime Jehova ka m ga-eche nche nke ọma; m ga-echere [“m ga-egosipụta àgwà nke ichere,” NW] Chineke nke nzọpụta m.” (Maịka 7:7) Nke ahụ ọ̀ pụtara ịnọ nkịtị? Ee e. E nwere ọtụtụ ọrụ a ga-arụ.

3. Dị ka 2 Pita 3:11, 12 si kwuo, àgwà dị aṅaa ka Ndị Kraịst kwesịrị inwe?

3 Pita onyeozi na-enyere anyị aka inwe àgwà kwesịrị ekwesị ka anyị nọ na-echere. Ọ na-asị: “Lee ụdị mmadụ unu kwesịrị ịbụ n’àgwà dị nsọ na omume nke ịsọpụrụ Chineke, na-echere ma na-eburu ọnụnọ nke ụbọchị Jehova n’uche!” (2 Pita 3:11, 12) N’akwụkwọ ozi abụọ o dere n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ kọwara ụdị mmadụ Ndị Kraịst kwesịrị ịbụ. Ọ dụkwara ha ọdụ ịnọgide na-akpa ‘àgwà dị nsọ ma na-eme omume nke ịsọpụrụ Chineke.’ Ọ bụ ezie na ihe dị ka afọ 30 agafeela kemgbe Jizọs Kraịst nyesịrị ihe ịrịba àmà “nke ngwụsị nke usoro ihe a,” Ndị Kraịst ekwesịghị ịkwụsị ịnọ na nche. (Matiu 24:3) Ha kwesịrị ịnọ “na-echere ma na-eburu ọnụnọ nke ụbọchị Jehova n’uche.”

4. Gịnị ka ‘iburu ọnụnọ nke ụbọchị Jehova n’uche’ gụnyere?

4 Okwu Grik a sụgharịrị n’ebe a ịbụ ‘na-eburu n’uche’ pụtara n’ụzọ nkịtị “ịgbapụ ihe ọsọ.” N’ezie, anyị apụghị ‘ịgbapụ ụbọchị Jehova ọsọ’ n’ụzọ nkịtị. A bịa na nke ahụ, anyị “amaghị ụbọchị ma ọ bụ awa” Jizọs Kraịst ga-abịa imezu ihe e kpere n’ikpe n’isi ndị iro Nna ya. (Matiu 24:36; 25:13) Otu akwụkwọ ntụaka na-akọwa na ngwaa e si na ya nweta okwu ahụ bụ́ “ịgbapụ ihe ọsọ” na-apụta “‘ime ngwa ngwa,’ n’ihi ya kwa, nwee nnọọ ihe jikọrọ ya na ‘ịnụ ọkụ n’obi, ịrụ ọrụ, inwe nchegbu banyere ihe.’” Ya mere, Pita nọ na-agba ndị kwere ekwe ibe ya ume ka ha na-atụsi anya ọnụnọ nke ụbọchị Jehova ike. Ha pụrụ ime nke a site n’iburu ya n’uche mgbe nile. (2 Pita 3:12) Ebe ‘ụbọchị Jehova, bụ́ ụbọchị ahụ dị ukwuu dịkwa egwu’ dị ezi nso ugbu a, anyị kwesịrị inwe otu ụzọ iche echiche ahụ.—Joel 2:31.

Jiri ‘Àgwà Dị Nsọ’ Na-echere

5. Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị na-atụsi anya “ụbọchị Jehova” ike?

5 Ọ bụrụ na anyị na-atụsi anya ike ịlanarị ụbọchị Jehova, anyị ga-eji ‘àgwà anyị dị nsọ na omume nke ịsọpụrụ Chineke’ gosipụta nke ahụ. Okwu ahụ bụ́ ‘àgwà dị nsọ’ pụrụ ichetara anyị nnọọ ndụmọdụ Pita bụ́: “Dị ka ụmụ na-erube isi, kwụsịnụ ịbụ ndị e mere ka ha kwekọọ n’ọchịchọ unu nwere n’oge gara aga n’amaghị ihe unu, kama, n’ụzọ kwekọrọ n’Onye Nsọ ahụ nke kpọrọ unu, ghọọkwanụ ndị dị nsọ n’omume nile unu, n’ihi na e dere, sị: ‘Unu aghaghị ịdị nsọ, n’ihi na adị m nsọ.’”—1 Pita 1:14-16.

6. Iji dị nsọ, gịnị ka anyị na-aghaghị ime?

6 Iji dị nsọ, anyị aghaghị ịnọgide na-adị ọcha n’anụ ahụ́, n’uche, n’omume, na n’ụzọ ime mmụọ. Ànyị na-akwadebe maka “ụbọchị Jehova” site n’ịnọgide na-adị nsọ dị ka ndị na-aza aha Jehova? Ọ dịghị mfe taa ịnọgide na-adị ọcha otú ahụ n’ihi na ụkpụrụ omume ndị e nwere n’ụwa nọgidere na-akawanye njọ. (1 Ndị Kọrint 7:31; 2 Timoti 3:13) Ànyị na-achọpụta na ọdịiche dị n’etiti ụkpụrụ omume anyị na nke ụwa na-ebuwanye ibu? Ma ọ́ bụghị otú ahụ, anyị nwere ihe mere anyị ga-eji na-enwe nchegbu. Ọ̀ pụrụ ịbụ na ụkpụrụ anyị onwe anyị na-agbaso, ọ bụ ezie na ọ ka nke ụwa elu, na-akawanye njọ? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ dị mkpa ka anyị mee ihe iji dozie ọnọdụ ahụ iji wee na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ.

7, 8. (a) Olee otú anyị pụrụ isi chefuo mkpa ọ dị ịdị na-akpa ‘àgwà dị nsọ’? (b) Olee ihe ndị anyị pụrụ ime iji mezie ihe?

7 N’ihi mmalite a malitere ịhụ ihe na-akpali mmekọahụ n’Intanet, nakwa otú e si anọ n’ebe dị nzuzo ekiri ya, ndị na-adịghị ahụbu ihe ndị dị otú ahụ rụrụ arụ na-achọtazi “ohere ndị na-adịghị agwụ agwụ ha ga-eji na-emeju agụụ mmekọahụ ha,” ka otu onye dọkịta kwuru. Ọ bụrụ na anyị na-achọ ihe n’ógbè Intanet ndị dị otú ahụ na-adịghị ọcha, n’ezie anyị ga na-eleghara iwu Bible bụ́ “unu emetụla ihe rụrụ arụ” aka anya. (Aịsaịa 52:11) Ànyị ga “na-eburu ọnụnọ nke ụbọchị Jehova n’uche” n’ezie? Ka ọ̀ pụrụ ịbụ na anyị na-eyigharị ụbọchị ahụ n’uche anyị, na-eche na ọ bụrụgodị na anyị ji ihe ndị rụrụ arụ na-emetọ uche anyị, na anyị ka nwere oge iji sachaa onwe anyị? Ọ bụrụ na anyị nwere nsogbu n’akụkụ a, lee ka ọ ga-esi dị ngwa ka anyị rịọ Jehova ka o ‘mee ka anya anyị abụọ si n’ile ihe efu gabiga, mee ka anyị dị ndụ n’ụzọ Ya nile’!—Abụ Ọma 119:37.

8 Ihe ka nnọọ n’ọnụ ọgụgụ ná Ndịàmà Jehova, ndị agadi na ndị na-eto eto, na-agbasochi ụkpụrụ dị elu nke Chineke banyere omume anya ma na-ezere ihe ụrà dị iche iche nke omume rụrụ arụ nke ụwa a. N’ịmara banyere ịdị ngwa nke oge anyị nakwa banyere ịdọ aka ná ntị Pita bụ́ na “ụbọchị Jehova ga-abịa dị ka onye ohi,” ha na-anọgide na-akpa ‘àgwà dị nsọ.’ (2 Pita 3:10) Omume ha na-egosi na ha “na-echere ma na-eburu ọnụnọ nke ụbọchị Jehova n’uche.” *

Jiri “Omume nke Ịsọpụrụ Chineke” Na-echere

9. Gịnị ka ịsọpụrụ Chineke kwesịrị ịkpali anyị ime?

9 “Omume nke ịsọpụrụ Chineke” dịkwa oké mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-eburu ụbọchị Jehova n’uche. “Ịsọpụrụ Chineke” na-agụnye inye Chineke nsọpụrụ ofufe bụ́ nke na-akpali anyị ime ihe ndị dị mma n’anya ya. Ịrapagidesi ike n’ebe Jehova nọ bụ ihe na-akpali anyị ime omume nsọpụrụ Chineke dị otú ahụ. Ọ bụ uche ya ka “a zọpụta ụdị mmadụ nile na ka ha bịaruo ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Timoti 2:4) Chineke ‘achọghị ka e bibie onye ọ bụla kama ọ na-achọ ka mmadụ nile ruo nchegharị.’ (2 Pita 3:9) N’ihi ya, ọ̀ bụ na nsọpụrụ anyị na-enye Chineke ekwesịghị ịkpali anyị itinyesikwu mgbalị ike iji nyere ndị mmadụ aka ịmụta banyere Jehova na iṅomi ya?—Ndị Efesọs 5:1.

10. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịnọ na nche megide “ike dị aghụghọ nke akụ̀ na ụba”?

10 Anyị ga-anọgide na-eme omume nsọpụrụ Chineke ma ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke. (Matiu 6:33) Nke a na-agụnye anyị inwe echiche ziri ezi banyere ihe onwunwe. Jizọs dọrọ aka ná ntị, sị: “Ghewenụ anya unu oghe, na-echekwanụ nche megide ụdị ọchịchọ anyaukwu ọ bụla, n’ihi na ọbụna mgbe mmadụ nwere ihe n’ụba, ndụ ya adịghị esi n’ihe ndị o nwere apụta.” (Luk 12:15) Ọ bụ ezie na ọ ga-esi ike ịhụ onwe anyị dị ka ndị ịhụ ego n’anya na-eme ka ha kpuo ìsì, anyị kwesịrị ịrịba ama na “nchegbu nke usoro ihe a na ike dị aghụghọ nke akụ̀ na ụba” pụrụ ‘ịkpagbu okwu’ Chineke. (Matiu 13:22) Ọ pụrụ isi ike ịkpata ihe e ji ebi ndụ. N’ihi ya, n’ebe ụfọdụ n’ụwa, ọtụtụ ndị na-eche na iji bie ndụ ka mma, ha aghaghị ịkwaga n’ala bara ọgaranya karị, ikekwe na-ahapụ ezinụlọ ha ruo afọ ole na ole. Ọbụna ụfọdụ n’ime ndị Chineke echewo otú ahụ. Site n’ịkwaga n’ala ọzọ, ha nwere ike ime ka ezinụlọ ha nwee ihe ọgbara ọhụrụ ndị e ji enyere ndụ aka. Otú ọ dị, gịnị pụrụ ime ọnọdụ ime mmụọ nke ndị ha hụrụ n’anya bụ́ ndị nọ n’obodo ha si bịa? Ọ bụrụ na a dịghị egosipụta ịbụisi n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’ebe obibi ha, hà ga-enwe ọnọdụ ime mmụọ nke dị mkpa iji lanarị ụbọchị Jehova?

11. Olee otú otu onye na-arụ ọrụ ná mba ọzọ si gosipụta na omume nke ịsọpụrụ Chineke dị mkpa karịa akụ̀ na ụba?

11 Otu onye ọrụ si Philippines mụtara eziokwu Bible site n’aka Ndịàmà Jehova na Japan. Mgbe ọ matara banyere ibu ọrụ nke ịbụisi bụ́ nke dabeere n’Akwụkwọ Nsọ, ọ chọpụtara na ọ dị mkpa ka o nyere ezinụlọ ya aka ịghọ ndị na-efe Jehova. (1 Ndị Kọrint 11:3) Nwunye ya bụ́ onye nọ n’obodo ha megidesiri okpukpe ọhụrụ ya ike ma chọọ ka ọ nọgide na-ezitere ha ego kama ịlọta ụlọ iji kụziere ezinụlọ ya nkwenkwe ya nke dabeere na Bible. Otú ọ dị, n’ịbụ onye ịdị ngwa nke oge na nchegbu o nwere banyere ndị ọ hụrụ n’anya kpaliri, ọ laghachiri n’obodo ya. A kwụghachiri ya ụgwọ maka ndidi o gosipụtara n’iji ịhụnanya na-emeso ndị ezinụlọ ya ihe. Ka oge na-aga, ezinụlọ ya bịara dịrị n’otu n’ezi ofufe, nwunye ya banyekwara n’ozi oge nile.

12. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ibute ihe ime mmụọ ụzọ ná ndụ?

12 A pụrụ iji ọnọdụ anyị tụnyere nke ndị nọ n’ụlọ na-agba ọkụ. Ọ̀ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ịgbakeriwe ala iji bupụta ihe onwunwe ndị dị n’ụlọ ahụ na-achọ ịda ada? Kama nke ahụ, ọ́ gaghị adị nnọọ mkpa karị ịzọpụta ndụ—nke anyị nakwa nke ndị ezinụlọ anyị na ndị ọzọ bi n’ụlọ ahụ? Ajọ usoro ihe a ji ọsọ na-eru ọgwụgwụ ya, ndụ dịkwa n’ihe ize ndụ. N’ịghọta nke a, n’ezie anyị kwesịrị ibute ihe ime mmụọ ụzọ ma jiri ịnụ ọkụ n’obi na-etinye uche n’ọrụ nkwusa Alaeze ahụ na-azọpụta ndụ.—1 Timoti 4:16.

Ọ Dị Anyị Mkpa Ịbụ “Ndị Na-enweghị Ntụpọ”

13. Olee ọnọdụ anyị kwesịrị ịchọ ịnọ na ya mgbe ụbọchị Jehova ga-etiwapụ?

13 N’imesi ike mkpa ọ dị ịnọgide na-enwe àgwà ichere, Pita na-ekwu, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, ebe unu na-echere ihe ndị a, meenụ ike unu nile ka [Chineke] wee hụ unu n’ikpeazụ dị ka ndị na-enweghị ntụpọ na ndị na-agbaghị ọrụ na ndị nọ n’udo.” (2 Pita 3:14) Tụkwasị na ndụmọdụ o nyere ka a na-akpa àgwà dị nsọ ma na-eme omume nsọpụrụ Chineke, Pita mesiri ike mkpa ọ dị ịbụ ndị Jehova hụrụ n’ikpeazụ dị ka ndị e ji ọbara dị oké ọnụ ahịa nke Jizọs mee ka ha dị ọcha. (Mkpughe 7:9, 14) Nke a na-achọ ka mmadụ gosipụta okwukwe n’àjà Jizọs ma ghọọ ohu Jehova raara onwe ya nye nke e mekwara baptizim.

14. Gịnị ka ịbụ onye “na-enweghị ntụpọ” na-agụnye?

14 Pita na-agba anyị ume ime ike anyị nile ka e wee hụta anyị dị ka ndị “na-enweghị ntụpọ.” Ànyị na-eme ka uwe anyị nke bụ́ àgwà na omume Ndị Kraịst ghara inwe ntụpọ, bụrụ nke ụwa na-etetọghị? Mgbe anyị hụrụ ntụpọ n’uwe anyị, anyị na-agbalị ozugbo ịsapụ ya. Ọ bụrụ na ọ bụ uwe anyị kasị nwee mmasị na ya, anyị na-eji nlezianya asa ya. Ọ̀ na-adị anyị otú ahụ mgbe uwe Ndị Kraịst anyị nwere ntụpọ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, n’ihi ọrụ ụfọdụ anyị gbara n’àgwà ma ọ bụ n’omume anyị?

15. N’ihi gịnị ka ndị Izrel ga-eji dụnye ihe dị yọrị yọrị n’ọnụ ọnụ uwe ala ha? (b) N’ihi gịnị ka ndị ohu Jehova nke oge a ji apụta ìhè dị ka ndị dị iche?

15 A gwara ndị Izrel ka ha dụnye “ihe dị yọrị yọrị n’ọnụ ọnụ uwe ala ha,” dụnyekwa “eriri na-acha anụnụ anụnụ n’elu ebe ahụ a dụnyere ihe ahụ dị yọrị yọrị n’uwe ala ha.” N’ihi gịnị? Ọ bụ ka ha wee na-echeta iwu Jehova, na-erube isi na ha, ma ‘bụrụ ndị dịịrị Chineke ha nsọ.’ (Ọnụ Ọgụgụ 15:38-40, NW) Dị ka ndị ohu Jehova n’oge a, anyị na-apụta ìhè dị ka ndị dị iche n’ụwa n’ihi na anyị na-edebe iwu na ụkpụrụ Chineke. Dị ka ihe atụ, anyị na-anọgide na-adị ọcha n’omume, anyị na-akwanyere ịdị nsọ nke ọbara ùgwù, anyị na-ezerekwa ụdị nile nke ikpere arụsị. (Ọrụ 15:28, 29) Ọtụtụ ndị na-akwanyere anyị ùgwù n’ihi mkpebi siri ike anyị mere ịnọgide bụrụ ndị a na-emerụghị emerụ.—Jems 1:27.

Ọ Dị Anyị Mkpa Ịbụ “Ndị Na-agbaghị Ọrụ”

16. Gịnị ka ịnọgide bụrụ “ndị na-agbaghị ọrụ” na-agụnye?

16 Pita kwukwara na e kwesịrị ịhụ anyị dị ka “ndị na-agbaghị ọrụ.” Olee otú nke ahụ ga-esi kwe omume? Dị ka ọ na-adịkarị, a pụrụ ihichapụ ma ọ bụ sachapụ ntụpọ ma a pụghị ime otú ahụ n’ihe banyere ọrụ mmadụ gbara. Ọ bụrụ na ihe gbara ọrụ, ọ na-egosi na ọ dị ihe dị n’ime ya nke na-adịghị mma, nke mebiri emebi. Pọl onyeozi dụrụ Ndị Kraịst ibe ya nọ na Filipaị ọdụ, sị: “Nọgidenụ na-eme ihe nile n’enweghị ntamu na arụmụka, ka unu wee bụrụ ndị na-enweghị ụta na ndị aka ha dị ọcha, ụmụ Chineke ndị na-enweghị mmerụ n’etiti ọgbọ gbagọrọ agbagọ na nke hịgọrọ ahịgọ, bụ́ ndị unu na-enwu n’etiti ha dị ka ihe ndị na-enye ìhè n’ụwa.” (Ndị Filipaị 2:14, 15) Ọ bụrụ na anyị agbasoo ndụmọdụ ahụ, anyị ga-ezere ịtamu ntamu na ịrụ ụka, anyị ga-ejikwa ezi ebumnobi na-ejere Chineke ozi. Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova na ndị agbata obi anyị nọ ga-akpali anyị ka anyị na-ekwusa “ozi ọma nke a nke alaeze.” (Matiu 22:35-40; 24:14) Ọzọkwa, anyị ga-anọgide na-akpọsa ozi ọma ahụ n’agbanyeghị na ndị mmadụ n’ozuzu apụghị ịghọta ihe mere anyị ji wepụta oge anyị iji gbalịa inyere ndị ọzọ aka ịmụta banyere Chineke na Okwu ya, bụ́ Bible.

17 Gịnị kwesịrị ịbụ ebumnobi anyị mgbe anyị na-agbalị iru eru maka ihe ùgwù dị iche iche n’ọgbakọ Ndị Kraịst?

17 Ebe ọ bụ na anyị na-achọ ka a hụta anyị dị ka “ndị na-agbaghị ọrụ,” anyị kwesịrị ịdị na-enyocha ihe bụ́ nzube anyị ji achụso ihe nile anyị na-achụso. Anyị ahapụwo ụzọ ụwa nke bụ́ ime ihe n’ihi ọdịmma onwe onye, dị ka ịgbalịsi ike inweta akụ̀ na ụba ma ọ bụ ike. Ọ bụrụ na anyị na-agbalị iru eru maka ihe ùgwù dị iche iche n’ọgbakọ Ndị Kraịst, ka anyị nọgide na-enwe ezi mbunobi ma bụrụ ndị ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova na ndị ọzọ nọ na-akpali mgbe nile. Ọ bụ ihe na-enye ume ọhụrụ ịhụ ndị ikom ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe ka ha ji ọṅụ na ọchịchọ ijere Jehova na ndị kwere ekwe ibe ha ozi “na-agbalị iru eru maka ọrụ onye nlekọta.” (1 Timoti 3:1; 2 Ndị Kọrint 1:24) N’ezie, ndị ruru eru ije ozi dị ka ndị okenye ‘na-azụ ìgwè atụrụ Chineke n’ọchịchọ obi; ọ bụghịkwa n’ihi ịhụnanya nke uru aghụghọ, kama n’ịnụ ọkụ n’obi; ọ bụghịkwa ime ndị bụ ihe nketa nke Chineke dị ka ọ bụ ha nwe ha, kama na-aghọ ihe nlereanya nye ìgwè atụrụ ahụ.’—1 Pita 5:1-4.

Ọ Dị Anyị Mkpa Ịbụ Ndị Nọ “n’Udo”

18. Àgwà ndị dị aṅaa ka e ji mara Ndịàmà Jehova?

18 N’ikpeazụ, Pita na-agwa anyị ka anyị bụrụ ndị a ga-ahụ “n’udo.” Iji mee ihe a a chọrọ, ọ dị mkpa ka anyị na Jehova na ndị agbata obi anyị dịrị n’udo. Pita mesiri ike mkpa ọ dị ‘inwe ịhụnanya siri ike maka ibe anyị’ nakwa ịnọgide soro Ndị Kraịst ibe anyị na-adị n’udo. (1 Pita 2:17; 3:10, 11; 4:8; 2 Pita 1:5-7) Iji nọgide na-adị n’udo, anyị aghaghị inwe ịhụnanya n’etiti onwe anyị. (Jọn 13:34, 35; Ndị Efesọs 4:1, 2) Ịhụnanya na udo dị n’etiti anyị na-apụta ìhè karịsịa mgbe anyị nwere mgbakọ mba nile. N’otu mgbakọ e nwere na Costa Rica na 1999, otu onye na-ere ihe n’ọdụ ụgbọelu were iwe n’ihi na Ndịàmà nọ n’obodo ahụ bụ́ ndị na-anabata ndị ọbịa ha nọchiri ihu ahịa ya n’amaghị ama. Otú ọ dị, n’echi ya, ọ chọpụtara ịhụnanya na udo e gosipụtara site n’ọṅụ Ndịàmà nọ n’obodo ahụ ji nabata ndị ọbịa ahụ, ọ bụ ezie na ha amabughị ndị ha bụ. N’ụbọchị nke ikpeazụ, onye ahịa ahụ sonyere n’ịnabata ndị ọbịa ahụ ma rịọ ka a bịa duziwere ya ọmụmụ Bible.

19. N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa ịdị na-eso ndị kwere ekwe ibe anyị na-adị n’udo?

19 Ezi obi anyị ji na-agbalị iso ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị ime mmụọ anyị na-adị n’udo pụrụ imetụta otú anyị si echesiru ụbọchị Jehova na ụwa ọhụrụ o kwere ná nkwa ike. (Abụ Ọma 37:11; 2 Pita 3:13) Ka e were ya na ọ dị onye kwere ekwe ibe anyị ọ na-esiri anyị ike iso na-emekọ ihe n’udo. Ànyị pụrụ iji anya nke uche hụ ebe anyị na ya nọ n’udo na Paradaịs? Ọ bụrụ na nwanna nwere ihe megide anyị, anyị kwesịrị ‘ime ka anyị na ya dị n’udo’ n’egbughị oge. (Matiu 5:23, 24) Ọ dị oké mkpa ime otú ahụ ma ọ bụrụ na anyị na Jehova ga-adị n’udo.—Abụ Ọma 35:27; 1 Jọn 4:20.

20. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka e kwesịrị isi na-egosipụta “àgwà nke ichere”?

20 Ànyị “na-echere ma na-eburu ọnụnọ nke ụbọchị Jehova n’uche”? Anyị na-egosipụta na anyị na-atụsi anya ọgwụgwụ nke ihe ọjọọ ike site n’ịnọgide na-adị nsọ n’ụwa a rụrụ arụ. Ọzọkwa, anyị na-egosipụta na anyị na-atụsi anya ọbịbịa nke ụbọchị Jehova nakwa ibi n’okpuru ịchịisi Alaeze ya ike site n’ịdị na-eme omume nsọpụrụ Chineke. Mgbalị anyị na-emekwa iso ndị anyị na ha na-efekọ ofufe na-adị n’udo ugbu a na-egosipụta na anyị na-atụ anya ibi n’ụwa ọhụrụ nke udo. Site n’ụzọ dị otú ahụ, anyị na-egosi na anyị nwere “àgwà nke ichere” nakwa na anyị “na-eburu ọnụnọ nke ụbọchị Jehova n’uche.”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Dị ka ihe atụ, lee Ụlọ Nche nke January 1, 2000, peeji nke 16 na 1997 Yearbook of Jehovah’s Witnesses, peeji nke 51.

Ị̀ Na-echeta?

• Gịnị ka iburu “ọnụnọ nke ụbọchị Jehova n’uche” pụtara?

• Olee otú anyị si eji omume anyị egosipụta “àgwà nke ichere”?

• N’ihi gịnị ka “omume ịsọpụrụ Chineke” ji dị oké mkpa?

• Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji bụrụ ndị Jehova ga-ahụta dị ka “ndị na-enweghị ntụpọ na ndị na-agbaghị ọrụ na ndị nọ n’udo”?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 11]

A na-eji àgwà dị nsọ egosipụta “àgwà nke ichere”

[Foto ndị dị na peeji nke 12]

Ọrụ nkwusa Alaeze ahụ na-azọpụta ndụ

[Foto dị na peeji nke 14]

Ka anyị na-echere maka ụbọchị Jehova, ka anyị na-agbalị iso ndị ọzọ na-adị n’udo