Eusebius—Ọ̀ Bụ “Nna nke Akụkọ Ihe Mere Eme nke Chọọchị”?
Eusebius—Ọ̀ Bụ “Nna nke Akụkọ Ihe Mere Eme nke Chọọchị”?
N’AFỌ 325 O.A., Eze Ukwu Constantine nke Rom kpọrọ ndị bishọp nile ka ha bịa na Nicaea. Nzube o ji kpọọ ha bụ nke a: idozi ihe ahụ kpataworo oké arụmụka nke bụ́ njikọ dị n’etiti Chineke na Ọkpara ya. Otu n’ime ndị gara nzukọ ahụ bụ nwoke ahụ e weere dị ka onye kasị mara akwụkwọ n’oge ya, bụ́ Eusebius nke Sesaria. Eusebius ejiriwo ịdị uchu mụọ Akwụkwọ Nsọ, ọ nọwokwa na-agbachitere nkwenkwe Ndị Kraịst bụ́ na e nwere nanị otu Chineke.
Ná Nzukọ ahụ e nwere na Nicaea, “Constantine n’onwe ya bụ onyeisi oche,” ka akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica na-ekwu, “o ji nnọọ ịnụ ọkụ n’obi duzie nkwurịta okwu ahụ, ma jiri aka ya tụpụta . . . ụkpụrụ ahụ dị oké mkpa nke e ji gosipụta njikọ dị n’etiti Kraịst na Chineke n’ụkpụrụ okwukwe nke kansụl ahụ nakweere, nke bụ́ na ‘ya na Nna ya bụ otu’ . . . N’ịbụ ndị tụrụ eze ukwu ahụ ụjọ, ndị bishọp ahụ, ma e wepụ nanị mmadụ abụọ n’ime ha, bịanyere aka n’ụkpụrụ okwukwe ahụ, ọtụtụ n’ime ha mere nnọọ otú ahụ n’agbanyeghị na ọ bụghị ọchịchọ ha.” Eusebius ò so ná ndị na-abịanyeghị aka na ya? Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ebe ọ kwụ? Ka anyị leba anya ná nzụlite Eusebius—iru eru ya na ihe ndị ọ rụzuru.
Ihe Odide Ya Ndị Dị Ịrịba Ama
O yiri ka a mụrụ Eusebius na Palestaịn n’ihe dị ka 260 O.A. N’oge ọ na-eto eto, o sooro Pamphilus, bụ́ onye nlekọta na chọọchị dị na Sesaria, kpakọrịta. N’ịbanye n’ụlọ akwụkwọ nkà mmụta okpukpe nke Pamphilus, Eusebius ghọrọ nwata akwụkwọ ji agụmakwụkwọ ya kpọrọ ihe. O ji nnukwu ọbá akwụkwọ Pamphilus mee ihe n’ụzọ dị irè. Eusebius mikpuru onwe ya n’ihe ọmụmụ ya, karịsịa n’ọmụmụ Bible. Ọ ghọkwara ezigbo enyi Pamphilus, mesịa kpọọ onwe ya “Eusebius nke Pamphilus.”
Eusebius kwuru banyere ihe mgbaru ọsọ ya, sị: “Ọ bụ nzube m ide banyere Ndịozi dị nsọ ndị nọchiri ibe ha nakwa banyere oge gafeworonụ site n’oge nke Onye Nzọpụta anyị ruo n’oge anyị; ịkọ otú a sị na ọtụtụ ihe omume ndị dị mkpa si were ọnọdụ n’akụkọ ihe mere eme nke chọọchị; na ikwu ndị nọrọla na parish ndị a kasị mara amara chịa ma lekọta chọọchị, na ndị jiworo okwu ọnụ ma ọ bụ ihe odide kwusaa okwu Chineke n’ọgbọ nke ọ bụla.”
A na-echeta Eusebius maka akwụkwọ ya e ji kpọrọ ihe nke ukwuu aha ya bụ History of the Christian Church. A na-ewere akwụkwọ ya a dị mpịakọta iri bụ́ ndị e bipụtara n’ihe dị ka 324 O.A., dị ka akwụkwọ mgbe ochie kasị mkpa ndị e dere ihe ndị mere na chọọchị na ha. N’ihi ihe a Eusebius rụzuru, a bịara mara ya dị ka nna nke akụkọ ihe mere eme nke chọọchị.
E wezụga akwụkwọ bụ́ Church History, Eusebius dere akwụkwọ bụ́ Chronicle, ná mpịakọta
abụọ. Mpịakọta nke mbụ ya bụ nchịkọta nke ihe ndị mere n’ụwa. Na narị afọ nke anọ, ọ ghọrọ ihe odide a nakweere n’ebe nile iji na-amata oge ihe ụfọdụ mere n’ụwa. Mpịakọta nke abụọ ya depụtara oge ihe ndị mere ihe akụkọ weere ọnọdụ. N’iji kọlụm ndị si n’elu gbadaa ala mee ihe, Eusebius gosipụtara usoro ndị eze nke mba dị iche iche.Eusebius dere akwụkwọ ihe mere eme abụọ ọzọ bụ́ Martyrs of Palestine na Life of Constantine. Akwụkwọ nke mbụ kọrọ ihe ndị mere n’afọ ndị dịrị n’agbata 303-310 O.A., nakwa ndị nwụrụ n’ihi okwukwe ha n’oge ahụ. Ọ ga-abụ na Eusebius ji anya ya hụ ihe ndị a. Akwụkwọ nke ọzọ, bụ́ nke e bipụtara dị ka akwụkwọ nwere mpịakọta anọ, ndị e bipụtara mgbe Eze Ukwu Constantine nwụsịrị na 337 O.A., kọrọ ihe ndị bara uru mere n’oge ndị gara aga. Kama ịbụ ndị e dere n’ụdị akụkọ, ihe e dere na ha karịsịa bụ okwu otuto.
Akwụkwọ ndị Eusebius dere iji gbachitere okwukwe na-agụnye nke o dere iji zaa Hierocles—onye ọchịchị Rom ya na ya dịkọrọ ndụ—okwu. Mgbe Hierocles dere akwụkwọ megide Ndị Kraịst, Eusebius dere nke ya iji gbachitere ha. Ọzọkwa, iji kwado na ọ bụ Chineke chepụtara Akwụkwọ Nsọ, o dere akwụkwọ 35, bụ́ ndị e weere dị ka akwụkwọ ndị kasị mkpa na ndị kasị kọwaa ihe nke ọma e nwetụrụla. Iri na ise ndị mbụ n’ime ha gbalịrị ime ka a ghọta na Ndị Kraịst ziri ezi n’ịnakwere ihe odide ndị dị nsọ nke ndị Hibru. Iri abụọ ndị nke ọzọ nyere ihe akaebe na-egosi na Ndị Kraịst ziri ezi n’ime ihe megidere echiche ndị Juu ma nakwere ụkpụrụ na omume ọhụrụ. Akwụkwọ ndị a n’ozuzu ha nyere nkọwa sara mbara iji gbachitere Iso Ụzọ Kraịst dị ka Eusebius si ghọta ya.
Eusebius dịrị ndụ ihe dị ka afọ 80 (ihe dị ka 260-ihe dị ka 340 O.A.), na-aghọ otu n’ime ndị kasị dee akwụkwọ n’oge ochie. O dere banyere ihe ndị mere na narị afọ atọ mbụ ruo n’oge Eze Ukwu Constantine. N’afọ ndị ikpeazụ nke ndụ ya, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye edemede nakwa dị ka bishọp nke Sesaria. Ọ bụ ezie na a kasị mara Eusebius dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme, ọ bụkwa onye nkwado okwukwe, onye na-ese map, onye nkwusa, onye nkatọ, na onye na-ede akwụkwọ ndị na-akọwa ihe odide okpukpe.
Nzube Ya nke Gbara Mkpị
N’ihi gịnị ka Eusebius ji malite nnukwu ọrụ dị otú ahụ a na-arụtụbeghị ụdị ya? Azịza ya dabeere na nkwenkwe ya bụ́ na ya bi n’oge mgbanwe ịbanye n’ọgbọ ọhụrụ. O chere na e nweela oké ihe ndị mere n’ọgbọ ndị gara aga nakwa na ọ dị mkpa ka e dekọọrọ ha ụmụ ndị ha ga-amụ.
Ọ dị ihe ọzọ bụ́ nzube Eusebius—ọ bụ iji kwadoo okwukwe. O kweere na Iso Ụzọ Kraịst sitere n’aka Chineke. Ma ụfọdụ ekwetaghị n’echiche a. Eusebius dere, sị: “Ọ bụkwa nzube m inye aha na ọnụ ọgụgụ na oge nke ndị, n’ihi ịhụ ihe ọhụrụ n’anya, mehieworo ihe n’ụzọ kasịnụ, sitekwa n’ịkpọsa na ha bụ ndị na-achọpụta ihe ọmụma, bụ́ nke ụgha, ha ejiriwo obi ọjọọ laa ìgwè atụrụ Kraịst n’iyi dị ka ajọ nkịta ọhịa.”
Eusebius ò weere ya na ya bụ Onye Kraịst? Ihe àmà na-egosi na o mere otú ahụ, n’ihi na ọ kpọrọ Kraịst “Onye Nzọpụta anyị.” O kwuru, sị: “Ọ bụ nzube m . . . ịkọ ihe ọjọọ ndị dakwasịrị mba ndị Juu dum ngwa ngwa n’ihi nkata ha kpara megide Onye Nzọpụta anyị, na idekọ ụzọ ndị Jentaịl siworo wakpo okwu Chineke nakwa oge ndị ha merela otú ahụ, na ịkọwa àgwà nke ndị gbachitewooro ya n’oge dịgasị iche iche, n’agbanyeghị ọbara ha a kwafuru na ọnụ e mekpọrọ ha, nakwa nkwupụta okwukwe ndị e meworo n’oge anyị, na aka Onye Nzọpụta anyị jiworo amara na obiọma nyere ha nile.”
Nchọpụta Ndị Sara Mbara O Mere
Akwụkwọ Eusebius gụrụ ma zoo aka na ha dị ọtụtụ. Ọ bụ nanị n’ihe odide Eusebius ka e si mata banyere ọtụtụ ndị a ma ama dịrị ndụ na narị afọ atọ ndị mbụ nke Oge Anyị. Ọ bụ nanị n’ihe odide ya ka e nwetara ihe ndekọ ndị bara uru bụ́ ndị mere ka a mata banyere ihe omume ndị dị mkpa. E si n’akwụkwọ ndị na-adịghịzi adị nweta ha.
Eusebius rụsịrị ọrụ ike ma saa anya ya na mmiri mgbe ọ na-ahọrọ ihe ndị o dere. O yiri ka o ji nlezianya gbalịa ịchọpụta ọdịiche dị n’etiti akụkọ a pụrụ ịtụkwasị obi na ndị a na-apụghị ịtụkwasị obi. N’agbanyeghị nke ahụ, e nwere ihe ndị na-ezighị ezi n’ihe odide ya. Mgbe ụfọdụ, ọ na-akọwahie na ọbụna na-aghọtahie ndị mmadụ na ihe ndị ha mere. A bịa n’ọgụgụ oge, ọ na-ede ihe ndị na-ezighị ezi mgbe ụfọdụ. Eusebius ejighịkwa nkà dee akwụkwọ ya. Otú ọ dị, n’agbanyeghị erughị eru ya ndị pụtara ìhè, e weere akwụkwọ ndị o dere dị ka akụ̀ dị oké ọnụ ahịa.
Ọ̀ Bụ Onye Hụrụ Eziokwu n’Anya?
Eusebius nwere nchegbu banyere okwu ahụ a na-edozibeghị nke metụtara njikọ dị n’etiti Nna ahụ na Ọkpara ya. Nna ahụ ọ̀ dị adị tupu Ọkpara ya, dị ka Eusebius kweere? Ka Nna ahụ na Ọkpara ya hà malitere ịdị n’otu mgbe? “Ọ bụrụ na ha malitere ịdị n’otu mgbe,” ka ọ jụrụ, “olee otú Nna ahụ ga-esi bụrụ Nna, Ọkpara ya abụrụ Ọkpara?” Ọbụna o ji Akwụkwọ Nsọ kwadoo ihe o kweere, na-ehota Jọn 14:28, nke na-asị na ‘Nna ahụ ka Jizọs ukwuu,’ na Jọn 17:3, bụ́ ebe e kwuru na Jizọs bụ onye nanị ezi Chineke ahụ “zitere.” N’izo aka ná Ndị Kọlọsi 1:15 na Jọn 1:1, Eusebius mere ka a mata na Logos ahụ, ma ọ bụ Okwu ahụ, bụ “onyinyo nke Chineke a na-apụghị ịhụ anya”—Ọkpara Chineke.
Otú ọ dị, n’ụzọ dị ịtụnanya, ná mmechi nke Nzukọ ahụ e nwere na Nicaea, Eusebius kwadoro ihe megidere echiche ya. N’ụzọ dị iche n’ihe dabeere n’Akwụkwọ Nsọ o kweere nke bụ́ na Chineke na Kraịst amaliteghị ịdị n’otu mgbe, ọ gara n’ihu ikwenyere eze ukwu ahụ.
Ihe A Ga-amụta
N’ihi gịnị ka Eusebius ji daa ná Nzukọ ahụ e nwere na Nicaea ma kwado nkwenkwe na-esiteghị n’Akwụkwọ Nsọ? Ò bu ihe ndị metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’uche? N’ihi gịnị ka o jidị gaa nzukọ ahụ agaa? Ọ bụ ezie na a kpọrọ ndị bishọp nile, ọ bụ nanị ụfọdụ n’ime ha—300—gara ya. Ọ̀ ga-abụ na Eusebius na-eche banyere ichekwa ọkwá ya? N’ihi gịnịkwa ka Eze Ukwu Constantine ji akwanyere ya ùgwù dị ukwuu? Eusebius nọdụrụ n’aka nri nke eze ukwu ahụ ná nzukọ ahụ.
O doro anya na Eusebius leghaara ihe Jizọs chọrọ anya nke bụ́ na ụmụazụ Ya ‘agaghị abụ akụkụ nke ụwa.’ (Jọn 17:16; 18:36) “Ndị na-akwa iko, ùnu amaghị na ịbụ ndị enyi nke ụwa bụ ịbụ ndị iro nke Chineke?” ka Jems onye na-eso ụzọ jụrụ. (Jems 4:4) Leekwa ka o si kwesị ekwesị bụ́ ndụmọdụ Pọl bụ́: “Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu n’ụzọ na-ekwekọghị ekwekọ”! (2 Ndị Kọrint 6:14) Ka anyị nọgide na-anọpụ iche n’ụwa ka anyị ‘na-efe Nna ahụ n’ime mmụọ na n’eziokwu.’—Jọn 4:24.
[Foto dị na peeji nke 31]
Ihe e sere n’ụdị “fresco” nke na-egosi Nzukọ ahụ e nwere na Nicaea
[Ebe E Si Nweta Foto]
Scala/Art Resource, NY
[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji 29]
Site n’ikike nke Special Collections Library, Mahadum Michigan