Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-eche Echiche nke Ọma—Na-eme Ihe n’Ụzọ Amamihe Dị na Ya

Na-eche Echiche nke Ọma—Na-eme Ihe n’Ụzọ Amamihe Dị na Ya

Na-eche Echiche nke Ọma—Na-eme Ihe n’Ụzọ Amamihe Dị na Ya

WEREGODỊ anya nke uche gị kirie ka ihe a na-eme: Jizọs Kraịst nọ na-akọwa na ndị iro ya bụ́ ndị okpukpe nọ na Jeruselem ga-emekpa ya ahụ́ ma mesịa gbuo ya. Ezigbo enyi ya bụ́ Pita onyeozi apụghị ikwere nke ahụ. N’ezie, ya akpọpụ Jizọs n’akụkụ ma baara ya mba. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Pita nwere ezi obi na ezigbo nchegbu. Ma olee otú Jizọs si lee echiche Pita anya? “Gaa n’azụ m, Setan!” ka Jizọs kwuru. “Ị bụụrụ m ihe ịsụ ngọngọ, n’ihi na ihe ndị ị na-eche abụghị echiche Chineke, kama nke mmadụ.”—Matiu 16:21-23.

Lee ka nke ahụ na-aghaghị isiwo wụọ Pita akpata oyi n’ahụ́! Kama ịbụrụ Nna ya Ukwu ọ hụrụ n’anya onye enyemaka na onye nkwado, n’oge a ọ bụụrụ ya “ihe ịsụ ngọngọ.” Olee otú nke a si mee? Ọ pụrụ ịbụwo na otu ihe nke na-emekarị ka mmadụ ghara ichezi echiche echezi—ikwere nanị n’ihe ọ chọrọ ikwere—mere ka Pita ghara iche echiche nke ọma.

Enwela Obi Ike Gabiga Ókè

Ihe pụrụ ime ka anyị ghara iche echiche nke ọma bụ àgwà nke inwe obi ike gabiga ókè. Pọl onyeozi dọrọ Ndị Kraịst ibe ya nọ na Kọrint oge ochie aka ná ntị, sị: “Ka onye na-eche na ya na-eguzo lezie anya ka ọ ghara ịda.” (1 Ndị Kọrint 10:12) N’ihi gịnị ka Pọl ji kwuo nke a? O doro anya na ọ bụ n’ihi na ọ maara otú o si dị mfe echiche mmadụ ịgbagọ agbagọ—ọbụna otú o si dị mfe Ndị Kraịst ịbụ ndị ‘e merụrụ obi ha pụọ n’izi ezi na ịdị ọcha kwesịrị Kraịst ahụ.’—2 Ndị Kọrint 11:3.

Nke a emewo otu agbụrụ dum nke ndị nna ochie Pọl. N’oge ahụ, Jehova gwara ha, sị: “Echiche nke m, ha abụghị echiche unu, ụzọ unu kwa, ha abụghị ụzọ m.” (Aịsaịa 55:8) Ha ghọrọ “ndị maara ihe n’anya ha onwe ha,” bụ́ nke kpataara ha ọdachi. (Aịsaịa 5:21) Ya mere, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya n’ezie inyocha otú anyị pụrụ isi na-eche echiche nke ọma ma si otú ahụ zere ọdachi yiri nke ahụ.

Kpachara Anya Banyere Echiche Anụ Ahụ́

Ụfọdụ ndị nọ na Kọrint nwere nnọọ echiche anụ ahụ́. (1 Ndị Kọrint 3:1-3) Ha tinyere uche na nkà ihe ọmụma mmadụ karịa n’Okwu Chineke. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ụbụrụ na-aghọ nnọọ ndị amamihe Gris nke oge ahụ nkọ. Otú ọ dị, n’anya Chineke, ha bụ ndị nzuzu. Pọl kwuru, sị: “E dere, sị: ‘M ga-eme ka amamihe nke ndị maara ihe laa n’iyi, ọgụgụ isi nke ndị oké amamihe ka m ga-akwagakwa n’ụsọ.’ Olee ebe onye amamihe nọ? Olee odeakwụkwọ? Olee ọ̀rụ́ ụka nke usoro ihe a? Ọ̀ bụ na Chineke emeghị ka amamihe nke ụwa bụrụ ihe nzuzu?” (1 Ndị Kọrint 1:19, 20) Ihe na-achịkwa ndị oké amamihe dị otú ahụ bụ “mmụọ nke ụwa” ọ bụghị mmụọ Chineke. (1 Ndị Kọrint 2:12) Nkà ihe ọmụma na echiche ha ekwekọghị n’echiche Jehova.

Isi sekpụ ntị nke echiche anụ ahụ́ dị otú ahụ bụ Setan bụ́ Ekwensu, bụ́ onye jiri agwọ rafuo Iv. (Jenesis 3:1-6; 2 Ndị Kọrint 11:3) Ọ̀ ka bụụrụ anyị ihe ize ndụ? Ee! Dị ka Okwu Chineke si kwuo, Setan ‘emewo ka uche ndị mmadụ kpuo ìsì’ ruo n’ókè nke na ọ ‘na-eduhiezi ụwa dum mmadụ bi.’ (2 Ndị Kọrint 4:4; Mkpughe 12:9) Lee ka o si dị mkpa ịnọ na nche megide aghụghọ ya!—2 Ndị Kọrint 2:11.

Nọrọ na Nche Megide ‘Aghụghọ nke Ụmụ Mmadụ’

Pọl onyeozi dọkwara aka ná ntị megide ‘aghụghọ nke ụmụ mmadụ.’ (Ndị Efesọs 4:14) O zutere “ndị ọrụ aghụghọ” bụ́ ndị mere ka ha na-ezisa eziokwu ahụ ma bụrụ n’ezie ndị na-ekpu ya ihu n’ala. (2 Ndị Kọrint 11:12-15) Iji mezuo nzube ha, ndị ikom dị otú ahụ pụrụ iji ihe àmà ndị na-akwado echiche ha, okwu ndị na-akpali akpali, okwu ndị na-abụchaghị eziokwu, okwu aghụghọ, na ụgha chara acha eme ihe.

Ndị na-agbasa echiche na-eduhie eduhie na-ejikarị okwu bụ́ “ịrọ òtù” eme ihe iji katọọ ndị ọzọ. N’otu aro a tụụrụ Nzukọ Ndị Omeiwu nke Kansụl Europe, e kwuru na ‘ọ ga-adị mma ka a gwa ndị na-enyocha òtù okpukpe ọhụrụ ka ha ghara iji okwu ahụ eme ihe.’ N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na e chere na okwu ahụ bụ́ “òtù nzuzo” na-enye echiche dịbigara njọ ókè. N’ụzọ yiri nke ahụ, ndị Gris ụbụrụ na-aghọ nkọ boro Pọl onyeozi ebubo ụgha na ọ bụ “onye nkwugheri,” ma ọ bụ, n’ụzọ nkịtị “onye na-atụtụ mkpụrụ.” Nke na-apụta na ọ dịghị ihe ọzọ ọ bụ ma ọ bụghị onye ekwurekwu, bụ́ onye na-atụtụ ihe ọmụma dị nta ma na-ekwughachi ha ugboro ugboro. N’ezie, Pọl nọ “na-akpọsa ozi ọma banyere Jizọs na mbilite n’ọnwụ ya.”—Ọrụ 17:18.

Ụzọ ndị ahụ ndị na-agbasa echiche na-eduhie eduhie si eme ihe ọ̀ na-aga nke ọma? Ee. Ha abụwo isi sekpụ ntị na-akpata ịkpọasị agbụrụ na nke okpukpe, site n’ime ka ndị mmadụ nwee echiche na-ezighị ezi banyere mba ma ọ bụ okpukpe nke ndị ọzọ. Ọtụtụ ndị ejiriwo ha megbuo ìgwè ndị a na-amachaghị ama. Adolf Hitler ji ụzọ ndị dị otú ahụ mee ihe n’ụzọ dị irè mgbe ọ kọwara ndị Juu na ndị ọzọ dị ka “ndị rụrụ arụ,” “ndị ọjọọ,” na ndị bụ́ “ihe ize ndụ” nye obodo. Ekwela mgbe ọ bụla ka ụdị aghụghọ dị otú a merụọ echiche gị.—Ọrụ 28:19-22.

Eduhiela Onwe Gị

Ọ dịkwa mfe anyị iduhie onwe anyị. N’ezie, ọ na-esi ike mmadụ ịkwụsị inwe echiche o ji kpọrọ oké ihe ma ọ bụ nyowe ya enyowe. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na anyị na-enwe mmasị dị ukwuu n’echiche anyị. N’ihi ya, anyị pụrụ iduhie onwe anyị site n’ịgbachitere onwe anyị—site n’ichepụta ihe ndị anyị ga-eji mee ka nkwenkwe ndị na-eduhie eduhie n’ezie yie ndị ziri ezi.

Nke a mere ụfọdụ Ndị Kraịst narị afọ mbụ. Ha maara banyere Okwu Chineke, ma ha ekweghị ka o duzie echiche ha. Ha bịara “jiri echiche ụgha na-aghọgbu onwe [ha].” (Jems 1:22, 26) Otu ihe nke pụrụ igosi na anyị na-eduhie onwe anyị n’ụzọ dị otú ahụ bụ ma ọ bụrụ na anyị na-ewe iwe mgbe a gbaghara ihe anyị kweere. Kama iwewe iwe, ọ bụ ihe amamihe dị na ya inwe uche gheere oghe ma jiri nlezianya gee ntị n’ihe ndị ọzọ nwere ikwu—ọbụna mgbe anyị ji n’aka na echiche anyị ziri ezi.—Ilu 18:17.

Gwuo Iji Gwupụta “Ihe Ọmụma Chineke”

Gịnị ka anyị pụrụ ime iji nọgide na-eche echiche nke ọma? E nwere ọtụtụ ihe enyemaka, ma anyị aghaghị ịdị njikere ịrụ ọrụ maka ya. Eze Solomọn maara ihe kwuru, sị: “Nwa m, ọ bụrụ na ị nara okwu ọnụ m nile, ọ bụrụkwa na i zobe ihe nile m nyere n’iwu n’ebe ị nọ; ị tọọrọ amamihe ntị gị n’ala, wee wezụga obi gị inwe nghọta; ee, ọ bụrụ na ọ bụ mmata ka ị na-akpọku, ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta ka ị na-eweliri olu gị; ọ bụrụ na ị chọọ ya dị ka ọlaọcha, ọ bụrụkwa na ọ bụ dị ka akụ̀ zoro ezo ka ị na-egwupụta ya: mgbe ahụ ka ị ga-aghọta egwu Jehova, ọ bụkwa ihe ọmụma Chineke ka ị ga-achọta.” (Ilu 2:1-5) Ee, ọ bụrụ na anyị emee mgbalị n’onwe anyị iji jiri eziokwu nke Okwu Chineke mejupụta uche na obi anyị, anyị ga-enwe ezi amamihe, ezi uche, na nghọta. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, anyị ga na-egwu ihe iji gwupụta ihe ndị bara uru karịa ọlaọcha ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ a na-ahụ anya nke dị oké ọnụ ahịa.—Ilu 3:13-15.

N’ezie, amamihe na ihe ọmụma bụ ihe ndị dị oké mkpa iji wee na-eche echiche nke ọma. “Amamihe ga-aba n’obi gị, ihe ọmụma ga-adịkwa mkpụrụ obi gị ụto,” ka Okwu Chineke na-ekwu, “izuzu ga na-eche gị nche, nghọta ga-echebe gị: ịnapụta gị n’ụzọ onye ọjọọ, n’aka mmadụ na-ekwu okwu ịgbakụta Chineke azụ; bụ́ ndị na-ahapụ okporo ụzọ nile nke izi ezi, ka ha wee jee ije n’ụzọ nile nke ọchịchịrị.”—Ilu 2:10-13.

Ọ dị mkpa karịsịa ikwe ka echiche Chineke na-eduzi echiche anyị n’oge e nwere nsogbu ma ọ bụ ihe ize ndụ. Oké mmetụta ndị dị ka iwe ma ọ bụ egwu pụrụ ime ka o sie ike iche echiche nke ọma. “Mmegbu na-eme ka onye maara ihe ghọọ onye nzuzu,” ka Solomọn na-ekwu. (Eklisiastis 7:7) Ọbụna o kwere omume ‘iwe oké iwe megide Jehova.’ (Ilu 19:3, NW) N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ịta Chineke ụta maka nsogbu anyị na iji ha emere ihe ngọpụ maka ime ihe ndị na-ekwekọghị n’iwu na ụkpụrụ ya. Kama ichewe na anyị kasị mara ihe mgbe nile, ka anyị jiri obi umeala na-ege ndị ndụmọdụ maara ihe ntị, bụ́ ndị na-achọ inyere anyị aka site n’iji Akwụkwọ Nsọ eme ihe. Ọ bụrụkwa na ọ dị mkpa, ka anyị dịrị njikere ịhapụ ọbụna echiche ndị gbanyesiri mkpọrọgwụ ike n’obi anyị mgbe o doro anyị anya na ha hiere ụzọ.—Ilu 1:1-5; 15:22.

“Nọgide Na-arịọ Chineke”

Anyị bi n’oge dị mgbagwoju anya na nke dị ize ndụ. Ikpegara Jehova ekpere mgbe nile maka nduzi dị oké mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-eji ezi uche eme ihe ma mee ihe n’ụzọ amamihe dị na ya. “Unu enwela nchegbu banyere ihe ọ bụla,” ka Pọl na-ede, “kama n’ihe nile site n’ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike ya na inye ekele, meenụ ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche nile ga-echekwa obi unu na ike iche echiche unu nche site na Kraịst Jizọs.” (Ndị Filipaị 4:6, 7) Ọ bụrụ na amamihe iji hụ maka nsogbu na ọnwụnwa ndị tara akpụ kọrọ anyị, ọ dị mkpa ka anyị “nọgide na-arịọ Chineke, n’ihi na o ji mmesapụ aka na-enye mmadụ nile ihe, n’akọchaghịkwa akọcha.”—Jems 1:5-8.

Ebe ọ bụ na Pita onyeozi maara na ọ dị mkpa ka Ndị Kraịst ibe ya jiri amamihe na-eme ihe, ọ gbalịrị ‘ịkpali ezi ikike iche echiche ha.’ Ọ chọrọ ka ha “cheta okwu ndị e kwuworo na mbụ site n’ọnụ ndị amụma dị nsọ na ihe Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị [Jizọs Kraịst] nyere n’iwu.” (2 Pita 3:1, 2) Ọ bụrụ na anyị emee nke a ma mee ka echiche anyị kwekọọ n’Okwu Jehova, anyị ga na-eche echiche nke ọma ma na-eme ihe n’ụzọ amamihe dị na ya.

[Foto ndị dị na peeji nke 21]

Ndị Kraịst oge mbụ kwere ka amamihe Chineke, ọ bụghị echiche nkà ihe ọmụma, kpụzie echiche ha

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Ndị ọkà ihe ọmụma site n’aka ekpe gaa n’aka nri: Epicurus: Foto nke e sere site n’ikike nke British Museum; Cicero: Nke e seere site n’akwụkwọ bụ́ The Lives of the Twelve Caesars; Plato: Roma, Musei Capitolini

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Ekpere na ịmụ Okwu Chineke dị oké mkpa