Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Ọzọ Hà Dị Anyị Mkpa N’ezie?

Ndị Ọzọ Hà Dị Anyị Mkpa N’ezie?

Ndị Ọzọ Hà Dị Anyị Mkpa N’ezie?

“MGBE anyị nyochara ndụ anyị na mbọ ndị anyị na-agba, anyị na-achọpụta n’oge na-adịghị anya na ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ihe nile anyị na-eme na ọchịchọ anyị dum dabeere n’ịdị adị nke ndị ọzọ,” ka ọkà mmụta sayensị ahụ a ma nke ọma bụ́ Albert Einstein kwuru. Ọ gbakwụnyere, sị: “Anyị na-eri nri ndị ọzọ mepụtara, na-eyi ákwà ndị ọzọ kwara, biri n’ụlọ ndị ọzọ wuru. . . . Mmadụ bụ ihe ọ bụ ma na-aghọta na ọ dịghị oké ihe o nwere n’ihi ụdị mmadụ ọ bụ, kama, ọ bụ n’ihi na o so n’ọha mmadụ buru ibu, bụ́ nke na-eduzi ịdị adị ya n’ụzọ anụ ahụ́ na n’ụzọ ime mmụọ site n’oge a mụrụ ya ruo n’oge ọ ga-anwụ.”

A bịa n’etiti ụmụ anụmanụ, a na-ahụkarị imekọ ihe ọnụ dị ka ihe e bu pụta ụwa. Enyí na-agagharị n’ìgwè, jiri nlezianya na-echebe ụmụ ha. Ọdụm ndị nke nne na-achụkọ nta ọnụ, ma na-eso ndị nke oké ekerịta nri ha. Azụ̀ dolphin na-egwukọ egwu ọnụ, ọbụna ha echebewokwa ụmụ anụmanụ ndị ọzọ ma ọ bụ ndị na-egwu mmiri mgbe ha nọ ná nsogbu.

Otú ọ dị, a bịa n’ebe ụmụ mmadụ nọ, ndị ọkà mmụta mmekọrịta mmadụ na ibe ya achọpụtawo otu àgwà nke na-enye ọtụtụ mmadụ nsogbu n’obi. Dị ka otu akwụkwọ akụkọ e bipụtara na Mexico si kwuo, ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị na-ekwu na “ọha mmadụ nọ na United States ahụsiwo anya n’ihi otú ndị mmadụ siworo na-anọrọ onwe ha ruo ọtụtụ iri afọ na otú imekọ ihe ọnụ si bụrụ ihe na-ala ala.” Akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru na “ọdịmma nke mba ahụ dabeere n’ime mgbanwe dị ukwuu ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya, bụ́ nke na-agụnye ịmaliteghachi imekọ ihe ọnụ.”

Nsogbu a amụbawo karịsịa n’etiti ndị bi ná mba ndị mepere emepe. E nwere àgwà na-amụbawanye ngwa ngwa nke ọtụtụ mmadụ ịnọrọ onwe ha. Ndị mmadụ chọrọ ‘ibi ndụ otú o si masị ha’ ma na-eguzogidesi ike ndị ọzọ ‘ịwabata n’ihe ndị dịịrị ha.’ E kwupụtawo echiche bụ́ na àgwà a emewo ka ọha mmadụ na-enwekwu nsogbu nke mmetụta uche, ịda mbà n’obi, na igbu onwe onye.

Dr. Daniel Goleman kwuru banyere nke a, sị: “Ịnọrọ onwe onye—echiche bụ́ na mmadụ enweghị onye ọ bụla ọzọ ọ pụrụ ịkọrọ ihe dị ya n’obi ma ọ bụ onye ya na ya ga na-akpakọrịta—ji okpukpu abụọ na-amụba ohere e nwere ịda ọrịa ma ọ bụ ịnwụ.” Akụkọ e bipụtara n’akwụkwọ bụ́ Science kwubiri na ịnọrọ onwe onye ‘na-akpata ọnwụ otú ise siga, ọbara mgbali elu, inwe oké abụba, ibu oké ibu, na adịghị emega ahụ́ si akpata.’

Ya mere, e nwere ihe ndị dịgasị iche iche mere ndị ọzọ ji dị anyị mkpa n’ezie. Anyị apụghị ịnọ n’adabereghị n’ebe ndị ọzọ nọ. Ya mere, olee otú a pụrụ isi dozie nsogbu nke mmadụ ịnọrọ onwe ya? Olee ihe meworo ka ndụ ọtụtụ ndị nwee ezi nzube? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị a.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 3]

“Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ihe nile anyị na-eme na ọchịchọ anyị dum dabeere n’ịdị adị nke ndị ọzọ.”—Albert Einstein