Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Tupu Ya Amalite na Mgbe Ọ Malitesịrị—O Nwetara Ike Iji Mee Mgbanwe

Tupu Ya Amalite na Mgbe Ọ Malitesịrị—O Nwetara Ike Iji Mee Mgbanwe

“Bịaruonụ Chineke Nso, Ọ Ga-abịarukwa Unu Nso”

Tupu Ya Amalite na Mgbe Ọ Malitesịrị—O Nwetara Ike Iji Mee Mgbanwe

SANDRA, bụ́ nwanyị nọ na Mexico, kọwara onwe ya dị ka ajọ nwa n’ezinụlọ ya. Ọjụjụ a jụrụ ya na mmetụta na-ekpo ọkụ a na-egosighị ya mere ka ọ hụsie anya n’oge ọ dị afọ iri na ụma. Ọ na-ekwu, sị: “Ebiri m ndụ n’oge uto m, na-enwe mmetụta na-adịghị apụ m apụ n’obi nke ịbụ onye tọgbọ chakoo ma na-enwe oké obi abụọ banyere ịdị adị m nakwa banyere ndụ.”

Mgbe Sandra nọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị, ọ malitere ịṅụ mmanya papa ya nwere n’ụlọ. Ka oge na-aga, ọ malitere ịzụ mmanya nke ya ma ghọọ onye aṅụrụma. “Ọ dịghị ihe ọ bụla na-akpali m ịdị ndụ,” ka ọ na-ekweta. N’ihi obi nkoropụ, Sandra malitere ịṅụ ọgwụ ọjọọ. “Nanị ihe nyeere m aka ichezọ nsogbu m,” ka ọ na-ekwu, “bụ ihe m na-ebu n’obere akpa m: karama mmanya, mkpụrụ ọgwụ ụfọdụ, ma ọ bụ obere wii wii.”

Mgbe Sandra gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ nkà mmụta ọgwụ, o mikpukwuru onwe ya ná ndụ aṅụrụma. Ọ nwara igbu onwe ya. Ma ọ nwụghị.

Sandra chọrọ enyemaka ime mmụọ na nkasi obi n’ọtụtụ okpukpe dị iche iche, ma ọ dịghị nke nwere isi. N’ịbụ onye na-enweghịzi olileanya na onye nwere obi nkoropụ, ọ jụrụ Chineke ugboro ugboro, sị: “Ebee ka ị nọ? Ị́ gaghị enyere m aka?” Mmetụta nke ịbụ onye na-abaghị n’ihe ọ na-enwe eruwo ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu mgbe otu n’ime Ndịàmà Jehova gwara ya okwu. Nke a dugara n’inwe ọmụmụ Bible onwe onye. O metụrụ Sandra n’ahụ́ nke ukwuu mgbe ọ matara na “Jehova nọ nso ndị obi ha tiwara etiwa.”—Abụ Ọma 34:18.

Onye mụụrụ Sandra Bible nyeere ya aka ịghọta na Jehova Chineke maara na anyị adịghị ike n’ihi mmehie na ezughị okè anyị ketara n’aka Adam. Sandra bịara mata na Chineke na-aghọta na anyị apụghị iru ụkpụrụ ezi omume n’ụzọ zuru ezu. (Abụ Ọma 51:5; Ndị Rom 3:23; 5:12, 18) Obi dị ya ụtọ ịmata na Jehova adịghị elekwasị anya n’adịghị ike anyị, ọ dịghịkwa atụ anya ka anyị mee ihe karịrị ike anyị. Ọbụ abụ ahụ jụrụ, sị: “Ọ bụrụ na Ị rịba ajọ omume nile ama, Jaa, Onyenwe anyị, ònye ga-eguzo?”—Abụ Ọma 130:3.

Otu eziokwu Bible nke tọrọ Sandra ụtọ n’obi bụ àjà mgbapụta Jizọs Kraịst. Site na ya, Jehova ji obi ebere mee ka ụmụ mmadụ na-erube isi na-enweta ọnọdụ dị mma n’agbanyeghị ezughị okè ha. (1 Jọn 2:2; 4:9, 10) Ee, anyị pụrụ inweta “mgbaghara nke njehie anyị” ma si otú ahụ bụrụ ndị e nyeere aka ịkwụsị inwe mmetụta ọ bụla nke ịbụ ndị na-abaghị uru.—Ndị Efesọs 1:7.

Sandra mụtara ezigbo ihe site n’ihe nlereanya nke Pọl onyeozi. Pọl nwere ekele dị ukwuu maka obiọma Chineke gosipụtara n’iji amara gbaghara ya ihe ndị o mehiere n’oge gara aga ma kwado ya n’ọgụ ọ lụsiri ike iji merie adịghị ike ndị o nwere mgbe ụfọdụ. (Ndị Rom 7:15-25; 1 Ndị Kọrint 15:9, 10) Pọl gbanwere ụzọ ndụ ya, ‘tipụta ahụ́ ya ọnyá ma chịkwaa ya dị ka ohu’ iji nọgide n’ụzọ Chineke kwadoro. (1 Ndị Kọrint 9:27) O kweghị ka ọchịchọ mmehie ya chịkwaa ya dị ka ohu.

Adịghị ike Sandra mekpara ya ahụ́, ma ọ nọgidere na-alụso ha ọgụ. O kpesiri ekpere ike maka enyemaka Jehova iji merie ha ma chọọ ebere ya. (Abụ Ọma 55:22; Jems 4:8) N’ịchọpụta na Chineke nwere mmasị n’ebe ya onwe ya nọ, Sandra bịara nwee ike ịgbanwe ndụ ya. “Ana m enwe ọṅụ nke ịkụziri ndị ọzọ Bible mgbe nile,” ka ọ na-ekwu. Sandra nwere ihe ùgwù nke inyere nwanne ya nwanyị nke tọrọ ya na nke ọ tọrọ aka ịmara Jehova. Ka ọ “na-eme ihe ọma,” ọ na-ejikwa nkà o nwere n’ịgwọ ọrịa eme ihe n’afọ ofufo ná mgbakọ Ndịàmà Jehova.—Ndị Galeshia 6:10.

Gịnị banyere ihe ndị riri Sandra ahụ́? O ji obi ike na-ekwu, sị: “Ọ dịghịzi ihe na-enye m nsogbu n’obi. Adịghịzi m aṅụ mmanya, ese siga, ma ọ bụ na-aṅụ ọgwụ ọjọọ. Ha adịghị m mkpa. Achọtara m ihe m na-achọ.”

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]

“Achọtara m ihe m na-achọ”

[Igbe dị na peeji nke 9]

Ụkpụrụ Bible Ndị Nọ n’Ọrụ

Ihe ndị na-esonụ bụ ụkpụrụ Bible ndị nyewooro ọtụtụ ndị aka ịkwụsị ihe ndị na-emerụ emerụ bụ́ ndị riri ha ahụ́:

“Ka anyị sachapụ onwe anyị mmerụ ọ bụla nke anụ ahụ́ na mmụọ, na-eme ka ịdị nsọ zuo okè n’egwu Chineke.” (2 Ndị Kọrint 7:1) Chineke na-agọzi ndị sachapụworo onwe ha mmerụ, na-ezere omume ndị na-adịghị ọcha.

“Egwu Jehova bụ ịkpọ ihe ọjọọ asị.” (Ilu 8:13) Ịtụ Chineke egwu nsọpụrụ na-enyere mmadụ aka ịkwụsị àgwà ọjọọ, gụnyere iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. E wezụga ime ihe na-atọ Jehova ụtọ, a na-echebe onye ahụ gbanwere omume ya pụọ n’ọrịa ndị na-eyi egwu.

‘Na-edo onwe gị n’okpuru ma na-erubere ọchịchị na ikike dị iche iche isi dị ka ndị na-achị achị.’ (Taịtọs 3:1) N’ọtụtụ ebe, inwe ma ọ bụ iji ọgwụ ụfọdụ eme ihe bụ ịda iwu. Ezi Ndị Kraịst adịghị enweta ma ọ bụ na-eji ọgwụ ndị megidere iwu eme ihe.