Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ugarit—Obodo Oge Ochie nke E Ji Ofufe Bel Mara

Ugarit—Obodo Oge Ochie nke E Ji Ofufe Bel Mara

Ugarit—Obodo Oge Ochie nke E Ji Ofufe Bel Mara

N’AFỌ 1928, otu onye Siria bụ́ onye ọrụ ugbo gburu ọgụ ya n’otu nkume e ji kpuchie ili nke ihe ndị dị ka efere nkụwa oge ochie dị n’ime ya. Echiche ya agatụghị aga n’uru ihe ahụ ọ chọtara ga-aba. Mgbe otu ìgwè ndị ọkà mmụta ihe ochie nọ na France, bụ́ nke Claude Schaeffer bụ onyeisi ya, nụrụ banyere ihe ahụ a chọtara na mberede, ha gara ebe ahụ n’afọ sochirinụ.

N’oge na-adịghị anya, e gwupụtara otu ihe odide nke mere ka ìgwè ahụ nwee ike ịmata obodo ha na-egwupụta ihe ndị e bibiri na ya. Ọ bụ Ugarit, bụ́ “otu n’ime obodo ndị kasị mkpa dịrị n’oge ochie na Nso Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa.” Ọbụna onye edemede bụ́ Barry Hoberman kwuru, sị: “Ọ dịghị ihe mgbe ochie a chọtaworo, ọbụnadị Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ, nke ka ya mee ka anyị ghọta nnọọ Bible.”—The Atlantic Monthly.

Ebe Ụzọ Gbara Ọtụtụ

N’ịbụ nke dị n’ebe dị mkputamkpu a maara dị ka Ras Shamra, n’Ụsọ Oké Osimiri Mediterenian nke ebe bụzi ebe ugwu Siria, Ugarit bụ obodo na-ekwo ekwo a ma ama n’ụwa na narị afọ iri nke abụọ T.O.A. Ókèala ya dị ihe dị ka kilomita 60 site n’Ugwu Casius n’ebe ugwu ya ruo Tell Sukas n’ebe ndịda ya, dịrịkwa kilomita 30 ruo 50 site na Mediterenian n’ebe ọdịda anyanwụ ya ruo na Ndagwurugwu Orontes n’ebe ọwụwa anyanwụ ya.

Anụ ụlọ na-amụ ọmụmụ nke ọma n’Ugarit nke ihu igwe ya na-agbachapụ agbapụ. Ihe ndị a na-emepụta n’ógbè ahụ bụ ọka, mmanụ oliv, mmanya, na osisi—ihe na-adịtụghị adị na Mesopotemia na n’Ijipt. Ọzọkwa, obodo ahụ ịbụ nke dị n’ebe ụzọ ahịa ndị a ma ama si gafee mere ka ọ bụrụ otu n’ime obodo ndị mbụ nwere nnukwu ọdụ ụgbọ mmiri e si aga mba dị iche iche. Ndị ahịa si Aegean, Anatolia, Babilọn, Ijipt, na ebe ndị ọzọ n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa na-aga Ugarit ịzụ ígwè, ihe ndị a rụtara n’ubi, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ a na-emepụta n’obodo ahụ.

N’agbanyeghị na Ugarit bụ obodo bara ọgaranya, ọ nọgidere mgbe nile bụrụ alaeze na-enwereghị onwe ya. Obodo ahụ dị na nsọtụ ebe ugwu nke Alaeze Ukwu Ijipt ruo mgbe e webatara ya n’Alaeze Ukwu Het na narị afọ nke 14 T.O.A. A manyere Ugarit ịtụ ụtụ nye alaeze na-achị ya na ịkpọgara ya ndị agha. Mgbe “Ndị Oké Osimiri” * wakporo Anatolia (ebe etiti Turkey) na ebe ugwu Siria ma malite ibibi ha, ndị Het gwara ndị Ugarit ka ha chịrị ndị agha na ìgwè ụgbọ mmiri ha bịa. N’ihi ya, Ugarit n’onwe ya enweghịzi ndị nchebe, e bibikwara ya kpam kpam n’ihe dị ka 1200 T.O.A.

Igosi Otú Ọ Dị n’Oge Ochie

Ihe ndị e bibiri n’Ugarit mere ka e nwee ebe dị nnọọ mkputamkpu nke fọrọ nke nta ka o ruo mita 20 n’ịdị elu ma dị ihe karịrị hekta 25 n’obosara. Ọ bụ nanị otu ụzọ n’ụzọ isii nke ebe a ka e gwupụtarala ihe ndị dị na ya. N’ebe ahụ, ndị ọkà mmụta ihe ochie egwupụtawo ihe ndị fọdụrụ n’otu nnukwu obí nke nwere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu narị ọnụ ụlọ na mbara èzí, ma dịrị ihe dị ka square mita 10,000 n’obosara. Obí ahụ nwere paịpụ mmiri si agba, ụlọ ịsa ahụ́ na nke mposi, na paịpụ mmiri nsị́ si agbapụ. E ji ọlaedo, nkume lapis lazuli, na ọdụ́ chọọ oche ndị dị na ya mma. A chọtawo ihe ndị dị mbadamba e ji ọdụ́ mee bụ́ ndị e ji nkà see ihe na ha. Ubi e ji mgbidi gbaa ogige na ọdọ mmiri nke nwere steepụ e si arịba na ya mere ka obí ahụ makwuo mma.

Ụlọ nsọ Bel na Dagan jupụtara n’obodo ahụ nakwa n’ala dị larịị nke gbara ya gburugburu. * Ụlọ nsọ ndị a topụrụ etopụ, bụ́ ndị dị mita 20 n’ogologo ma eleghị anya, nwere obere paseeji ndị e si abanye n’ọnụ ụlọ dị n’ime ha bụ́ ebe e debere ihe oyiyi nke chi a nọ na ha efe. E nwere steepụ ndị e si arịgo n’ebe eze na-anọ eduzi ememe dịgasị iche iche. N’abalị ma ọ bụ n’oge mmiri na-ezosi ike, ọ pụrụ ịbụwo na a na-amụnye ọkụ n’ogidi ndị dị n’elu ụlọ nsọ ndị ahụ iji duzie ndị ọkwọ ụgbọ mmiri irute n’ọdụ ụgbọ mmiri n’udo. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ bụ ndị ọkwọ ụgbọ mmiri bụ́ ndị kweere na ọ bụ chi oké mmiri ozuzo bụ́ Bel-Hadad mere ha ji lọta n’udo, wetara arịlịka nkume 17 a hụrụ n’ebe nsọ ya, iji mezuo nkwa ha.

Ihe Odide Ndị Bara Uru A Chọtara

A chọtara ọtụtụ puku mbadamba ụrọ ndị e dere ihe na ha n’ebe nile ná mkpọmkpọ ebe nke Ugarit. A chọtawo ihe odide ndị metụtara akụ̀ na ụba, nkà iwu, mmekọrịta mba na mba, nakwa ọchịchị n’asụsụ asatọ, bụ́ ndị e ji ụdị mkpụrụ akwụkwọ ise dee. Ìgwè ahụ Schaeffer bụ onyeisi ya chọtara ihe ndị e dere n’asụsụ a na-amabeghị ruo ugbu a—nke ha kpọrọ asụsụ Ugarit—nke e ji akara cuneiform 30 mee ihe na ya, bụ́ ndị mejupụtara otu n’ime mkpụrụ akwụkwọ ndị kasị ochie a chọtatụrụla.

Tụkwasị n’ikwu banyere ihe nke ụwa, ihe odide ndị a chọtara n’Ugarit nwere ndị nyere nghọta ọhụrụ banyere echiche na ihe omume okpukpe nke oge ahụ. Ọ dị ka okpukpe ndị Ugarit ò yiri nnọọ nke ndị Kenan ha na ha gbara agbata obi. Dị ka Roland de Vaux si kwuo, ihe odide ndị a “na-egosipụta nnọọ, n’ụzọ ziri ezi, otú ala Kenan si mepee anya n’oge dịrị nnọọ tupu Izrel ebibie ya.”

Okpukpe n’Obodo Bel

Aha ihe karịrị chi na chi nwanyị 200 dị n’ihe odide ndị ahụ a chọtara na Ras Shamra. Chi kasị ukwuu bụ El, bụ́ nke a kpọrọ nna nke ndị bụ́ chi na nke ụmụ mmadụ. Chi oké mmiri ozuzo bụ́ Bel-Hadad bụkwa “onye na-achịkwa igwe ojii” na “onye nwe ụwa.” A na-egosipụta El dị ka agadi nwoke maara ihe, nwee afụ ọnụ chara awọ, bụ́ onye nọ n’ebe dị anya n’ebe ụmụ mmadụ nọ. N’aka nke ọzọ, Bel bụ chi dị ike ma nwee oké ọchịchọ bụ́ onye na-achọ ịchị ndị bụ́ chi na ihe a kpọrọ mmadụ.

Ikekwe, a na-agụ ihe odide ndị ahụ a chọtara n’oge a na-eme ememe okpukpe, dị ka ememe afọ ọhụrụ ma ọ bụ nke owuwe ihe ubi. Otú ọ dị, a maghị kpọmkwem otú e si akọwa ha. N’otu uri nke kwuru banyere okwu a na-ese maka ịchịisi, Bel meriri nwa El nke El kasị hụ n’anya, bụ́ chi oké osimiri bụ́ Yamm. Ikekwe, mmeri a mere ka obi sie ndị Ugarit na-akwọ ụgbọ mmiri ike na Bel ga-echebe ha n’oké osimiri. N’ọgụ Bel na Mot ji oké iwe lụọ, e meriri Bel, ya arịdaakwa n’okpuru ala. Oké ọkọchi amalite, ụmụ mmadụ anọwazie nkịtị. Nwunye na nwanne nwanyị Bel bụ́ Anat—chi nwanyị nke ịhụnanya na agha—egbuo Mot ma mee ka Bel dịghachi ndụ. Bel ekpochapụ ụmụ nile nwunye El, bụ́ Athirat (Ashera) mụrụ, ma rịgoroghachi n’ocheeze. Ma, Mot lọghachiri ka afọ asaa gasịrị.

Ụfọdụ na-akọwa uri a dị ka ihe na-egosi oge ndị a na-enwe n’afọ bụ́ nke okpomọkụ oge ọkọchị na-achụla mmiri ozuzo na-enye ndụ, o ruokwa n’oge mgbụsị akwụkwọ, mmiri ozuzo alọghachi. Ndị ọzọ na-eche na usoro afọ asaa ahụ metụtara egwu a na-atụ ụnwụ nri na oké ọkọchị. Nke ọ sọrọ ya bụrụ, e kweere na Bel ịbụ chi kasị elu dị oké mkpa ka ụmụ mmadụ wee na-enwe ihe ịga nke ọma n’ọrụ ha. Ọkà mmụta bụ́ Peter Craigie na-ekwu, sị: “Ihe mgbaru ọsọ nke okpukpe Bel bụ ịhụ na ọ bụ ya kasị elu; ndị na-efe ya kweere na ọ bụ nanị mgbe ọ bụ chi kasị elu ka a ga-anọgide na-enwe ihe ọkụkụ na ehi bụ́ ihe ndị dị oké mkpa ka ụmụ mmadụ wee nọgide na-adị ndụ.”

Ihe Nchebe Pụọ n’Ikpere Arụsị

Otú okpukpe ndị Ugarit si rụọ arụọ pụtara nnọọ ìhè n’ihe odide ndị ahụ e gwupụtara n’ala. Akwụkwọ bụ́ The Illustrated Bible Dictionary na-ekwu, sị: “Ihe odide ndị ahụ na-egosi ihe ihere ndị ofufe nke chi ndị a kpatara; tinyere otú e si jiri agha, ịgba akwụna n’ebe nsọ, ịhụnanya mmekọahụ, na ndakpọ nke mmekọrịta mmadụ na ibe ya ha kpatara, kpọrọ oké ihe n’ofufe ha.” De Vaux na-ekwu, sị: “Mgbe mmadụ gụrụ uri ndị a, ọ na-achọpụta otú ndị kweere na Yahweh n’ezie na ndị amụma ukwu ahụ si sọọ ofufe a oyi.” Iwu ahụ Chineke nyere mba Izrel oge ochie bụ ihe nchebe pụọ n’okpukpe ụgha dị otú ahụ.

Ịjụ ndị mmụọ ase, ịgụ kpakpando, na majik bụ ihe ndị e mere aghara aghara n’Ugarit. A chọrọ ihe ịrịba ama na ihe àmà ọdịnihu ọ bụghị nanị n’ihe ndị dị na mbara igwe kamakwa n’ụmụ e bu n’afọ bụ́ ndị nwere nkwarụ nakwa n’akụkụ ahụ́ ndị dị n’ime ahụ́ anụmanụ ndị e gburu egbu. “E kweere na chi a chụụrụ anụmanụ n’àjà na-ejikọta onwe ya n’ahụ́ anụmanụ ahụ nakwa na mmụọ nke chi ahụ na mmụọ nke anụmanụ ahụ na-ejikọta bụrụ otu,” ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Jacqueline Gachet na-ekwu. “N’ihi ya, site n’ịgụ ihe ịrịba ama ndị a hụrụ n’akụkụ ahụ́ ndị ahụ, o kwere omume ịmata uche nke ndị bụ́ chi bụ́ ndị nwere ike inye ma ọ́ bụghị azịza ọma ọ bụrụ nke ọjọọ n’ajụjụ a jụrụ ha banyere ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu ma ọ bụ banyere ihe a ga-eme n’ọnọdụ ụfọdụ kpọmkwem.” (Le pays d’Ougarit autour de 1200 av.J.C.) N’ụzọ dị iche, a gwara ụmụ Izrel ka ha zere omume ndị dị otú ahụ.—Deuterọnọmi 18:9-14.

N’ụzọ doro anya, Iwu Mozis megidere idina anụmanụ. (Levitikọs 18:23) Olee otú e si lee omume a anya n’Ugarit? N’ihe odide ndị ahụ a chọtara, Bel na-eso nne ehi enwe mmekọahụ. “Ọ bụrụ na e kwuo na Bel na-aghọ oké ehi iji na-eme ya,” ka ọkà mmụta ihe ochie bụ́ Cyrus Gordon kwuru, “a pụghị ikwu otu ihe ahụ maka ndị nchụàjà ya bụ́ ndị na-emeghachi ihe ndị a kọrọ n’akụkọ ifo na o mere.”

E nyere ụmụ Izrel iwu, sị: “Unu egbula egbugbu n’anụ ahụ́ unu n’ihi mkpụrụ obi [nwụrụ anwụ].” (Levitikọs 19:28) Otú ọ dị, ka ọ na-emeghachi omume n’ọnwụ Bel, El “gburu egbugbu n’anụ ahụ́ ya, o ji agụba kawasịa ahụ́ ya; o gburu egbugbu na ntì ya nakwa n’akụkụ àgbà ya.” Ihe àmà na-egosi na igbu egbugbu n’aha ememe okpukpe bụ ihe e ji mara ndị na-efe Bel.—1 Ndị Eze 18:28.

O yiri ka otu uri ndị Ugarit ọ̀ na-enye echiche na isi nwa ewu n’ime mmiri ara so n’ememe ọmụmụ a na-emekarị n’okpukpe ndị Kenan. Otú ọ dị, n’Iwu Mozis, e nyere ụmụ Izrel iwu, sị: “Esila nwa ewu n’ime mmiri ara nke nne ya.”—Ọpụpụ 23:19.

Iji Ha Tụnyere Ihe Odide Bible

N’ụzọ bụ́ isi, a dabeere na Hibru e ji dee Bible wee sụgharịa ihe odide Ugarit na mbụ. Peter Craigie na-ekwu, sị: “E nwere ọtụtụ okwu e ji mee ihe n’ihe odide Hibru bụ́ ndị ihe ha pụtara na-edoghị anya na ndị a na-amaghị ihe ha pụtara mgbe ụfọdụ; ndị nsụgharị e nwere tupu narị afọ nke 20 ji ụzọ dịgasị iche iche kọwaa ihe ha chere na ha pụtara. Ma mgbe a hụrụ okwu ndị ahụ n’ihe odide Ugarit, ọ na-ekwe omume ịghọta ihe ha pụtara.”

Dị ka ihe atụ, a na-asụgharịkarị otu okwu Hibru e ji mee ihe n’Aịsaịa 3:18 ịbụ “ihe a na-eke n’egedege ihu.” Okwu Ugarit e si otu ebe nweta ya na ya pụtara ma anyanwụ ma chi nwanyị anyanwụ. N’ihi ya, ọ pụrụ ịbụwo na ndị inyom Jeruselem ahụ e kwuru banyere ha n’amụma Aịzaịa ji obere ọla ndị yiri anyanwụ nakwa “ihe ịchọ mma nile yiri ọnwa” chọọ onwe ha mma iji sọpụrụ chi dị iche iche nke ndị Kenan.

N’Ilu 26:23 n’ihe odide Masora, e ji “egbugbere ọnụ na-ere ọkụ na obi ọjọọ” tụnyere ite ụrọ e ji “afụrụ ụzụ ọlaọcha” machie. Okwu Ugarit e si na ya nweta ya na-ekwe ka a sụgharịa okwu ahụ ịbụ “dị ka ọla a gbazere agbaze nke e ji machie mpekele ite ụrọ.” N’ụzọ dabara adaba, New World Translation sụgharịrị ilu a ịbụ: “Dị ka ọlaọcha a gbazere agbaze nke e ji machie mpekele ite ụrọ, otú ahụ ka egbugbere ọnụ ire ụtọ na obi ọjọọ dị.”

À Dabeere na Ha Dee Bible?

Nnyocha e mere n’ihe odide ndị ahụ a chọtara na Ras Shamra emewo ka ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-ekwu na e si n’akwụkwọ uri ndị Ugarit nweta ihe e dere n’ebe ụfọdụ na Bible. André Caquot, bụ́ onye òtù French Institute, na-ekwu na “okpukpe ndị Izrel dabeere n’ọdịbendị ndị Kenan.”

Banyere Abụ Ọma nke 29, Mitchell Dahood nke Ụlọ Akwụkwọ Ndị Bishọp Maka Nkụzi Bible nke dị na Rom na-ekwu, sị: “Ndị na-efe Yahweh nwetara abụ ọma a site n’ukwe ndị Kenan bu ya ụzọ bụ́ nke a na-ekwere chi oké mmiri ozuzo bụ́ Bel . . . Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụzie na a pụrụ ịhụ okwu nile e ji mee ihe n’abụ ọma ahụ n’ihe odide Kenan ndị e dere tupu e dee abụ ọma ahụ.” Ò ziri ezi ikwubi otú ahụ? Ọ dịghị ma ọlị!

Ndị ọkà mmụta ka eleru anya na-aghọta na e tinyewo nnu na ose n’ihe ndị yiri ibe ha. Ndị ọzọ akatọwo ihe ha kpọrọ ihe nile si n’Ugarit. “Ọ dịghị ihe odide Ugarit ya na Abụ Ọma nke 29 yiri n’ụzọ zuru ezu,” ka ọkà mmụta okpukpe bụ́ Garry Brantley na-ekwu. “Inye echiche na e si n’akụkọ ifo ndị na-ekpere arụsị nweta ihe e dere n’Abụ Ọma nke 29 (ma ọ bụ ihe odide ọzọ dị na Bible) enweghị ihe àmà na-akwado ya.”

Eziokwu ahụ bụ́ na ihe odide abụọ yiri ibe ha n’atụmatụ okwu, uri, na n’ụzọ e si dee ha ọ̀ bụ ihe àmà na-egosi na e si n’otu nweta nke ọzọ? N’ụzọ dị iche, e kwesịrị ịtụ anya na a ga-enwe myirịta dị otú ahụ. Akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia of Religion na-ekwu, sị: “Ihe kpatara myirịta a e nwere n’ọdịdị nakwa n’ihe ndị e dere na ha bụ ọdịbendị: n’agbanyeghị na Ugarit na Izrel adịtụghị n’otu ebe na n’otu oge, ha so n’otu ìgwè ka ukwuu nke na-agbaso otu ọdịbendị bụ́ nke okwu ndị ha ji eme ihe n’uri na n’okpukpe bụ otu.” N’ihi ya, Garry Brantley na-ekwubi, sị: “Ọ bụ ihe na-ekwesịghị ekwesị ikwu na e si na nkwenkwe ndị ọgọ mmụọ nweta ihe e dere na Bible nanị n’ihi na okwu e ji dee ha yiri ibe ha.”

N’ikpeazụ, e kwesịrị ịrịba ama na ọ bụrụ na ọ dị otú ihe odide ndị ahụ a chọtara na Ras Shamra si yie ndị nke Bible, ọ bụ nanị n’otú e si dee ha, ha eyighị n’ụzọ ime mmụọ. “[A dịghị] ahụ ụkpụrụ omume ndị dị elu a na-ahụ na Bible n’ihe odide Ugarit,” ka ọkà mmụta ihe ochie bụ́ Cyrus Gordon na-ekwu. N’ezie, ọdịiche e nwere na ha karịrị nnọọ myirịta ọ bụla e nwere.

O yiri ka ịmụ banyere Ugarit ọ̀ ga-anọgide na-enyere ndị mmụta Bible aka ịghọta ọnọdụ ọdịbendị, nke akụkọ ihe mere eme, na nke okpukpe nke ndị dere Bible nakwa nke mba Hibru n’ozuzu ya. Inyochakwu ihe odide ndị ahụ a chọtara na Ras Shamra pụkwara ime ka a ghọtakwuo Hibru oge ochie. Otú ọ dị, nke kasịnụ bụ na ihe mgbe ochie ndị ahụ a chọtara n’Ugarit na-eme ka ọdịiche dị n’etiti ofufe rụrụ arụ a na-efe Bel na ofufe dị ọcha a na-efe Jehova pụta ìhè nke ọma.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 N’ozuzu, ndị a maara dị ka “Ndị Oké Osimiri” bụ ndị ọkwọ ụgbọ mmiri si n’àgwàetiti na n’ụsọ oké osimiri ndị dị na Mediterenian. Ọ pụrụ ịbụ na ndị Filistia so n’ime ha.—Emọs 9:7.

^ par. 10 Ọ bụ ezie na e nwere echiche dịgasị iche iche, ụfọdụ na-akpọ ụlọ nsọ Dagan ụlọ nsọ El. Roland de Vaux, bụ́ ọkà mmụta bụ́ onye France, bụrụkwa Prọfesọ n’Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Bible nke Jeruselem, na-enye echiche na Dagan—Degọn nke Ndị Ikpe 16:23 na 1 Samuel 5:1-5—bụ ezigbo aha El. Akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia of Religion na-ekwu na ikekwe “e nwere ihe jikọrọ Dagan na [El] n’ụzọ ụfọdụ ma ọ bụkwanụ ha bụ otu ihe.” N’ihe odide ndị ahụ a chọtara na Ras Shamra, a kpọrọ Bel ọkpara Dagan, ma ihe okwu ahụ bụ́ “ọkpara” pụtara n’ebe ahụ edoghị anya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 25]

Ihe ndị ọkà mmụta ihe ochie chọtara n’Ugarit emewo ka anyị ghọtakwuo Akwụkwọ Nsọ

[Map/Foto ndị dị na peeji nke 24, 25]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Alaeze Ukwu Het na narị afọ nke 14 T.O.A.

OKÉ OSIMIRI MEDITERENIAN

Yufretis

UGWU CASIUS (JEBEL EL-AGRA)

Ugarit (Ras Shamra)

Tell Sukas

Orontes

SIRIA

IJIPT

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Obere ihe oyiyi nke Bel na iko nke yiri isi anụ: Musée du Louvre, Paris; ihe osise nke obí eze: © D. Héron-Hugé pour “Le Monde de la Bible”

[Foto dị na peeji nke 25]

Ihe ndị fọdụrụ n’ebe e si abanye n’obí ahụ

[Foto dị na peeji nke 26]

Uri akụkọ ifo ndị Ugarit pụrụ igosi ihe mere e ji dee ihe e dere n’Ọpụpụ 23:19

[Ebe E Si Nweta Foto]

Musée du Louvre, Paris

[Foto ndị dị na peeji nke 27]

Nkume a tụrụ Bel na ya

Efere ọlaedo nke e sere ebe a na-achụ nta na ya

Okwuchi igbe ihe ịchọ mma e ji ọdụ́ mee, bụ́ nke e sere chi nwanyị ọmụmụ na ya

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto nile: Musée du Louvre, Paris