Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Jehova kwere ka ndị ohu ya n’oge ochie, bụ́ ndị Izrel, lụọ karịa otu nwanyị, ma ọ dịghị ekwe ugbu a. Ụkpụrụ ya ọ̀ na-agbanwe agbanwe?

Jehova agbanwebeghị echiche ya banyere ịlụ karịa otu nwanyị. (Abụ Ọma 19:7; Malakaị 3:6) O soghị ná ndokwa o mere maka ụmụ mmadụ ná mmalite, ọ bụghịkwa ndokwa ya ugbu a. Mgbe o kere Iv dị ka nwunye nye Adam, Jehova kwupụtara na ụkpụrụ ya bụ otu nwunye otu di. “N’ihi nke a ka nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya, rapara n’ahụ́ nwunye ya: ha ewee ghọọ otu anụ ahụ́.”—Jenesis 2:24.

Mgbe Jizọs Kraịst nọ n’ụwa, o kwughachiri ụkpụrụ a mgbe ọ na-aza ndị jụrụ ya ajụjụ banyere ịgba alụkwaghịm na ịlụgharị di ma ọ bụ nwunye, ajụjụ. O kwuru, sị: “Ọ̀ bụ na unu agụghị na onye kere ha site ná mmalite mere ha nwoke na nwanyị wee sị, ‘N’ihi nke a, nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ́’? Nke mere na ha abụkwaghị anụ ahụ́ abụọ, kama otu.” Jizọs gbakwụnyere, sị: “Onye ọ bụla nke gbara nwunye ya alụkwaghịm, ma e wezụga n’ihi ịkwa iko, wee lụọ nwunye ọzọ na-akwa iko.” (Matiu 19:4-6, 9) Site na nke a, o doro anya na mmadụ ịlụ nwanyị ọzọ ma ọ bụ ịlụ ìgwè nwanyị tụkwasị na nke o nwere bụkwa ịkwa iko.

Gịnịzi mere e ji kwe ka a na-alụ karịa otu nwanyị n’oge ochie? Buru n’uche na ọ bụghị Jehova ka omume ahụ si n’aka ya malite. Onye mbụ e kwuru okwu ya na Bible na ọ lụrụ karịa otu nwanyị bụ Lemek, onye si n’eriri Ken. (Jenesis 4:19-24) Mgbe Jehova wetara Iju Mmiri nke ụbọchị Noa, Noa na ụmụ ya atọ nwere nanị otu nwunye otu nwunye. E bibiri ndị nile lụrụ karịa otu nwanyị n’oge Iju Mmiri ahụ.

Ọtụtụ narị afọ ka e mesịrị, mgbe Jehova họọrọ ndị Izrel dị ka ndị ya, ha adịlarị mbụ na-alụ karịa otu nwanyị, ọ bụ ezie na o doro anya na ọ bụ nnọọ ihe a na-emekarị bụ́ ịlụ nanị otu nwanyị. Chineke achọghị ka ezinụlọ ebe di lụrụ karịa otu nwanyị tisaa. Kama nke ahụ, ọ chịkwara omume ahụ n’ụzọ siri ike.—Ọpụpụ 21:10, 11; Deuterọnọmi 21:15-17.

Ọ bụghị nanị ihe Jizọs kwuru banyere ụkpụrụ mbụ Jehova setịpụrụ maka alụmdi na nwunye gosiri na nkwere e kweere ka a na-alụ karịa otu nwanyị bụ ruo nwa oge, kamakwa ihe Pọl onyeozi dere n’ike mmụọ nsọ Chineke gosikwara nke a. O kwuru, sị: “Ka nwoke ọ bụla nwee nwunye nke ya, ka nwanyị ọ bụla nweekwa di nke ya.” (1 Ndị Kọrint 7:2) E nyekwara Pọl ike mmụọ nsọ ide na nwoke ọ bụla a họpụtara ịbụ onye nlekọta ma ọ bụ ohu na-eje ozi n’ọgbakọ Ndị Kraịst aghaghị ịbụ “di nke otu nwunye.”—1 Timoti 3:2, 12; Taịtọs 1:6.

Ya mere, nkwere Jehova kweere ka a na-alụ karịa otu nwanyị bịara ná njedebe mgbe e guzobere ọgbakọ Ndị Kraịst ihe dị ka afọ 2,000 gara aga. N’oge ahụ, a maliteghachiri ịgbaso ụkpụrụ e setịpụrụ maka alụmdi na nwunye dị ka ọ dị ná mmalite mgbe Chineke kere nwoke na nwanyị: otu di, otu nwunye. Ọ bụkwa ụkpụrụ ndị Chineke na-agbaso taa n’ụwa dum.—Mak 10:11, 12; 1 Ndị Kọrint 6:9, 10.