Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova, Chineke Nke Eziokwu

Jehova, Chineke Nke Eziokwu

Jehova, Chineke Nke Eziokwu

“Ị gbapụtawo m, Jehova, Chineke nke eziokwu.”—ABỤ ỌMA 31:5.

1. Olee ọnọdụ e nwere n’eluigwe na n’ụwa n’oge ụgha na-adịghị?

E NWERE oge ụgha na-adịghị. Ndị bi n’eluigwe a na-adịghị ahụ anya bụ ndị mmụọ e kere eke zuru okè, bụ́ ndị na-ejere Onye Okike ha, bụ́ “Chineke nke eziokwu,” ozi. (Abụ Ọma 31:5) Ụgha adịghị, aghụghọ adịghị. Jehova gwara ụmụ ndị ikom ya bụ́ mmụọ eziokwu. O mere otú ahụ n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya nakwa n’ihi na o nwere mmasị dị ukwuu n’ọdịmma ha. Otú ahụkwa ka ọ dị n’ụwa. Jehova kere nwoke na nwanyị mbụ, o sikwa n’ọnụ ndị ọ họpụtara na-agwa ha okwu mgbe nile n’ụzọ doro anya, n’ụzọ kwụ ọtọ, na n’ụzọ eziokwu. Lee ka nke ahụ na-aghaghị isiwo magbuo onwe ya!

2. Ònye mere ka ụgha dịrị, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

2 Otú ọ dị, ka e mesịrị, otu nwa Chineke bụ́ mmụọ ji ịwa anya malite ime onwe ya chi, na-eguzogide Jehova. Mmụọ a e kere eke, bụ́ onye a bịara mara dị ka Setan bụ́ Ekwensu, chọrọ ka ndị ọzọ fewe ya ofufe. Iji nweta ihe ọ na-achọ, o ji ụgha mee ihe iji nwee ike ime ka ndị ọzọ nọrọ n’okpuru ya. Site n’ime otú ahụ, ọ ghọrọ ma ‘onye ụgha ma nna nke ụgha.’—Jọn 8:44.

3. Olee otú Adam na Iv si meghachi omume n’ụgha Setan ghaara ha, gịnị sikwa na ya pụta?

3 Setan si n’ọnụ agwọ gwa nwanyị mbụ ahụ, bụ́ Iv, na ọ bụrụ na o leghara iwu Chineke anya ma rie mkpụrụ osisi ahụ a machibidoro iwu, ọ gaghị anwụ. Nke ahụ bụ ụgha. Ọ gara n’ihu ịgwa ya na site n’iri mkpụrụ osisi ahụ, ọ ga-adị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ. Nke ahụ bụkwa ụgha. Ọ bụ ezie na a ghatụbeghịrị Iv ụgha mbụ, ọ ghaghị ịghọtawo na ihe ọ nụrụ n’ọnụ agwọ ahụ dị iche n’ihe Chineke gwara di ya, bụ́ Adam. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ họọrọ ikwere ihe Setan kwuru, ọ bụghị ihe Jehova kwuru. N’ịbụ onye a ghọgbunyụrụ anya, o weere mkpụrụ osisi ahụ rie. Mgbe e mesịrị, Adam rikwara mkpụrụ osisi ahụ. (Jenesis 3:1-6) Dị ka Iv, a ghatụbeghịrị Adam ụgha, ma a ghọgbughị ya. (1 Timoti 2:14) O gosiri site n’omume ya na ya jụrụ Onye Mere ya. Nke a kpataara ihe a kpọrọ mmadụ ọdachi. N’ihi nnupụisi Adam, mmehie na ọnwụ—tinyere mmerụ na oké nhụjuanya—ruru ụmụ ya nile aka.—Ndị Rom 5:12.

4. (a) Olee ụgha a ghara n’Iden? (b) Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji ghara ịbụ ndị Setan ga-eduhie?

4 Ụgha gbasakwara. Anyị aghaghị ịghọta na ụgha ndị ahụ a ghara n’ogige Iden bụ ịma Jehova n’onwe ya aka na ọ bụghị onye eziokwu. Setan kwuru na Chineke ji aghụghọ na-anapụ mmadụ abụọ mbụ ahụ ezi ihe. N’ezie, nke ahụ abụghị eziokwu. Adam na Iv eriteghị uru ná nnupụisi ha. Ha nwụrụ, dị nnọọ ka Jehova kwuru na ha ga-anwụ. Ka o sina dị, Setan nọgidere na-ekwutọ Jehova, ruo n’ókè nke na ọtụtụ narị afọ mgbe e mesịrị, e nyere Jọn onyeozi ike mmụọ nsọ ide na Setan “na-eduhie ụwa dum mmadụ bi.” (Mkpughe 12:9) Iji zere ịbụ ndị Setan bụ́ Ekwensu ga-eduhie, anyị aghaghị inwe obi ike zuru ezu na Jehova bụ onye eziokwu nakwa na Okwu ya bụ eziokwu. Olee otú ị pụrụ isi zụlite ma mee ka ntụkwasị obi i nwere n’ebe Jehova nọ sikwuo ike na otú ị pụrụ isi wusie onwe gị ike iji guzogide aghụghọ na ụgha ndị Onye Iro ya na-akwalite?

Jehova Maara Eziokwu

5, 6. (a) Olee ihe ọmụma Jehova nwere? (b) Olee otú ihe ọmụma ụmụ mmadụ hà ma e jiri ya tụnyere nke Jehova?

5 Bible na-akọwa Jehova mgbe nile dị ka onye “kere ihe nile.” (Ndị Efesọs 3:9) Ọ bụ “Onye mere eluigwe na ụwa na oké osimiri na ihe nile dị n’ime ha.” (Ọrụ 4:24) Ebe Jehova bụ Onye Okike, ọ maara ihe bụ́ eziokwu banyere ihe nile. Iji maa atụ: Tụlee ihe banyere nwoke nke tụrụ ụkpụrụ ụlọ ya ma jiri aka ya wuo ya. Ọ ga-ama otú ụlọ ahụ dị site n’isi ruo n’ọdụ, ọ ga-akakwa onye ọ bụla na-ekiri ụlọ ahụ ghọta otú ọ dị. Ndị mmadụ na-ama banyere ihe ndị ha ji aka ha chepụta ma rụọ. N’ụzọ yiri nke ahụ, Onye Okike maara ihe nile banyere ihe ndị o kere eke.

6 Aịzaịa onye amụma kwuru n’ụzọ magburu onwe ya ókè ihe ọmụma Jehova haruru. Anyị na-agụ, sị: “Ònye tụworo mmiri nile n’ọbụ aka Ya, were ntụaka tụpụta eluigwe, nagidezuo ájá nke ụwa na mgbé, sie ugwu nile n’ihe òsìsì, tụọ ugwu nta nile n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀? Ònye tụpụtaworo mmụọ nke Jehova, ma ọ bụ, dị ka onye ndụmọdụ Ya, na-eme ka Ọ mara ihe? Ya na ònye gbara izu? ònye mere ka Ọ ghọta ihe? ònye ziri Ya ihe n’okporo ụzọ ikpe, ziekwa Ya ihe ọmụma, meekwa ka Ọ mara ụzọ nghọta?” (Aịsaịa 40:12-14) N’ezie, Jehova bụ “Chineke nke ọmụma ihe,” bụrụkwa “Onye zuru okè n’ọmụma ihe.” (1 Samuel 2:3; Job 36:4; 37:16) Lee ka ihe anyị maara si pee mpe ma e jiri ha tụnyere ihe ọ maara! N’agbanyeghị ihe ọmụma dị ukwuu ihe a kpọrọ mmadụ nwetaworo, nghọta anyị nwere banyere ihe okike ndị a na-ahụ anya erughịdị “nsọtụ ụzọ [Chineke] nile.” Ọ dị ka iji “ntakwu okwu” tụnyere “egbe eluigwe nke ịdị ike.”—Job 26:14.

7. Gịnị ka Devid ghọtara banyere ihe ọmụma Jehova, n’ihi ya kwa, gịnị ka anyị na-aghaghị ịghọta?

7 Ebe ọ bụ Jehova kere anyị, ọ pụtara na ọ maara anyị nke ọma. Eze Devid ghọtara nke a. O dere, sị: “Jehova, I gwupụtawo ala obi m, I wee mara m. Gị onwe gị amawo nnọdụ ala m na mbili ọtọ m, Ị na-aghọta echiche m nile site n’ebe dị anya. Okporo ụzọ m na ndina ala m ka Ị fụchaworo dị ka ọka, ọ bụkwa ụzọ m nile ka Ị mawooro nke ọma. N’ihi na ọ dịghị okwu dị n’ire m, ma, lee, Jehova, Ị machasịwo ya.” (Abụ Ọma 139:1-4) N’ezie, Devid ghọtara na ụmụ mmadụ nweere onwe ha ime nhọrọ—Chineke enyewo anyị ikike irubere ya isi ma ọ bụ inupụrụ ya isi. (Deuterọnọmi 30:19, 20; Joshua 24:15) Otú o sina dị, Jehova maara anyị nnọọ nke ọma karịa ka anyị maara onwe anyị. Ọ chọrọ ọdịmma anyị, o nwekwara ikike nke iduzi ụzọ anyị. (Jeremaịa 10:23) N’ezie, ọ dịghị onye nkụzi, onye ọkachamara, onye ndụmọdụ ka Jehova mara ịkụziri anyị eziokwu na ime ka anyị nwee amamihe ma na-enwe obi ụtọ.

Jehova Bụ Onye Eziokwu

8. Olee otú anyị si mara na Jehova bụ onye eziokwu?

8 Ọ bụ otu ihe ịmara eziokwu ahụ, ma, ọ bụ nnọọ ihe ọzọ ịdị na-ekwu eziokwu, ịbụ onye eziokwu, mgbe nile. Dị ka ihe atụ, Ekwensu họọrọ ịghara ‘iguzosi ike n’eziokwu.’ (Jọn 8:44) N’ụzọ dị iche, Jehova ‘na-aba ụba n’eziokwu.’ (Ọpụpụ 34:6) Akwụkwọ Nsọ na-agba akaebe mgbe nile na Jehova bụ onye eziokwu. Pọl onyeozi kwuru na “ọ [gaghị] ekwe Chineke omume ịgha ụgha” nakwa na Chineke “[apụghị] ịgha ụgha.” (Ndị Hibru 6:18; Taịtọs 1:2) Eziokwu bụ akụkụ dị mkpa nke àgwà Chineke. Anyị pụrụ ịdabere n’ebe Jehova nọ ma tụkwasị ya obi n’ihi na ọ bụ onye eziokwu; ọ dịtụghị aghọgbu ndị na-eguzosi ike n’ihe nye ya.

9. Olee otú aha Jehova na eziokwu si nwee njikọ?

9 Aha Jehova kpọmkwem na-agba akaebe na ọ bụ onye eziokwu. Aha Chineke pụtara “Ọ Na-eme Ka Ọ Ghọọ.” Nke a na-eme ka a mara Jehova dị ka onye na-eji nke nta nke nta aghọ Onye Mmezu nke ihe nile o kwere ná nkwa. Ọ dịghị onye ọzọ pụrụ ime otú ahụ. Ebe ọ bụ na Jehova bụ Onye Kasị Elu, ọ dịghị ihe pụrụ igbochi ya imezu nzube ya. Ọ bụghị nanị na Jehova bụ onye eziokwu kama ọ bụ nanị ya nwere ike na amamihe ime ihe nile o kwuru.

10. (a) Olee otú Jọshụa si hụ na Jehova bụ onye eziokwu? (b) Olee nkwa Jehova kwere nke ị hụrụla ka o mezuru?

10 Jọshụa so n’ime ọtụtụ ndị hụrụ ihe omume ndị dị ịrịba ama bụ́ ndị gbara akaebe na Jehova bụ onye eziokwu. Jọshụa nọ n’Ijipt mgbe Jehova tiri mba ahụ ihe otiti iri, na-ekwu banyere nke ọ bụla tupu ya emee ya. Tinyere ihe ndị ọzọ, Jọshụa hụrụ mmezu nke nkwa Jehova kwere ịnapụta ụmụ Izrel n’Ijipt na iduru ha banye n’Ala Nkwa ahụ, na-emeri usuu ndị agha dị ike nke Kenan bụ́ ndị megidere ha. Ka ọ na-eru n’ọgwụgwụ nke ndụ ya, Jọshụa gwara ndị okenye nke mba Izrel, sị: “Unu amawo n’obi unu nile na n’ime mkpụrụ obi unu nile, na ọ dịghị otu ihe dapụrụ n’ezi ihe nile nke Jehova, bụ́ Chineke unu, kwuru banyere unu; ha nile emeworo unu, ọ dịghị otu ihe dapụrụ n’ime ya.” (Joshua 23:14) Ọ bụ ezie na ị hụghị ọrụ ebube ndị ahụ Jọshụa hụrụ, ị̀ hụwo mmezu nke nkwa Chineke n’oge ndụ gị?

Jehova Na-ekpughe Eziokwu

11. Gịnị na-egosi na Jehova na-enwe mmasị ịgwa ihe a kpọrọ mmadụ eziokwu?

11 Cheedị banyere nne ma ọ bụ nna nke nwere ihe ọmụma dị ukwuu ma bụrụ onye na-adịghị agwakebe ụmụ ya okwu. Í nweghị obi ekele na Jehova adịghị otú ahụ? Jehova ji ịhụnanya agwa ihe a kpọrọ mmadụ okwu, ọ na-emekwa ya mgbe nile. Akwụkwọ Nsọ na-akpọ ya “Onye Nkụzi Ukwu.” (Aịsaịa 30:20, NW) Ọ na-eji obiọma sitere n’ịhụnanya ya agwa ọbụna ndị na-enweghị mmasị ige ya ntị okwu. Dị ka ihe atụ, e nyere Izikiel ọrụ ime nkwusa nye ndị Jehova maara na ha agaghị anabata ozi ya. Jehova kwuru, sị: “Nwa nke mmadụ, jee, baa n’ụlọ [Izrel], were okwu m nile gwa ha.” Ya adọzie ya aka ná ntị, sị: “[Ha] agaghị ekwe ige gị ntị; n’ihi na ha adịghị ekwe ige m ntị: n’ihi na ụlọ [Izrel] nile bụ ndị nwere egedege ihu siri ike, ọ bụkwa ndị obi ha siri ike ka ha bụ.” Nke ahụ bụ ọrụ siri ike, ma Izikiel ji ikwesị ntụkwasị obi rụzuo ya, sitekwa n’ime otú ahụ, o gosipụtara ọmịiko Jehova. Ọ bụrụ na ị na-arụ ọrụ nkwusa tara akpụ ma dabere n’ebe Chineke nọ, obi pụrụ isi gị ike na ọ ga-ewusikwu gị ike dị nnọọ ka o wusiri Izikiel onye amụma.—Ezikiel 3:4, 7-9.

12, 13. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Chineke siworo gwa ụmụ mmadụ okwu?

12 Jehova na-achọ ka “a zọpụta ụdị mmadụ nile na ka ha bịaruo ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Timoti 2:4) O siwo n’ọnụ ndị amụma, ndị mmụọ ozi, na ọbụna Ọkpara ọ hụrụ n’anya, bụ́ Jizọs Kraịst, kwuo okwu. (Ndị Hibru 1:1, 2; 2:2) Jizọs gwara Paịlet, sị: “Ọ bụ n’ihi nke a ka e jiworo mụọ m, ọ bụkwa n’ihi nke a ka m jiworo bịa n’ụwa, ka m wee gbaara eziokwu àmà. Onye ọ bụla nke dịnyeere eziokwu na-ege ntị n’olu m.” Paịlet nwere ohere magburu onwe ya ịmụta eziokwu banyere ndokwa Jehova mere maka nzọpụta site n’ọnụ Ọkpara Chineke kpọmkwem. Otú ọ dị, Paịlet adịnyeghịrị eziokwu ahụ, ọ chọghịkwa ịmụta ihe n’aka Jizọs. Kama nke ahụ, Paịlet ji nlelị zaghachi, sị: “Gịnị bụ eziokwu?” (Jọn 18:37, 38) Lee ihe dị mwute nke ahụ bụụrụ ya! Ma, ọtụtụ ndị gere ntị n’eziokwu Jizọs kpọsara. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Obi ụtọ na-adịrị anya unu n’ihi na ha na-ahụ ụzọ, nakwa ntị unu n’ihi na ha na-anụ ihe.”—Matiu 13:16.

13 Jehova echekwawo eziokwu ahụ n’ime Bible, o mewokwa ka o ruo ndị nọ n’ebe nile aka. Bible na-ekpughe ihe otú ha dị n’ezie. Ọ na-akọwa àgwà, nzube, na iwu Chineke, nakwa ọnọdụ ihe a kpọrọ mmadụ nọ na ya n’ezie. Jizọs gwara Jehova n’ekpere, sị: “Okwu gị bụ eziokwu.” (Jọn 17:17) N’ihi nke a, Bible bụ akwụkwọ pụrụ iche. Ọ bụ nanị ya ka e dere n’ike mmụọ nsọ nke Chineke nke maara ihe nile. (2 Timoti 3:16) Ọ bụ onyinye dị oké ọnụ ahịa e nyere ihe a kpọrọ mmadụ, nke ndị ohu Chineke ji akpọrọ ihe. Anyị ga-abụ ndị maara ihe ịdị na-agụ ya kwa ụbọchị.

Na-ejidesi Eziokwu ahụ Ike

14. Olee ihe ụfọdụ Jehova kwuru na ya ga-eme, n’ihi gịnịkwa ka anyị ji kwesị ikwere ya?

14 Anyị kwesịrị iji ihe Jehova gwara anyị n’Okwu ya kpọrọ ihe. Ọ bụ ihe ọ sịrị na ya bụ, ọ ga-emekwa ihe ọ sịrị na ya ga-eme. Anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji tụkwasị Chineke obi. Anyị pụrụ ikwere ya mgbe Jehova na-asị na ya ga-eweta “ịbọ ọbọ n’isi ndị na-amaghị Chineke na ndị na-adịghị erube isi n’ozi ọma banyere Onyenwe anyị Jizọs.” (2 Ndị Tesalonaịka 1:8) Anyị pụkwara ikwere ihe Jehova kwuru mgbe ọ na-asị na ya hụrụ ndị na-agbaso ezi omume n’anya, mgbe ọ na-asị na ya ga-enye ndị na-egosipụta okwukwe ndụ ebighị ebi, na mgbe ọ na-asị na ya ga-eme ka ihe mgbu, ịkwa ákwá, na ọbụna ọnwụ kwụsị. Jehova mesiri ike otú nkwa ikpeazụ a si bụrụ ihe a pụrụ ịdabere na ya site n’inye Jọn onyeozi ntụziaka a, sị: “Dee ha, n’ihi na okwu ndị a kwesịrị ntụkwasị obi ma bụrụ eziokwu.”—Mkpughe 21:4, 5; Ilu 15:9; Jọn 3:36.

15. Olee ụfọdụ n’ime ụgha ndị Setan na-akwalite?

15 Setan na Jehova dị nnọọ iche. Kama ime ka ndị mmadụ mara ihe, Setan na-eduhie ha. Iji mezuo nzube ya nke ime ka ndị mmadụ gbakụta ofufe dị ọcha azụ, Setan na-akwalite ụgha n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu. Dị ka ihe atụ, Setan ga-achọ ka anyị kwere na nhụjuanya a na-enwe n’ụwa adịghị emetụ Chineke n’obi nakwa na ọ chọghị ịma banyere ya. Ma, Bible na-egosi na Jehova na-eche banyere ihe ndị o kere eke n’ụzọ miri emi ma na-enwe mwute banyere ajọ omume na nhụjuanya. (Ọrụ 17:24-30) Setan na-achọkwa ka ndị mmadụ kwere na ịchụso ihe ime mmụọ bụ igbu oge. N’ụzọ dị iche, Akwụkwọ Nsọ na-emesi anyị obi ike na “Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya.” Ọzọkwa, Akwụkwọ Nsọ kwuru n’ụzọ doro anya na “ọ bụ onye na-akwụghachi ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.”—Ndị Hibru 6:10; 11:6.

16. N’ihi gịnị ka Ndị Kraịst na-aghaghị iji nọgide na-amụ anya ma na-ejidesi eziokwu ahụ ike?

16 Pọl onyeozi dere banyere Setan, sị: “Chi nke usoro ihe a [emewo] ka uche ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì, ka ìhè nke ozi ọma ahụ dị ebube banyere Kraịst ahụ, onye bụ́ onyinyo Chineke, wee ghara inwupụta.” (2 Ndị Kọrint 4:4) Dị ka Iv, ụfọdụ mmadụ na-abụ ndị Setan bụ́ Ekwensu ghọgbunyụrụ anya. Ndị ọzọ na-agbaso omume Adam, bụ́ onye a na-aghọgbughị kama ọ ma ụma họrọ inupụ isi. (Jud 5, 11) N’ihi ya, ọ dị oké mkpa ka Ndị Kraịst nọgide na-amụ anya ma na-ejidesi eziokwu ahụ ike.

Jehova Na-achọ ‘Okwukwe Na-enweghị Ihu Abụọ’

17. Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji nweta ihu ọma Jehova?

17 Ebe ọ bụ na Jehova bụ onye eziokwu n’ụzọ ya nile, ọ na-atụ anya ka ndị na-efe ya ofufe bụrụkwa ndị eziokwu. Ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Jehova, ònye ga-anọ dị ka ọbịa n’ụlọikwuu Gị? Ònye ga-ebi n’ugwu nsọ Gị? Onye na-eje ije n’izu okè, nke na-arụkwa ọrụ ezi omume, nke na-ekwukwa eziokwu n’obi ya.” (Abụ Ọma 15:1, 2) Nye ndị Juu bụrụ abụ ahụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na okwu ahụ bụ́ ugwu nsọ Jehova na-echetara ha Ugwu Zaịọn, bụ́ ebe Eze Devid bubatara ikpe ọgbụgba ndụ ahụ n’ụlọikwuu o wuru ebe ahụ. (2 Samuel 6:12, 17) Ugwu ahụ na ụlọikwuu ahụ na-eme ka e cheta ebe Jehova biri n’ụzọ ihe atụ. N’ebe ahụ, ndị mmadụ pụrụ ịgakwuru Chineke iji rịọ maka ihu ọma ya.

18. (a) Gịnị ka iso Chineke bụrụ enyi na-achọ n’aka anyị? (b) Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

18 Onye ọ bụla nke chọrọ iso Jehova bụrụ enyi aghaghị ịdị na-ekwu eziokwu “n’obi ya,” ọ bụghị nanị n’egbugbere ọnụ ya. Ezi ndị enyi Chineke aghaghị ịbụ ndị nwere obi eziokwu, ha aghaghịkwa inye ihe àmà na-egosi na ha nwere ‘okwukwe na-enweghị ihu abụọ,’ n’ihi na ime ihe n’eziokwu na-esite n’obi. (1 Timoti 1:5; Matiu 12:34, 35) Enyi Chineke anaghị abụ onye aghụghọ ma ọ bụ onye nduhie, n’ihi na “onye aghụghọ, Jehova na-akpọ ya onye arụ.” (Abụ Ọma 5:6) Ndịàmà Jehova n’ụwa nile na-agbasi mbọ ike ịbụ ndị eziokwu iji bụrụ ndị na-eṅomi Chineke ha. Isiokwu na-esonụ ga-atụle isi ihe a.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• N’ihi gịnị ka Jehova ji mara ihe bụ́ eziokwu banyere ihe nile?

• Gịnị na-egosi na Jehova bụ onye eziokwu?

• Olee otú Jehova siworo kpughee eziokwu?

• N’ihe banyere eziokwu, gịnị ka a chọrọ anyị n’aka?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Chineke nke eziokwu maara ihe nile banyere ihe ndị o kere eke

[Foto ndị dị na peeji nke 12, 13]

Nkwa Jehova ga-emezucha