Obi Ụtọ Na-adịrị Onye ahụ nke Jehova Bụ Chineke Ya
Akụkọ Ndụ
Obi Ụtọ Na-adịrị Onye ahụ nke Jehova Bụ Chineke Ya
DỊ KA TOM DIDUR SI KỌỌ
A gbazitelarị otu ụlọ ezumezu dị n’ógbè a. A tụrụ anya na ihe dị ka mmadụ 300 ga-abịa mgbakọ a ga-enwe n’obodo Porcupine Plain, dị na Saskatchewan, Canada. Na Wednesday, snow malitere ịda, ka ọ na-erule Friday, snow nọgidere na-adasi ike nke na ọ dịghị ekwe ka a hụ ihe ọ bụla. Ọ̀tụ̀tụ̀ ịjụ oyi mụbara ruo minus 40 degrees Celsius. Mmadụ 28 bịara, gụnyere ụmụaka ole na ole. Nke a bụ mgbakọ mbụ m duziri dị ka onye nlekọta sekit ọhụrụ, adịkwa m afọ 25 ma bụrụ onye ahụ́ na-erughị ala. Tupu mụ agwa gị ihe merenụ, ka m buru ụzọ kọọrọ gị otu m si malite ịnụ ụtọ ihe ùgwù ije ozi a pụrụ iche.
ABỤ M nke asaa n’ime ụmụ asatọ nne m mụrụ, anyị nile bụcha ụmụ nwoke. Bill bụ ọkpara, Metro, John, Fred, Mike, na Alex na-esote ya. A mụrụ m na 1925, Wally bụkwa nke ikpeazụ. Anyị bi n’obodo dị Ukraina nso, nke dị na Manitoba, bụ́ ebe ndị mụrụ m bụ́ Michael na Anna Didur nwere otu obere ugbo. Nna m rụrụ ọrụ dị ka onye na-edozi ụzọ ụgbọ okporo ígwè. Ebe ọ bụ na obere ụlọ ndị nọ n’ụzọ okporo ígwè dịpụrụ adịpụ abụghị ebe kwesịrị ekwesị ịnọ zụlite nnukwu ezinụlọ, anyị gara biri n’ugbo anyị. Papa m anaghị anọ n’ụlọ mgbe nile, n’ihi ya ọ dị n’ubu mama m ịzụlite anyị. Site n’oge ruo n’oge, ọ na-ahapụ anyị ma gakwuru papa m ma nọọ otu izu ma ọ bụ karịa, ma ọ hụrụ na anyị mụtara otú e si esi nri, eme bred, na otú e si arụ ọrụ ndị dị n’ụlọ. Ebe ọ bụkwa na anyị bụ ndị Chọọchị Katọlik Gris, ụfọdụ n’ime ọzụzụ mama m nyere anyị mgbe anyị bụ ụmụaka gụnyere ibu ekpere n’isi na ime ememe okpukpe ndị ọzọ.
Ịnata Eziokwu Bible
A kpaliri ọchịchọ m ịghọta Bible n’oge m bụ nwa okorobịa. Onye agbata obi anyị, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova, na-eleta ezinụlọ anyị mgbe nile iji gụọrọ anyị akụkụ Bible ndị metụtara Alaeze Chineke, Amagedọn, na ngọzi ndị a ga-enweta n’ime ụwa ọhụrụ. Mama m enwetụghị mmasị n’ihe ọ na-ekwu, ma ozi ahụ masịrị Mike na Alex. N’ezie, ihe ha mụtara mere ka ha jụ ije agha n’ihi akọ na uche ha n’oge Agha Ụwa nke Abụọ. Ka e mesịrị, a tụrụ Mike mkpọrọ ruo nwa oge, ebe a kpọgara Alex n’ogige ọrụ mmanye n’Ontario. Ka oge na-aga, Fred na Wally nakwerekwaara eziokwu ahụ. Otú ọ dị, ụmụnne m atọ ndị tọchara anyị anakwereghị ya. Ruo ọtụtụ afọ, nne m megidere eziokwu ahụ ma mesịa mee ihe tụrụ anyị nile n’anya site n’iwere nguzo ya n’akụkụ Jehova. E mere ya baptizim mgbe ọ dị afọ 83. Mama m dị afọ 96 mgbe ọ nwụrụ. Papa m nwekwara mmasị n’eziokwu ahụ tupu ya anwụọ.
Mgbe m dị afọ 17, agara m ịchọ ọrụ na Winnipeg na isoro ndị ga-enyere m aka ịmụ Bible na-akpakọ. A machibidoro Ndịàmà Jehova iwu n’oge ahụ, ma a na-enwechi nzukọ anya. Nzukọ mbụ m gara bụ n’ụlọ mmadụ. Ebe ọ bụ na a zụlitere m n’okpukpe Katọlik Gris, ihe ndị mbụ m nụrụ dara m ka ihe ọhụrụ ná ntị. Otú ọ dị, nke nta nke nta, abịara m ghọta ihe mere Akwụkwọ Nsọ ji ghara ịkwado usoro ndị ụkọchukwu na ndị aghasa, nakwa ihe mere na Chineke akwadoghị omume nke ndị ụkọchukwu nke ịgọzi ndị agha. (Aịsaịa 2:4; Matiu 23:8-10; Ndị Rom 12:17, 18) Ibi ndụ n’ime Paradaịs n’elu ala yiri nnọọ ihe ga-ekwe omume na ihe ezi uche dị na ya karịa ịga ebe dị anya iji bie ndụ ebighị ebi.
Ebe e meworo ka m kwenye na nke a bụ eziokwu ahụ, araara m onwe m nye Jehova, e meekwa m baptizim n’afọ 1942 na Winnipeg. Na 1943, e wepụrụ iwu ahụ a machibidoro Ndịàmà Jehova, ọrụ nkwusa ahụ birikwaara ọkụ. Eziokwu Bible nọkwa na-enwe mmetụta miri emi n’obi m. Enwere m ihe ùgwù nke ije ozi dị ka ohu ọgbakọ nakwa ikere òkè n’ịkpọsa okwu ihu ọha na ije ozi n’ókèala a na-eketaghị ọrụ na ya. Ịga mgbakọ ukwu ndị e nwere na United States sokwa mee ka m too etoo n’ụzọ ime mmụọ.
Ịmụba Ozi M Na-ejere Jehova
Na 1950, edebara m aha m dị ka onye ozi ọsụ ụzọ, na December nke afọ ahụkwa, a kpọrọ m ije ozi dị ka onye nlekọta sekit. Enwere m ihe ùgwù nke ịnata ọzụzụ na nso Toronto n’aka Charlie Hepworth, bụ́ nwanna nwoke nweworo ahụmahụ ma na-eguzosi ike n’ihe. Enwekwara m ọṅụ nke isoro nwanne m nwoke bụ́ Alex, bụ́ onye nọworo na-eje ozi dị ka onye nlekọta sekit na Winnipeg, jekọọ ozi n’izu ikpeazụ nke ọzụzụ m.
Mgbakọ sekit mbụ m, dị ka m kọwara ná mmalite, adịghị apụ m apụ n’obi. Dị ka ọ na-adị, enwere m nchegbu banyere ihe ga-esi na ya pụta. Otú ọ dị, onye nlekọta distrikti anyị, bụ́ Nwanna Jack Nathan, mere ka anyị nile jide ọrụ n’aka ma nwee obi ụtọ. Anyị sooro ndị bịaranụ chịkọta usoro ihe omume nke mgbakọ ahụ. Anyị keere òkè n’ịkọ ahụmahụ, mụgharịa ụzọ iche ozi ọma n’ihu mmadụ n’ọrụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ, mụgharịa otú e si eme nletaghachi, ma mee ihe ngosi nke otú a pụrụ isi duzie ọmụmụ Bible ebe obibi. Anyị bụrụ ọtụtụ abụ Alaeze. E nwere ihe oriri n’ụba. Anyị ṅụrụ kọfị, taakwa achịcha e tinyere anụ n’ime ya ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ awa abụọ ọ bụla. Ụfọdụ rahụrụ n’elu bench na n’elu ikpo okwu, ebe ndị ọzọ rahụrụ n’ala ụlọ. Na Sunday, snow kwụsịtụrụ ịda nke mere ka anyị nwee mmadụ 96 ndị bịara maka okwu ihu ọha. Ahụmahụ ahụ kuziiri m otú e si anagide ọnọdụ ndị siri ike.
Ebe ọzọ m rụrụ ọrụ sekit bụ n’ebe ugwu Alberta, dị na British Columbia, nakwa na Yukon Territory, bụ́ obodo nke anyanwụ ime abalị. Ime
njem n’Okporo Ụzọ Awara Awara Alaska nke jupụtara na nkume site na Dawson Creek, British Columbia ruo Whitehorse, Yukon (nke ịdị anya ya dị kilomita 1,477), na ịgba àmà n’okporo ụzọ ahụ chọrọ ntachi obi na nlezianya. Snow na-eju ebe nile, mkpọda ugwu na-amị amị na ahụchaghị ụzọ nke ọma n’ihi snow ahụ na-adanụ na-abụ ihe ịma aka siri ike.O juru m anya ịhụ otú eziokwu ahụ si baruo n’Ime Ime Ebe Ugwu. N’otu oge, mụ na Walter Lewkowicz gara n’otu obere ụlọ nke dị nso ógbè Lower Post, British Columbia, nke dị n’Okporo Ụzọ Awara Awara Alaska na nso Yukon Territory. Anyị maara na mmadụ bi n’ụlọ ahụ n’ihi na anyị hụrụ ìhè ọkụ site n’obere windo. Ọ bụ ihe dị ka elekere itoolu nke abalị, anyị wee kụọ aka n’ụzọ. Anyị nụrụ ka otu nwoke sịrị anyị bata, anyị wee banye. Lee ihe ịtụnanya ọ bụ ịhụ otu agadi nwoke nke dina n’elu ihe ndina ya, na-agụ magazin Ụlọ Nche! N’ezie, o nwere mbipụta dị ọhụrụ karịa nke anyị na-enyefe. O kwuru na ya na-enweta akwụkwọ ozi ya site n’ụgbọelu. Ebe ọ bụ na ka ọ dị mgbe ahụ, ọ karịwo ụbọchị asatọ anyị na-eletabeghị ọgbakọ ọ bụla, anyị enwetabeghị magazin ndị kasị ọhụrụ. Nwoke ahụ sịrị na aha ya bụ Fred Berg, ọ bụrịị ezie na ọ nọwo na atụ ụtụ magazin ruo ọtụtụ afọ, nke a bụ mbụ Ndịàmà Jehova na-abịa na nke ya. Fred mere ka anyị rahụ n’ụlọ ya n’abalị ahụ. Anyị sooro ya kerịta ọtụtụ eziokwu ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ, ma mee ndokwa ka Ndịàmà ọzọ na-agafe ebe ahụ mgbe nile na-abịa eleta ya.
Ruo ọtụtụ afọ, eletara m obere sekit atọ. Ha dị site na Grande Prairie, Alberta, nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ ruo Kodiak, Alaska, nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ, bụ́ ihe karịrị kilomita 3,500 n’ogologo.
N’ụzọ magburu onwe ya, amụtara m na n’ime ime obodo, nakwa n’ebe ọ bụla ọzọ, obiọma Jehova na-erughịrị mmadụ bụ maka mmadụ nile, nakwa na mmụọ Chineke na-akwali uche na obi nke ndị nwere ezi ọchịchọ obi maka ndụ ebighị ebi. Otu onye n’ime ndị dị otú ahụ bụ Henry Lepine bụ́ onye Dawson City, Yukon, nke a na-akpọzi Dawson. Henry bi n’ógbè dịpụrụ adịpụ. N’ezie, ọ hapụtụbeghị ebe ahụ a na-egwu ọlaedo ruo ihe karịrị
afọ 60. Otú ọ dị, mmụọ Jehova kpaliri nwoke a dị afọ 84 ịga Anchorage maka mgbakọ sekit, bụ́ njem karịrị kilomita 1,600, ọ bụ ezie na ọ gatụbeghị nzukọ ọgbakọ mbụ. Ihe omume ahụ tọrọ ya ụtọ nke ukwuu, o nwekwara oké ọṅụ n’ihi mkpakọrịta ndị o so nwee. Mgbe Henry laghachiri Dawson City, ọ nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi ruo mgbe ọ nwụrụ. Ọtụtụ ndị maara Henry nọ na-eche ihe kpaliri agadi nwoke a ime ogologo njem dị otú ahụ. Ọchịchọ a nke ịmata ihe kpaliri ya mere ka ụfọdụ ndị meworo agadi nakwere eziokwu ahụ. Ya mere, n’ụzọ na-apụtachaghị ìhè, Henry gbara ezi àmà.Jehova Gosiri M Obiọma Na-erughịrị Mmadụ
N’afọ 1955, enwere m obi ụtọ ịnata ọkpụkpọ òkù ịga klas nke 26 nke Watchtower Bible School of Gilead. Ọzụzụ ahụ wusikwuru okwukwe m ike ma nyere m aka ịbịarukwu Jehova nso. Mgbe m gụsịrị akwụkwọ, e zighachiri m ịrụ ọrụ sekit na Canada.
Ruo ihe dị ka otu afọ, ejere m ozi n’ógbè Ontario. E mesịrị zigaghachi m n’Ebe Ugwu ahụ mara mma. M ka pụrụ iji anya nke uche m na-ahụ okporo ụzọ awara awara ndị ahụ ka ha gbara ọdọ mmiri ndị na-egbuke egbuke gburugburu, na ugwu dị elu ndị snow kpuchiri ọnụ ọnụ ha. N’oge okpomọkụ, ndagwurugwu na ala ahịhịa juru na-eyi kapet mara oké mma nke e ji okooko ọhịa ndị tụrụ àgwà mee. Ikuku dị ebe ahụ na-ajụ ahụ́ oyi, mmiri ya na-adịkwa ọcha. Anụ ọhịa bea, anụ ọhịa wolf, anụ moose, anụ ọhịa caribou, na anụ ọhịa ndị ọzọ na-agagharị n’ebe obibi ha n’enweghị onye na-enye ha nsogbu.
Otú ọ dị, Alaska wetaara m ọtụtụ ihe ịma aka—ọ bụghị nanị n’ihi ihu ígwé nke na-agbanwe agbanwe kamakwa n’ihi ịdị oké anya nke ókèala ndị dị na ya. Sekit m gbasara ruo kilomita 3,200 site n’ebe ọwụwa anyanwụ ruo ebe ọdịda anyanwụ. Laa azụ n’oge ahụ, e meghị ndokwa ka ndị nlekọta sekit nwee ụgbọala. Ụmụnna ndị m na-eleta wepụtara onwe ha ịkwọrọ m site n’otu ọgbakọ gaa n’ọzọ. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, ana m arịọ ndị na-anya gwongworo ma ọ bụ ndị na-eme njem nleta ka ha bupụtụ m.
Ebe ihe a nọ mee n’otu oge bụ n’Okporo Ụzọ Awara Awara Alaska nke dị n’agbata Tok Junction, dị n’Alaska, na Mile 1201, ma ọ bụ n’ógbè Scotty Creek. Ọfịs ndị na-ahụ maka ntụbata na mbupụ ngwá ahịa ndị dị n’ebe abụọ ndị a ji ihe dị ka kilomita 160 dị anya site n’ebe ibe ha dị. Agafere m ọfịs ndị na-ahụ maka ntụbata na mbupụ ngwa ahịa nke United States na Tok ma nweta ụgbọala kwọọrọ m gaa ihe dị ka kilomita 50. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ dịghị ụgbọala ọzọ gbafetaranụ, agakwara m ije ruo ihe dị ka awa iri ma garuo ihe karịrị kilomita 40. Ọ bụ nanị mgbe e mesịrị ka m chọpụtara na obere oge ka m gafesịrị ebe ndị na-ahụ maka ntụbata na mbupụ ngwa ahịa na-anọ, ụgbọala nile kwụsịrị ịgba n’okporo ụzọ awara awara ahụ n’ihi snow na-adasi ike na nso ebe ahụ ndị na-ahụ maka ntụbata na mbupụ ngwa ahịa na-anọ. Ka ọ na-erule etiti abalị, ọ̀tụ̀tụ̀ ịjụ oyi mụbara ruo ihe dị ka minus 23 degrees Celsius, ma m ka nọ ebe dị ihe dị ka kilomita 80 site n’ebe m pụrụ ịgbaba. Achọsiri m nnọọ ebe m ga-agbaba ike.
Ka m nọ na-aga ka onye ike gwụrụ, ahụrụ m otu obere ụgbọala a gbahapụrụ n’akụkụ ụzọ, bụ́ nke ọ fọrọ nke nta ka snow kpuchichaa ya. Echere m na ọ bụrụ na m banye n’ime ya ma rahụ n’oche dị na ya, apụrụ m ịlanarị abalị ahụ oké
oyi na-atụ. Ejisiri m ike wepụsịa ọtụtụ snow iji meghee ụzọ ahụ, ma hụ na ọ dịtụghị ihe fọdụrụ n’ime ya ma ọ bụghị nanị ahụ́ ime ụgbọala ahụ. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ahụrụ m otu obere ụlọ ọ na-adịghị onye nọ n’ime ya nke dị n’ebe na-adịchaghị anya ná mgbada nke okporo ụzọ ahụ. Mgbe m dọgagidere ma mesịa banye n’ime ya ma mụnye ọkụ, abịara m nwee ike izurutụ ike ruo awa ole na ole. N’ụtụtụ, ejisiri m ike nweta ụgbọala ruo ebe ọzọ m ga-ebi, bụ́ ebe m nwetara ụfọdụ ihe oriri ndị dị m mkpa, ma mechie ebe m merụrụ ahụ́ ná mkpịsị aka m.Jehova Mere Ka Ọ Na-eto n’Ebe Ugwu
Nleta mbụ m letara Fairbanks gbara m ume nke ukwuu. Anyị nwere ezigbo ọganihu n’ozi anyị, ihe dịkwa ka mmadụ 50 bịara gere okwu ihu ọha na Sunday. Anyị zụkọrọ ná ntakịrị ebe obibi nke ndị ozi ala ọzọ, bụ́ ebe Vernor na Lorraine Davis bi. Ndị mmadụ si na kichin ha, n’ụlọ ihi ụra ha, nakwa na paseeji na-ewepụta isi ha iji nụrụ okwu ihu ọha ahụ. Site ná mmeghachi omume a dị mma, anyị matara na Ụlọ Nzukọ Alaeze ga-eme ka ọrụ nkwusa anyị gbanyekwuo mkpọrọgwụ na Fairbanks. Ya mere site n’enyemaka Jehova, anyị zụtara otu nnukwu ụlọ ụgbọala na-adọkpụ, nke bụbu ebe a nọ agba egwu, ma buga ya n’ala ọzọ kwesịrị ekwesị. Anyị gbapuru mmiri, rụnyekwa ebe ịsa ahụ́ na ihe na-ekpo ụlọ ọkụ. N’ime otu afọ, e nwere Ụlọ Nzukọ Alaeze a na-anọ na ya amụ ihe na Fairbanks. Mgbe a rụnyere ya kichin, a bịara nọrọ n’ụlọ nzukọ ahụ nwee otu mgbakọ distrikti n’afọ 1958, nke mmadụ 330 bịara.
N’oge oyi nke afọ 1960, eji m ụgbọala mee ogologo njem gaa n’isi ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova na New York iji nara ọzụzụ a haziri maka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị nile nọ na United States na Canada iji nyere ha aka imeziwanye nkà ha. Mgbe m nọ n’ebe ahụ, Nwanna Nathan Knorr na ụmụnna nwoke ndị ọzọ nwere ibu ọrụ jụrụ m ma ọ̀ ga-ekwe omume inwe alaka ụlọ ọrụ n’Alaska. Ka ọnwa ole na ole gasịrị, anyị nwere obi ụtọ ịnụ na malite na September 1, 1961, Alaska ga-enwe alaka ụlọ ọrụ nke ya. A gwara nwanna nwoke bụ́ Andrew K. Wanger ka ọ na-elekọta ọrụ a na-arụ n’alaka ahụ. Ya na nwunye ya bụ́ Vera ejewo ozi na Brooklyn ruo afọ 20, ma nwee ahụmahụ n’ọrụ njegharị. Anyị nwere obi ụtọ ná nhiwe e hiwere alaka ụlọ ọrụ n’Alaska n’ihi na o belatara njem nke onye nlekọta sekit na-eme ma mee ka o lekwasị anya ná mkpa ndị ka ukwuu nke ọgbakọ dị iche iche na ókèala ndị dịpụrụ adịpụ.
Oge oyi nke afọ 1962 bụ oge obi ụtọ n’Ebe Ugwu. A raara alaka ụlọ ọrụ Alaska nye, e nwekwara mgbakọ distrikti na Juneau, Alaska. E wuru ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ na Juneau nakwa na Whitehorse, dị na Yukon, e guzobekwara ọtụtụ ìgwè ọhụrụ ndị dịpụrụ adịpụ.
Ịlaghachi Canada
Ruo ọtụtụ afọ, mụ na Margareta Petras, bụ́ onye bi na Canada, anọwo na-ederịta akwụkwọ ozi. Reta, dị ka a na-akpọkarị ya, malitere ịsụ ụzọ na 1947, gụsịa akwụkwọ na Gilead na 1955, ma na-asụ ụzọ n’ebe ọwụwa anyanwụ Canada. Agwara m ya okwu ọlụlụ, o kwetakwara. Anyị lụrụ na Whitehorse na February 1963. Ka ọ na-erule n’oge mgbụsị akwụkwọ nke afọ ahụ, e zigara m ọrụ sekit n’ebe ọdịda anyanwụ Canada, anyị nwekwara ọṅụ nke ije ozi n’ebe ahụ ruo afọ 25 ọzọ.
N’ihi ihe ndị metụtara ahụ́ ike, n’afọ 1988, e zigara anyị ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche na Winnipeg, Manitoba. Nke a gụnyere ilekọta otu Ụlọ Mgbakọ ruo ihe dị ka afọ ise. Ruo ókè o kwere omume, anyị ka na-ekere òkè n’ọrụ na-enye obi ụtọ nke ime ndị na-eso ụzọ. N’ọrụ sekit, anyị maliteere ndị ọzọ ọtụtụ ọmụmụ Bible. Ugbu a, site n’obiọma na-erughịrị mmadụ nke Jehova, anyị na-amalite ha ma nwekwuo obi ụtọ nke ịhụ ndị anyị na-amụrụ ihe ka ha na-enwe ọganihu ruo ná nraranye na baptizim.
Ekwenyesiri m ike na ijere Jehova ozi bụ ụzọ ndụ kasị mma. O nwere nzube ma na-enye afọ ojuju, ọ na-emekwa ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ na-emiwanye emi kwa ụbọchị. Nke a bụ ihe na-eweta ezi obi ụtọ. N’agbanyeghị ọrụ ọchịchị Chineke ọ bụla e nyere anyị, n’agbanyeghịkwa ebe ọ bụla e kenyere anyị ọrụ, anyị kweere ihe ọbụ abụ ahụ kwuru, bụ́ onye sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị Chineke ha bụ Jehova!”—Abụ Ọma 144:15, NW.
[Foto dị na peeji nke 24, 25]
N’ọrụ sekit
[Foto dị na peeji nke 25]
Mgbe m gara ileta Henry Lepine na Dawson City. Anọ m n’aka ekpe
[Foto dị na peeji nke 26]
Ụlọ Nzukọ Alaeze mbụ n’Anchorage
[Foto dị na peeji nke 26]
Mụ na Reta n’afọ 1998