Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Unu Natara n’Efu, Na-enyenụ n’Efu”

“Unu Natara n’Efu, Na-enyenụ n’Efu”

“Unu Natara n’Efu, Na-enyenụ n’Efu”

“UNU natara n’efu, na-enyenụ n’efu.” (Matiu 10:8) Jizọs nyere ndịozi ya ntụziaka ahụ mgbe o zigara ha ikwusa ozi ọma. Ndịozi ahụ hà rubere isi ná ntụziaka a? Ee, ha nọgidekwara na-eme otú ahụ ọbụna mgbe Jizọs hapụsịrị ụwa.

Dị ka ihe atụ, mgbe Saịmọn, onye bụbu onye mgbaasị hụrụ ike nke ọrụ ebube ndịozi bụ́ Pịta na Jọn nwere, o chere ha ego n’ihu ka ha wee nye ya ike ahụ. Ma Pịta baara Saịmọn mba na-asị: “Ka gị na ọlaọcha gị laa n’iyi, n’ihi na i chere na ị pụrụ iji ego nweta onyinye nke Chineke na-enye n’efu.”—Ọrụ 8:18-20.

Pọl onyeozi gosipụtara mmụọ yiri nke Pita. Pọl gaara abụwo ibu arọ n’ụzọ ego nye ụmụnna ya Ndị Kraịst nọ na Kọrint. Otú ọ dị, o ji aka ya rụọ ọrụ iji kwado onwe ya. (Ọrụ 18:1-3) Ya mere, ọ pụrụ iji obi ike kwuo na ya kwusaara ndị Kọrint ozi ọma “n’anaghị ụgwọ ọrụ.”—1 Ndị Kọrint 4:12; 9:18.

Ọ dị mwute ikwu na ọtụtụ ndị na-asị na ha bụ ụmụazụ Kraịst egosibeghị na ha dị njikere otú ahụ ‘inye n’efu.’ N’ezie, ọtụtụ ndị ndú okpukpe nke Krisendọm “na-ezi ihe n’ihi ụgwọ.” (Maịka 3:11) Ọbụna ụfọdụ ndị ndú okpukpe abawo ọgaranya site n’ego ìgwè atụrụ ha na-atụkọta n’ụlọ ụka. Na 1989, a tụrụ otu onye okwuchukwu na United States mkpọrọ afọ 45. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ nọwo “na-egwunara ndị na-akwado ya ọtụtụ nde dollar na wayo ma jiri ụfọdụ n’ime ego ahụ zụọ ụlọ na ụgbọala, gaa ezumike, zụọkwa ọbụna ụlọ nkịta nwere ntụ oyi.”—People’s Daily Graphic, October 7, 1989.

Na Ghana, dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Ghanaian Times nke March 31, 1990, si kwuo, otu ụkọchukwu Roman Katọlik buuru ego a tụkọtara mgbe a na-ekpe ụka ma jiri iwe tụghachiri ya ndị bịara ụka. Akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu na “ihe mere o ji mee otú ahụ bụ na dị ka ndị meworo okenye, a tụrụ anya na ha ekwesịghị iji akwụkwọ ego ndị dị nta wee nye onyinye.” Ọ bụghị ihe ijuanya na ọtụtụ chọọchị na-anwa ọbụna ime ka ndị òtù ha malite inwe anyaukwu site n’ịkwalitesi ike ịgba chaa chaa na atụmatụ ndị ọzọ iji nweta ego.

N’ụzọ dị iche na nke a, Ndịàmà Jehova na-agbalịsi ike iṅomi Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nke oge mbụ. Ha enweghị ndị ụkọchukwu a na-akwụ ụgwọ. Onyeàmà ọ bụla bụ onye ozi e nyere ibu ọrụ nke ikwusara ndị ọzọ ‘ozi ọma nke alaeze.’ (Matiu 24:14) N’ihi ya, ihe karịrị nde isii n’ime ha n’ụwa nile na-ekere òkè n’iwetara ndị mmadụ “mmiri nke ndụ ahụ” n’efu. (Mkpughe 22:17) N’ụzọ dị otú a, ọbụna ndị “na-enweghị ego” pụrụ irite uru n’ozi Bible. (Aịsaịa 55:1) Ọ bụ ezie na e ji onyinye afọ ofufo na-akwado ọrụ ha zuru ụwa ọnụ, ha adịghị arịọ ego ma ọlị. Dị ka ezi ndị ozi Chineke, ha abụghị “ndị na-ere okwu Chineke,” kama ha na-ekwu ‘site n’izi ezi nke obi, ee, dị ka ndị e si n’ebe Chineke nọ zipụ.’—2 Ndị Kọrint 2:17.

Otú ọ dị, gịnị mere Ndịàmà Jehova ji adị njikere inyere ndị ọzọ aka, na-ahụ maka ihe ndị ọ na-efu ha? Gịnị na-akpali ha ime otú ahụ? Inye n’efu ọ̀ pụtara na ha adịtụghị enweta ụgwọ ọrụ ná mgbalị ndị ha na-eme?

Azịza Nye Ihe Ịma Aka Setan

Ọchịchọ ime ihe na-atọ Jehova ụtọ bụ isi ihe na-akpali ezi Ndị Kraịst taa—ọ bụghị ime onwe ha ọgaranya. N’ihi ya, ha na-enwe ike ịzaghachi Setan bụ́ Ekwensu n’aka ọ mara ọtụtụ puku afọ gara aga. Banyere onye ezi omume aha ya bụ Job, Setan mara Jehova aka site n’ịjụ ya, sị: “Ọ̀ bụ n’efu ka Job na-atụ egwu Chineke?” Setan boro ebubo na Job na-ejere Chineke ozi nanị n’ihi na Ọ gbaara ya ogige nke nchebe gburugburu. Setan rụrụ ụka na ọ bụrụ na a napụ Job ihe nile o nwere, na ọ ga-agbakụta Chineke azụ n’ihu ya!—Job 1:7-11.

Iji zaghachị ihe ịma aka a, Chineke nyere Setan ohere ka o lee Job ule, na-asị: “Ihe nile o nwere dị n’aka gị.” (Job 1:12) Gịnị si n’ime ya pụta? Job gosipụtara na Setan bụ onye ụgha. N’agbanyeghị ahụhụ nile dakwasịrị ya, Job guzosiri ike n’ihe. Ọ sịrị: “Ruo mgbe m ga-ekubi ume, agaghị m atụfu iguzosi ike m n’ezi ihe!”—Job 27:5, 6, NW.

Ndị na-efe ezi ofufe taa na-egosipụta àgwà yiri nke Job. Ihe na-akpali ha ijere Chineke ozi abụghị nchegbu maka ihe onwunwe.

Onyinye nke Obiọma Na-erughịrị Mmadụ nke Chineke Nyere n’Efu

Ihe ọzọ mere ezi Ndị Kraịst ji adị njikere ‘inye n’efu’ bụ na ha onwe ha kwa “natara n’efu” n’aka Chineke. Ihe a kpọrọ mmadụ nọ n’agbụ mmehie na ọnwụ n’ihi mmehie nke nna nna anyị bụ́ Adam. (Ndị Rom 5:12) Jehova ji ịhụnanya dokwaa ka Ọkpara ya nwụọ ọnwụ ịchụàjà—ihe furu Chineke oké ihe. N’ezie, ihe a kpọrọ mmadụ erughị eru inweta ya. Ee e, ọ bụ onyinye si n’aka Chineke.—Ndị Rom 4:4; 5:8; 6:23.

Dị ka e dekọrọ ná Ndị Rom 3:23, 24, Pọl gwara Ndị Kraịst e tere mmanụ otú a, sị: “Mmadụ nile emehiewo, gharakwa iru ebube Chineke, ọ bụkwa dị ka onyinye e nyere n’efu ka a na-akpọ ha ndị ezi omume site n’obiọma ya na-erughịrị mmadụ site ná ntọhapụ nke sitere n’ihe mgbapụta ahụ Kraịst Jizọs kwụrụ.” Ndị nwere olileanya ịdị ndụ n’elu ala ruo mgbe ebighị ebi, natakwara “onyinye e nyere n’efu.” Onyinye a na-agụnye ihe ùgwù nke ịbụ ndị a gụrụ ná ndị ezi omume dị ka ndị enyi Jehova.—Jems 2:23; Mkpughe 7:14.

Àjà mgbapụta Kraịst na-emekwa ka o kwe Ndị Kraịst nile omume ije ozi dị ka ndị ozi Chineke. Pọl onyeozi dere, sị: “M ghọrọ onye ozi nke a [ihe nzuzo dị nsọ] dị ka onyinye nke obiọma na-erughịrị mmadụ nke Chineke si dị bụ́ nke e nyere n’efu.” (Ndị Efesọs 3:4-7) N’ịbụ ndị e nyere ozi a site n’onyinye nke ha na-erughị eru inweta, ma ọ bụ nke ha na-apụghị iji aka ha nweta, ezi ndị ozi Chineke apụghị nnọọ ịtụ anya ka a na-akwụ ha ụgwọ ọnwa n’ihi izi ndị ọzọ ozi ọma banyere onyinye a.

Ndụ Ebighị Ebi—Ọ̀ Bụ Ihe Na-akpali Ịchọ Ọdịmma Onwe Onye Nanị?

Nke a ọ̀ pụtaziri na Chineke na-atụ anya ka Ndị Kraịst na-ejere ya ozi n’enweghị olileanya inweta ụgwọ ọrụ? Ee e, n’ihi na Pọl onyeozi gwara ndị kwere ekwe ibe ya, sị: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya, ebe unu jewooro ndị nsọ ozi ma nọgide na-eje ozi.” (Ndị Hibru 6:10) Jehova abụghịkwa onye na-ekpe ikpe na-ezighị ezi. (Deuterọnọmi 32:4) N’ụzọ megidere nke a, Jehova bụ “onye na-akwụghachi ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Ma, ọ̀ bụ na nkwa ịdị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs abụghị ihe na-akpali ịchọ ọdịmma nke onwe onye nanị?—Luk 23:43.

Ọ dịghị ma ọlị. Otu ihe kpatara ya bụ na ọchịchọ ịdị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs n’elu ala sitere n’aka Chineke n’onwe ya. Ọ bụ ya chere di na nwunye mbụ bụ́ mmadụ atụmanya a n’ihu. (Jenesis 1:28; 2:15-17) Mgbe Adam na Iv mere ka ụmụ ha ghara inweta atụmanya ahụ, O mekwara ka o kwe omume inweghachi atụmanya a. N’ihi ya, Chineke na-ekwe nkwa n’ime Okwu ya na “a ga-emekwa ka ihe e kere eke n’onwe ya nwere onwe ya pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure ma nweta nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.” (Ndị Rom 8:21) N’ihi ya, dị ka Mozis oge ochie, o kwesịrị nnọọ ekwesị ka Ndị Kraịst taa ‘legide anya n’ụgwọ ọrụ a ga-akwụ ha.’ (Ndị Hibru 11:26) Chineke anaghị akwụ ụgwọ ọrụ a dị ka ihe iri ngo. Ọ na-akwụ ya n’ihi ezi ịhụnanya o nwere n’ebe ndị na-ejere ya ozi nọ. (2 Ndị Tesalonaịka 2:16, 17) N’imeghachi omume na nke ahụ, “anyị na-ahụ n’anya, n’ihi na o bu ụzọ hụ anyị n’anya.”—1 Jọn 4:19.

Ebumnobi Kwesịrị Ekwesị Iji Na-ejere Chineke Ozi

Otú o sina dị, Ndị Kraịst taa aghaghị ịnọgide na-enyocha ihe ha bu n’obi na-ejere Chineke ozi. Na Jọn 6:10-13, anyị na-agụ na Jizọs ji ụzọ ọrụ ebube nye ìgwè mmadụ karịrị puku ise nri. Mgbe nke ahụ gasịrị, ụfọdụ malitere iso Jizọs n’ihi ọdịmma onwe ha nanị. Jizọs gwara ha, sị: “Unu na-achọgharị m. . . n’ihi na unu riri achịcha ahụ, afọ ewee ju unu.” (Jọn 6:26) Ihe dị ka afọ 30 ka e mesịrị, ụfọdụ Ndị Kraịst raara onwe ha nye jeere Chineke ozi n’otu aka ahụ ma “ọ bụghị n’ebumnobi dị ọcha.” (Ndị Filipaị 1:17) Ụfọdụ ndị ‘na-ekwereghị okwu ndị na-enye ezi ndụ nke Jizọs Kraịst’ chọrọ ọbụna ụzọ ha ga-esi were mkpakọrịta ha na Ndị Kraịst nweta uru nke aka ha.—1 Timoti 6:3-5.

Taa, Onye Kraịst nke na-eje ozi nanị n’ihi na ọ chọrọ ịdị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs pụkwara ịdị na-eje ozi n’ihi ọdịmma onwe onye nanị. N’ikpeazụ, nke a pụrụ ịkpata ọdịda ime mmụọ. N’ihi na usoro ihe Setan yiri ka ọ dịteela aka karị otú a tụrụ anya ya, ọ pụrụ inwe ‘ike ọgwụgwụ,’ na-eche na ọgwụgwụ egbuola oge ịbịa. (Ndị Galeshia 6:9) Ọ pụrụ ọbụna ịmalite iwe iwe n’ihi ihe onwunwe ndị ọ chụworo n’àjà. Jizọs na-echetara anyị, sị: “Ị ghaghị iji obi gị dum, jirikwa mkpụrụ obi gị dum, jirikwa uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” (Matiu 22:37) Ee, onye isi ihe mere o ji ejere Chineke ozi bụ ịhụnanya anaghị ebu oge n’obi eje ozi ya. Ọ na-ekpebisi ike ijere Jehova ozi ruo mgbe ebighị ebi! (Maịka 4:5) Ọ naghị akwa ụta banyere ihe ọ bụla ọ chụworo n’àjà n’ihi ozi ọ na-ejere Chineke. (Ndị Hibru 13:15, 16) Ịhụnanya o nwere n’ebe Chineke nọ na-akpali ya itinye ihe ndị metụtara Chineke n’ọnọdụ mbụ ná ndụ ya.—Matiu 6:33.

Taa, ihe karịrị nde ndị na-efe ezi ofufe isii ‘na-enye onwe ha n’afọ ofufo’ n’ozi Jehova. (Abụ Ọma 110:3) Ị̀ bụ otu n’ime ha? Ọ bụrụ na ị bụghị, mgbe ahụ, tụgharịa uche n’ihe Chineke na-enye: ezi ihe ọmụma nke eziokwu; (Jọn 17:3) nnwere onwe pụọ n’agbụ nke ozizi dị iche iche nke okpukpe ụgha; (Jọn 8:32) olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi. (Mkpughe 21:3, 4) Ndịàmà Jehova pụrụ inyere gị aka ịmụta otú ị pụrụ isi nweta ihe a nile site n’aka Chineke—n’efu.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 22]

Ọchịchọ ime ihe na-atọ Jehova ụtọ bụ isi ihe na-akpali ezi Ndị Kraịst taa—ọ bụghị ime onwe ha ọgaranya

[Foto dị na peeji nke 21]

Onyinye nke ihe mgbapụta ahụ Chineke nyere n’efu na-akpali Ndị Kraịst izi ndị ọzọ ozi ọma ahụ n’efu!