Ị̀ Na-achọsi Jehova Ike?
Ị̀ Na-achọsi Jehova Ike?
OTU nwoke bụ́ Onye Kraịst chọsiri ike iso ndị ya na ha na-eso eme njem n’ụgbọ okporo ígwè kerịta ozi ọma sitere na Bible. (Mak 13:10) Ma, ụjọ jichiri ya. Ọ̀ dara mbà? Ee e, o kpesiri ekpere ike banyere ya ma gbalịa ịmụta otú ọ pụrụ isi malite mkparịta ụka. Jehova Chineke zara arịrịọ nwoke a ma nye ya ume iji gbaa àmà.
Mgbalị siri ike dị otú ahụ dị oké mkpa mgbe anyị na-achọ Jehova na ngọzi ya. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Onye na-abịaru Chineke nso aghaghị ikwere na ọ dị adị, nakwa na ọ bụ onye na-akwụghachi ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Nanị ịchọ Jehova ezughị. Ngwaa Grik nke a sụgharịrị ịbụ “ịchọsi ike” bụ ụdị ngwaa na-enye echiche nke ime ihe n’ụzọ siri ike na itinye mgbalị siri ike. Nke a na-agụnye iji obi, uche, mkpụrụ obi, na ike dum na-eme ihe. Ọ bụrụ na anyị na-achọsi Jehova ike, anyị agaghị na-egosipụta omume ọ gbasaghị m, na-etinye nanị obere mgbalị, ma ọ bụ dị umengwụ. Kama nke ahụ, anyị na-egosipụta ezi ịnụ ọkụ n’obi n’ịchọ ya.—Ọrụ 15:17.
Ndị Chọsiri Jehova Ike
Ihe atụ nke ndị tinyere mgbalị siri ike n’ịchọ Jehova jupụtara n’Akwụkwọ Nsọ. Otu onye mere otú ahụ bụ Jekọb, bụ́ onye gbasoro mmụọ ozi Chineke nwoghara enwogha mgba n’ụzọ siri ike ruo chi ọbụbọ. N’ihi ya, e nyere Jekọb aha ahụ bụ́ Izrel (Onye jisiworo ike n’ebe Chineke nọ) n’ihi na o jisiri ike, ma ọ bụ nọgidesie ike, gbalịsie ike, n’ebe Chineke nọ. Mmụọ ozi ahụ gọziri ya n’ihi mgbalị siri ike o mere.—Jenesis 32:28.
E nwekwara nwanyị Galili a na-ekwughị aha ya bụ́ onye nwere oruru ọbara ruo ihe dị ka afọ 12, bụ́ nke kpataara ya ‘ọtụtụ ihe mgbu.’ N’ọnọdụ dị otú a, o kwesịghị imetụ ndị ọzọ aka. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ katara obi ịga hụ Jizọs. Ọ nọgidere na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na m bitụ nanị uwe elu ya aka m ga-agbake.” Cheedị banyere nwanyị ahụ ka ọ na-agbalịsi ike isi n’etiti ‘ìgwè mmadụ na-eso [Jizọs] ma na-adagide ya’ gafere. Ka o metụrụ uwe elu Jizọs aka, o nwere mmetụta na “ebe ọbara ya ahụ si erupụta takpọrọ”—a gwọrọ ọrịa ya na-adịghị ala ala! Mgbe Jizọs jụrụ, sị, “Ònye bitụrụ uwe elu m aka?” egwu tụrụ ya. Ma Jizọs ji obi ọmịiko gwa ya, sị: “Nwa m nwanyị, okwukwe gị emewo ka ahụ́ dị gị mma. Laa n’udo, sikwa n’ajọ ọrịa gị pụta wee nwee ahụ́ ike.” A kwụghachiri mgbalị o mere ụgwọ.—Mak 5:24-34; Levitikọs 15:25-27.
N’oge ọzọkwa, otu nwanyị Fonishia rịọsiri Matiu 15:22-28.
Jizọs arịrịọ ike ka ọ gwọọ nwa ya nwanyị. Jizọs zaghachiri na o kwesịghị ekwesị ka e were nri ụmụaka ga-eri nye ụmụ nkịta. Ihe o bu n’uche bụ na ya apụghị ịhapụ ndị Juu kwesịrị ka ya lekọta ma lekọtawa ndị na-abụghị ndị Izrel. Otú o sina dị, n’ịghọta isi ihe dị n’ihe atụ ya, nwanyị ahụ rịọrọ, sị: “Ee, Onyenwe anyị; ma n’ezie ụmụ nkịta na-eri irighịrị ihe na-esi na tebụl nna ha ukwu na-adapụsị.” Okwukwe siri ike na ezi obi o nwere kpaliri Jizọs ikwu, sị: “Nwanyị, okwukwe gị dị ukwuu; ya meere gị dị ka i si chọọ.”—Gịnị gaara emeworị ndị a ma ọ bụrụ na ha anọgidesighị ike ná mgbalị ha? Hà gaara enweta ngọzi ndị ahụ ma ọ bụrụ na ha dara mbà mgbe ha chere ihe mgbochi na ọjụjụ ha nwetara ná mbụ ihu? Ee e! Ihe atụ ndị a gosipụtara isi ihe Jizọs kụziri nke ọma, nke bụ́ na “ịnọgidesi ike” kwesịrị ekwesị, ọbụna dị oké mkpa n’ịchọ Jehova.—Luk 11:5-13.
Dị Ka Uche Ya Si Dị
N’ihe ndekọ nke ndị ahụ a gwọrọ n’ụzọ ọrụ ebube bụ́ ndị a kpọtụrụ aha na mbụ, mgbalị siri ike ọ̀ bụ nanị ihe a chọrọ iji gwọọ ha? Ee e, arịrịọ ha aghaghị ikwekọ n’uche Chineke. E nyere Jizọs ike ịrụ ọrụ ebube iji nye ihe àmà doro anya na ọ bụ Ọkpara Chineke, Mezaịa ahụ e kwere ná nkwa. (Jọn 6:14; 9:33; Ọrụ 2:22) Ọzọkwa, ọrụ ebube ndị ahụ Jizọs rụrụ nyere ihe atụ nke ngọzi elu ala ndị magburu onwe ha Jehova ga-enye ihe a kpọrọ mmadụ n’Ọchịchị Narị Afọ Iri Kraịst.—Mkpughe 21:4; 22:2.
Ọ bụghịzi uche Chineke ka ndị na-ekpe ezi okpukpe nwee ikike nke ịrụ ọrụ ebube, dị ka inwe ike ịgwọ ọrịa na ịsụ asụsụ dị iche iche. (1 Ndị Kọrint 13:8, 13) Uche ya n’oge anyị na-agụnye ịhụ na e kwusara ozi ọma nke Alaeze n’ụwa nile ‘ka ụdị mmadụ nile bịaruo ezi ihe ọmụma nke eziokwu.’ (1 Timoti 2:4; Matiu 24:14; 28:19, 20) Ndị ohu Chineke pụrụ ịtụ anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị na a ga-anụ ekpere ha na-ekpesi ike ma ọ bụrụ na ha ejiri ezi obi tinye mgbalị kwekọrọ n’uche ya.
Ụfọdụ pụrụ iche, sị, ‘N’ihi gịnị ka anyị ji adọgbu onwe anyị n’ọrụ ebe ọ bụ na mee elu mee ala uche Chineke ga-emesị mezuo?’ Otú ọ dị, ọ bụ eziokwu na Jehova ga-emezu nzube ya n’agbanyeghị mgbalị ụmụ mmadụ mere, ọ na-enwe obi ụtọ ịhụ na ụmụ mmadụ na-etinye aka n’imezu uche ya. A pụrụ iji Jehova tụnyere nwoke na-ewu ụlọ. Onye ahụ na-ewu ụlọ nwere ụkpụrụ zuru ezu iji wuo ihe owuwu ahụ, ma ọ na-ahọrọ ihe ndị e ji ewu ụlọ ndị dị n’ógbè ya. N’ụzọ yiri nke ahụ, Jehova nwere ihe ọ na-arụ taa, ọ na-enwekwa obi ụtọ iji ndị ohu ya, bụ́ ndị na-enye Abụ Ọma 110:3; 1 Ndị Kọrint 9:16, 17.
onwe ha n’afọ ofufo na-arụ ya.—Tụlee ahụmahụ nke Toshio na-eto eto. Mgbe ọ banyere n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị, ọ chọrọ ịgba àmà dị ukwuu ruo n’ókè o kwere mee n’ókèala ya pụrụ iche. Ọ na-eji Bible ya mgbe nile ma na-agbalịsi ike ịbụ Onye Kraịst kwesịrị nṅomi. Ná ngwụsị nke afọ mbụ ya n’ụlọ akwụkwọ, o nwetara ohere ịgwa ụmụ klas ya okwu. Toshio kpegaara Jehova ekpere maka enyemaka, o nwekwara obi ụtọ ịhụ ka ụmụ klas ya dum gere ntị nke ọma n’okwu o kwuru nke isiokwu ya bụ “Ihe Mgbaru Ọsọ M nke Iji Ịsụ Ụzọ Mere Ọrụ.” Ọ kọwara na ya chọrọ ịbụ onye ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova. Otu n’ime ụmụ akwụkwọ ibe ya kwetara iso ya mụọ Bible, o nwekwara ọganihu ruo n’ịbụ onye e mere baptizim. A kwụghachiri mgbalị siri ike Toshio mere bụ́ ndị kwekọrọ n’ekpere ndị o kpere ụgwọ n’ụzọ dị ukwuu.
Olee Otú Mgbalị Gị Siruru n’Ike?
Ị pụrụ isi n’ụzọ dịgasị iche iche gosipụta na ị na-achọsi Jehova na ngọzi ya ike. Nke mbụ, e nwere ihe ndị bụ́ isi ị pụrụ ime, dị ka ịkwadebe nke ọma maka nzukọ dị iche iche nke Ndị Kraịst. Site n’azịza ndị i chere echiche nke ọma zaa, okwu gị ndị na-akpali akpali, na ihe ngosi ndị dị irè ị na-eme, ị na-ekpughe otú ọchịchọ ị na-achọ Jehova siruru n’ike. Ị pụkwara igosipụta mgbalị siri ike ị na-eme site n’ime ka ozi gị na-aka mma. Gịnị banyere igosipụtakwu omume enyi mgbe ị na-agwa onye nwe ụlọ okwu ma na-eji okwu mmalite ndị dabara adaba maka ókèala gị eme ihe? (Ndị Kọlọsi 3:23) Site n’iji obi ya dum wepụta onwe ya, nwoke bụ́ Onye Kraịst pụrụ ịnakwere ibu ọrụ n’ọgbakọ, ndị dị ka ije ozi dị ka ohu na-eje ozi ma ọ bụ okenye. (1 Timoti 3:1, 2, 12, 13) Site n’iwepụta onwe gị, ị pụrụ inweta ọṅụ na-abịa site n’inye ihe. Ị pụrụ itinye akwụkwọ ije ozi n’iwu ihe owuwu alaka ma ọ bụ ije ozi n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova. Ọ bụrụ na ị bụ nwoke ruru eru nke na-alụbeghị nwanyị, ị pụrụ ịchọ ịga Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi, bụ́ nke na-akwadebe ndị ikom ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe ịghọ ndị ọzụzụ atụrụ ọma. Ọ bụrụ na ị lụrụ di ma ọ bụ nwunye, ozi ala ọzọ pụrụ ịbụ ụzọ isi gosipụta ọchịchọ siri ike i nwere ijere Jehova ozi. Ịkwaga n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze pụrụ ikwe gị omume.—1 Ndị Kọrint 16:9.
Ihe kasị mkpa bụ mmụọ i ji na-eje ozi gị. N’agbanyeghị ọrụ e nyere gị, jiri mgbalị siri ike na “izi ezi nke obi” na-arụ ya. (Ọrụ 2:46; ) I kwesịrị ile ọrụ ọ bụla anya dị ka ohere i nwere iji gosipụta ọchịchọ siri ike ị na-eme iji wetara Jehova otuto. Na-ekpe ekpere mgbe nile maka enyemaka Jehova, meekwa ihe nile i nwere ike ime. Mgbe ahụ, ị ga-enweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu. Ndị Rom 12:8
Ụgwọ Ọrụ Maka Mgbali Siri Ike
Ì chetara nwoke Onye Kraịst ahụ kpere ekpere iji merie ụjọ ya ka o wee nwee ike ikwusara ndị njem ibe ya ozi ọma? Jehova gọziri ọchịchọ sitere n’ezi obi o nwere. Nwanna nwoke ahụ rụrụ ọrụ n’iji ụzọ iche ihe n’ihu dị mma na-eme ihe, na-eji isiokwu dị iche iche e ji amalite mkparịta ụka eme ihe. O ji Bible mee ihe n’ụzọ dị irè iji gbaara otu nwoke nwere nchegbu banyere nsogbu ndị mmadụ na-enwe ná mmekọrịta ha na ibe ha àmà. Nletaghachi o meere nwoke ahụ ọtụtụ ugboro n’ụgbọ okporo ígwè dugara n’ọmụmụ Bible ebe obibi. N’ezie, Jehova gọziri ya maka mgbalị siri ike o mere!
Ị pụrụ inweta ụgwọ ọrụ dị otú ahụ ma ọ bụrụ na ị nọgide na-achọsi Jehova ike. Ọ bụrụ na i jiri obi umeala nọgidesie ike ma na-etinye uche gị dum n’ọrụ ọchịchị Chineke ọ bụla ị na-arụ, Jehova ga-eji gị mee ihe n’ụzọ kwekọrọ ná nzube ya ma wụkwasị gị ngọzi bara ụba.
[Foto dị na peeji nke 26]
Gịnị gaara emeworị nwanyị a ma ọ bụrụ na ọ nọgidesighị ike?
[Foto dị na peeji nke 27]
Ị̀ na-anọgidesi ike n’ịrịọ Jehova maka ngọzi ya?
[Foto ndị dị na peeji nke 28]
Olee ụzọ ị pụrụ isi na-egosi na ị na-achọsi Jehova ike?