Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-echeta?

Ị̀ Na-echeta?

Ị̀ Na-echeta?

Ọ̀ masịwo gị ịgụ mbipụta Ụlọ Nche ndị ọhụrụ? Ọ dị mma, lee ma ị̀ pụrụ ịza ajụjụ ndị na-esonụ:

Olee ụzọ ụfọdụ Rut si gosipụta ezi ihe nlereanya?

Ọ bụ ezi ihe nlereanya n’ihi ịhụnanya o nwere n’ebe Jehova nọ, ezi ịhụnanya o nwere n’ebe Naomi nọ, nakwa n’igosipụta àgwà ịdị uchu na obi umeala. Ọ bụ ya mere ndị mmadụ ji lee ya anya dị ka “nwanyị na-ejide onwe ya nke ọma.” (Rut 3:11)—4/15, peeji nke 23-26.

Olee otú anyị si mara na Jehova na-eche banyere ndị nkịtị?

Ọ gwara ndị Izrel, bụ́ ndị e mekpọrọ ọnụ n’Ijipt, ka ha ghara imegbu ndị ọ na-enweghị ka ọ ha ha. (Ọpụpụ 22:21-24) Jizọs bụ́ onye ṅomiri Nna ya, gosiri ezi mmasị n’ebe ndị nkịtị nọ, ọ họkwaarạ ndị ikom “na-agụghị oké akwụkwọ na ndị nkịtị” ịbụ ndịozi ya. (Ọrụ 4:13; Matiu 9:36) Anyị pụrụ iṅomi Chineke site n’iche banyere ndị ọzọ, dị ka ndị na-eto eto.—4/15, peeji nke 28-31.

• Gịnị mere anyị ji jide n’aka na Jehova na-ahụ ihe anyị na-eme?

Ihe ndekọ Bible na-egosi na Jehova na-ahụ ihe ụmụ mmadụ na-arụzu. Ọ hụrụ àjà Ebel chụrụ, ọ na-ahụkwa ‘àjà otuto, mkpụrụ egbugbere ọnụ anyị.’ (Ndị Hibru 13:15) Jehova maara na Ịnọk gbalisiri ike ime ihe na-atọ Ya ụtọ site n’ibi ndụ dị ọcha. Chineke hụkwara otú nwanyị Zarefat nke di ya nwụrụ na-abụghị onye Izrel si soro Ịlaịja kerịta obere ihe o nwere. Jehova na-ahụkwa ihe ndị anyị ji okwukwe na-eme.—5/1, peeji nke 28-31.

N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na mgbe Pentikọst 33 O.A., gasịrị, ndị Juu ghọrọ Ndị Kraịst aghaghị ịrara onwe ha nye Chineke?

Na 1513 T.O.A., ndị Izrel oge ochie na Jehova bịara nwee mmekọrịta a raara nye. (Ọpụpụ 19:3-8) Site na mgbe ahụ gaa n’ihu, a mụnyere ndị Juu ná mba ahụ a raara nye n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu ahụ. Ma Jehova ji ọnwụ Kraịst na 33 O.A., wepụ ọgbụgba ndụ Iwu ahụ. (Ndị Kọlọsi 2:14) Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ dị ndị Juu chọrọ ijere Chineke ozi n’ụzọ ọ na-anakwere mkpa ịrara onwe ha nye ya ma bụrụ ndị e mere baptizim n’aha Jizọs Kraịst.—5/15, peeji nke 30-31.

Ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ ọ̀ bụ akụkụ nke ezi ofufe taa?

Iji ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ eme ihe bụ akụkụ ofufe nke Izrel oge ochie. (Ọpụpụ 30:37, 38; Levitikọs 16:12, 13) Ma ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, tinyere iji ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ eme ihe, kwụsịrị mgbe Kraịst nwụrụ. Ndị Kraịst pụrụ ikpebi n’onwe ha ma ha ga-eji ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ eme ihe n’ihe ndị na-emetụtaghị okpukpe, ma ọ bụghị akụkụ nke ezi ofufe taa. E kwesịkwara ichebara mmetụta ndị ọzọ echiche iji zere ime ka ha sụọ ngọngọ.—6/1, peeji nke 28-30.

Ihe dị aṅaa mere ihe akụkọ na nso nso a kpaliri ọtụtụ ndị ichekwu echiche banyere eziokwu ahụ bụ́ na Jizọs biri ndụ n’ụwa?

A kọwo ọtụtụ akụkọ banyere otu igbe, ihe ndebe ọkpụkpụ, a chọtara n’Izrel. O yiri ka ọ dịwara kemgbe narị afọ mbụ, e nwekwara ihe e dekwasịrị n’elu ya nke na-agụ, sị: “Jems, nwa Josef, nwanne Jizọs.” Ụfọdụ na-ewere nke a dị ka “ihe kasị ochie nke na-esiteghị na Bible nke na-agba akaebe” banyere ịdị adị Jizọs.—6/15, peeji nke 3-4.

Olee otú mmadụ si amụta ịhụ n’anya?

Ụmụ mmadụ na-ebu ụzọ amụta ịhụ n’anya site n’ihe nlereanya na ọzụzụ nke ndị mụrụ ha. Mgbe di na nwunye na-ahụrịta onwe ha n’anya ma na-akwanyere ibe ha ùgwù, ụmụ ha pụrụ ịmụta igosi ịhụnanya. (Ndị Efesọs 5:28; Taịtọs 2:4) Ọbụna ma ọ bụrụ na mmadụ esighị n’ezinụlọ na-ahụ n’anya, ọ pụrụ ịmụta igosipụta ịhụnanya site n’ịnakwere nduzi Jehova yiri nke nna, site n’inweta enyemaka nke mmụọ nsọ, na site n’irite uru ná nkwado na-ekpo ọkụ nke òtù ụmụnna Ndị Kraịst.—7/1, peeji nke 4-7.

Ònye bụ Eusebius, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site ná ndụ ya?

Eusebius bụ ọkọ akụkọ ihe mere eme nke oge ochie, bụ́ onye dezuru mpịakọta iri nke akwụkwọ aha ya bụ History of the Christian Church na 324 O.A. Ọ bụ ezie na o kweere na Nna ahụ dị adị tupu Ọkpara ya, Eusebius nabatara echiche dị iche ná nzukọ e nwere na Nicaea. N’ụzọ doro anya, o leghaara ihe Jizọs chọrọ nke bụ́ na ndị na-eso ụzọ Ya ‘agaghị abụ akụkụ nke ụwa,’ anya. (Jọn 17:16)—7/15, peeji nke 29-31.

Jehova ọ̀ gbanwewo echiche ya banyere ịlụ karịa otu nwanyị?

Ee e, Jehova agbanwebeghị echiche ya banyere ịlụ karịa otu nwanyị. (Malakaị 3:6) Ndokwa Chineke mere maka nwoke mbụ ahụ bụ ka ọ “rapara n’ahụ́ nwunye ya” ma soro ya bụrụ otu anụ ahụ́. (Jenesis 2:24) Jizọs kwuru na ịgba alụkwaghịm ma ọ́ bụghị nanị n’ihi ịkwa iko ma lụọ onye ọzọ na-eme ka mmadụ ghọọ onye na-akwa iko. (Matiu 19:4-6, 9) Nhapụ Jehova hapụrụ ịlụ karịa otu nwanyị bịara ná njedebe mgbe e guzobere ọgbakọ Ndị Kraịst.—8/1, peeji nke 28.