Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụdị Aha Dị Aṅaa Ka Ị Na-emere Onwe Gị?

Ụdị Aha Dị Aṅaa Ka Ị Na-emere Onwe Gị?

Ụdị Aha Dị Aṅaa Ka Ị Na-emere Onwe Gị?

Ị̀GỤTỤLA ịma ọkwa ọnwụ mmadụ n’akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta n’ógbè unu ma ọ bụ hụ ogologo ihe e dere banyere ndụ onye nwụrụ anwụ na ihe ndị ọ rụzuru? Ị̀ na-ajụ onwe gị sị, ‘Gịnị ka ndị mmadụ ga na-ekwu banyere m?’ Mmadụ ole chetụrụla echiche banyere otú a ga-esi na-echeta ha mgbe ha nwụrụ? Ya mere, ajụjụ ndị chọrọ iji ezi obi lebara ha anya bụ: Gịnị ka ndị mmadụ ga na-ekwu banyere gị taa ma a sị na ị nwụrụ ụnyaahụ? Ụdị aha dị aṅaa ka ị na-emere onwe gị? Olee otú ọ ga-amasị gị ka Chineke na ndị ma onye ị bụ si na-echeta gị?

Onye amamihe dere akwụkwọ Bible bụ́ Eklisiastis kwuru, sị: “Ezi aha dị mma karịa ezi mmanụ otite na-esi ísì ụtọ; ọzọ, ụbọchị ọnwụ mmadụ dị mma karịa ụbọchị a mụrụ ya.” (Eklisiastis 7:1) N’ihi gịnị ka ụbọchị ọnwụ mmadụ ga-eji dị mma karịa ụbọchị a mụrụ ya? Ọ bụ n’ihi na mgbe a mụrụ mmadụ, o mebereghị onwe ya aha. Ọ dịghị ihe ọ bụla a maara banyere ya. Ọ ga-emere onwe ya aha ọma ma ọ bụ aha ọjọọ ka ọ na-adị ndụ. Nye ndị jiworo ọtụtụ afọ meere onwe ha ezi aha, n’ezie, ụbọchị ọnwụ dị mma karịa ụbọchị ọmụmụ.

N’ihi ya, ọ dị anyị n’aka ịhọrọ ihe anyị ga-eme. N’ezie, kwa ụbọchị, anyị nwere ọtụtụ ihe anyị pụrụ ịhọrọ ime bụ́ ndị ga-ekpebi ụdị aha anyị meere onwe anyị karịsịa n’ebe Chineke nọ mgbe anyị nwụrụ. Ya mere, otu onye Hibru ahụ maara ihe dere, sị: “Ncheta a na-echeta onye ezi omume bụ ihe ngọzi: ma aha ndị na-emebi iwu ga-ere ure.” (Ilu 10:7) Ịbụ onye Chineke chetara ịgọzi ya—lee ihe ùgwù nke ahụ bụ!

Ọ bụrụ na anyị maara ihe, ihe mgbaru ọsọ anyị ga-abụ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ site n’ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ya. Nke ahụ pụtara ịgbaso ụkpụrụ ndị bụ́ isi Kraịst kwupụtara: “‘Ị ghaghị iji obi gị dum, jirikwa mkpụrụ obi gị dum, jirikwa uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.’ Nke a bụ ihe e nyere n’iwu nke kasịnụ, bụrụkwa nke mbụ. Nke abụọ, dị ka ya, bụ nke a, ‘Ị ghaghị ịhụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’ N’ihe abụọ a e nyere n’iwu ka Iwu ahụ dum, nakwa akwụkwọ Ndị Amụma dabeere.”—Matiu 22:37-40.

A na-echeta ụfọdụ ndị dị ka ndị omepụrụ onye ọ dịịrị, ndị na-akwalite ọdịmma ọha na eze, na ndị na-akwado ihe ndị ruuru mmadụ, ma ọ bụ maka ihe ndị ha rụzuru n’azụmahịa, nkà mmụta sayensị, na nkà mmụta ọgwụ na ahụ́ ike, ma ọ bụ n’ihe ndị ọzọ. Otú ọ dị, olee otú ọ ga-amasị gị ka e si na-echeta gị?

Onye Scotland na-ede uri bụ́ Robert Burns (1759-1796) kwupụtara ọchịchọ inwe chi ga-enye anyị onyinye ịhụ onwe anyị otú ndị ọzọ si ahụ anyị. Ị̀ pụrụ iji ezi obi nyochaa onwe gị ma kwuo na i meere onwe gị aha dị mma n’ebe ndị mmadụ na Chineke nọ? Mee elu mee ala, mmekọrịta anyị na ndị ọzọ dị mkpa n’ezie karịa ihe ọ bụla na-adịru nwa oge anyị pụrụ ịrụzu n’ime egwuregwu ma ọ bụ n’ịchụ nta ego. N’ihi ya ajụjụ bụ: Olee otú ụzọ anyị si emeso ndị ọzọ ihe—mkparịta ụka anyị, àgwà anyị, mmegharị ahụ́ anyị—si emetụta ha? Hà na-ele anyị anya dị ka ndị dị mfe mbịakwute ka ọ̀ bụ dị ka ndị dị mpako? Dị ka ndị dị obiọma ka ọ̀ bụ dị ka ndị dị aka ike? Dị ka ndị na-ekwenye ekwenye ka ọ̀ bụ dị ka ndị ọ na-esi ike imeta mma? Dị ka ndị nwere obi mmadụ ka ọ̀ bụ dị ka ndị ihe banyere ndị ọzọ na-adịghị emetụ n’ahụ́? Dị ka ndị nkatọ na-etida etida ka ọ̀ bụ dị ka ndị na-enye ndụmọdụ bara uru? Ka anyị tụlee ihe atụ ụfọdụ e nwere n’oge gara aga na n’oge a iji hụ ihe anyị pụrụ ịmụta.

[Foto dị na peeji nke 3]

Robert Burns kwupụtara ọchịchọ inwe chi ga-enye anyị onyinye ịhụ onwe anyị otú ndị ọzọ si ahụ anyị.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’akwụkwọ bụ́ A History of England