Anyị Ga Na-ejegharị N’aha Jehova Ruo Mgbe Ebighị Ebi!
Anyị Ga Na-ejegharị N’aha Jehova Ruo Mgbe Ebighị Ebi!
“Anyị ga na-ejegharịkwa n’aha Jehova, bụ́ Chineke anyị, ruo mgbe nile ebighị ebi.”—MAỊKA 4:5.
1. Ozi ndị dị aṅaa dị na Maịka isi nke 3 ruo nke 5?
JEHOVA nwere ihe ọ ga-agwa ndị ya, o jikwa Maịka na-eme ihe dị ka onye amụma ya. Ọ bụ nzube Chineke ime ihe megide ndị ajọ omume. Ọ gaje inye Izrel ntaramahụhụ maka isi n’ezi ofufe dapụ. Otú ọ dị, n’ụzọ na-enye obi ụtọ, Jehova ga-agọzi ndị na-ejegharị n’aha ya. E mere ka ozi ndị a pụta ìhè nke ọma n’isi nke 3 ruo nke 5 nke amụma Maịka.
2, 3. (a) Àgwà dị aṅaa ka ndị ndú Izrel kwesịrị igosipụta, ma gịnị ka ha na-eme n’ezie? (b) Olee otú ị ga-esi kọwaa atụmatụ okwu e ji mee ihe na Maịka 3:2, 3?
2 Onye amụma Chineke na-ekwu, sị: “Nụrụnụ, unu ndị isi Jekọb, na unu ndị ikpe ụlọ [Izrel]: ọ́ bụghị ihe dịịrị unu, bụ́ ịmara ikpe?” Ee, nke ahụ kwesịrị ịbụ ihe dịịrị ha, ma gịnị ka ha na-eme n’ezie? Maịka na-ekwu, sị: “Unu ndị na-akpọ ezi ihe asị, ndị na-ahụkwa ihe ọjọọ n’anya; ndị na-adọwapụ ha akpụkpọ n’ahụ́, na anụ ahụ́ ha n’ọkpụkpụ nile ha; ndị na-erikwa anụ ahụ́ ndị m; ọ bụkwa akpụkpọ ahụ́ ha ka ha gbaworo ha, ọ bụkwa ọkpụkpụ nile ha ka ha gbajisịworo: ee, ha egbubisịwo ha dị ka ihe a ga-esi n’ite, na dị ka anụ n’etiti ite ọla.”—Maịka 3:1-3.
3 Leenụ, ndị ndú ahụ na-emegbu ndị ogbenye, bụ́ ndị na-enweghị onye inyeaka! Ndị nụrụ ihe Maịka kwuru ghọtara atụmatụ okwu e ji mee ihe n’ebe a nke ọma. Mgbe a na-akwadebe atụrụ e gburu egbu site n’isi ya esi, a na-ebu ụzọ gbaa ya akpụkpọ, mgbe ahụ, gburisie ya. Mgbe ụfọdụ a na-akụwa ọkpụkpụ ha iji wepụta ụmị ha. A na-eji nnukwute ite, dị ka nke ahụ Maịka kpọtụrụ aha, sie ma anụ ahụ ma ọkpụkpụ ya. (Ezikiel 24:3-5, 10) Lee ihe atụ dabara nnọọ adaba ọ bụ nke mmeso ọjọọ ajọ ndị ndú nke ndị oge Maịka mesoro ha!
Jehova Chọrọ Ka Anyị Na-ekpe Ikpe Ziri Ezi
4. Ọdịiche dị aṅaa ka e nwere n’etiti Jehova na ndị ndú Izrel?
4 E nwere nnukwute ọdịiche dị n’etiti Onye Ọzụzụ Atụrụ ahụ na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova, na ndị ndú Izrel. N’ihi ekpeghị ikpe ziri ezi, ha adịghị arụ ọrụ ha bụ́ ichebe ìgwè atụrụ ahụ. Kama nke ahụ, ha na-erigbu atụrụ ihe atụ ahụ n’ihi ọchịchọ ọdịmma onwe ha nanị, na-ekpe ha ikpe na-ezighị ezi ma na-akwafu “ọbara” ha, dị ka e kwuru na Maịka 3:10. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ọnọdụ a?
5. Gịnị ka Jehova na-atụ anya ya n’aka ndị na-edu ndú n’etiti ndị ya?
5 Chineke na-atụ anya ka ndị na-edu ndú n’etiti ndị ya na-ekpe ikpe ziri ezi. Nke a bụ ihe anyị na-ahụ na-eme n’etiti ndị ohu Jehova taa. Ọzọkwa, nke a kwekọrọ n’Aịsaịa 32:1, bụ́ ebe anyị na-agụ, sị: “Lee, n’ezi omume ka otu eze ga-abụ eze, ndị isi kwa, n’ikpe ziri ezi ka ha ga-abụ ndị isi.” Ma n’oge Maịka, gịnị ka anyị na-ahụ? “Ndị na-akpọ ezi ihe asị, ndị na-ahụkwa ihe ọjọọ n’anya” nọgidere na-agbagọ ikpe ziri ezi.
Ekpere Ole Ndị Ka A Na-aza?
6, 7. Isi ihe dị aṅaa dị mkpa ka e mesiri ike na Maịka 3:4?
6 Ndị ajọ omume ha na Maịka dịkọrọ ndụ hà pụrụ ịtụ anya inweta ihu ọma Jehova? Ọ dịghị ma ọlị! Maịka 3:4 na-ekwu, sị: “Ha ga-etiku Jehova mkpu, ma Ọ gaghị aza ha: Ọ ga-ezonahụkwa ha ihu Ya na mgbe ahụ, dị ka ha meworo ka omume nile ha jọọ njọ.” Nke a na-emesi otu isi ihe dị oké mkpa ike.
7 Jehova agaghị aza ekpere anyị ma ọ bụrụ na anyị na-eme mmehie. Nke ahụ bụ eziokwu ma ọ bụrụ na anyị na-ebi ụdị ndụ abụọ, na-ekpuchi mmehie anyị ma na-eme ka anyị ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Chineke ozi. Dị ka e dekọrọ n’Abụ Ọma 26:4, Devid bụrụ abụ, sị: “Mụ na mmadụ efu anọkọghị; mụ na ndị ihu abụọ adịghị abakọkwa.” Lezienụ otú Jehova na-agaghị esi zaa ekpere nke ndị ma ụma na-emebi Okwu ya!
Ndị Mmụọ Chineke Mere Ka Ha Nwee Ike
8. Banyere gịnị ka a dọrọ ndị amụma ụgha nke oge Maịka aka ná ntị?
8 Lee omume ọjọọ ndị jupụtara n’etiti ndị ndú ime mmụọ nke Izrel! Ndị amụma ụgha na-eme ka ndị Chineke wagharịa n’ụzọ ime mmụọ. Ndị ndú nwere anyaukwu na-eti mkpu “Udo” ma n’ezie na-edo agha nsọ megide onye ọ bụla nke na-adịghị etinye ihe n’ọnụ ha. “N’ihi nke a,” ka Jehova na-ekwu, “ka abalị ga-adịrị unu, unu ewee ghara ịhụ ọhụụ; ọchịchịrị ga-agbakwara unu, unu ewee ghara ịjụ ase; anyanwụ ga-adakputekwa ndị amụma ahụ, ụbọchị ewee jie nji n’elu ha. Ihere ga-emekwa ndị ọhụụ, ndị na-ajụ ase ga-enwekwa ihu ihere; ee, ha ga-ekpuchi egbugbere ọnụ elu ha.”—Maịka 3:5-7a.
9, 10. Gịnị ka ‘ikpuchi egbugbere ọnụ elu’ pụtara, gịnịkwa mere na e nweghị ihe mere Maịka ga-eji mee otú ahụ?
9 Gịnị mere ha ga-eji ‘na-ekpuchi egbugbere ọnụ elu ha’? Nke a bụ ihe ndị ajọ omume ahụ ha na Maịka dịkọrọ ndụ na-eme n’ihi ihere. Ihere kwesịkwara ime ndị ikom ọjọọ a. “Ọ dịghị ọzịza Chineke na-aza,” dị ka ha kwuru. (Maịka 3:7b) Jehova adịghị aṅa ntị n’ekpere nke ndị ajọ omume ọ bụla dị mpako.
10 Ọ dịghị ihe ọ bụla mere Maịka ga-eji ‘na-ekpuchi egbugbere ọnụ elu’ ya. Ihere adịghị eme ya. Jehova na-aza ekpere ya. Rịba Maịka 3:8 ama, bụ́ ebe onye amụma ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-ekwu, sị: “Ma otú ọ dị, mụ onwe m jupụtara n’ike, bụ́ Mmụọ nke Jehova, na ikpe, na ịdị ike.” Lee ka Maịka si nwee ekele na n’ogologo oge ahụ nile o ji ikwesị ntụkwasị obi jee ozi ya, o “jupụtara n’ike, bụ́ Mmụọ nke Jehova” mgbe nile! Nke a enyewo ya ike “igosi Jekọb njehie ya, na igosi [Izrel] mmehie ya.”
11. Olee otú ụmụ mmadụ si enweta ike iji na-ekwusa ozi Chineke?
11 Ike karịrị ike mmadụ dị Maịka mkpa iji kwusaa ozi ikpe ọmụma nke Chineke. Mmụọ Jehova, ma ọ bụ ike ya dị ike nọ n’ọrụ, dị oké mkpa. Oleekwanụ banyere anyị? Anyị ga-enwe ike ịrụzu ọrụ ime nkwusa e nyere anyị ịrụ nanị ma ọ bụrụ na Jehova enye anyị ume site na mmụọ nsọ ya. Mgbalị anyị ime nkwusa ga-akụrịrị afọ n’ala ma ọ bụrụ na anyị amara ụma na-eme mmehie. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, Chineke apụghị ịza ekpere anyị na-ekpe maka ume iji rụọ ọrụ a. N’ezie, anyị apụghị ikwusa ozi ikpe nke Nna anyị nke eluigwe ọ gwụla ma “Mmụọ nke Jehova” ọ dịkwasịrị anyị. Site n’ekpere ndị a na-aza nakwa site n’enyemaka nke mmụọ nsọ, anyị na-enwe ike iji obi ike ekwu okwu Chineke, dị ka Maịka.
12. N’ihi gịnị ka ndị na-eso Jizọs pụrụ iji nwee ike ‘ịnọgide na-ekwu okwu Chineke n’atụghị egwu’?
n’Ọrụ 4:23-31. Weredị ya na ị bụ otu n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs na narị afọ mbụ. Ndị mkpagbu obi tara mmiri anọwo na-achọ imechi ndị na-eso ụzọ Kraịst ọnụ. Ma ndị a na-eguzosi ike n’ihe kpegaara Eze Onyenwe ha ekpere, na-arịọ, sị: “Jehova, leba anya n’iyi egwu ha, nyekwa ndị ohu gị ikike ịnọgide na-ekwu okwu gị n’atụghị egwu ọ bụla.” Gịnị si na ya pụta? Mgbe ha rịọsiwokwara arịrịọ ike, e mere ka ebe ahụ ha zukọtara maa jijiji, ha nile jupụtakwara na mmụọ nsọ, na-ekwukwa okwu Chineke n’atụghị egwu. Ya mere, ka anyị na-adabere n’ebe Jehova nọ site n’ekpere ma na-adabere n’enyemaka ya site na mmụọ nsọ ka anyị na-ejezu ozi anyị.
12 Ma eleghị anya ị na-echeta ihe ndekọ ahụ dị13. Gịnị ga-eme Jeruselem na Sameria, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
13 Chee echiche ọzọ banyere oge Maịka. Dị ka e dekọrọ na Maịka 3:9-12, ndị ọchịchị ahụ ikpe ọbara mara na-ekpe ikpe n’ihi iri ngo, ndị nchụàjà ya na-ezi ihe n’ihi ụgwọ a ga-akwụ ha, ndị amụma ụgha na-ajụkwa ase n’ihi ego. Ka a sịkwa ihe mere Chineke ji kwubie na isi obodo Juda, bụ́ Jeruselem, “ga-aghọkwa obo ihe obo ihe”! Ebe ọ bụ na ofufe ụgha na omume rụrụ arụ jupụtakwara n’Izrel, e nyere Maịka ike mmụọ nsọ ịdọ ha aka ná ntị na Chineke ga-eme ka Sameria ghọọ “obo ihe.” (Maịka 1:6) N’ezie, onye amụma ahụ dị ndụ hụ mbibi ahụ e buru n’amụma nke usuu ndị agha Asiria bibiri Sameria na 740 T.O.A. (2 Ndị Eze 17:5, 6; 25:) Ihe àmà na-egosi na ọ bụ nanị site n’ike Jehova ka a pụrụ izi ozi ndị a dị ike megide Jeruselem na Sameria. 1-21
14. Olee otú e si mezuo amụma ahụ e dekọrọ na Maịka 3:12, oleekwa otú nke ahụ kwesịrị isi metụta anyị?
14 N’ezie, Juda apụghị ịgbanahụ ikpe ọmụma Jehova. Ná mmezu nke amụma ahụ e dekọrọ na Maịka 3:12, “a ga-eji plough gwuo Zaịọn dị ka ubi.” Ugbu a anyị nọ na narị afọ nke 21, ọ bụrụ na anyị echeghachi echiche azụ, anyị na-ahụ na ihe ndị a mere mgbe ndị Babilọn bibiri Juda na Jeruselem na 607 T.O.A. Nke a weere ọnọdụ ọtụtụ afọ mgbe Maịka busịrị ya n’amụma, ma o ji n’aka na ọ ga-eme. N’ezie, anyị kwesịkwara inwe obi ike dị otú ahụ na ajọ usoro ihe dị ugbu a ga-abịa ná njedebe ‘n’ụbọchị Jehova’ ahụ e buru n’amụma?—2 Pita 3:11, 12.
Jehova Edozie Okwu
15. Olee otú ị ga-esi kọwaa amụma ahụ e dekọrọ na Maịka 4:1-4 n’okwu nke aka gị?
15 N’ileghachi anya azụ, anyị na-ahụ na Maịka mesịrị zie ozi na-akpali akpali nke na-enye olileanya. Lee ihe na-agba ume e kwuru na Maịka 4:1-4! Maịka na-ekwu ná mkpirikpi, sị: “Ọ ga-erukwa, n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a, na ugwu nke ụlọ Jehova ga na-eguzosi ike n’elu ugwu nile, a ga-ebulikwa ugwu ahụ elu karịa ugwu nta nile; ndị dị iche iche ga-eruba n’ime ya dị ka osimiri. . . . Ọ ga-ekpekwa ikpe n’etiti ọtụtụ ndị dị iche iche, dozikwaara mba dị iche iche nwere ume okwu ha ruo ebe dị anya; ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ. Ma ha ga-ebi, onye ọ bụla n’okpuru osisi [vaịn] ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji: n’ihi na ọnụ nke Jehova nke usuu nile nke ndị agha ekwuwo okwu.”
16, 17. Olee otú e si na-emezu Maịka 4:1-4 taa?
16 Ole ndị bụ “ọtụtụ ndị dị iche iche” na “mba dị iche iche nwere ume” ndị a kpọturu uche n’ebe a? Ha abụghị mba na ọchịchị dị iche iche nke ụwa a. Kama nke ahụ, amụma ahụ na-ekwu banyere ndị si ná mba nile bụ́ ndị na-eje ozi dị nsọ ugbu a n’ịdị n’otu n’ugwu nke ezi ofufe Jehova.
17 N’ikwekọ n’amụma Maịka, n’isi nso, a ga na-efe Jehova ofufe dị ọcha n’ụzọ kasị zuo ezuo n’ụwa nile. Taa, a na-akụziri ndị “nwere ezi ọchịchọ obi maka ndụ ebighị ebi” ụzọ Jehova. (Ọrụ 13:48) Jehova na-ekpe ikpe ma na-edozi okwu n’ụzọ ime mmụọ maka ndị kwere ekwe bụ́ ndị na-akwado Alaeze ahụ. Ha ga-agabiga ‘oké mkpagbu ahụ’ dị ka akụkụ nke “oké ìgwè mmadụ” ahụ. (Mkpughe 7:9, 14) Ebe ha kpụgharịworo mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè, ha na Ndịàmà Jehova ibe ha nakwa ndị ọzọ, na-ebi n’udo ọbụna taa. Lee ihe na-enye obi ụtọ ọ bụ iso n’ime ha!
Ndị Kpebisiri Ike Ijegharị n’Aha Jehova
18. Gịnị ka mmadụ ‘ịnọ n’okpuru osisi vaịn ya na n’okpuru osisi fig ya’ bụ ihe atụ ya?
18 N’oge anyị a, mgbe ụjọ ji ụwa aka ọjọọ, obi dị anyị ụtọ na ọtụtụ ndị na-amụta ụzọ Jehova. Ọ na-agụsi anyị agụụ ike ịhụ oge ahụ nke dị nso ugbu a mgbe ndị nile dị otú ahụ hụrụ Chineke n’anya na-agaghị amụtakwa agha ọzọ kama ha ga-anọ n’okpuru osisi vaịn na n’okpuru osisi fig ha. A na-akụkarị osisi fig n’ubi vaịn. (Luk 13:6) Mmadụ ịnọ n’okpuru osisi vaịn ya na n’okpuru osisi fig ya bụ ihe atụ nke inwe udo, ọganihu na ịnọ ná nchebe. Ọbụna ugbu a, mmekọrịta anyị na Jehova na-eme ka anyị nwee udo nke obi na nchebe ime mmụọ. Mgbe a ga-enwe ọnọdụ ndị ahụ n’oge ịchịisi Alaeze ahụ, anyị ga-anọ ná ntụkwasị obi n’ụzọ zuru ezu ma ghara ịdị na-atụ ụjọ.
19. Gịnị ka ijegharị n’aha Jehova pụtara?
19 Iji nweta ihu ọma na ngọzi Chineke, anyị aghaghị ịdị na-ejegharị n’aha Jehova. E kwupụtara nke a n’ụzọ dị ike na Maịka 4:5, bụ́ ebe onye amụma ahụ kwuru, sị: “Ndị nile dị iche iche na-ejegharị, onye ọ bụla n’aha nke chi ya, anyị onwe anyị ga na-ejegharịkwa n’aha Jehova, bụ́ Chineke anyị, ruo mgbe nile ebighị ebi.” Ijegharị n’aha Jehova apụtaghị nanị ikwu na ọ bụ Chineke anyị. Ọ chọrọ ihe karịrị anyị ikere òkè ná nzukọ Ndị Kraịst na n’ọrụ nkwusa Alaeze ahụ, ọ bụ ezie na ọrụ ndị dị otú ahụ dịkwa oké mkpa. Ọ bụrụ na anyị na-ejegharị n’aha Jehova, anyị raara onwe anyị nye ya ma na-agbalịsi ike iji ịhụnanya sitere n’obi dum na-ejere ya ozi n’ikwesị ntụkwasị obi. (Matiu 22:37) N’ezie, dịkwa ka ndị na-efe ya ofufe, anyị ekpebisiwo ike ịdị na-ejegharị n’aha Jehova bụ́ Chineke anyị ruo mgbe nile ebighị ebi.
20. Gịnị ka e buru n’amụma na Maịka 4:6-13?
20 Ugbu a, biko tụlee okwu amụma ndị dị na Maịka 4:6-13. “Ada Zaịọn” aghaghị ije biri n’ala ọzọ, “bịaruo Babilọn.” Nke ahụ kpọmkwem bụ ihe mere ndị bi na Jeruselem na narị afọ nke asaa T.O.A. Ka o sina dị, amụma Maịka na-egosi na ihe fọdụrụnụ gaje ịlaghachi Juda nakwa na Jehova ga-ahụ na e bibiri ndị iro Zaịọn mgbe a ga-eweghachi ya.
21, 22. N’ụzọ dị aṅaa ka e si mezuo ihe dị na Maịka 5:2?
21 E buru amụma banyere ihe ndị ọzọ dị ịrịba ama ga-emenụ na Maịka isi 5. Dị ka ihe atụ, rịba ama ihe e kwuru na Maịka 5:2-4. Maịka na-ebu amụma na Onye Ọchịchị Chineke họpụtara—onye “sitere na mgbe ochie”—ga-esi na Betlehem pụta. Ọ ga-achị dị ka onye ọzụzụ atụrụ “n’ike nke Jehova.” Ọzọkwa, Onye Ọchịchị a ga-adị ukwuu, ọ bụghị nanị n’Izrel, kama “ruo nsọtụ nile nke ụwa.” Ịmata onye ọ bụ ga-abụ ihe ijuanya nye ndị bi n’ụwa n’ozuzu ha, ma ọ bụghịrị anyị ihe omimi ma ọlị.
22 Ònye bụ onye kasị mkpa a mụtụrụla na Betlehem? Ònyekwa “ga-adị ukwuu ruo nsọtụ nile nke ụwa”? Ọ dịghị onye ọzọ ọ bụ ma ọ bụghị Mezaịa ahụ, bụ́ Jizọs Kraịst! Mgbe Herọd Onye Ukwu jụrụ ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ ebe a gaje ịmụ Mezaịa ahụ, ha zara sị: “Na Betlehem nke Judia.” Ọbụna ha hotakwara ihe e kwuru na Maịka 5:2. (Matiu 2:3-6) Ụfọdụ n’ime ndị nkịtị makwaara nke a, n’ihi na Jọn 7:42 sịrị na ha kwuru, sị: “Ọ̀ bụ na Akwụkwọ Nsọ ekwughị na Kraịst ahụ ga-esi n’ụmụ Devid apụta, sitekwa na Betlehem bụ́ obodo ebe Devid biri?”
Ezi Ume Ọhụrụ Maka Ndị Mmadụ
23. Gịnị na-eme ugbu a ná mmezu nke Maịka 5:7?
23 Maịka 5:5-15 na-ezo aka ná mwakpo ndị Asiria ga-eme bụ́ nke ga-enwe ihe ịga nke ọma na-agaghị adịte aka ma na-akọwapụta na Chineke ga-abọ ọbọ n’ahụ́ mba ndị na-enupụ isi. Maịka 5:7 na-ekwe nkwa na a ga-eme ka ndị Juu fọdụrụnụ gosiri nchegharị laghachi n’ala ha, ma okwu ndị a metụtakwara oge anyị. Maịka na-ekwu, sị: “Ndị Jekọb fọdụrụ ga-adịkwa n’etiti ọtụtụ ndị dị iche iche dị ka igirigi sitere n’ebe Jehova nọ, dị ka abụrụbụ mmiri n’elu ihe ọkụkụ.” E ji okwu ihe atụ a mara mma buo amụma na ihe fọdụrụ na Jekọb, ma ọ bụ Izrel, ime mmụọ, ga-abụrụ ndị ahụ ngọzi sitere n’aka Chineke. “Atụrụ ọzọ” nke Jizọs, bụ́ ndị nwere olileanya ibi n’ụwa, nwere obi ụtọ iso ihe fọdụrụ ‘n’Izrel nke Chineke’ nke oge a na-ejekọ ozi n’otu ubu, na-enye aka ime ka ndị ọzọ nwee ume ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ. (Jọn 10:16; Ndị Galeshia 6:16; Zefanaịa 3:9) A bịa na nke a, ọ dị isi ihe ọzọ e kwesịrị ichebara echiche. Dị ka ndị nkwusa Alaeze, anyị nile kwesịrị iji ihe ùgwù anyị nke ime ka ndị ọzọ nweta ezi ume ọhụrụ kpọrọ ihe.
24. Isi ihe ndị dị aṅaa dị na Maịka isi nke 3 ruo nke 5 masịworo gị?
24 Gịnị ka ị mụtaworo n’isi nke 3 ruo nke 5 nke amụma Maịka? Ma eleghị anya, ọ bụ isi ihe ndị dị ka ndị a: (1) Chineke na-atụ anya ka
ndị na-edu ndú n’etiti ndị ya na-ekpe ikpe ziri ezi. (2) Jehova agaghị aza ekpere anyị ma ọ bụrụ na anyị ma ụma na-eme mmehie. (3) Anyị pụrụ ịrụzu ọrụ ime nkwusa e nyere anyị nanị ma ọ bụrụ na Chineke enye anyị ume site na mmụọ nsọ ya. (4) Iji nweta ihu ọma Chineke, anyị aghaghị ịdị na-ejegharị n’aha Jehova. (5) Dị ka ndị nkwusa Alaeze, anyị kwesịrị iji ihe ùgwù anyị nke ime ka ndị mmadụ nweta ezi ume ọhụrụ kpọrọ ihe. Isi ihe ndị ọzọ pụrụ ịmasịwo gị. Gịnị ọzọ ka anyị pụrụ ịmụta site n’akwụkwọ amụma a nke Bible? Isiokwu na-esonụ ga-enyere anyị aka ịmụta ihe ndị bara uru site n’isiakwụkwọ abụọ ikpeazụ nke amụma Maịka nke na-ewusi okwukwe ike.Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
• Gịnị ka Chineke na-atụ anya ya n’aka ndị na-edu ndú n’etiti ndị ya?
• N’ihi gịnị ka ekpere na mmụọ nsọ ji dị mkpa n’ihe banyere ozi anyị na-ejere Jehova?
• Olee otú ndị mmadụ si ‘ejegharị n’aha Jehova’?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 15]
Ị̀ pụrụ ịkọwa ihe atụ Maịka nyere banyere nnukwu ite ọla?
[Foto ndị dị na peeji nke 16]
Dị ka Maịka, anyị ji obi ike na-eje ozi anyị