Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ezi Ofufe Ejikọọ Otu Ezinụlọ

Ezi Ofufe Ejikọọ Otu Ezinụlọ

Ezi Ofufe Ejikọọ Otu Ezinụlọ

MARIA dị afọ 13 mgbe ya na nwanne ya nwanyị nke ọ tọrọ, bụ́ Lucy, nụrụ banyere Jehova site n’aka otu onye ikwu ha. Ọ kọwakwaara ha banyere olileanya nke Paradaịs n’elu ala. N’ịbụ ndị a kpaliri mmasị ha, ha sooro ya gaa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova. Ntụziaka doro anya e nyere n’ebe ahụ masịrị Maria. Ọ dị nnọọ iche n’ebe chọọchị dị, bụ́ ebe ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nanị egwu ka ha na-agụ! N’oge na-adịghị anya, ụmụaka ahụ sooro otu n’ime Ndịàmà Jehova na-amụ Bible.

Nwanne ha nwoke nke tọrọ ha bụ́ Hugo, nwere mmasị na nkà ihe ọmụma na evolushọn. O weere onwe ya dị ka onye na-ekweghị na Chineke. Ma, ọ gụrụ akwụkwọ bụ́ Life—How Did It Get Here? By Evolution or by Creation?  * ka ọ na-eje ozi agha. Ọ chọtara azịza nke ajụjụ dị iche iche ndị okpukpe ọzọ na-apụghị ịza. Mgbe o jesịrị ozi agha, ọ malitere iwusi okwukwe ọhụrụ o nwere n’ebe Chineke nọ ike site n’ịmụ Bible na iso ụmụnne ya ndị nwanyị na-aga nzukọ dị iche iche. E mere Maria na Lucy baptizim na 1992, afọ abụọ ka ha nụsịrị banyere eziokwu ahụ nke mbụ ya, e mekwara nwanne ha nwoke baptizim ka afọ abụọ ọzọ gasịrị.

Ka ọ dịgodị, ndị mụrụ ha, bụ́ ndị ji ọdịnala okpukpe Katọlik kpọrọ ihe, gosiri mmasị dị nta n’eziokwu ahụ. Ha na-ele Ndịàmà Jehova anya dị ka ndị na-akpasu iwe, ọ bụ ezie na ha na-enwe mmasị n’ezi àgwà na ejiji kwesịrị ekwesị nke Ndịàmà na-eto eto bụ́ ndị ụmụ ha na-akpọta n’ụlọ. Ọzọkwa, a kpalikwara ọchịchọ ịmatakwu ihe nke ndị mụrụ ha mgbe ụmụ ha na-ekwu banyere ihe ndị ha mụtara ná nzukọ n’oge ha na-eri nri.

N’agbanyeghị nke ahụ, ndị mụrụ ha nwere mmasị n’amoosu. Nna ha bụ onye aṅụrụma nke na-eti nne ha ihe. Ezinụlọ ahụ na-achọ itisasị. Ka e mesịrị, nna ha nọrọ izu abụọ n’ụlọ mkpọrọ n’ihi àgwà ọjọọ ọ kpara mgbe mmanya na-egbu ya. Mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ, ọ malitere ịgụ Bible. Ka ọ na-agụ ya, ọ gụtara ebe Jizọs kwuru banyere ihe ịrịba ama nke ụbọchi ikpeazụ. N’ịbụ ndị nwere mgbagwoju anya, nne na nna ahụ bịara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma nakwere ọmụmụ Bible ebe obibi. Mgbe ha mụtara eziokwu ahụ, ha bibiri akwụkwọ ha nile ndị metụtara amoosu ma nwere onwe ha pụọ ná mwakpo ndị mmụọ ọjọọ na-awakpo ha site n’ịkpọku aha Jehova. Ha malitere ime mgbanwe ndị dị ịrịba ama n’àgwà ha.

Ị̀ pụrụ ichetụ echiche ụdị mkpali Maria na Lucy nwere n’ikiri ka Hugo na-eme nne na nna ha baptizim n’otu n’ime mgbakọ distikti ndị e nwere na Bolivia na 1999? Ihe dị ka afọ itoolu agafewo kemgbe Maria na Lucy nụsịrị banyere Jehova na nkwa ya nke mbụ ya. Ha na Hugo bụ ndị ozi oge nile ugbu a. Lee obi ụtọ ha nwere na ezi ofufe jikọtara ezinụlọ ha!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.